Ndị A Kwadebere maka Ije Ozi Ala Ọzọ n’Afọ Ndị 1990
OTU oge pụrụ iche na-amalite maka ije ozi ala ọzọ. Site n’inwe ọnụ ụzọ ghere oghe ndị na-emepe n’ọtụtụ ebe ndị ọhụrụ, Ndịàmà Jehova nile na-ekwesị ntụkwasị obi na-enwe ọchịchọ ịga n’ihu n’ịrụ ọbụna ọrụ ka ukwuu.
Ya mere ọ bụ site n’oké olileanya ka 24 ụmụ akwụkwọ nke klasị nke 89 nke Watchtower Bible School of Gilead ji bịa ihe omume ngụsị akwụkwọ ha na September 9, 1990. Ndị na-ege ntị nke ihe karịrị 5,000 ndị a kpọrọ òkù na ndị so n’ezinụlọ Betel zukọrọ maka ememe ngụsị akwụkwọ nke ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ndị a, bụ́ ndị nataworo ọrụ e kenyere ha gaa ná mba iri. N’ịbụ nke na-ewere ọnọdụ kpọmkwem n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Jersey City, New Jersey, ndị ahụ zukọrọ na Betel dị na Brooklyn, Watchtower Farms, na Watchtower Educational Center dị na Patterson, New York, nụkwara ihe omume ahụ nile.
Ozugbo ọ kụrụ elekere 10:00 nke ụtụtụ, Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na onye isi oche nke ụbọchị ahụ, kpọpụtara abụ mmeghe. Mgbe nke a gasịrị, Arthur Worsley nke ezinụlọ Betel dị na Brooklyn kpere ekpere. Mgbe ahụ onye isi oche zoro aka n’Ọrụ Ndị Ozi 10:33, ebe onye ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs gwara Pita, sị: “Anyị onwe anyị nile nọ n’ebe a n’ihu Chineke, ịnụ ihe nile nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nyeworo gị n’iwu.” Ọ bụ ihe a rịbara ama na ihe akụkọ ahụ mere n’oge Pita gaje imeghe ụzọ maka ozi ọma ahụ ịbụ nke a kpọsara nye ndị nke mba nile.
Philip D. Wilcox, onye sitere Watchtower Farms, kwuru okwu nke mbụ n’ime okwu asaa ndị na-akpali akpali. N’ịkpọtụ uche ná Ndị Filipaị 4:7, o ji “Kwenụ Ka Udo nke Chineke Nyere Unu Aka n’Ọrụ E Kenyere Unu” mere isiokwu. Ọ sịrị: “Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ezi udo nile. O nwere udo n’ụzọ zuru ezu, ma ọ bụ n’ụzọ a na-akparaghị ókè, ọ dịghị enwekwa ahụmahụ nke nchegbu obi ilu ọ bụla, ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma ọ bụ uche mgbakasị. N’ihi nke ahụ, e nwere ịdị jụụ na udo nke ghara ọnụnọ mara mma nke Jehova nọkwasịrị n’ocheeze ya gburugburu, dị ka e gosipụtara ya site n’eke na ogwurugwu ahụ nke yiri emarald nke Jọn hụrụ n’ọhụụ ya. (Mkpughe 4:2, 3) Udo ya na-esi n’ebe ọ nọ na-apụta irutere ndị nile ga-ekwe ka o nyere ha aka. ì ga-ekwe ka o nyere gị aka?” Nwanna Wilcox kwupụtara ihe enyemaka abụọ dị mkpa, ekpere na ịdị njikere ichere Jehova. (Maịka 7:7; Ndị Filipaị 4:6) O kwuru na ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kwere ka o mee nke pụrụ ịkpatara anyị mmerụahụ na-adịgide adịgide.
Lloyd Barry, onye so n’Òtù Na-achị Isi, sochiri n’isiokwu bụ “Nọgidenụ Na-enwe Ihu Ọchị.” Ọ malitere site n’ikwu, sị, “Ịchị ọchị bụ ọgwụ dị mma.” O chetara ahịrị okwu ahụ n’ihi na laa azụ na 1955 ọ bụ isiokwu ihu akwụkwọ nke mbipụta mbụ nke magazin ahụ bụ Teta! nke pụtara n’asụsụ Japanese. Ma ọ̀ bụ ụdị ọchị dị aṅaa? Ọ bụghị “ịchị ọchị nke onye nzuzu” nke oké mkpọtụ, nke ezi uche na-adịghị na ya. (Eklisiastis 7:6) Kama nke ahụ, ọ bụ ọchị sitere n’ime obi, nke dịkwa nro, nke ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ, bụ́ ndị na-azaghachi n’òkù Devid nke ịnọgide mgbe nile ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.’ (Abụ Ọma 32:11) Nwanna Barry kwuru na n’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche siri ike, Job nọgidere na-egosi ihu ọchị, n’ihi na ọ matara na ọ na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. Ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-eguzosi ike n’agbanyeghị ahụmahụ ndị na-eweta ọnwụnwa dị ka nke Job ga-anata ngọzi ka ukwuu n’ikpeazụ. (Job 29:24; 42:12) Onye ọkà okwu ahụ mechiri okwu ya, sị: “Nọgidenụ na-arụ ọrụ, nọgidenụ na-enwe ihu ọchị, unu ga-anatakwa ihu ọchị ebighị ebi nke nnwapụta Jehova.”
Onye ọzọ kwuru okwu bụ Richard E. Abrahamson, bụ́ onye họọrọ isiokwu bụ “Meenụ Ka Mmadụ Nile Mara Ezi Uche Unu,” nke dabeere ná Ndị Filipaị 4:5, (NW). Dị ka nghọta bụ isi nke okwu Grik ahụ si dị, okwu ahụ bụ “ezi uche” pụrụ igosipụta echiche nke “ikwenye n’ihe.” Ndị ozi ala ọzọ ụfọdụ enwewo nsogbu nanị n’ihi ihe ndị na-amasị ha. Ọ nwụrụ otu onye ibubo n’ahụ, bụ́ ụzọ onye ozi ala ọzọ ibe ya si dọbiri cheese mgbe ha na-eri nri. Mgbe 22 afọ nke ije ozi ala ọzọ gasịrị, onye ahụ nke o wutere chọpụtara na ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ndị a na-enwe na-amalite n’ihi ihe ndị na-enweghị isi karịa otú mmadụ si adọbiri cheese. Onye ọkà okwu ahụ nyere okwu ndụmọdụ, sị: “Mụta ime mgbanwe n’ọnọdụ ọ bụla, dị ka osisi na-eme mgbe oké ifufe na-efe. E nwere ọtụtụ uru a na-erite site n’ikwenye n’ihe, dị ka ịnọ n’ọnọdụ ka mma ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche, na mmadụ ịnọgide n’ọrụ e kenyere ya na-enwe udo nke uche.”
Milton G. Henschel, onye so n’Òtù Na-achị Isi tụlere isiokwu ahụ bụ “E Meghewo Ọnụ Ụzọ Dị Ukwuu nke Na-eduje n’Ịrụ Ọrụ.” Nwanna Henschel kwuru na Jisọs hụrụ ndị mmadụ n’anya, nwee ọmịiko n’ahụ ha, kụziekwara ha ọtụtụ ihe. Site n’Efesọs, Pọl onyeozi degaara ndị Kọrint akwụkwọ, na-asị: “E megheworo m ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike, ọzọ, ọtụtụ ndị na-emegide m.” (1 Ndị Kọrint 16:8, 9) N’agbanyeghị mmegide nke a, Pọl ziri ihe n’ụlọ akwụkwọ Tiranọs ruo afọ abụọ, nke mere na ozi Alaeze ahụ ghọrọ nke a maara n’ebe nile n’ógbè Esia. (Ọrụ 19:9, 10) Ọnụ ụzọ ahụ e megheworo dujere n’inwe ihe ịga nke ọma o nwere n’ime nkwusa ya. Ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs nọkwa na-arụ ọrụ ná ngwụsị nke narị afọ mbụ ahụ.—Mkpughe 2:1-7.
Jack D. Redford, bụ́ onye nkụzi Gilead, kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ “Nọgidenụ Na-anwale Ihe Unu Onwe Unu Bụ.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Ndị ozi ala ọzọ nke Gilead emeghewo ubi ọhụrụ ma gbaa ọgbakọ dị iche iche ndị e guzobeworo eguzobe ume, na-atachi obi n’ọtụtụ ihe ma na-eguzogide ihe ndọrọ ndị Ekwensu wepụtaworo iji mee ka ha dapụ. Ndị ọhụrụ nọgidere na-esonyere ha. Site n’ahụmahụ abụọ ndị doro anya nke ọma, onye nkụzi ahụ mere ihe atụ otú o si dị mkpa mmadụ ịnwapụta okwukwe ya. Otu onye ozi ala ọzọ tụfuru ihe ùgwù ya mgbe o jisịrị mpako leghara ndụmọdụ ịdọ aka ná ntị anya banyere ịgbaso ụzọ ọjọọ. N’ụzọ megidere nke ahụ, onye nke ọzọ ji ọṅụ nọgide n’ọrụ e kenyere ya, ọ bụ ezie na n’ọnwa atọ ndị mbụ ya n’ebe ahụ, ọ tawo ahụ nke ukwuu n’ihi ọrịa nke kpatakwaara ya enweghị ntụtụ isi na ntị ochichi. Ọ ka nọkwa n’ebe ahụ mgbe 42 afọ gasịworo, sitekwa n’ọmụmụ Bible, o nyeworo 156 ndị mmadụ aka ime baptism. Nwanna Redford mechiri okwu ya, sị: “Guzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbakwara unu ọsọ. Unu anarala ihe ndọrọ ya. Nọgidenụ na-egosipụta ihe unu onwe unu bụ. Jehova ga-elekọta unu.”
Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nkụzi ozọ, bụ́ Ulysses V. Glass, kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ “N’ebe Ndị Dị Umeala n’Obi Nọ Ka Amamihe Dị.” (Ilu 11:2) O ji klọkụ a na-agba n’aka nke ji batịrị ike anyanwụ na-arụ ọrụ mee ihe ikọwa na ìhè nke Okwu Chineke pụrụ ịnọgide na-eme ka anyị “na-anụ ọkụ.” Ọ rụtụrụ aka, sị, “Ma nanị ihe ọmụma adịghị enye amamihe. Ịdị umeala n’obi bụkwa ihe Chineke chọrọ n’aka anyị.” (Maịka 6:8) Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị na-atụ egwu Chineke, “mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (Ilu 9:10) N’eziokwu, anyị aghaghị iche echiche banyere onwe anyị, nkatọ onwe onye pụrụ ibibi ihe. Jehova enyewo ụfọdụ ikike pụrụ iche, dị ka o mere n’oge a na-ewu ụlọ ikwuu ahụ, ma a ghaghị ịrụ ọrụ iji ikwesị ntụkwasị obi na-adị umeala n’obi. Nwanna Glass gwara klasị ahụ, sị, “N’oge agụmakwụkwọ unu, unu gosipụtara ihe àmà nke ịbụ ndị a pụrụ ịdabere na ha na nkwanye ùgwù. Gosipụtanụ ụdị ikwesị ntụkwasị obi nke a n’ọrụ e kenyere unu, Chineke ga-agọzikwa unu.”
Albert D. Schroeder, onye so n’Òtu Na-achị Isi, kwuru okwu ahụ bụ isi a kpọrọ “Ndị A Kwadebere nke Ọma maka Ije Ozi Ala Ọzọ n’Afọ Ndị 1990.” Ọ malitere okwu ya, sị: “Afọ ndị 1990 ejiworị oké mkpọtụ malite. E mewo ka ọtụtụ mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe mee mkpatụ. N’ọtụtụ ọnwa gara aga e mepere Mgbidi Berlin. Akwụkwọ akụkọ The New York Times dere otu isiokwu bụ: August 1990, Ọnwa ahụ Nke Mere Ka Ụwa Mee Mkpatụ.’ Ya mere, unu ndị gụsịworo akwụkwọ na-ebi n’ime oge nke na-eme mkpatụ. Ọnwa ise ndị ahụ nke unu ji mụọ ihe hà akwadewo unu maka ya? Ee, n’ezie!” Mgbe ahụ ọ kpọtụrụ uche n’ụfọdụ isi ihe ndị na-enye aka nke dị na New World Translation of the Holy Scriptures—With References na ụzọ ọmụmụ a na-amụ ya siworo mee ka Okwu Chineke dị ndụ. Otu ngwá ọrụ ọzọ dị ike nke kwadebeworo ụmụ akwụkwọ ahụ bụ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” nke dị ugbu a ná mbipụta 1990 ya a tụleghachiworo atụleghachi. Akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ Mankind’s Search for God kwesịrị ịbụ ihe inyeaka dị ike nye ndị ozi ala ọzọ. Nwanna Schroeder mechiri okwu ya, sị: “Ya mere, ụmụnna, keleenụ Jehova maka ọzụzụ dị ebube, nke dịkwa oké ọnụ ahịa unu nataworo—nke dị ike, nke a na-apụghịkwa ime ka ọ maa jijiji. Jirinụ ngọzi Jehova gaa n’ihu, nweekwanụ obi ike zuru ezu n’ebe ya na Onye ndú anyị dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. Okwu ndị ahụ anyị na-ahụ n’Akwụkwọ nsọ bụ n’ezie okwu Chineke, ọ ga-eduzi ma tụziere unu ụzọ n’ọrụ ozi ala ọzọ unu.”
A gụpụtara ozi ekele sitere ná mba 11. Ụmụ akwụkwọ ahụ natakwara diplọma ha, otu n’ime ha gụpụtara akwụkwọ ozi na-emetụ n’obi nke e degaara Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel.
Nnọkọ ehihie ahụ gụnyekwara ọmụmụ ihe Ụlọ Nche e mere nkenke, nke David L. Walker, bụ́ onye so na Watchtower Farms Committee, duziri. Mgbe ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ ji isiokwu ahụ na-akpali akpali nke bụ “Ike nke Ekpere Nwere n’ime Nkwusa” mee ihe igosipụta ahụmahụ ndị a na-enweta n’ubi. Otu ọgbakọ dị n’ebe ahụ mere ihe nkiri na-akpali akpali nke bụ Ndị A Tọhapụrụ Ịkwalite Ezi Ofufe, nke dabeere ná nlọta Ezra lọtara na Jerusalem ịkwalite ezi ofufe. Nwanna Frederick W. Franz, bụ́ onye isi oche nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, mechiri site n’ikpe ekpere na-akpali akpali.
[Foto dị na peeji nke 24]
Klasị nke 89 nke Ndị Na-agụcha Akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru ebe a, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtara aha ndị ahụ site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla. (1) Ahr, K.; Johnston, L.; Ng Ying Kin, V.; Sukkau, A.; Rodriguez, A.; Myklebust, N. (2) Ahr, H.; Verbeek, P.; Verbeek, K; DeBolt, S.; DeBolt, S. (3) Sukkau, W.; Ayala, L; Ayala, S.; Jenson, R.; Ng Ying Kin, J.; Myklebust, T. (4) Rodriguez, C; Ferlisi, G.; Ferlisi, L; Tank, J.; Jenson, K.; Tank, J.; Johnston, P.