Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 5/15 p. 30-31
  • Iwulite Okwukwe Site n’Ọmụmụ Bible n’India

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwulite Okwukwe Site n’Ọmụmụ Bible n’India
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe Iji Merie Ọrụsị
  • Dị Ka Nwanyị Di Ya Nwụrụ, Achọtara M Ezi Nkasi Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Owuwe Ihe Ubi ahụ n’India
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • India—“Ịdị n’Otu n’Agbanyeghị Ndịrịta Iche”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmata Ihe Dị Mma ma Mee Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 5/15 p. 30-31

Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe

Iwulite Okwukwe Site n’Ọmụmụ Bible n’India

SITE ná nnukwu Ugwu Himalaya nke snow jupụtara bụ́ nke dị n’ebe ugwu ruo n’ikperé mmiri nke Oké Osimiri India nke na-enupụta uzu ọkụ bụ́ nke dị n’ebe ndịda, India bụ ala nke nwere ihe n’ụdị dịgasị iche, n’ọdịdị mbara ala nakwa n’ụzọ okpukpe. N’ime ihe karịrị otu ijeri nke ndị bi na ya, ihe dị ka pasent 83 bụ ndị Hindu, pasent 11 bụ ndị Alakụba, ndị mejụtara ọnụ ọgụgụ fọdụrụnụ n’ụzọ bụ́ isi bụ ndị na-aza ndị Kraịst n’ọnụ, ndị Sikh, ndị Buddha, na ndị Jain. Ha nile nweere onwe ha ife ofufe. “Okpukpe na-ekere òkè dị mkpa n’ụzọ ndụ nke ndị India,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu.

E ji ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe ndị Kraịst ha mara Ndịàmà Jehova nke ọma, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị 21,200 n’India. Dị ka ndị òtù ha n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị nọ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, Ndịàmà nọ n’India na-ewere ya dị ka ihe ùgwù inyere ndị agbata obi ha aka iwulite okwukwe siri ike n’Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Tụlee otú otu ezinụlọ bi na Chennai nke dị n’ebe ndịda India si nweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible.

Tupu ha ezute Ndịàmà Jehova, ezinụlọ a na-ekeresi òkè ike n’ihe omume òtù ụka mmụọ nsọ nke Katọlik, na-azọrọ na ha na-ahụ ọhụụ, na-asụ asụsụ dị iche iche, na-agwọkwa ndị ọrịa. A ma ha ama na chọọchị nakwa n’ógbè ha, ọbụna ndị mmadụ na-akpọ ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ ahụ “swami,” nke pụtara “onyenwe anyị.” Mgbe ahụ, otu ụbọchị, otu Onyeàmà letara ezinụlọ ahụ ma gosi ha site na Bible na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ọ bụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, dị ka e kweere n’ebe nile. Onyeàmà ahụ gosikwara ha na aha Chineke bụ Jehova nakwa na nzube Jehova maka ụwa bụ ime ka ọ ghọọ paradaịs mara mma.—Abụ Ọma 83:18; Luk 23:43; Jọn 3:16.

Ebe ọ bụ na ha na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù ma nwee mmasị n’ihe ha nụrụ, ndị òtù ezinụlọ a kwetara iso Ndịàmà Jehova na-enwechi ọmụmụ Bible anya. Nke a mere ka ndị enyi ha nọ na chọọchị ha ahụ na-akwa ha emo. Ka o sina dị, ezinụlọ ahụ nọgidere ná mkpebi ha ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ha. Ka ihe ọmụma ha mụbara, okwukwe ha esikwuo ike, ha kwụsịrị ihe omume dị iche iche ha na-eme bụ́ nke okpukpe ụgha. Taa, mmadụ atọ so n’ezinụlọ a bụ Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi e mere baptism, nne ha na-ejekwa ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka mgbe ọ bụla o kwere ya mee.

Okwukwe Iji Merie Ọrụsị

Okwukwe na obi ike dị ukwuu dị Sunder Lal, bụ́ nwa okorobịa bi n’otu obodo nta dị na Punjab, mkpa iji soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Otu ihe kpatara ya bụ na ọ jụla nkwere ezinụlọ ya na ndị obodo ya kweere n’ọtụtụ chi iji fee ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe. Ihe nke ọzọ bụ na Sunder Lal enweghị ụkwụ ọ bụla.

Tupu 1992, Sunder Lal nwere ihe ndị ọ na-eme mgbe dum ná ndụ. Ọ na-arụ ọrụ dị ka osote dọkịta ma na-esonyere ezinụlọ ya n’ife chi dị iche iche n’okpuru nduzi nke onye ozizi ha họpụtara. E mesịa, n’otu abalị, ọ dara mgbe ọ na-agafe n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Ụgbọ okporo ígwè rịrị ya elu ma si n’apata ụkwụ kwọbie ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọ nwụghị, ụwa ya ghasasịrị. N’ụzọ kwere nghọta, Sunder Lal nwere nkụda mmụọ n’ụzọ dị ukwuu, o chekwara echiche ọbụna igbu onwe ya. Ndị ezinụlọ ya nyeere ya aka, ma ọdịnihu ya yiri ihe olileanya na-adịkwaghị na ya.

Mgbe ahụ, otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ Sunder Lal ma gosi ya site na Bible na Chineke ekwewo nkwa ime ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma na inye ndị nile hụrụ ya n’anya ma na-atụ egwu ya, ahụ ike zuru okè. Sunder Lal nakweere ọmụmụ Bible, o jikwa ịdị uchu mụọ ihe ruo otu afọ. A kpọrọ ya òkù ịbịa nzukọ ndị Kraịst, n’ikpeazụ kwa, otu enyi ya buuru ya n’azụ ịnyịnya ígwè gaa. Ọ bụ ezie na o nwere ihe mgbu n’elu ịnyịnya ígwè ahụ, ụgwọ ọrụ o nwetara dị ukwuu. Ọ chọpụtara na ihe ọ mụtara n’ọmụmụ Bible onwe onye ya bụ eziokwu mgbe o zutere ndị ọzọ bụ́ ndị kweere n’ezie ná nkwa ndị dị n’Okwu Chineke ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ozizi Bible.

Sunder Lal malitere isoro ndị agbata obi ya na-ekerịta ozi ọma ahụ, na 1995 kwa, e mere ya baptism. Na mbụ, ọ na-ekere òkè n’ozi site n’ịkpụ akpụ na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’obodo nta ya, nke bụ́ otú o si agagharị. Ma ugbu a, o nwetara onyinye site n’aka ụmụnna ime mmụọ ya—ịnyịnya ígwè nwere ụkwụ atọ bụ́ nke a rụrụ n’ụzọ pụrụ iche ka e jiri aka “na-anyagharị” ya. Site n’enyemaka nke ịnyịnya ígwè ya a nwere ụkwụ atọ, o nwekwuru ike ijegharị n’onwe ya ugbu a, o nwekwara ike ime njem ahụ na-ewe kilomita 12 n’onwe ya iji gaa nzukọ ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-agbara ịnyịnya ígwè ya na-aga n’oge oké mmiri ozuzo; okpomọkụ na-adị ihe karịrị 43 degree Celsius n’oge ndị ọzọ.

Tụkwasị n’ịga nzukọ, Sunder Lal na-eduziri ndị ọzọ bụ́ ndị chọrọ enyemaka n’iwulite okwukwe siri ike n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova nọ, ọtụtụ ọmụmụ Bible. N’ezie, e meela mmadụ asaa n’ime ndị ọ mụụrụ Bible, baptism, dịkwa ka mmadụ atọ ọzọ ọ kpọtụụrụ bụ́ ndị Ndịàmà ibe ya mụụru Bible, merela.

Dị ka Bible si kwuo, “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Ma nye ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi,” ịmụchi Okwu Chineke anya pụrụ iwulite okwukwe siri ike. (Ọrụ 13:48) Ọmụmụ ihe dị otú ahụ na-emekwa ka anya na-egbukepụ n’olileanya nke ọdịnihu dị ebube—ihe ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị bi n’India na-egosipụta okwukwe na ya.

[Map dị na peeji 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFGHANISTAN

PAKISTAN

NEPAL

BHUTAN

CHINA

BANGLADESH

MYANMAR

LAOS

THAILAND

VIETNAM

CAMBODIA

SRI LANKA

INDIA

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya