Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼N’ihi gịnị ka nsụgharị nke 2 Pita 1:19 na New World Translation of the Holy Scriptures ji dị iche ná nsụgharị Bible ndị ọzọ?
N’imesi ike abamuru nke okwu Chineke sitere n’ike mmụọ ya, Pita onyeozi dere, sị: “N’ihi nke a, a na-eme ka okwu amụma guzosiere anyị ike karị; unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ya ntị dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa, n’ime obi unu.”—2 Pita 1:19, NW.
Rịba ama na e jiri akara kọma kebipụta ahịrị okwu ahụ bụ “ruo mgbe chi ga-abọ kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa.” Ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible adịghị eme nke a.
Dị ka ihe atụ, Dr. James Moffat sụgharịrị akụkụ ikpeazụ nke amaokwu ahụ, sị: “. . . ọ na-enwu dị ka oriọna n’ime ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe Chi ga-abọ kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa n’ime obi unu.” Nsụgharị ndị yiri nke a na-eduje n’echiche ahụ nke bụ na mbili nke kpakpando isi ụtụtụ ahụ na-ewere ọnọdụ n’ime obi nke ndị kwere ekwe, dị ka mgbe ha nwere ụdị ụfọdụ nke ìhè ime mmụọ.
Otú ọ dị, ọbụna laa azụ n’oge Mosis, e zoro aka n’eziokwu ahụ nke bụ na ‘otu kpakpando nke sitere na Jekọb’ ga-ebilite. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17; tụlee Abụ Ọma 89:34-37.) Jisọs kọwara onwe ya n’ụzọ doro anya dị ka ‘nwa Devid ahụ, na kpakpando ụtụtụ nke na-enwu enwu.’—Mkpughe 22:16.
Nkọwa nke a nke “kpakpando isi ụtụtụ,” ma ọ bụ “kpakpando ụtụtụ” ahụ, kwekọrọ n’ọnọdụ okwu nke ihe Pita onyeozi na-atụle. Ọ ka zosịrị aka n’ọhụụ nnwogha ahụ nke ọ hụrụ ihe dị ka 30 afọ tupu mgbe ahụ. (Matiu 16:28–17:9) Ọhụụ ahụ nke na-enwu enwu zoro aka n’oge mgbe Jisọs ‘ga-abịa n’alaeze’ ma ọ bụ mgbe a ga-eme ka ọ dị ebube n’ike Alaeze. Ihe Pita hụrụ mesiri ike abamuru nke okwu Chineke; n’otu aka ahụ, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nke oge a ṅaa ntị n’okwu amụma ahụ.
Ọ bụ ezie na obi ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha nọbu—ha ka nọkwa—n’ọchịchịrị, o kwesịghị ịdị otú ahụ n’ihe banyere ezi ndị Kraịst. Ọ bụ dị ka à ga-asị na ha nwere oriọna nke na-enwu n’ihe gaara abụworị ebe gbara ọchịchịrị, bụ́ obi ha. Pita maara na site n’ige ntị n’okwu amụma Chineke nke na-enye ìhè, ndị Kraịst ga-anọgide mụrụ anya, bụrụkwa ndị nọ n’ìhè ruo na chi ọbụbọ nke ụbọchị ọhụrụ. Nke ahụ ga-abụ mgbe “kpakpando isi ụtụtụ,” ma ọ bụ ‘kpakpando ụtụtụ na-enwu enwu,’ ga na-achị achị n’ezie n’ike Alaeze.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na E. W. Bullinger dere banyere 2 Pita 1:19, sị: “N’ebe a, o doro anya na a ghaghị inwe akara ngebichi, n’ihi na ọ bụ amụma ahụ bụ ìhè nke na-enwu enwu, Kraịst na mpụta Ya bụkwa kpakpando isi ụtụtụ na Chi ọbụbọ ahụ. N’ezie, ihe ọ pụtara apụghị ịbụ na a na-agba anyị ume ige ntị n’okwu amụma ahụ ruo mgbe e kpughere Kraịst n’ime obi anyị! Ee e; kama anyị ga na-ege ntị n’ime obi anyị n’okwu amụma nke a, ruo mgbe mmezu ga-abịa ná mpụta nke Kraịst—bụ́ mbili nke Onye ahụ a kpọrọ ‘Kpakpando Ụtụtụ.’”—Figures of Speech Used in the Bible, 1898.
N’ụzọ kwekọrọ na nke a, nsụgharị Bible dị iche iche na-etinye akara ngebichi na 2 Pita 1:19.a Nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures nọgidere n’usoro ndepụta okwu nke a na-ahụ n’asụsụ Grik mbụ. Ma o jiri akara kọma mee ihe iji kebipụta ahịrị okwu ahụ bụ “ruo mgbe chi ga-abọ kpakpando isi ụtụtụ wee biliekwa” site n’agbamume ahụ nke ige ntị n’okwu ahụ bụ ‘dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, n’ime obi unu.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ lee The Twentieth Century New Testament (mbipụta 1904), The Emphatic Diaglott (mbipụta 1942), Concordant Literal New Testament (1976).