Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/1 p. 20-25
  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ichela Echiche n’Anụ Ahụ”
  • Udo n’Etiti Anyị na Ụmụnna Anyị
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Udo’
  • Okwu Ndị Na-eme Udo
  • ‘Mee Ihe Nile Ị Pụrụ Ime’
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Udo, Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/1 p. 20-25

“Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”

“Jehova dị ukwuu, onye udo ohu ya na-atọ ya ụtọ.”—ABỤ ỌMA 35:27.

1. Udo dị aṅaa ka anyị nwere taa?

LEE nnọọ ihe ọṅụ ọ bụ ịnọ n’udo n’ime ụwa nke a kewasịrị ekewasị! Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ife Jehova, bụ́ “Chineke nke udo,” nakwa ikere òkè ná ngọzi nile nke “ọgbụgba ndụ udo” ya! Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ, n’agbanyeghị nrụgide nile nke ndụ, ịmara “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile” na ịnọ ‘n’ihe okike ahụ nke bụ udo,’ nke na-ejikọta ndị Chineke n’agbanyeghị mba ha si na ya, asụsụ ha, agbụrụ ha, ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ!—1 Ndị Tesalọnaịka 5:23; Ezikiel 37:26; Ndị Filipaị 4:7; Ndị Efesọs 4:3.

2, 3. (a) Ọ bụ ezie na ndị Chineke, dị ka otu ìgwè, ga-anọgide, gịnị pụrụ ime ndị Kraịst n’otu n’otu? (b) Gịnị ka Bible na-agba anyị ume ime?

2 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-ewere udo nke a n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Otú ọ dị, anyị apụghị ile ya anya dị ka ihe na-abịara onwe ya. A naghị anọgide n’udo nanị n’ihi na anyị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst ma ọ bụ n’ihi na anyị nọ n’ezinụlọ ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha, ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ ga-anọgide dị ka otu ìgwè atụrụ ruo ọgwụgwụ, ụfọdụ ndị n’otu n’otu pụrụ ịtụfu udo ha wee dapụ.—Jọn 10:16; Matiu 24:13; Ndị Rom 11:22; 1 Ndị Kọrint 10:12.

3 Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.” (Ndị Hibru 3:12) Ịdọ aka ná ntị nke a metụtakwara oké ìgwè mmadụ ahụ. Ya mere, Bible na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Chọọ udo, gbasookwa ya. N’ihi na anya abụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị ya abụọ dịkwa n’ebe arịrịọ ha dị: ma ihu nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] dịgidere ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:10-12; Abụ Ọma 34:14, 15.

“Ichela Echiche n’Anụ Ahụ”

4. Gịnị pụrụ inye udo anyị na Chineke nsogbu?

4 Gịnị pụrụ igbochi nchụso anyị na-achụso udo? Pọl hotara otu ihe mgbe ọ sịrị: “Ichela echiche n’anụ ahụ pụtara ọnwụ; ma ichela echiche ná mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo; n’ihi na ichela echiche n’anụ ahụ pụtara ya na Chineke ịdị n’iro.” (Ndị Rom 8:6, 7, NW) Site n’okwu ahụ bụ “anụ ahụ” Pọl na-ezo aka n’ọnọdụ anyị daworo ada dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị ketara ọchịchọ ime mmehie. Ịdaba n’ọchịchọ nile nke anụ ahụ daworo ada ga-emebi udo anyị. Ọ bụrụ na onye Kraịst emee omume rụrụ arụ, ghaa ụgha, zuo ohi, jiri ọgwụ ọjọọ mee ihe, ma ọ bụ mebie iwu Chineke n’ụzọ ọzọ n’enweghị nchegharị, ọ na-emebi udo ahụ nke dịbu n’etiti ya na Jehova. (Ilu 15:8, 29; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Karịsịa, ọ bụrụ na o kwere ka ihe onwunwe ghọọ ihe dị ya mkpa karịa ihe ime mmụọ, udo nke ya na Chineke ga-anọ n’ihe ize ndụ dị ukwuu.—Matiu 6:24; 1 Jọn 2:15-17.

5. Gịnị ka ịgbaso udo gụnyere?

5 N’aka nke ọzọ, Pọl sịrị: “Ichela echiche ná mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” Udo bụ akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ bụrụkwa na anyị azụọ obi anyị ịmata mkpa ihe ime mmụọ, na-ekpe ekpere ka mmụọ Chineke nyere anyị aka na nke a, mgbe ahụ, anyị ga-ezere “ichela echiche n’anụ ahụ.” (Ndị Galetia 5:22-24) Na 1 Pita 3:10-12, e jikọrọ udo na ezi omume. (Ndị Rom 5:1) Pita kwuru na ịgbaso udo gụnyere ‘ịgbakụta ihe ọjọọ azụ na ime ezi ihe.’ Mmụọ Chineke pụrụ inyere anyị aka ịdị “na-agbaso ezi omume,” wee si otú a chebe udo nke anyị na Chineke.—1 Timoti 6:11, 12.

6. Gịnị bụ otu n’ime ibu ọrụ ndị okenye nwere n’ebe udo nke ọgbakọ dị?

6 Mgbaso nke udo bụ ihe dị mkpa nke ukwuu nye ndị okenye ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ anwaa iwebata omume ndị na-emerụ emerụ, ndị okenye nwere ibu ọrụ nke ichebe ọgbakọ site n’ịnwa ịtụ onye mmehie ahụ mmehie ya n’anya. Ọ bụrụ na ọ nakwere ịtụ mmehie n’anya ahụ, ọ ga-enwetaghachi udo ya. (Ndị Hibru 12:11) Ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a chụpụ ya ka e wee chebe mmekọrịta udo nke dị n’etiti ọgbakọ na Jehova.—1 Ndị Kọrint 5:1-5.

Udo n’Etiti Anyị na Ụmụnna Anyị

7. Ngosipụta dị aṅaa nke ‘ichela echiche n’anụ ahụ’ ka Pọl dọrọ ndị Kọrint aka ná ntị banyere ya?

7 Ọ bụghị nanị na “ichela echiche n’anụ ahụ” pụrụ ibibi udo nke anyị na Chineke, kama ọ pụkwara ibibi ezi mmekọrịta anyị na ndị Kraịst ndị ọzọ nwere. Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Unu bụ ndị anụ ahụ na-achị ruo ugbu a: n’ihi na ebe ekworo na esemokwu dị n’etiti unu, ùnu abụghị ndị anụ ahụ na-achị, ndị na-ejegharịkwa dị ka mmadụ?” (1 Ndị Kọrint 3:3) Ekworo na esemokwu bụ kpọmkwem ihe ndị na-emegide udo.

8. (a) Gịnị pụrụ ime onye nke kpatara ekworo na esemokwu n’ime ọgbakọ? (b) Na gịnị ka udo nke anyị na Chineke dabeere?

8 Inye udo nke ọgbakọ nsogbu site n’ịkwalite ekworo na esemokwu bụ ihe dị njọ nke ukwuu. N’ikwu okwu banyere otu àgwà nke e jikọtara ya na udo dị ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ, Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla.” (1 Jọn 4:20) N’ụzọ dị otú ahụ, ọ bụrụ na mmadụ akpalite ekworo na esemokwu n’etiti ụmụnna, ọ̀ pụrụ iso Chineke dịrị n’udo n’ezie? O doro anya na ọ pụghị ime otú ahụ! A na-agba anyị ume, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ. Ka a na-eme ka unu zuo okè [“guzozie,” NW]; ka a na-akasi unu obi; na-atụkwasịnu uche unu nile n’otu ihe; na-adịnụ n’udo: Chineke nke ịhụnanya na udo ga-anọnyekwara unu.” (2 Ndị Kọrint 13:11) Ee, ọ bụrụ na anyị na ibe anyị anọgide na-ebi n’udo, mgbe ahụ Chineke nke ịhụnanya na udo ga-anọnyere anyị.

9. Olee otú anyị si mara na mgbe ụfọdụ ndị Kraịst ga-enwe nghọtahie na enweghị nkwekọrịta?

9 Nke a apụtaghị na ọ dịghị mgbe a ga-enwe nghọtahie n’etiti ndị Kraịst. N’izu ndị na-esochi Pentikọst, e nwere nghọtahie n’ime ọgbakọ ọhụrụ ndị Kraịst ahụ banyere nkesa nri a na-eme kwa ụbọchị. (Ọrụ 6:1) N’otu oge, nghọtahie e nwere n’etiti Pọl na Banabas dujere ‘n’oké iwe.’ (Ọrụ 15:39) Ọ dịrị mkpa ka Pọl nye Yuodia na Sintiki ndụmọdụ, ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha bụ ezi ụmụnna nwanyị ndị na-anụ ọkụ n’obi, “ka ha tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Filipaị 4:2) Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji nye ndụmọdụ sara mbara banyere otú a ga-esi dozie okwu mgbe ọ bụla e nyere udo nke dị n’etiti ndị Kraịst nsogbu, meekwa ka ịdị mkpa ya pụta ìhè, bụ́ ileba anya n’okwu ndị dị otú ahụ ngwa ngwa! (Matiu 5:23-25; 18:15-17) Ọ garaghị enye ndụmọdụ nke a ma a sị na ọ tụghị anya na a ga-enwe ihe isi ike n’etiti ndị na-eso ụzọ ya.

10. Olee ọnọdụ ndị na-ebilite mgbe ụfọdụ n’ime ọgbakọ, oleekwa ibu ọrụ nke a na-atụkwasị ndị nile o metụtara?

10 Ya mere, taa, o kwere omume na a pụrụ imejọ mmadụ site n’okwu a na-ejighị akọ kwuo ma ọ bụ mmejọ nke o chere na o sitere n’aka onye Kraịst ibe ya. Àgwà nke otu onye pụrụ ịgbakasị onye ọzọ ahụ nke ukwuu. A pụrụ inwe nsogbu n’ihi oké ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ. Ọ pụrụ ịbụ na mmadụ ekwenyeghị ma ọlị n’otu mkpebi ndị okenye mere. N’ime òtù ndị okenye, ọ pụrụ ịbụ na otu onye okenye nwere echiche siri ike banyere otu ihe, nwaakwa ịmanye ndị okenye ndị ọzọ ikwenyere echiche nke ya. N’agbanyeghị na ihe ndị dị otú ahụ na-eme, ọ ka dịkwa mkpa ka anyị chọọ udo, gbasookwa ya. Ihe ịma aka dị na ya bụ ileba anya ná nsogbu ndị a n’ụzọ ndị Kraịst si eme ihe ka anyị wee chebe “ihe okike nke bụ udo.”—Ndị Efesọs 4:3.

11. Olee ndokwa ndị Jehova meworo iji nyere anyị aka ịgbaso udo n’ebe ibe anyị nọ?

11 Bible na-asị: “Jehova dị ukwuu, onye udo ohu ya na-atọ ya ụtọ.” (Abụ Ọma 35:27) Ee, Jehova chọrọ ka anyị dịrị n’udo. N’ihi ya, o dokwawo ihe abụọ pụtara ìhè iji nyere anyị aka ichebe udo n’etiti onwe anyị nakwa n’etiti anyị na ya. Otu bụ mmụọ nsọ, nke udo bụ otu mkpụrụ ya, gụnyere àgwà e ji eme udo ndị e jikọtara ha na ya, dị ka ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. (Ndị Galetia 5:22, 23) Nke ọzọ bụ amamihe Chineke, nke anyị na-agụ banyere ya, sị: “Amamihe ahụ nke si n’elu bịa buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obi ọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ.”—Jemes 3:17, 18.

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a kpaghasịwo udo anyị na ụmụnna anyị?

12 Ya mere, mgbe a kpaghasịrị udo dị n’etiti anyị na ndị ọzọ, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka amamihe sitere n’elu igosi anyị ụzọ anyị ga-esi mee ihe, anyị kwesịkwara ịrịọ maka mmụọ nsọ inye anyị ike ime ihe ziri ezi. (Luk 11:13; Jemes 1:5; 1 Jọn 3:22) N’ime ihe kwekọrọ n’ekpere anyị, anyị pụrụ ileba anya n’isi iyi nke amamihe Chineke, bụ́ Bible, maka nduzi, nyochaakwa akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Bible anyị pụrụ inweta maka ndụmọdụ banyere ụzọ anyị ga-esi tinye ihe Akwụkwọ nsọ kwuru n’ọrụ. (2 Timoti 3:16) Anyị pụkwara ịchọ inweta okwu ndụmọdụ site n’aka ndị okenye n’ọgbakọ. Nzọụkwụ ikpeazụ ga-abụ ịgbaso nduzi e nwetara. Aịsaịa 54:13 na-asị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” Nke a na-apụta na udo anyị dabeere n’anyị itinye n’ọrụ ihe ndị Jehova na-akụziri anyị.

‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-eme Udo’

13, 14. (a) Gịnị ka okwu Jisọs bụ́ ‘onye na-eme udo’ na-egosi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo?

13 Jisọs, n’Ozizi Elu Ugwu ya, sịrị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo: n’ihi na ndị ahụ ka a ga-akpọ ụmu Chineke.” (Matiu 5:9) ‘Onye na-eme udo’ n’ebe a adịghị ezo aka n’onye dị nwayọọ dị ka ụdị mmadụ ya si dị. Okwu Grik mbụ e jiri mee ihe pụtara “ndị na-eme udo.” Onye na-eme udo nwere nkà nke iweghachite udo mgbe a kpaghasịrị ya. Ma, nke ka mkpa, onye na-eme udo na-agbalịsi ike izere kpam kpam ịkpaghasị udo. ‘Udo na-achị achị n’ime obi ya.’ (Ndị Kọlọsi 3:15) Ọ bụrụ na ndị ohu Chineke agbalịsie ike ịbụ ndị na-eme udo, mgbe ahụ a gaghị enwe ọtụtụ nsogbu ndị ga-ebilite n’etiti ha.

14 Ịghọ onye na-eme udo gụnyere ịmata adịghị ike nke onwe anyị. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst pụrụ ịbụ onye na-ewe iwe ọkụ ma ọ bụ onye ihe na-emetụtakarị n’ahụ na onye a na-akpasu iwe ọsọ ọsọ. Mgbe ọ nọ ná nrụgide, mmetụta uche ya pụrụ ime ka o chefuo ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. Nke a abụghị ihe a na-atụghị anya n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Ndị Rom 7:21-23) Otú o sina dị, e depụtara ibu iro, esemokwu, na ọnụma dị ka ọrụ nile nke anụ ahụ. (Ndị Galetia 5:19-21) Ọ bụrụ na anyị ahụ àgwà ndị dị otú ahụ n’ime onwe anyị—ma ọ bụ ọ bụrụ na ndị ọzọ adọrọ uche anyị gaa na ha—anyị kwesịrị isi n’ala ala obi kpee ekpere mgbe nile maka mmụọ Jehova ịzụlite n’ime anyị njide onwe onye na ịdị nwayọọ. N’ezie, mmadụ nile kwesịrị ịgbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ dị ka akụkụ nke mmadụ ọhụrụ ya.—Ndị Efesọs 4:23, 24; Ndị Kọlọsi 3:10, 15.

15. Olee ụzọ amamihe si n’elu si emegide inwe isi ike n’ụzọ ezi echiche na-adịghị ya?

15 N’oge ụfọdụ, otu onye isi ike na-enye ọgbakọ ma ọ bụ òtù ndị okenye nsogbu, na-ekwu mgbe nile ka a gbasoo ụzọ nke onwe ya. N’eziokwu, mgbe a bịara n’iwu Chineke, onye Kraịst kwesịrị imesi uche ya ike, ọbụna ghara ịdị nro. Ọ bụrụkwa na anyị chere na anyị nwere echiche ziri ezi nke pụrụ ịbara ndị ọzọ uru, ọ dịghị ihe dị njọ n’ikwupụta echiche anyị hoo haa, ọ bụrụhaala na anyị na-akọwa ihe ndị kpatara ya. Ma anyị achọghị ịdị ka ndị ahụ nọ n’ụwa bụ ndị ‘ekwenye ekwenye.’ (2 Timoti 3:1-4) Amamihe ahụ nke si n’elu bịa dị udo, nwee ezi uche. Ndị ahụ omume ha guzobere usoro nke adịghị nro site n’isi ike kwesịrị ịnara ndụmọdụ Pọl nyere ndị Filipaị ka ha ‘ghara ime ihe ọ bụla site na mpako.’—Ndị Filipaị 2:3.

16. Olee otú ndụmọdụ Pọl n’akwụkwọ Ndị Filipaị si enyere anyị aka imeri mpako?

16 N’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl gbara ume na anyị kwesịrị iji obi eziokwu ‘gụọ ndị ọzọ ná ndị ka anyị mma site n’obi dị umeala.’ Nke a bụ kpọmkwem ihe dị iche n’ebe mpako dị. Onye Kraịst tozuru okè adịghị ebu ụzọ eche banyere ịrụgide ndị ọzọ ịnakwere echiche nke onwe ya, izere mmechuihu, ma ọ bụ ichebe ọnọdụ na ikike nke onwe ya. Nke a ga-emegide agbamume Pọl nke ‘ịhapụ ile ihe nke aka ya anya, kama ilekwa ihe nke mmadụ ibe ya anya.’—Ndị Filipai 2:4; 1 Pita 5:2, 3, 6.

Okwu Ndị Na-eme Udo

17. Olee ụzọ iji ire eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma pụrụ isi kpaghasịa udo nke ọgbakọ?

17 Onye nke na-achụso udo na-elezikarị anya n’otú o si eji ire eme ihe. Jemes dọrọ aka ná ntị sị: “Ire bụkwa ihe nta dị n’ahụ, ọ na-anyakwa isi oké ihe. Lee, otú oké ọhịa hà ukwuu, bụ́ nke ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ.” (Jemes 3:5) Asị̀rị̀ arụrụala, ịkatọ ndị ọzọ n’azụ, okwu obi ọjọọ na nke dị ike, ntamu na ime mkpesa, tinyekwara okwu ịja mma ụgha maka iji nweta ọdịmma onwe onye—ihe ndị a nile bụ ọrụ nile nke anụ ahụ nke na-akpaghasị udo nke ndị Chineke.—1 Ndị Kọrint 10:10; 2 Ndị Kọrint 12:20; 1 Timoti 5:13; Jud 16.

18. (a) Ọ bụrụ na e nwee ngahie n’iji ire mee ihe nke a na-elezighị anya mee, gịnị bụ ụzọ ziri ezi nke onye ọ bụla o metụtara kwesịrị ịgbaso? (b) Mgbe iwe mere ka mmadụ kwuo okwu ndị na-akpata mwute, olee ụzọ ndị Kraịst tozuru okè si emeghachi omume?

18 N’eziokwu, Jemes sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti mmadụ pụrụ imejụ ire anya.” (Jemes 3:8) Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị Kraịst tozuru okè na-ekwu ihe ndị ha ga-emesịa kwaara ụta n’ezie. Anyị nile na-enwe olileanya na ndị ọzọ ga-agbaghara anyị mmejọ ndị dị otú ahụ dị ka anyị na-agbaghara ha. (Matiu 6:12) Mgbe ụfọdụ oké ntiwapụ nke iwe pụrụ ịkpata ikwu okwu ndị na-akpata mwute. Mgbe ahụ, onye na-eme udo ga-echeta na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Mgbe mgbe, ọ ghaghị nnọọ ijide onwe ya ma jụ iji okwu iwe zaghachi okwu iwe ndị ahụ. Mgbe e mesịrị, mgbe iwe dajụsịrị, onye na-eme udo nke nwere ọmịiko maara otú e si eleghara ihe ndị e kwuru mgbe iwe dị ọkụ anya. Onye Kraịst nke dịkwa obi umeala ga-amakwa otú e si arịọ mgbaghara, nwaakwa imela ọnyá ọ bụla ọ kpataworo. Ọ bụ ihe na-egosi ike nke omume ọma inwe ike isite n’obi eziokwu sị, “Ihe m mere wutere m.”

19. Gịnị ka anyị na-amụta site n’aka Pọl na Jisọs banyere ụzọ e si enye ndụmọdụ?

19 A pụrụ iji ire mee ihe inye ndị ọzọ ndụmọdụ. Pọl baara Pita mba n’ihu ọha mgbe o mere ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’Antiọk. Jisọs nyekwara ndụmọdụ ndị siri ike n’ozi ndị o zijeere ọgbakọ asaa ndị ahụ. (Ndị Galetia 2:11-14; Mkpughe, isi 2, 3) Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe atụ ndị a, anyị na-amụta na ndụmọdụ ekwesịghị ịdị nro nke ukwuu nke na a gaghị aghọta isi ihe mere e ji nye ya. Otú o sina dị, Jisọs na Pọl abụghị ndị na-agwa mmadụ okwu n’ike ma ọ bụ ndị obi ọjọọ. Ndụmọdụ ha abụghị ụzọ isi wụpụ mgbakasị ahụ nke onwe ha. Ha na-anwa n’obi eziokwu inyere ụmụnna ha aka. Ọ bụrụ na onye nke na-enye ndụmọdụ enwee mmetụta nke na ya adịghị achịkwa ire ya n’ụzọ zuru ezu, ọ pụrụ ịhọrọ ịkwụsịtụ ma kurutụ ume tupu ọ na-ekwu ihe ọ bụla. Ma o meghị otú ahụ, ọ pụrụ ikwu okwu dị ike ma kpata nsogbu dị njọ karịa nke ọ na-anwa idozi.—Ilu 12:18.

20. Gịnị kwesịrị ịchịkwa ihe nile anyị na-agwa ma ọ bụ na-ekwu banyere ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom?

20 Dị ka e kwuworo, udo na ịhụnanya nwere njikọ dị ukwuu dị ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ọ bụrụ na ihe anyị gwara ụmụnna anyị—ma ọ bụ ihe anyị kwuru banyere ha—bụ mgbe nile ngosipụta nke ịhụnanya anyị maka ha, mgbe ahụ ọ ga-etinye ihe n’udo nke ọgbakọ. (Jọn 15:12, 13) Okwu ọnụ anyị aghaghị ‘ịdị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ.’ (Ndị Kọlọsi 4:6) Ha kwesịrị ịdị ụtọ, dị ka a pụrụ ikwu ya, na-adọrọ obi. Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Nweenụ nnú n’ime unu, unu na ibe unu dịkwa n’udo.”—Mak 9:50.

‘Mee Ihe Nile Ị Pụrụ Ime’

21. Gịnị na-apụta ìhè banyere ndị Chineke ná nzukọ ndị ha na-enwe kwa izu na n’oge mgbakọ nta na mgbakọ ukwu dị iche iche?

21 Onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” (Abụ Ọma 133:1) N’ikwu eziokwu, ọ na-enye anyị obi ụtọ ịnọnyere ụmụnna anyị, karịsịa ná nzukọ ndị anyị na-enwe kwa izu na n’oge mgbakọ nta na mgbakọ ukwu dị iche iche. N’oge ndị dị otú ahụ, udo anyị na-apụta ìhè nye ọbụna ndị nọ n’èzí.

22. (a) Olee udo ụgha nke mba nile ga-eche na ha na-enweta n’oe na-adịghị anya, ọ̀ ga-edujekwa na gịnị? (b) Olee ezi udo nke ọgbụgba ndụ Chineke maka udo ga-eduje na ya?

22 N’oge na-adịghị anya, mba nile ga-eche na ha na-enweta udo n’enweghị enyemaka Jehova. Ma mgbe ha na-asị, “Udo na ntụkwasị obi!” mbibi mberede ga-abịakwasị ndị nile ha na Chineke na-adịghị n’udo. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Mgbe nke ahụ gasịrị, onye ukwu ahụ bụ Onye Isi Udo ga-amalite ịgwọpụ ihe a kpọrọ mmadụ mmetụta nile na-eweta mbibi nke ntụfu mbụ mmadụ tụfuru udo nke ya na Chineke. (Aịsaịa 9:6, 7; Mkpughe 22:1, 2) Mgbe ahụ, ọgbụgba ndụ Chineke maka udo ga-eweta ịdị jụụ nke elu ụwa dum. Ọbụna anụ ndị bi n’ọhịa ga-ezuru ike site n’omume ịkpọasị.—Abụ Ọma 37:10, 11; 72:3-7; Aịsaịa 11:1-9; Mkpughe 21:3, 4.

23. Ọ bụrụ na anyị weere olileanya maka ụwa ọhụrụ nke udo n’ihe dị oké ọnụ ahịa, gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a?

23 Lee aha oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! Ì ji ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ‘na-agbaso udo n’ebe mmadụ nile nọ.’ Chọọ ịdị n’udo ugbu a n’etiti gị na ụmụnna gị, karịsịakwa n’etiti gị na Jehova. Ee, “ebe unu na-ele anya ihe ndị a, na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu ya.”—Ndị Hibru 12:14; 2 Pita 3:14.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị pụrụ itisasị udo nke anyị na Jehova?

◻ Ụdị nghọtahie ndị dị aṅaa ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka e dozie n’ime ọgbakọ?

◻ Olee ndokwa Jehova meworo iji nyere anyị aka ịchọ udo na ịgbaso ya?

◻ Àgwà anụ ahụ ndị dị aṅaa pụrụ ịkpaghasị udo nke ọgbakọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi guzogide ha?

[Foto dị na peeji nke 22]

Udo na-ejupụta n’etiti ndị Jehova ziworo ihe

[Foto dị na peeji nke 24]

Lee ka udo ụmụnna ndị na-eje ozi n’ịdị n’otu si atọ ụtọ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya