Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • su isi 3 p. 21-29
  • Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Usoro Ihe Nke A Ga-adịru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Usoro Ihe Nke A Ga-adịru?
  • Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE ỊRỊBA AMA NKE ỌTỤTỤ IHE MEZURU
  • ‘OGE A KARA AKA NKE NDỊ MBA ỌZỌ’
  • RUO ÓKÈ HA AṄAA KA IHE NDỊ Ị NA-ATỤ ANYA HA BỤ EZIE?
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • “Ọgwụgwụ Ụwa” Ọ̀ Dị Nso?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Nweenụ Ekele—Alaeze Mesaịa nke Jehova Na-achị Achị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
su isi 3 p. 21-29

Isi nke 3

Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Usoro Ihe Nke A Ga-adịru?

1. Banyere nkwa Bible dị iche iche, gịnị ka ọtụtụ n’ime anyị jụworo?

O KWERE nnọọ nghọta na mmadụ ga-achọ ịmata oge ọ ga-adịru tupu ihe omume ndị ahụ a kọwara nke ọma n’ime Bible, ndị ga-eduga n’Amagedọn emee. Olee mgbe a ga-ala ajọ usoro ihe nke a n’iyi? Ànyị ga-adị ndụ wee hụ ka ala ghọrọ ebe ndị hụrụ ezi omume n’anya pụrụ ịnọ n’udo na ntụkwasị obi zuru okè?

2. (a) Ajụjụ dị aṅaa yiri ya ka ndị ozi Jisọs jụrụ? (b) Ànyị maara kpọmkwem mgbe ajọ usoro ihe nke a ga-agwụsị? (ch) Ma ihe ọmụma na-enye aka dị aṅaa ka Jisọs nyere?

2 Jisọs Kraist nyere nkọwa ndị kwesịrị ịrịba ama, ndị zara ajụjụ ndị ahụ. O mere nke a mgbe ndị ozi ya jụrụ, sị: “Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ] gị na nke ọgwụgwụ [usoro ihe nke a]?” N’ihe banyere mbibi nke ajọ usoro ihe nke a, Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge awa ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:3, 36) Ma, ọ kọwakwara n’ụzọ zuru ezu ọgbọ ahụ nke gaje ịhụ ‘oge ọgwụgwụ [Grik: syn-te’lei-a] nke usoro ihe nke a,’ bụ oge nke na-eduba “n’ọgwụgwụ [Grik: te’los] ahụ. Gụọ ya n’onwe gị na Bible gị na Matiu 24:3-25:46, ọzọkwa n’ihe ndekọ yiri ya, ndị dị na Mak 13:4-37 nakwa Luk 21:7-36.

3. Ànyị si aṅaa mara na azịza Jisọs abụghị nanị ịkọwa ihe ndị ga-eme na narị afọ mbụ?

3 Ka ị na-agụ ihe ndekọ ndị a, ị ga-achọpụta na, nanị n’otu akụkụ, Jisọs na-akọwa ihe omume ndị na-eduba, gụnyekọtakwa mbibi nke Jerusalem na ụlọ nsọ ya n’afọ 70 O.A. Ọ pụtara ìhè na o bu n’uche ihe nke ga-enwe mmetụta dị ukwuu karị. N’ihi gịnị? N’ihi na na Matiu 24: 21, o kwuru banyere “mkpagbu ukwu nke ihe dị ka akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” Nke a metụtara ihe dị ukwuu karịa mbibi nke otu obodo na ndị a gbachibidoro n’ime ya. Na Luk 21:31, a sịkwara na ihe omume ndị a kọwara n’ebe ahụ na-ezo aka n’ebe ọbịbịa nke “Alaeze Chineke” ahụ a na-atụ anya ya eri ogologo oge dị. Gịnị bụ “ihe ịrịba ama” ahụ e kwesịrị ịrịba ama nke Jisụs sịrị ka a na-atụ anya ya?

IHE ỊRỊBA AMA NKE ỌTỤTỤ IHE MEZURU

4. Gịnị bụ “ihe ịrịba ama” ahụ Jisọs nyere?

4 O buru amụma banyere agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe gbasara ebe nile, oké ala ọma jijiji, na mmụọ enweghị ịhụnanya n’ime oge mmụba nke mmebi iwu, ma ọ dịghị otu n’ime ndị a nke nanị ya bụ “ihe ịrịba ama” ahụ. Akụkụ nile nke ihe ahụ e buru n’amụma aghaghị imezu n’oge ndụ nke otu ọgbọ ka nkọwa ahụ wee zuo ezuo. A gụnyekwara, ‘mkpagbu nke mba dị iche iche, n’amaghị ụzọ mgbapụ, ebe ụmụ mmadụ na-atụbọ site n’egwu’ n’ihi ihe ndị na-eme n’eluigwe na n’osimiri dị gburugburu ha. (Luk 21:10, 11, 25-32; Matiu 24:12; tụlee 2 Timoti 3:1-5.) N’ụzọ dị iche ná ndị a nile, ma bụrụ akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ, Jisọs buru amụma nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze Chineke n’agbanyeghị mkpagbu a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya ná mba nile. (Mak 13:9-13) Nkọwa ahụ ọtụtụ ihe mezuru ò kwekọrọ kpọmkwem n’oge nke anyị na-ebi n’ime ya?

5. Gịnị ga-eme ka ihe omume ndị a karịa nanị mmeghachi nke ihe mere eme?

5 Ndị mkparị pụrụ ịkwa emo, na-asị na e nweela agha, ụnwụ, ala ọma jijiji, na ihe ndị ọzọ ugboro ugboro n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ma ihe omume ndị dị otú ahụ na-apụta ihe pụrụ iche mgbe ha nile pụtakọrọ ọnụ, ọ bụghị nanị n’ebe ole na ole dịpụrụ adịpụ, kama n’ókè zuru ụwa ọnụ, ruokwa ogologo oge nke malitere n’afọ e buru n’amụma ogologo oge tupu o ruo.

6, 7. Olee ihe omume na ọnọdụ ndị dị na narị afọ nke iri abụọ nke a ndị kwekọrọ n’ezie n’ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mezuru? (Mgbe ị na-aza, jiri Bible gị gosi akụkụ amụma Jisọs nke ị na-akọwa.)

6 Tụlee ihe ndị a mere eme: Agha ahụ nke tiwapụrụ na 1914 buru oké ibu nke na a bịara mara ya dị ka agha ụwa mbụ, eri mgbe ahụkwa, udo alọghachibeghị n’ezie n’ụwa. Ka Agha Ụwa Mbụ ahụ gasịrị, otu n’ime ụnwụ nri kasị njọ nke ihe a kpọrọ mmadụ hụtụrụla bịara, ọ bụna taa, 40 nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi ụkọ nri. Ọrịa na-efe efe si Spain nke 1918 wepụrụ ndụ n’ọnụ ọgụgụ na-enweghị ihe yiri ya n’akụkọ ihe mere eme nke nrịrịa, n’agbanyeghịkwa nnyocha sayensị, ọtụtụ iri nde mmadụ na-arịa ọrịa cancer, ọrịa obi, ọrịa mmekọahụ ndị na-asọ oyi, ịba, ịba ogbu na nwayọọ na ìsì mmiri. Ókè ala ọma jijiji ji na-eme amụbawo ihe dị ka okpukpu iri abụọ nke ihe ọ bụbu ná nkezi n’ime puku afọ abụọ dịrị tupu 1914. Egwu na nhụsianya n’ókè zuru ụwa ọnụ na-emekpa ndị nọ n’afọ ndụ nile ahụ. N’etiti ihe ndị kpatara ya bụ ọgba aghara nke akụ na ụba, imempụ n’ihe ike na iyi egwu mgbuchapụ n’agha nuklia, na-eji ngwá agha ndị a gbapụrụ site n’ụgbọ okpuru mmiri ma ọ bụ ndị na-ezo ka mmiri site n’eluigwe—ihe a na-apụghị ime eme tupu narị afọ nke iri abụọ nke a.

7 N’etiti ihe a nile, a na-eme nkwusa pụrụ iche nke zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma Alaeze Chineke, dị ka Jisọs buru n’amụma. N’ihe karịrị 200 ala na àgwà etiti dị iche iche nke oké osimiri, Ndịàmà Jehova na-etinye ọtụtụ narị nde awa kwa afọ, n’anaghị ego, iji nyere ndị nọ n’ọnọdụ ndụ nile aka ịghọta ihe ihe ndị a na-eme n’ụwa pụtara site n’enyemaka nke Okwu Chineke. N’iji ya kpọrọ ihe, Ndịàmà ahụ na-ezoro ụmụ mmadụ aka n’ụzọ nlanarị gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị. Ndịàmà ahụ na-emekwa nke a n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ na, dị ka otu akụkọ si Canada kwuru, “ma eleghị anya [ha] na-anagide nsogbu ka ukwuu maka mmejọ dị nta karịa òtù okpukpe ọ bụla ọzọ n’ụwa.”

8. Oge dị aṅaa ka a gụnyekwara n’amụma nke a?

8 Anyị aghaghị iburukwa n’uche na, dị ka otu akụkụ nke amụma ya, Jisọs zoro aka n’ebe ngabiga nke otu ogologo oge a kara aka dị, na-asị: “Ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge [a kara aka nke ndị mba ọzọ] ga-emezu.” (Luk 21:24) ‘Oge a kara aka’ ahụ ọ̀ gwụla?

‘OGE A KARA AKA NKE NDỊ MBA ỌZỌ’

9. (a) Gịnị bụ “Jerusalem” ahụ nke ndị mba ọzọ ‘zọdara’? (b) Olee mgbe ‘nzọda’ ahụ bidoro?

9 Iji ghọta azịza ya, anyị aghaghị ịghọta ịdị mkpa nke Jerusalem n’onwe ya. E kwuru okwu banyere obodo ahụ na ebe obibi ndị eze ya nke dị n’elu Ugwu Zaion dị ka “obodo Eze ukwu . . . obodo Jehova.” (Abụ Ọma 48:2, 8; Matiu 5:34, 35) A sịrị na ndị eze nke ụlọ ndị eze nke Devid nọkwasịrị “n’ocheeze Jehova.” Ya mere, Jerusalem bụ ihe nnọchianya a hụrụ anya na Jehova na-achị isi n’elu ala. (1 Ihe Emere 29:23) Otú a, mgbe Chineke kwere ka usuu ndị agha Babilọn bibie Jerusalem, dọkpụrụ eze ya jee ala ụzọ, hapụkwa ala ahụ ịtọgbọrọ n’efu, a na-azọda Alaeze Chineke nke e si n’aka eze si n’eriri ezinụlọ Eze Devid wee na-achị. Mgbe nke ahụ mere, na 607 T.O.A., ọ kara akara mbido nke ‘oge a kara aka nke mba ndị [Jentail].’ Eri mgbe ahụ, ọ dịbeghị onye si n’eriri ezinụlọ Devid chịrị dị ka eze na Jerusalem.

10. (a) Gịnị ka ọgwụgwụ nke ‘nzọda’ ahụ ga-apụta? (b) Mgbe ahụ, olee “Jerusalem” nke Jisọs ga-esi na ya chịa achị, n’ihi gịnị?

10 Ya mere, gịnị ka ọgwụgwụ nke ‘ịzọda Jerusalem’ ga-apụta? Jehova emesịwo tinyeghachi n’ocheeze, eze nke ọ họpụtara, onye si n’eriri ezinụlọ Devid, ịchị isi ugbu a, ọ bụghị nanị n’etiti ndị Juu, kama n’ihe omume nke ihe dum a kpọrọ mmadụ. Onye ahụ bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraist. (Luk 1:30-33) Ma, olee ebe ọ ga-esi na-achị? Ò ga-abụ site n’obodo Jerusalem nke elu ala? Jisọs kwupụtara hoo haa na a ga-anapụ Israel anụ ahụ ohere nile metụtara Alaeze Chineke. (Matiu 21:43; leekwa Matiu23:37, 38.) Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị na-efe ezi Chineke ahụ legara anya na “Jerusalem nke dị n’elu,” bụ nzukọ eluigwe nke Chineke nke ihe e kere eke ndị bụ mmụọ kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka nne ha. (Ndị Galetia 4:26) Ọ gaje ịbụ na Jerusalem eluigwe ahụ ka a ga-edokwasị Jisọs n’ocheeze, ịchị isi n’elu ala. (Abụ Ọma 110:1, 2) Nke ahụ ga-eme n’ọgwụgwụ ‘oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.’ Olee mgbe nke ahụ ga-abụ?

11, na chaatị (peji 27). (a) Olee otú e si agụkọ ngabiga nke ‘oge a kara aka’ ahụ? (b) Ya mere, gịnị malitere mgbe ‘oge a kara aka’ ahụ gwụrụ? (ch) Olee otú ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si ele 1914 anya? (Lee peji 29.)

11 Ọtụtụ iri afọ tupu o ruo, a matara na ọ ga-abịa na 1914 n’ọgwụgwụ nke mmezu bụ isi nke “oge asaa” ahụ nke Daniel 4:10-17.a Ma nghọta zuru ezu nke ihe ọ pụtara bịara nwayọọ nwayọọ n’ime afọ ndị sochiri. N’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, ndị mmụta Bible hụrụ ka ọ na-apụta ìhè nwayọọ nwayọọ n’anya ha akụkụ zuru ezu nke ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mezuru nke Jisọs sịrị na ha ga-egosi ọnụnọ ya nke eluigwe n’ike Alaeze. Ọ ghọrọ ihe doro anya na ha abanyela n’ezie ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a,’ na Kraist amalitela ịchị achị dị ka Eze na 1914, nakwa na ọgwụgwụ nke ajọ ụwa nke a ga-abịa n’ime ọgbọ ahụ nke hụrụ mmalite nke ihe ndị a.

RUO ÓKÈ HA AṄAA KA IHE NDỊ Ị NA-ATỤ ANYA HA BỤ EZIE?

12. Ihe dịgasị ahaa na-ezighị ezi na-eme ka nkwubi okwu nke a siere mmadụ ụfọdụ ike ịnakwere? (Matiu 24:26, 27; Jọn 14: 3, 19)

12 Ọ na-esiri ụfọdụ ndị matara eziokwu ndị a ná mmezu nke amụma Jisọs ike ịnakwere nkwubi okwu nke ihe ndị ahụ na-eduje na ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-atụ anya ihe ọzọ. A kụziiri ha na ọbịbịa nke abụọ nke Kraist ga-abụ n’ụzọ a pụrụ ịhụ anya, na ọ ga-edubakwa ná ntọgha nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ìgwè. Na narị afọ mbụ, ndị Juu nwekwara olileanya ndị na-emezughị. Ha tụrụ anya na ọbịbịa Mesiaia ga-abụ site ná ngosipụta nke ike nke ga-ana- pụta ha n’aka Rom. N’ijidesi ihe na-ezighị ezi ha tụrụ anya ya ike, ha jụrụ Ọkpara nke Chineke n’onwe ya. Lee nnọọ ka ọ ga-esi bụrụ amaghị ihe imejọghachi ihe otú ahụ ọzọ mgbe Kraist nọ anọ n’ike Alaeze! Ọ dị nnọọ mma karị ịhụta ihe Akwụkwọ nsọ n’onwe ya na-ekwu n’ezie!

13. Ihe omume dịgasị aṅaa ka Bible onwe ya na-ejikọta ha na ọnụnọ Kraist?

13 Bible gosiri na ọ ga-abụ n’etiti ndị iro ya ka Kraist ga-amalite ọchịchị. (Abụ Ọma 110.1, 2) O kwuru okwu banyere nchụpụ nke a ga-achụpụ Setan na ndị ajọ mmụọ ya site n’eluigwe bịa na gburugburu elu ala mgbe e nyesịrị Kraist ike Alaeze; ya mere, a gaje inwe oge ahụhụ mụbara amụba nye ụwa. (Mkpughe 12:7-12) N’ime oge ahụ a ga-enwe mmụbawanye nkwusa nke ozi Alaeze ahụ, iji nye ndị mmadụ ohere ime ihe n’olileanya nke nlanarị. (Matiu 24:14; Mkpughe 12:17) Ma nke ahụ ọ ga-eduba ná ntọgha nke ụwa dum? Kama nke ahụ, Bible na-egosi na ihe ga- esochi ya bụ mbibi nke ụdị ya na-adịbeghị n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ agaghị eji anya nkịtị hụ Jisọs Kraist ahụ e mere ebube mgbe ọ bụla, ndị nile na-ejighị obi ha nabata eziokwu nile banyere ọnụnọ nke Kraist dị ka eze ka a ga-arụgide ‘ịhụ’ na ọ bụ ya, dị ka e buru n’amụrna, na-ewetara ha mbibi.—Mkpughe 1:7; Matiu 24:30; tụlee 1 Timoti 6:15, 16; Jọn 14:19.

14, 15. N’ihi gịnị ka ngabiga nke ọtụtụ afọ kemgbe 1914 ji ghara inye ihe obi abụọ na anyị nọ n’ezie n’ime “mgbe ikpeazụ” ahụ?

14 Ma ugbu a, ngabiga nke 73 afọ kemgbe 1914 ó gosighị na obi abụọ ụfọdụ pụrụ ịdị banyere ma ànyị abanyela n’ezie n’ime “mgbe ikpeazụ” ahụ kemgbe afọ ahụ, ma ọbịbịa Kraist dị ka onye na-eweta mbibi ọ̀ dịkwala nso? Ọ dịghị ma ọlị! Banyere ndị gaje ịhụ mmezu nke “ihe ịrịba ama” ahụ site ná mbido ya, malite na 1914, Jisọs sịrị: “N’ezie asị m unu, ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Mak 13:30) Ndị so n’ọgbọ ahụ ka nọ ndụ, ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ha na-atalata n’ike n’ike.

15 Ọ bụ ezie na nchọpụta e mere gosiri na nkezi nke afọ ndụ a na-atụ anya mmadụ ịdịru n’ụwa dum bụ ugbu a nanị 60 afọ, ma ọtụtụ nde mmadụ na-adị ndụ gafee afọ ndụ ahụ. Dị ka ọnụ ọgụgụ ndị e nwere ugbu a na-egosi, na 1980, ihe chọrọ iru 250,000,000 nke ndị dị ndụ na 1914 ka dị ndụ mgbe ahụ. Ọgbụ ahụ agabigabeghị. Otú ọ dị, ọ dị mmasị ịmara na n’ime ndị a mụrụ na 1900 ma ọ bụ tupu ya, ọnụ ọgụgụ nke òtù United Nations bipụtara gosiri na nanị ihe dị ka 35,316,000 ka dị ndụ na 1980. Ya mere, ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịda ọsọ ọsọ ka ndị mmadụ n’otu n’otu na-eru iri afọ asaa na iri afọ asatọ ha. Mgbe a tụlekọtara ya na akụkụ nile nke ihe ịrịba ama amụma nke Jisọs, eziokwu a nile na-egosi nke ọma na ọgwụgwụ dị nso.—Luk 21:28.

16. Ya mere, gịnị kwesịrị ịbụ omume anyị?

16 Ugbu a abụghị oge ịnọ n’enweghị mmasị. Ọ bụ oge ime ihe ngwa ngwa! Dị ka Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị: “Unu bụrụkwa ndị e doziworo, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ [Jisọs Kraist] ga-abịa.”—Matiu 24:44.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ bu “Ka Alaeze Gị Bịa,” peji 127-139, 186-189.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Otú Ndị Ọkọ Akụkọ Si Ele 1914 Anya

E nwere ezi ihe ndị mere e jiworo kpọọ agha ahụ nke malitere na 1914 Agha Ukwu ahụ na Agha Ụwa Mbụ. A lụtụbeghị agha bibiri ihe otú ahụ mbụ. Agha ndị a lụworo eri mgbe ahụ bụ nanị iwere ihe bidoro na 1914 gaa n’ihu. Tụlee okwu ndị a banyere mme- tụta nke afọ ahụ dị mkpa:

● “Ọ bụghị nanị na agha ahụ agbanweela maapụ Europe, kpasuokwa mgbanwe ọchịchị ndị bibirí alaeze atọ, kama mmetụta ya ndị pụtara ihè na ndị na-apụtaghị ihè metụtara ihe karịrị nke ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile. Mgbe agha ahụ ga- sịrị, ma ndị ọchịchị ma ndị ọzọ gbara mbọ ịkwụsịlata ma ọ bụ ịkwụsịcha mgbanwe ahụ wee weghachi ihe ’otú o kwesịrị,’ bịaghachi n’ụwa nke dịrị tupu 1914. Ma nke ahụ apụghị ikwe omume. Ala ọma jijiji ahụ adịwo oké njọ, dịteekwa anya nke na a dọkasịwo ụwa ochie ahụ ruo na ntọala ya. Ọ dịghị onye pụrụ iwughachi ya otú ọ dịbu, ya na usoro ya nile, ọtụtụ nche- pụta na ụkpụrụ omume ya nile.

“. . . Ọ dị mkpa, bụ mgbanwe nke meworo n’ihe ndị a na-ewe n’ihe dị mkpa, nke guzobeworo ụkpụrụ ndị ọhụrụ nke ihe ndị a na-ewe n’ihe dị mkpa n’ọtụtụ akụkụ. . . . Ọ bụghị nanị ndị agha nọ n’ihu agha ghọworo ndị e mekpọrọ ọnụ, ndị na-emesokwa ihe onwunwe ndị agbata obi ha n’ejighị ihe kpọrọ ihe. Ọ bụghị nanị na e tipịasịwo echiche nile, ọtụtụ ikpọasị na echiche na-abụghị ezie nke ihe ndị dị mkpa, kama e tipịawokwa ọtụtụ ụkpụrụ omenala maka ndụ na omume nke ndị bikọrọ ọnụ. Ihe ndị a na-ewe n’ihe dị mkpa na-agbanwe, ihe nile yiri ihe mmiri na-ebupụ, dị ka à ga-asị na ihe nile enwekwaghị ezi mkpọrọgwụ—otú ahụ ka ọ dị n’usoro ego, tinyekwara ụkpụrụ omume nke mmekọahụ, ya na ụkpụrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na iwu nile nke ime nkà. . . .

“Oké anọghị ná ntụkwasị obi nke e ji mara oge ahụ ka a na-ahụta karịsịa n’akụkụ nke akụ na ụba. N’ebe a, agha ahụ ebibisịwo usoro dị mgba- gwoju anya, nke a pụrụ ịgbanwe ọsọ ọsọ, nke nwekwara usoro guzozirí egu- zozi, nweekwa iwu ndị siri ike na ihe ndị na-adịgide adịgide ndị a na-ewe n’ihe dị mkpa. . . . Ọ bụna n’akụkụ nke a, o kweghị omume ịlọghachi ’n’otu’ o kwesịrị.’ ’’— Vàrldshistoria—Folkens liv och Ku/fur(Stockholm: 1958), Vol. VII, peji 421,422.

“Ọkara narị afọ agafeela, ma aka- ra nke ọdachi Agha Ukwu ahụ hapụrụ n’ahụ na mkpụrụ obi mba nile apụbeghị . . . Ịdị ukwuu a na-ahụ anya na nke omume nke ajọ nsogbu a hiri nne nke na ọ dịghị ihe a hapụrụ ka bụkwa ihe ọ bụ na mbụ. Òtù ụmụ mmadu n’akụkụ ya nile: usoro ọchịchị, ókèala mba, iwu, usuu ndị agha, mmekọrịta mba na mba, tinyekwara nchepụta, ndụ ezinụlọ, akụ, ọnọdụ, mmekọrịta onwe onye—a gbanwere ihe nile site n’elu ruo ala. ... Ihe a kpọrọ mmadụ mesịrị tụfuo nguzozi ya, n’enweghachighị ya ọzọ ruo taa.”—General Charles de Gaulle, mgbe ọ na-ekwu okwu na 1968 (Le Monde, November 12, 1968).

“Kemgbe 1914, onye ọ bụla maara ihe na-aga n’ụwa enweela mwute dị ukwuu n’ihi ihe yirila ịzọ ije a kara aka ijeru ọdachi ka ukwuu. Ọtụtụ ndị na- eche echiche ebidola iche na ọ dịghị ihe a pụrụ ime iji gbochie ịdakpu n’ime mbibi. Ha na-ahụ agbụrụ mmadụ dị ka dike nke akụkọ ọdachi ndị Grik, nke chi ndị iwe ji na-achụgharị, onye na-abụkwaghị ya na-achịkwa ihe na-eme ya.—Bertrand Russell, Times Magazine nke New York, September 27, 1953.

“Isite n’oge ugbu a leghachi anya azụ, anyị na-ahụ taa na ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ webatara ‘Oge Nsogbu’ nke narị afọ nke iri abụọ—n’okwu ọkọ akụkọ ihe mere eme onye Britain bụ Arnold Toynbee—nke mmepeanya anyị na-esibeghị na ya pụta. N’ụzọ pụtara ihè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ihè, ọgba aghara nile nke narị afọ gara aga gbanyere mkpọrọgwụ na 1914.—The Fall of the Dynasties: The Collapse of the Old Order (New York: 1963), nke Edmond Taylor dere, peji 16.

[Chaatị dị na peeji nke 27]

1914—Afọ nke Ngụkọ Oge Bible na Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa Kara Akara

Ngụkọ Oge

→ Bible buru amụma “oge asaa,” nke,

mgbe ọ gasịrị, Chineke ga-enye onye ọ

họọrọ ịchị isi ụwa

(Daniel 4:3-17)

→ “Oge asaa” = 2,520 afọ

(Tụleee Mkpughe 11:2, 3; 12:6, 14;

Ezikiel 4:6.)

→ Mbido nke “oge asaa”: 607 T.O.A.

(Ezikiel 21:25-27; Luk 21:24)

→ Ngwụsị nke “oge asaa”: 1914 O.A.

E chiri Jisọs Kraist eze n’eluigwe, ọ

malitere ịchị n’etiti ndị iro ya (Abụ

Ọma 110:1, 2)

E si n’eluigwe chụpụ Setan; ahụhụ

nye ihe a kpọrọ mmadụ (Mkpughe 12:

7-12)

Mgbe ikpeazụ malitere (2 Timoti 3:

1-5)

Ihe Omume Ndị E buru n’Amụma Iji Mata Mgbe Ikpeazụ

→ Agha (Agha ụwa mbụ malitere na 1914;

udo alọghachibeghị n’ezie)

→ Ụnwụ (Ugbu a na-egbu 40 nde

mmadụ kwa afọ)

→ Ntiwapụ nke nrịrịa (N’agbanyeghị

nnyocha gaworo n’ihu nke ọkà mmụta

sayensị)

→ Ala ọma jijiji (Ná nkezi, ihe dị ka

okpukpu 20 nke ndị buru ibu kwa afọ

kemgbe 1914)

→ Egwu (Nke imempụ, ndakpọ akụ na

ụba, mkpochapụ nuklia)

Chineke ga-ebibi ajọ ụwa nke a tupu ọgbọ ahụ nke hụrụ 1914 agabiga (Matiu 24:3-34; Luk 21:7-32)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya