Nweenụ Ekele—Alaeze Mesaịa nke Jehova Na-achị Achị
Anyị na-ekele gị, [Jehova, NW] Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, . . . n’ihi na i werewo oké ike gi, i bụkwara eze.”—MKPUGHE 11:17.
1. Gịnị ka onyeisi oche Watch Tower Society kwuru mgbe ọ gasịrị njem na Europe na 1911?
NÁ MMALITE 1911, onyeisi oche nke Watch Tower Society, bụ́ C. T. Russell, kwuru otu usoro okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible n’obodo ndị bụ isi nke Europe. N’ikwu okwu banyere njem ahụ, Russell dere ihe a sonụ n’Ụlọ Nche (Bekee), May 15, 1911: “Ọ bụụrụ anyị ihe ijuanya ịhụ ọtụtụ ihe àmà nke ihe ịga nke ọma n’ebe nile . . . Ndị na-agụ akwụkwọ anyị maara na ruo ọtụtụ afọ, anyị anọwo na-atụ anya ka Ọgbọ nke a gwụsịa n’oge oké nsogbu, anyị na-atụkwa anya na ọ ga-etiwapụ na mberede nakwa n’ike n’oge na-adịghị anya mgbe October, 1914, gasịrị, bụ́ mgbe, dị ka anyị ghọtadebere Akwụkwọ nsọ, Oge Ndị Jentaịl—mgbe a hapụụrụ ndị Jentaịl ọchịchị ụwa—ga-agwụsị; ya mere, ọ bụ mgbe oge ga-eru ka Alaeze Mesaịa malite iji ike ya mee ihe.” È mezuru olileanya nke a?
2. È si aṅaa tisasịa udo na 1914, oleekwa ihe mwute ndị si na ya pụta?
2 N’ime ọkara mbụ nke 1914, o yiri nnọọ ka ụwa anọghị n’ihe ize ndụ ọ bụla nke agha. Ma na mberede, e tisasịrị udo mgbe otu onye Serbia gbagburu onye nketa nke ocheeze Austria na June 28, 1914. N’oge na-adịghi anya, Austria-Hungary malitere ibuso Serbia agha. Russia dụnyeere ndị Serbia úkwù, ya mere, Germany wee malite ibuso Russia agha n’August 1. Mgbe ahụ, Germany malitere ibuso France agha n’August 3; Great Britain malitere ibuso Germany agha n’August 4; Montenegro malitere ibuso Austria-Hungary agha n’August 7; Japan malitere ibuso Germany agha n’August 23; Austria-Hungary malitere ibuso Belgium agha n’August 28. Ọtụtụ ndị chere na agha ahụ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Kama nke ahụ, ọ gbasawanyere wee ghọọ agha kasị njọ e nwetụworo n’akụkọ ihe mere eme ruo mgbe ahụ, mgbe 19 mba ndị ọzọ dụnyeere ndị dị iche iche úkwù ná mwụfu ọbara zuru ụwa ọnụ nke gburu ihe karịrị 13,000,000 ndị agha na ndị nkịtị, nweekwa ihe karịrị 21,000,000 mmadụ ndị o gbubisịrị ụkwụ na aka na ndị e merụrụ ahụ n’ụzọ ndị ọzọ.
3, 4. Gịnị mere n’isi ulo orụ Society n’ụtụtụ Friday, October 2, 1914?
3 N’ụtụtụ Friday, October 2, 1914, Russell maara ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị na Brooklyn, New York, ọkwa, sị: “Oge Ndị Jentaịl agwụsịwo; oge ndị eze ha agabigawokwa.” Ezinụlọ ahụ dị na Betel, bụ́ “ụlọ nke Chineke,” ji oké ịkụ aka nabata nke a.
4 Nkwado dị aṅaa ka C. T. Russell na ndị òtù ya nwere maka inwe ọṅụ dị otú ahụ n’ụtụtụ ahụ nke ọnwa October? Olee ebe okwu ahụ bụ “Oge Ndị Jentaịl” malitere? Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Oge Ndị Jentad kwụsịrị n’October 1914? Oleekwa ụzọ nke ahụ kwesịrị isi metụta gị?
Jerusalem na Oge Ndị Jentaịl
5. Olee ebe okwu ahụ bụ “Oge Ndị Jentaịl” malitere?
5 Okwu ahụ bụ “Oge Ndị Jentaịl,” ma ọ bụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,” sitere n’oké amụma ahụ Jisọs buru banyere mbibi nke Jerusalem. (Luk 21:5-36, King James Version) Ụbọchị abụọ tupu o buo amụma ahụ, Jisọs gosiri onwe ya n’ihu ndị bi na Jerusalem dị ka Mesaịa ha. Ka o ji obi umeala nọkwasị n’elu ịnyịnya ibu na-abanye n’obodo ahụ, ìgwè ndị Juu tiri mkpu mmeri, dị ka Zekaraịa 9:9 buru amụma ya. Ha ji oké olu tie mkpu, sị, “Onye a gọziri agọzi ka eze nke na-abịa n’aha [Jehova, NW], bụ.”—Luk 19: 28-40.
6, 7. Ajọ ikpe ọmụma ọbara dị aṅaa ka ndị Judia nke narị afọ mbụ wetara n’isi onwe ha, gịnị sikwa na ya pụta?
6 Ma Jisọs matara na n’oge na-adịghị anya, a gaje iduru echiche ọha mmadụ gaa n’imegide ya n’ihi ajọ ịkpọasị nke ndị ndú okpukpe nọ na Jerusalem nwere n’okpuru nduzi nke nna ha, bụ́ Ekwensu. (Jenesis 3:15; Jọn 8:44) N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, na Naịsan 14, otu ìgwè ndị Juu ji iti mkpu na-achọ ogbugbu Jisọs. Ha tikuru onye ọchịchị Rom ahụ nke ọ na-amasịchaghị ime ihe ahụ ha chọrọ, mkpu, sị, “Ọbara ya dị anyị n’isi, dịkwa n’isi ụmụ anyị.” (Matiu 27:24, 25) Kama ịnakwere Jisọs dị ka Eze Mesaịa ahụ, ndị isi nchụaja kwupụtara, sị: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:15) Mgbe ahụ, a kpọgidere ezi Mesaịa ahụ n’elu osisi ịta ahụhụ ka ọ nwụọ, ebe e boworo ya ebubo ụgha dị ka onye na-akpali nnupụisi megide Rom na onye na-ekwulu Chineke nke ndị Juu.—Mak 14:61-64; Luk 23:2; Jọn 18:36; 19:7.
7 Ọ bụ ihe e ji n’aka na ọnụma Chineke ga-abịakwasị ndị bi na Judia n’ihi ajọ ikpe ọbara nke mara ha. Jerusalem, ya na ọmarịcha ụlọ nsọ ya, apụkwaghị ịbụ nke a kpọrọ “obodo nke eze ukwu ahụ,” bụ́ Jehova. (Matiu 5:35; Luk 13:33-35) Ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ Jisọs, ndị na-eso ụzọ ya kwuru okwu ịja mma banyere ụlọ nsọ dị n’obodo ahụ. Ná nzaghachi, Jisọs buru amụma, sị: “Ihe ndị a nke unu na-ekiri, ụbọchị ga-abịa, nke a na-agaghị ahapụ otu nkume n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.”—Luk 21:5, 6.
8. Mgbe Jisọs nyere “ihe ịrịba ama” nke ihe omume ndị ga-eduje ná mbibi Jerusalem, gịnị ọzọ ka o metụtara?
8 Ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere ihe ijuanya, wee jụọ, sị: “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-abụkwa? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla ihe ndị a gaje ime?” (Luk 21:7) Ná Nzaghachi, Jisọs buru amụma n’ụzọ ziri ezi banyere ihe omume ndị dujere ná mbibi Jerusalem, o kwukwara okwu nke a dị mkpa: “Ndị Jentaịl ga-azọdakwa Jerusalem, ruo mgbe oge ndị Jentaịl ga-emezu.” (Luk 21: 8-24, KJ) Otụ́ a, Jisọs zoro aka n’ọdịnihu gaa n’ihe ga-eme mgbe mbibi Jerusalem gasịrị—ihe nke na-aghaghị ichere “ruo mgbe oge ndị Jentaịl ga-emezu.” N’ihe banyere “ihe ịrịba ama ahụ,” Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Ya mere, ihe ịrịba ama ahụ gaje inwe mmezu abụọ. Mmezu nke mbụ, ma ọ bụ nke dị nta, ga-egosi na ‘ịtọgbọrọ n’efu nke Jerusalem dị nso.’ (Luk 21:20) Mmezu nke abụọ, nke dịkwa ukwuu karị, ga-abịa mgbe oge ndị Jentaịl gwụsịworo, ọ ga-egosikwa na “alaeze Chineke dị nso.”—Tụlee Matiu 24:3.
E Ji Obodo Ka Mma Dochie Anya Jerusalem Elu Ala
9. Olee mgbe Jerusalem elu ala tụfuru ọnọdụ ihu ọma o nwere, ọ̀ bụkwa gịnị ka e jiworo dochie anya ya?
9 Site n’ịsị “Ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge nke mba ọzọ ga-emezu,” (NW) Jisọs ọ̀ na-atụ aro na a ga-emesịa weghachi obodo elu ala ahụ n’ọnọdụ nke inweta ihu ọma Chineke? Ee e. Mgbe e gbusịrị Ọkpara Chineke ọ hụrụ n’anya, Jerusalem elu ala tụfuru ọnọdụ pụrụ iche o nwere ruo mgbe ebighị ebi, e jiriwokwa nke ka mma nke ukwuu dochie anya ya, bụ́ “Obodo nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jerusalem nke dị n’eluigwe.”—Ndị Hibru 12:22; Matiu 23: 37, 38; 27:50, 51.
10. Gịnị ka okwu ahụ bụ “Jerusalem nke dị n’eluigwe” pụtara?
10 Okwu ahụ bụ “Jerusalem nke dị n’eluigwe” bụ nke e jiri mee ihe n’ime Bible ịkọwa Alaeze eluigwe ahụ nke a na-apụghị ibibi ebibi, bụ́ nke a kpọworo ndị Kraịst e tere mmanụ bịa na ya.a (Ndị Hibru 11:10; 12:22, 28) Mgbe Pọl onyeozi dere nke a, ndị Juu ka nwere mmasị dị ukwuu n’obodo elu ala ahụ ya na ụlọ nsọ ya. Otú a, Pọl chetaara ndị Hibru bụ ndị Kraịst na “anyị enweghị obodo n’ebe a nke na-adịgide, kama anyị na-achọ obodo ahụ nke gaje ịbịa.”—Ndị Hibru 13:14.
Ihe Mere E Ji Kpọọ Ya Jerusalem nke Dị n’Eluigwe
11. Ruokwa mgbe Jerusalem elu ala tụfuru ihu oma Jehova, gịnị ka ọ nọchiri anya ya?
11 Ruo ogologo oge, Jerusalem bụ isi obodo nke mba Israel, bụ́ nke e kwuru na ndị eze ya ‘na-anọkwasị n’ocheeze Jehova.’ (1 Ihe Emere 29:23) Ọzọkwa, Jehova sooro Devid banye n’ọgbụgba ndụ na ọbụbụeze ga-anọgide n’ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Dị nnọọ ka isi obodo ndị e nwere n’oge a, dị ka Washington, Moscow, Canberra, na Pretoria, bụ ndị a na-eji amata ọchịchị ha dị iche iche, otú ahụ ka e jiri Jerusalem mee ihe na Bible ịnọchi anya alaeze Devid.—2 Samuel 7:16; Luk 1:32.
12. Olee ụzo e kwesịrị isi kọwaa okwu ahụ bụ “Oge Ndị Jentail”?
12 Alaeze Devid nwere ókèala a kpaara ókè, na-agbasa ruo n’ókè ndị ahụ Chineke kpaara ya, bụ́ Israel oge ochie. Ya mere, Jerusalem nke elu ala bụ nanị ụdị nke Alaeze Mesaịa ahụ nke bụ ezie, nke ga-achị achị site n’eluigwe, nweekwa elu ala dum dị ka ebe ọ na-achị. (Abụ Ọma 2:2, 7, 8; Daniel 7:13, 14; 2 Timoti 4:18) Otú a, akwụkwọ ahụ bụ The Time Is At Hand, nke ndị Watch Tower Society bipụtara na 1889, kwuru hoo haa, sị: “Okwu ahụ bụ ‘Oge Ndị Jentaịl’ bụ nke Onyenwe anyị ji mee ihe n’ịkọwa agbata oge ahụ dị n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa nke dị n’etiti mwepụ nke ihe atụ ahụ nke Alaeze Chineke, bụ́ Alaeze Israel (Ezik. 21:25-27), na mwebata na nguzobe nke ihe ahụ o sere onyinyo ya, bụ́ ezi Alaeze Chineke ahụ.”
Oge Ndị Jentaịl—Ogologo Oge Hà Aṅaa?
13. Olee mgbe Oge Ndị Jentail ahụ malitere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka i ji zaa otú ahụ?
13 Eze Nebukadneza nke Babilọn kwaturu Alaeze ihe atụ ahụ nke Chineke na 607 T.O.A. Ka ọ na-erule ọnwa nke asaa nke ndị Juu, bụ́ ihe dị ka etiti ọnwa October, ala ahụ atọgbọrọwo n’efu.b (2 Ndị Eze 25:8, 9, 22, 25, 26) Iji nwapụta na ọ bụ Chineke kwere ka nke a mee, Jehova Chineke nyere Nebukadneza otu nrọ. O metụtara otu osisi nke e gbuturu ma kwere ka o toliteghachikwa ọzọ mgbe ogologo “oge asaa” gabigasịrị. Nrọ ahụ nwere mmezu mbụ ya mgbe e weghachiri Nebukadneza n’ocheeze ya mgbe nwa oge nta nke ịwị ara gasịrị.—Daniel 4:10-17, 28-36.
14. Gịnị bụ isi ihe dị ná nrọ Nebukadneza?
14 Otụ́ ọ dị, isiokwu nke nrọ Nebukadneza gosiri na mmezu ya bụ isi metụtara alaeze ihe atụ nke Chineke, bụ́ nke e kweworo ka eze onye Jentaịl ahụ ‘gbutuo.’ Nrọ ahụ mechiri site ná nkwupụta nke a nke na-egosi ihe e zubere: “Ka ndị dị ndụ wee mara na Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya, ọ bụkwa onye dị ala karịa mmadụ nile ka ọ na-eme ka o bilie ịbụ onyeisi ya.”—Daniel 4:17.
15. Olee ụzọ Jisọs Kraịst si ruo eruo ịbụ “onye dị ala karị mmadụ nile”? (Matiu 11:29)
15 Ọ bụ nanị otu onye ruru eru n’akụkụ nile ịbụ onye a kpọrọ “onye dị ala karịa mmadụ nile.” Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya gosiri onwe ya ịbụ onye dị otú ahụ site n’ịdị njikere ịhapụ ebube eluigwe ya wee bụrụ onye a mụrụ dị ka mmadụ, dị ka Jisọs, onye tara ahụhụ ọnwụ obi ọjọọ kasị na-eweda mmadụ n’ala n’aka Setan. (Ndị Filipaị 2: 3, 5-11) Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ wee laghachi n’ebube eluigwe, ọ dịrị mkpa ka Jisọs chere ruo mgbe ogologo oge asaa nke ọchịchị ndị Jentaịl gwụsịrị tupu e dokwasi ya n’ocheeze dị ka Eze Mesaịa ahụ n’elu ihe a kpọrọ mmadụ.—Ndị Hibru 10:12, 13.
16. Olee ụzọ akwụkwọ Mkpughe si enyere ndị Kraịst aka ịgụkọ mgbe oge asaa ahụ gwụsịrị?
16 Ma olee otú Ndịàmà Jehova si wee ghọta otú oge asaa ahụ ha n’ogologo? Bible na-ekpughe na “otu oge, na oge abụọ, na nkera otu oge,” ma ọ bụ oge atọ na nkera, pụtara 1,260 ụbọchị. (Mkpughe 12:6, 14) Ya mere, okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ, ma ọ bụ oge asaa ga-apụta 2,520 ụbọchị. N’ịdabere ná nduzi amụma ahụ bụ “otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ,” oge asaa ahụ ga-apụta 2,520 afọ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:34; Ezikiel 4:6) Site ná ngụkọ nke a, Oge Ndị Jentaịl nke malitere n’October 607 T.O.A., gwụsịrị mgbe 2,520 afọ ga-sịrị, n’October 1914.
17. Ọkwa obi ụtọ dị aṅaa ka oge ruru ka a maa ya na 1914?
17 N’October 1914, Jehova Chineke dokwasịrị Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, n’ocheeze n’Alaeze eluigwe ahụ. N’ikpeazụ, ọhụụ Mkpughe ahụ nke onyeozi ndị Kraịst ahụ bụ Jọn malitere ịghọ ihe mere eme n’ezie, a pụkwara ịma ọkwa ahụ bụ: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova], na nke Kraịst ya: ọ [Jehova] ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 1:10; 4:1; 11:15) Lee nnọọ ozi dị ebube nke a bụ, leekwa ihe na-akpata ọṅụ kasị ukwuu ọ bụ nye ndị nile so bụrụ ndị nketa na ndị Alaeze ahụ ga-achị!—Mkpughe 11:17.
18. N’ihi gịnị ka ọnọdụ iru újú jiworo mekpaa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ kemgbe 1914?
18 N’eziokwu, nye ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, e nwebeghị obi ụtọ dị ukwuu n’elu ala kemgbe 1914. Ma ọnọdụ ọjọọ ndị dị n’ụwa bụ ihe ndị na-egosi na ọchịchị Setan na-abịaru nso ọgwụgwụ ya. Ànyị si aṅaa mara nke a? Akwụkwọ Mkpughe gosiri na nguzobe nke Alaeze Chineke ga-akpata agha n’eluigwe. A gaje ịchụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe, machibidokwa ha na gburugburu elu ala anyị. Mgbe ọ hụsịrị mmeri nke a n’otu ọhụụ amụma, Jọn nụrụ oké olu ka ọ na-ekwu, sị: “Ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bị n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”-Mkpughe 12:1-12.
19. N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji nwee obi ụtọ nke ukwuu ịdị ndụ n’oge a?
19 Ọnọdụ ụwa nke na-adịwanye njọ kemgbe 1914 bụ ihe àmà na-egosi na ọhụụ Jọn abụwo ihe mere eme n’ezie, na ọgwụgwụ nke ụmụ mmadụ nile ndị jụrụ ido onwe ha n’okpuru ịbụ ọkaaka nke Chineke na-abịakwa nso nke ukwuu. (Luk 21:10, 11, 25-32) Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịdị ndụ n’oge nke a dị ebube mgbe Jehova Chineke, bụ́ Onye pụrụ ime ihe nile, ga-edozi oké ihe iseokwu ahụ nke ịbụ ọkaaka ya n’elu ala! Mgbe ahụ, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma, a ga-ebulikwa mmadụ ndị ezi omume lanarịrịnụ gaa n’izu okè. Ọbụna na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, nyekwa ha ohere iru eru maka ndụ ebighị ebi.—Mkpughe 20:1-3, 12, 13; 21:3-5.
Mkpa Ọ Dị Ime Mgbanwe n’Oge A
20. (a) N’elu ala, olee ndị gosiri onwe ha ịbụ ezi ndị ohu Jehova tupu 1914? (b) Mgbanwe dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ dị njikere ime?
20 Ruo 38 afọ tupu 1914, Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, zoro aka n’afọ ahụ dị ka afọ mgbe Oge Ndị Jentaịl ga-agwụsị.c Lee ihe àmà pụtara ìhè nke ahụ bụ na ha bụ ezi ndị ohu Jehova! Ma, dị ka ndị ohu Chineke nke narị afọ mbụ, ha nwekwara olileanya ụfọdụ ndị na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, ha tụrụ anya na a ga-akpọgo ọnụ ọgụgụ ahụ zuru ezu nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’eluigwe n’October 1914. Ha chekwara na agha ahụ nke malitere na 1914 ga-eduje kpọmkwem n’ọgwụgwụ nke ụwa Setan.
21. Inye ọzụzụ dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nwetara n’oge Agha Ụwa Mbụ?
21 Ma, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị Kraịst e tere mmanụ ghọtara na a ka nwere ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ n’elu ala. N’ihi nnọgidesi ike ha n’ịgba àmà ihu ọha n’oge Agha Ụwa Mbụ, ha nwetara ajọ mkpagbu site n’aka ndị isi ọchịchị, site n’agbamume nke ndị ndú okpukpe Krisendọm. (Abụ Ọma 2:1-6) E tiri ọrụ ezi ndị Kraịst oké ihe otiti na June 21, 1918, mgbe a mara ndị isi ọrụ nke Watch Tower Society dị na United States ikpe ịga mkpọrọ 20 afọ n’ihi ebubo ụgha dị iche iche.
22, 23. (a) Gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ meworo kemgbe 1919, ụzọ mmeghachi omume abụọ dị aṅaa ka nke a kpatawokwara? (b) Gịnị bụ ihe ahụ Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi sere onyinyo ya?
22 Agha Ụwa Mbụ kwụsịrị na mberede na November 1918. Mgbe ahụ, na March 25, 1919, a tọhapụrụ ndị ọrụ Watch Tower Society ahụ site n’ụlọ mkpọrọ. E mesịrị kachapụ ebubo nile ahụ e boro ha kpam kpam. Oge udo nke a na-atụghị anya ya megheere ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, nke yiri ohere ndị ahụ megheere ndị na-eso ụzọ Kraịst mbụ mgbe mmụọ nsọ ahụ nyesịrị ha ike n’afọ 33 O.A.—Ọrụ 2:17-21, 41.
23 Kemgbe 1919, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, dị ka otu òtù, ejiwo ịnụ ọkụ n’obi rube isi n’iwu ahụ nke dị n’okwu Jisọs e dere na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Dị ka ihe si na nke a pụta, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde anọ nke “atụrụ ọzọ” nke Kraịst ararawo ndụ ha nye ijere Jehova ozi ha na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ. (Jọn 10:16) Krisendọm, n’okpuru nduzi nke ndị ndú okpukpe ya, nọgidere na-ajụ ozi Alaeze ahụ. Nhọrọ ọ họọrọ atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ mmadụ dị ka nke ka mma na mkpagbu ọ na-akpagbu Ndịàmà Jehova kwekọrọ n’ajọ mmeso ndị bi na Judia na narị afọ mbụ mesoro Kraịst. Dị nnọọ ka Jehova mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi Jerusalem, otú ahụ ka ọ ga-emekwa n’isi ihe ahụ Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi sere onyinyo ya, bụ́ Krisendọm. Dịkwa ka ọgbọ nke nụrụ ozi ikpe ọmụma Kraịst dịrị ndụ ịhụ mbibi ahu o buru amụma ya, otú ahụ ka ọgbọ nke dị kemgbe 1914 ‘na-agaghị agabiga ma ọlị’ tupu “mkpagbu ukwu” ahụ e buru amụma ya abịa.—Matiu 24:21, 22, 34.
24. Iji lanarị wee banye n’ime uwa ohụrụ Chineke, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
24 Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji lanarị mkpagbu ukwu ahụ wee dịrị ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke? N’agbanyeghị olileanya ndị na-ezighị ezi onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inweworị, anyị aghaghị ịnọ na nche megide ịda n’ụra n’ihe banyere ọrụ anyị nke ndị Kraịst. (Habakuk 2:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-6) Ndị nwere ike icheta ihe ndị mere kemgbe 1914 na-adịwanye ole na ole. Otú a, ọ dị mkpa ka anyị mụrụ anya; e nweghị oge ọ bụla a ga-emefusị. (Matiu 24:42) Ndị nile chọrọ ịdị ndụ gabiga ọgwụgwụ nke ajọ ụwa Setan aghaghị ime ihe ugbu a n’ụzọ gosiri na ha kwenyere n’okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ: “Anyị na-ekele gị, [Jehova, NW] Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, . . . n’ihi na i werewo oké ike gị, ị bụkwara eze.”—Mkpughe 11:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche nke September 15, 1983, peji 22.
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ihe mere nke a ji kaa akara mmalite nke Oge Ndị Jentaịl, lee “Ka Alaeze Gị Bịa,” isi 14, nke ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
c C. T. Russell dere otu ihe odide nke isiokwu ya bu “Oge Ndị Jentail: Olee Mgbe Ha Ga-agwụsị?,” bụ́ nke e bipụtara na magazin ahụ bụ Bible Examiner, October 1876. Na peji 27, ihe odide ahụ sịri: “Oge asaa ahụ ga-agwụsị na A.D. 1914.”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Gịnị ka Jerusalem oge ochie nọchiri anya ya, ma ò si aṅaa tụfuo ọnọdụ ya dị ùgwù?
◻ Olee mgbe Oge Ndị Jentaịl malitere, oleekwa mgbe ọ gwụsịrị, oleekwa ihe e buru n’amụma nke si na ya pụta?
◻ Gịnị ka mbibi nke Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi sere onyinyo ya?
◻ Ànyị sị aṅaa mara na mkpagbu ukwu ahụ dị nso, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji lanarị ya?
[Foto dị na peeji nke 16]
Jerusalem na ụlọ nsọ ya tụfuru ọnọdụ ihe ùgwù ha, ma Chineke nọgidere na-agọzi Ọkpara ya, bụ́ Mesaịa ahụ, ọbụna na-agwa ya okwu kpọmkwem site n’eluigwe