Dị Ka Nwanyị Di Ya Nwụrụ, Achọtara M Ezi Nkasi Obi
Dị ka Lily Arthur si kọọ
Otu nwa okoro bụ onye ozi nke Ndịàmà Jehova nọ na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’otu akụkụ nke Ootacamund, India. Dị ka omenala ndị ebe ahụ si dị, ndị inyom adịghị emeghere onye dị otú a nke ha na-amaghị ụzọ. Mgbe hour ole na ole gasịrị, n’ịbụ onye ike gwụsịrị, onye nwetụkwara nkụda aka, ọ tụgharịrị wee laba. Ma ọ kwụsịrị, na-enwe mmetụta nke bụ na ọ dị mkpa ka ya jee n’ọnụ ụzọ nke ọzọ. Tụlee ihe merenụ, dị ka nwanyị nke meghere ụzọ ahụ si kọọ ya.
EKU m nwa m nwanyị gbaworo ọnwa abụọ n’aka, nwa m nwoke nke dị 22 ọnwa guzokwa m n’akụkụ, m wee mepee ụzọ ahụ ngwa ngwa wee hụ onye m na-amaghị ama ka o guzo n’ebe ahụ. Kpọmkwem n’anyasị bu nke ahụ ụzọ, enwewo m oké nkụda mmụọ. N’ịchọ nkasi obi, ekpewo m ekpere, sị: “Nna anyị nke eluigwe, biko kasie m obi site n’Okwu gị.” Ugbu a, n’ịbụrụ m ihe ijuanya, onye nke a m na-amaghị ama kọwara, sị: “Ana m ewetara gị ozi nkasi obi na olileanya site n’Okwu Chineke.” Echere m na ọ ghaghị ịbụ onye amụma nke Chineke zitere. Ma gịnị bụ ọnọdụ nke kpaliri ekpere ahụ m kpere maka enyemaka?
Ịmụta Eziokwu Bible
Amụrụ m na 1922 n’obodo nta nke Gudalur n’ógbè ahụ mara mma nke Ugwu Nilgiri n’ebe ndịda India. Nne m nwụrụ mgbe m gbara afọ atọ. Mgbe e mesịrị, Nna m, bụ́ onye ụkọchukwu Protestant, lụrụ nwanyị ọzọ. Ozugbo anyị nwere ike ikwu okwu, Nna m kụziiri mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị otú e si ekpe ekpere. Mgbe m dị afọ anọ, ka Nna m na-anọdụ n’oche ya kwa ụbọchị na-agụ Bible, ana m anọ n’ala na-agụ Bible nke m.
Mgbe m tolitere, aghọrọ m onye nkụzi. Mgbe ahụ, mgbe m gbaruru 21 afọ, nna m mere ndokwa ka m lụọ di. Mụ na di m mụtara otu nwa nwoke, bụ́ Sunder, e mesịakwa anyị mụta otu nwa nwanyị, bụ́ Rathna. Otú ọ dị, n’ihe dị ka oge a mụrụ Rathna, di m malitere ịrịa ọrịa nke ukwuu, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ nwụkwara. N’afọ ndụ 24, na mberede, abụ m nwanyị di ya nwụrụ, na-enwe ibu ọrụ nke ilekọta ụmụntakịrị abụọ.
Mgbe nke ahụ gasịrị arịọrọ m Chineke ka ọ kasie m obi site n’Okwu ya, ọ bụkwa n’echi ya ka onye ozi Ndịàmà Jehova ahụ bịara. Akpọbatara m ya wee nara akwụkwọ ahụ bụ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.” N’anyasị ahụ mgbe m nọ na-agụ ya, anọgidere m na-ahụ aha ahụ bụ Jehova, nke bụụrụ m ihe ọhụrụ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, onye ozi ahụ bịaghachiri wee gosi m n’ime Bible na nke a bụ aha Chineke.
N’oge na-adịghị anya amụtakwara m na ozizi ndị ahụ dị ka Atọ n’Ime Otu na ọkụ ala mmụọ adabereghị na Bible. Enwetara m nkasi obi na olileanya mgbe m mụtara na n’okpuru Alaeze Chineke, ụwa ga-aghọ paradaịs, na ndị nwụrụ anwụ anyị hụrụ n’anya ga-abịaghachikwa ná mbilite n’ọnwụ. Nke kasị mkpa bụ na amalitere m ịmata ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na-ahụkwa ya n’anya, bụ́ onye nụrụ ekpere m wee nyere m aka.
Iso Ndị Ọzọ Kerịta Ihe Ọmụma M Nwetara Ọhụrụ
Amalitere m iche echiche banyere otú o si bụrụ na adịghị m agụbu amaokwu Bible ndị ahụ aha Chineke dị na ha. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka m na-ahụghị n’ọgụgụ Bible m olileanya ahụ doro anya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs? Ana m akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ nke ndị ozi ala ọzọ okpukpe Protestant na-elekọta, m wee gosi onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ amaokwu Bible ndị ahụ. (Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 37:29; 83:18; Aịsaịa 11:6-9; Mkpughe 21:3, 4) Ekwuru m na anyị elefuruwo amaokwu ndị a anya. Ma ọ bụụrụ m ihe ịtụnanya na nke a amasịghị ya.
Mgbe ahụ edegaara m onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ, onye nọ n’obodo ọzọ akwụkwọ, na-ehota okwu sitere n’amaokwu Bible ndị a. Arịọrọ m ya ka o nye m ohere mụ na ya ikwurịta okwu. Ọ zaghachiri m na nna ya, bụ́ onye ụkọchukwu a ma ama si England, ga-eso m tụlee okwu ahụ. Nwanne nwoke nke onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ bụ onye bishọp a ma ama.
Akwadebere m isi ihe na akụkụ akwụkwọ nsọ nile ahụ, werekwa akwụkwọ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” m, kpọrọkwa ụmụ m jee n’obodo nke ọzọ ahụ. Eji m ịnụ ọkụ n’obi kọwaa onye Jehova bụ, na e nweghị Atọ n’Ime Otu dịnụ, na ihe ndị ọzọ m mụtaworo. Ha gere ntị ruo nwa oge ma ha ekwughị okwu ọ bụla. Mgbe ahụ, onye ụkọchukwu ahụ si England kwuru, sị: “M ga-ekpere gị ekpere.” O wee kpee ekpere n’isi m, zilagakwa m.
Ịgba Àmà Okporo Ámá
Otu ụbọchị, onye ozi Ndịàmà Jehova ahụ kpọrọ m òkù ka m soro jee ịgba àmà n’okporo ámá, na-eji magazin Ụlọ Nche na Teta! Agwara m ya na nke ahụ bụ ihe m na-apụghị ime. Lee, n’India, ndị mmadụ na-ele nwanyị na-eguzo n’okporo ámá ma ọ bụ nke na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ anya n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ ga-ewetara aha nwanyị ahụ nkọcha, ọbụna wetakwara ezinụlọ ya nkọcha. Ebe ọ bụ na m hụrụ nna m n’anya nke ukwuu, nweekwa nsọpụrụ dị omimi n’ebe ọ nọ, achọghị m iwetara ya nkọcha.
Ma onye ozi ahụ gosiri m otu amaokwu Bible nke na-asị: “Nwa m, mara ihe, meekwa ka obi tọọ m ụtọ, ka m wee zaghachi onye na-akọcha m okwu.” (Ilu 27:11, King James Version) Ọ sịrị: “Ị na-eme ka obi tọọ Jehova ụtọ site n’igosipụta n’ihu ọha na ị dịnyeere ya na Alaeze ya.” N’ịchọ karịsịa ihe ọ bụla ọzọ ime ka obi tọọ Jehova ụtọ, ebuuru m akpa magazin ahụ wee soro ya jee ọrụ ịgba àmà okporo ámá. Ọbụna ugbu a, apụghị m ịghọta otú m si mee ya. Nke a bụ na 1946, ihe dị ka ọnwa anọ mgbe mụ na ya kwurịtasịrị okwu nke mbụ.
A Gbara M Ume Imeri Egwu
Na 1947, anaara m ọrụ nkụzi ná mpụga mpụga nke obodo Madras, n’ụsọ oké osimiri nke ebe Ọwụwa Anyanwụ India, m wee kpọrọ ụmụ m kwafee n’ebe ahụ. Otu ìgwè nta nke ihe dị ka Ndịàmà Jehova asatọ na-ezukọ mgbe mgbe n’obodọ ahụ. Iji wee jee nzukọ ndị ahụ, ọ dị mkpa ka anyị gaa njem maịlụ 16. N’oge ahụ n’India, ndị inyom adịghị agakarị njem nanị ha. Ha na-adabere n’ebe ndị nwoke nọ ịkpọ ha jee. Amaghị m ụzọ m ga-esi banye na bọs, ụzọ m ga-esi kwuo ka e resị m tiketi, na ụzọ m ga-esi rịda site na bọs ahụ, na ihe ndị ọzọ. Echere m na ekwesịrị m ịdị na-ejere Jehova ozi, ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ya mere ekpere m ekpere, sị: “Jehova Chineke, apụghị m ịdị ndụ n’ejeghịrị gị ozi. Ma ọ bụ nnọọ ihe na-apụghị ikwe omume nye m, bụ́ nwanyị onye India, ije site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”
Enwere m olileanya na Jehova ga-eme ka m nwụọ iji wee napụ m ihe isi ike nke a. Otú ọ dị, ekpebiri m ịgụ otu ihe sitere na Bible. Ná ndaba, asaghere m gaa n’akwụkwọ Jeremaịa, ebe o kwuru, sị: “Asịla, Nwata ka m bụ: n’ihi na ọ bụ onye ọ bụla m ga-ezi gị ka ị ga-ejekwuru, ọ bụkwa ihe ọ bụla m ga-enye gị n’iwu ka i ga-ekwu. Atụla egwu ihu ha: n’ihi na gị ka m nọnyeere ịnapụta gị.”—Jeremaịa 1:7, 8.
Ọ dị m nnọọ ka Jehova ọ̀ na-agwa m okwu kpọmkwem. Ya mere eji m obi ike jee n’ígwè m ji adụ ákwà wee dụta otu akpa m ga na-eji ebu magazin. Mgbe m kpesịrị ekpere site n’ala ala obi, apụrụ m nanị m wee jee site n’ụlọ ruo n’ụlọ, tinye akwụkwọ nile m ji, ọbụna malite otu ọmụmụ Bible n’ụbọchị ahụ. Ekpebisiri m ike idebe Jehova n’ọkwá mbụ ná ndụ m, etinyekwara m ntụkwasị obi na obi ike zuru ezu n’ebe ọ nọ. Ọrụ nkwusa ihu ọha ghọrọ ihe m na-eme mgbe nile ná ndụ n’agbanyeghị okwu nkọcha ndị a na-agwa m. N’agbanyeghị mmegide ahụ, ọrụ m nwere mmetụta siri ike n’ahụ ụfọdụ ndị.
E mere ihe atụ nke a mgbe mụ na nwa m nwanyị soro jee site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Madras mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. Otu nwoke onye Hindu, bụ́ onye ọkà ikpe n’Ụlọikpe Ukwu, n’ịgụhie afọ ndụ m, kwuru, sị: “Amawo m magazin ndị a ọbụna tupu a mụọ gị! Iri afọ atọ gara aga, otu nwanyị na-eguzo mgbe nile n’okporo ụzọ Mount Road na-eche ha n’ihu ndị mmadụ.” Nwoke ahụ chọrọ ịtụ ụtụ.
N’otu ụlọ ọzọ, onye Brahman nke okpukpe Hindu, bụ́ onye ọrụ nke laworo ezumike nká, kpọbatara anyị n’ime ụlọ wee sị: “Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwanyị na-anọ n’okporo ụzọ Mount Road na-eche Ụlọ Nche n’ihu ndị mmadụ. Aga m anara akwụkwọ a unu na-eche m n’ihu n’ihi nsọpụrụ m nwere maka nwanyị ahụ.” Achịrị m ọchị n’ihi na amaara m na ọ bụ m bụ nwanyị ahụ ha abụọ na-ekwu banyere ya.
Ịbụ Onye E Wusiri Ike na Onye A Gọziri Agọzi
Ọ bụ n’October 1947 ka m gosipụtara nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri. N’oge ahụ, ọ bụ nanị m bụ nwanyị Onyeàmà na-asụ asụsụ Tamil n’ime steti ahụ dum, ma ugbu a, e nwere ọtụtụ narị ndị inyom Tamil bụ Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-arụsikwa ọrụ ike n’ebe ahụ.
Mgbe e mesịrị m baptism, mmegide bịara site n’akụkụ nile. Nwanne m nwoke dere akwụkwọ, sị: “Ị gabigawo ókè nile nke ihe kwesịrị ekwesị na ihe dị ọcha.” Anatakwara m mmegide n’ụlọ akwụkwọ ebe m na-arụ ọrụ, sitekwa ná ndị obodo ahụ. Ma arapagidesiri m ike ọbụna karị n’ebe Jehova nọ site n’ịnọgide na-ekpesi ekpere ike. Ọ bụrụ na m eteta n’etiti abalị, ana m amụnye oriọna ọkụ, bụ́ nke na-eji kerosin enwu, wee malite ịmụ ihe.
Ka a nọ na-ewusi m ike, anọ m n’ọnọdụ ka mma ịkasi ndị ọzọ obi, na-enyekwara ha aka. Otu nwanyị onye Hindu meworo agadi nke mụ na ya na-amụ ihe guzosiri ike maka ofufe Jehova. Mgbe ọ nwụrụ, otu nwanyị ọzọ nọ n’ezinụlọ ahụ kwuru, sị: “Ihe mere ka anyị nile nwee obi ụtọ bụ nguzosi ike ya nye Chineke ahụ onye ọ họọrọ ife ofufe ruokwa ọgwụgwụ.”
Otu nwanyị ọzọ m duziiri ọmụmụ ihe adịghị achị ọchị ma ọlị. Mgbe nile, ihu ya na-egosipụtakarị nchekasị na mwute. Ma mgbe m kụzisịịrị ya banyere Jehova, agbara m ya ume ikpeku ya ekpere, ebe ọ bụ na ọ maara nsogbu anyị, na-enwekwa nchegbu maka anyị nile. N’izu ọzọ, ihu ya na-egbukepụ egbukepụ. Ọ bụ mgbe mbụ m hụworo ka ọ chịrị ọchị. Ọ kọwara, sị: “Anọwo m na-ekpeku Jehova ekpere, enwekwara m udo nke uche na nke obi.” Ọ raara ndụ ya nye Jehova, nọgidekwa n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike.
Ịhazi Ibu Ọrụ Dị Iche Iche
Ebe m nwere ụmụntakịrị abụọ m ga-elekọta, echere m na imezu ọchịchọ m nke ijere Jehova ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ yiri ihe na-agaghị ekwe omume. Ma mgbe ahụ, ohere ọhụrụ nke ije ozi meghere mgbe ọ dị mkpa ka e nwee onye ga na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ Tamil. Site n’enyemaka Jehova, enwere m ike ilekọta ọrụ ahụ, n’otu mgbe ahụ, na-arụkwa ọrụ ego dị ka onye nkụzi, na-elekọta ụmụntakịrị m, na-arụ ọrụ ndị dịịrị m n’ụlọ, na-ejezu nzukọ nile, na-ekerekwa òkè n’ije ozi ubi. N’ikpeazụ, mgbe ụmụntakịrị ndị ahụ tolitere, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ ihe ùgwù nke m nweworo ruo 33 afọ ugbu a.
Ọbụna site na mgbe Sunder na Rathna dị na nwata, agbalịrị m ịkụnye n’ime ha ịhụnanya maka Jehova na ọchịchọ nke idebe ọdịmma ya mgbe nile n’ọkwá mbụ n’akụkụ nile nke ndụ ha. Ha maara na onye mbụ ha ga-agwa okwu mgbe ha tetara n’ụra bụ Jehova, na ọ bụkwa ya bụ onye ikpeazụ ha ga-agwa okwu tupu ha alaba ụra. Ha makwaara na e kwesịghị ilefuru ịkwadebe maka nzukọ ndị Kraịst na ije ozi ubi anya n’ihi ihe omume ụlọ akwụkwọ a na-eme n’ụlọ. Ọ bụ ezie na ana m agba ha ume ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ọ dịghị mgbe m na-arụgide ha inweta akara dị elu, na-atụ egwu na ha ga-eme ka nke ahụ bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ ha.
Mgbe ha mesịrị baptism, ha na-eji oge ezumike ụlọ akwụkwọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ. Agbara m Rathna ume inwe obi ike, ka ọ ghara ime ihere dị ka m meburu. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na kọleji, jeekwa nweta ọzụzụ n’ọrụ aka, ọ malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, mgbe e mesịrị ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị lụrụ ya, bụ́ Richard Gabriel, onye na-eje ozi ugbu a dị ka onye nchịkọta nke Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’India. Ha na nwa ha nwanyị, bụ́ Abigail, na-arụ ọrụ oge nile n’alaka ụlọ ọrụ dị n’India, nwa ha nwoke nta, bụ́ Andrew, bụkwa onye nkwusa nke ozi ọma ahụ.
Otú ọ dị, mgbe ọ gbara afọ 18, Sunder mere ihe tiwara m obi mgbe ọ kwụsịrị iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Afọ ndị sochirinụ bụụrụ m oge ihe mgbu. Anọgidere m na-arịọ Jehova ka ọ gbaghara ihe nile m na-emezighị emezi mgbe m na-azụlite ya, ka o meekwa ka Sunder nwetaghachi echiche ya ka o wee nwee ike ịlọghachi. Ma, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, akwụsịrị m inwe olileanya. Ma mgbe ahụ, otu ụbọchị, mgbe afọ 13 gasịrị, ọ bịara wee gwa m, sị: “Mama, echegbula onwe gị, aga m eme nke ọma.”
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Sunder mere mgbalị pụrụ iche iji wee bụrụ onye tozuru okè n’ime mmụọ. O nwere ọganihu ruo n’ókè nke ịbụ onye e nyere nlekọta nke otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Mgbe e mesịrị, ọ hapụrụ ọrụ ya nke ọ na-anata ụgwọ dị mma na ya wee ghọọ onye ọsụ ụzọ. Ugbu a, ya na nwunye ya, bụ Esther, na-ejekọ ozi n’ọrụ nke a na Bangalore, n’ebe ndịda nke India.
Nkasi Obi nke Na-adịru Ogologo Ndụ Nile
Ọtụtụ mgbe, ana m ekele Jehova maka ikwe ka m nweta ahụhụ na ihe isi ike n’ime afọ ndị a nile. N’enweghị ahụmahụ dị otú ahụ, agaraghị m enwe ihe ùgwù ahụ dị oké ọnụ ahịa nke idetụ ịdị mma Jehova ire, obi ebere ya, na ngosipụta ya nile nke ezi nlekọta na mmetụta, ruo ókè dị otú a. (Jemes 5:11) Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịgụta na Bible banyere nlekọta na nchegbu Jehova nwere maka “nwa mgbei, na nwanyị di ya nwụrụ.” (Deuterọnọmi 24:19-21) Ma ọ dịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere nkasi obi na obi ụtọ nke inweta nlekọta na nchegbu ya.
Amụtawo m itinye ntụkwasị obi na obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ, n’adabereghị ná nghọta nke mụ onwe m, ma n’ụzọ m nile na-amara ya. (Abụ Ọma 43:5; Ilu 3:5, 6) Dị ka nwanyị di ya nwụrụ nke na-emebeghị agadi, ekpekuru m Chineke ekpere maka nkasi obi site n’Okwu ya, ugbu a, mgbe m gbaworo 68 afọ, apụrụ m ikwu n’ezie na n’ịghọta Bible na itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ, enwetawo m nkasi obi karịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nile.
[Foto dị na peeji nke 26]
Lily Arthur na ndị ezinụlọ ya