Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/15 p. 19-22
  • Òle Ndị n’Ezie Nwere Ọkpụkpọ nke Eluigwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Òle Ndị n’Ezie Nwere Ọkpụkpọ nke Eluigwe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nchụaja na Ndị Eze Nwere Ọmịiko
  • Ịgba Àmà nke Mmụọ ahụ
  • Ihe Mere Ha Na-eji Ekere Òkè
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Echiche Ndị Na-ezighị Ezi?
  • Ọ Dị Oké Mkpa Iji Nlezianya Mee Nnyocha
  • Cheta Onye Na-eme Nhọrọ ahụ
  • Gịnị Ka Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Inwe Onwe Dị Ebube n’Isi Nso Maka Ụmụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova Ekubata Ọtụtụ Ụmụ Ndị Ikom n’Ebube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • ”Mmụọ Nsọ n’Onwe Ya So Mmụọ Anyị Na-agba Àmà”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/15 p. 19-22

Òle Ndị n’Ezie Nwere Ọkpụkpọ nke Eluigwe?

JEHOVA hụrụ agbụrụ mmadụ n’anya. Ee, ịhụnanya nke a hiri nne nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ka ọ bụrụ ihe mgbapụta iji nwetaghachi ihe nna anyị ochie, bụ́ Adam tụfuru! Gịnịkwa bụ nke ahụ? Ndụ ebighị ebi dị ka ụmụ mmadụ zuru okè, na-enwe iru eru na olileanya nile so ya. (Jọn 3:16) Ihe mgbapụta ahụ bụkwa ihe ngosipụta nke ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ.—Matiu 20:28.

E gosipụtawo ịhụnanya Chineke n’imeghe olileanya abụọ ndị Chineke nyere, bụ́ ndị dabeere n’uru nke àjà mgbapụta Jisọs. (1 Jọn 2:1, 2) Tupu Jisọs anwụọ dị ka mmadụ, nanị olileanya dịịrị ndị nwere nnwapụta Chineke bụ nke ndụ n’ime paradaịs elu ala. (Luk 23:43) Otú ọ dị, mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, Jehova nyere “ìgwè atụrụ nta” olileanya nke eluigwe. (Luk 12:32) Ma gịnị meworo n’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga? Kemgbe 1931, ozi Alaeze ahụ elekwasịwo anya karị n’ebe “atụrụ ọzọ” ahụ dị, sitekwa na 1935 gaa n’ihu, Chineke anọwo na-adọta “oké ìgwè mmadụ” nke ndị yiri atụrụ dị otú ahụ bịa n’ebe ya onwe ya nọ site na Kraịst. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) N’ime obi ha, Chineke etinyewo olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala. Ha chọrọ iri nri zuru okè, nwee ụmụ anụmanụ n’okpuru ha n’ụzọ ịhụnanya, sorokwa ụmụ mmadụ ibe ha bụ ndị ezi omume nwee mkpakọrịta ruo mgbe ebighị ebi.

Ndị Nchụaja na Ndị Eze Nwere Ọmịiko

Ebe ịhụnanya kpaliri Jisọs inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta, o doro anya na ọ ga-abụ Eze eluigwe nke nwere ọmịiko. Ma, Jisọs agaghị anọ nanị ya n’ibuli ihe a kpọrọ mmadụ bịa n’izu okè n’ime Ọchịchị Puku Afọ ya. Jehova emewo ndokwa ka ndị eze ndị ọzọ nwere ọmịiko soro nọrọ n’eluigwe. Ee, “ha ga-abụ ndị nchụaja nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya bụrụ eze [otu puku afọ].”—Mkpughe 20:1-6.

Òle ka ndị ahụ ha na Kraịst ga-eso chịa achị ga-adị, oleekwa ụzọ e si ahọpụta ha maka ihe ùgwù nke a dị ebube? Ee, Jọn onyeozi hụrụ 144,000 n’elu Ugwu Zaịọn nke dị n’eluigwe ka ha na Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ. N’ịbụ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ,” ha ga-ama ihe ọ pụtara bụ́ inweta ọnwụnwa dị iche iche, ịnagide ibu arọ nile nke ezughị okè, ịta ahụhụ, nakwa ịnwụ anwụ dị ka ụmụ mmadụ. (Mkpughe 14:1-5; Job 14:1) N’ihi ya, lee nnọọ aha ndị eze bụkwa ndị nchụaja nwere ọmịiko ha ga-abụ!

Ịgba Àmà nke Mmụọ ahụ

Ndị so na 144,000 ahụ ‘nwere otite mmanụ sitere n’onye nsọ ahụ,’ bụ́ Jehova. (1 Jọn 2:20) Ọ bụ otite mmanụ gaa n’olileanya nke eluigwe. Chineke ‘akawo ha akara, nyekwa ha mmụọ nsọ n’obi ha, bụ́ ihe ha ji mara na ha ga-enwezu nkwa ahụ nile.’—2 Ndị Kọrint 1:21, 22.

Ee, ndị ahụ nwere ọkpụkpọ nke eluigwe nwere ọgbụgba àmà nke mmụọ Chineke banyere nke ahụ. N’ihe banyere nke a, Pọl dere ná Ndị Rom 8:15-17, sị: “Unu anataghị mmụọ nke ịbụ ohu ịlaghachi n’egwu ọzọ; kama unu natara mmụọ nke ido ka nwa nwoke, nke anyị na-eti mkpu n’ime ya, sị, Aba, Nna. Mmụọ nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyị na ya otuto.” Ọ bụ site ná mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya, ka ndị e tere mmanụ na-eti mkpu, sị, “Aba, Nna.”

Ihe àmà bụ isi nke na-egosi na e tewo mmadụ mmanụ maka ọkpụkpọ nke eluigwe ahụ bụ mmụọ, ma ọ bụ echiche siri ike nke ịbụ nwa. (Ndị Galetia 4:6, 7) Mmadụ dị otú ahụ na-ejide n’aka n’ụzọ ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na Chineke ewerewo ya dị ka nwa ime mmụọ dị ka otu n’ime 144,000 ndị so na-eketa Alaeze eluigwe ahụ. Ọ pụrụ ịgba àmà na olileanya eluigwe ya abụghị ọchịchọ nke o wulitere n’onwe ya ma ọ bụ ihe o chepụtara n’echiche, kama na o sitere na Jehova dị ka ihe sitere n’ịrụ ọrụ nke mmụọ Chineke n’ebe ọ nọ pụta.—1 Pita 1:3, 4.

N’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ Chineke, mmụọ ahụ, ma ọ bụ echiche siri ike, nke ndị e tere mmanụ na-arụ ọrụ dị ka ike na-akpali akpali. Ọ na-akpali ha ịzaghachi nke ọma n’ihe Okwu Chineke kwuru banyere olileanya eluigwe ahụ. Ha na-azaghachikwa n’ụzọ dị mma n’ụzọ Jehova si emeso ha ihe site ná mmụọ nsọ ahụ. Otú a, ha ji n’aka na ha bụ ụmụ ime mmụọ na ndị nketa nke Chineke.

Mgbe ndị e tere mmanụ na-agụ ihe Okwu Chineke kwuru banyere ụmụ ime mmụọ ya na olileanya eluigwe ahụ, mkpali ha na-enwe bụ ikwu n’ime onwe ha, sị, ‘Nke a bụ mụ ka a na-ekwu banyere ya!’ Ee, ha na-eji ọṅụ na-azaghachi mgbe Okwu nke Nna ha na-ekwe nkwa nke nkwụghachi ụgwọ n’eluigwe. Ha na-asị, ‘Ọ bụ mụ ka a na-ekwu okwu banyere ya!’ mgbe ha na-agụ, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ugbu a ka anyị bụ ụmụ Chineke.” (1 Jọn 3:2) Mgbe ndị e tere mmanụ na-agụkwa na Chineke ewepụtawo otu ndị ‘ka ha wee bụrụ otu aha mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke,’ mkpali uche ha na-abụ ịzaghachi, sị, ‘Ee, o wepụtara m maka nzube ahụ.’ (Jemes 1:18) Ha maara na ha abụwo “ndị e mere baptism ịba n’ime Kraịst Jisọs,” nakwa ịba n’ime ọnwụ ya. (Ndị Rom 6:3) Ya mere, ha na-ekwenyesi ike na ha bụ akụkụ nke ahụ ime mmụọ Kraịst, na-enwekwa olileanya nke ịnwụ ọnwụ yiri nke ya na ịbụkwa ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe.

Iji wee keta Alaeze eluigwe ahụ, ndị e tere mmanụ aghaghị ‘ịdị na-anụ ọkụ n’obi ime ka ọkpụkpọ na nhọpụta ha bụrụ ihe e ji n’aka.’ (2 Pita 1:5-11) Ha na-eje ije n’okwukwe, nọgidekwa na-eto eto n’ime mmụọ, dịkwa ka ndị ahụ nwere olileanya elu ala. Ya mere, gịnị ọzọ ka e nwere n’ịgba àmà nke mmụọ ahụ?

Ihe Mere Ha Na-eji Ekere Òkè

Ndị Kraịst e tere mmanụ achọghị ije eluigwe n’ihi na ọnọdụ ndụ a na-adị n’elu ala taa ejughị ha afọ. (Tụlee Jud 3, 4, 16.) Kama nke ahụ, mmụọ nsọ ahụ na-eso mmụọ nke ha na-agba àmà na ha bụ ụmụ Chineke. Ha jikwa n’aka na e webatawo ha n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ndị so n’ọgbụgba ndụ nke a bụ Jehova Chineke na Israel ime mmụọ. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Galetia 6:15, 16; Ndị Hibru 12:22-24) Ọgbụgba ndụ nke a, nke e mere ka ọ dị irè site n’ọbara Jisọs a wụsịrị na-ewepụtara aha Jehova otu ndị, na-emekwa ka ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ bụrụ akụkụ nke “mkpụrụ” Abraham. (Ndị Galetia 3:26-29; Ọrụ 15:14) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nọgidere na-arụ ọrụ ruo mgbe ndị Israel ime mmụọ nile bilitesịrị n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.

Ọzọkwa, ndị ahụ nwere ọkpụkpọ nke eluigwe n’ezie adịghị enwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na ha sokwa n’ọgbụgba ndụ ahụ maka Alaeze eluigwe. Jisọs zoro aka n’ọgbụgba ndụ nke a nke dị n’etiti ya onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya mgbe o kwuru, sị: “Ma unu onwe unu bụ ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile; mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie ṅụọkwa na table nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Luk 22:28-30) E mere ka ọgbụgba ndụ nke a dịrị irè n’ebe ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ site na ha ịbụ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ n’ụbọchị Pentikọst nke 33 O.A. Ọ nọgidere na-adị irè n’etiti Kraịst na ndị ya na ha na-achị achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 22:5.

O doro ndị ahụ nwere ọkpụkpọ nke eluigwe anya na ha so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nakwa n’ọgbụgba ndụ ahụ maka Alaeze. Ya mere, ha ziri ezi n’ikere òkè n’achịcha na mmanya nnọchianya ahụ a na-enwe n’oge ahụ a na-eme ememe ncheta Nri Anyasị Onyenwe anyị, ma ọ bụ Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs Kraịst kwa afọ. Achịcha ahụ na-ekoghị eko na-ese onyinyo anụ ahụ Jisọs nke na-enweghị mmehie ọ bụla, mmanya ahụ na-esekwa onyinyo ọbara ya zuru okè nke a wụpụrụ n’ọnwụ, nke mekwara ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dịrị irè.—1 Ndị Kọrint 11:23-26.

Ọ bụrụ na Jehova akụnyewo n’ime gị olileanya ahụ a na-apụghị ịgọpụ agọpụ nke ndụ eluigwe, ị na-adabere na nke ahụ. Ị na-ekpe ekpere iji gosipụta olileanya ahụ. Ọ na-erikpu gị, ị pụghịkwa iwepụ ya site n’ahụ gị. Ị na-enwe ọchịchọ ime mmụọ ndị dị oké ike. Ma ọ bụrụ na obi esichaghị gị ike ma ọ bụ na i jichaghị n’aka, mgbe ahụ, o doro anya na i kwesịghị ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ nke Nri Anyasị Onyenwe anyị.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Echiche Ndị Na-ezighị Ezi?

Ụfọdụ ndị pụrụ ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi na ha ekwenyeghị n’ezie na otite mmanụ ‘adabereghị n’onye na-achọ ma ọ bụ n’onye na-agba ọsọ, kama ọ dabeere na Chineke.’ (Ndị Rom 9:16) Ọ bụghị ihe dịịrị mmadụ ahụ n’onwe ya ikpebi na ya ga-achọ ịbụ onye e webatara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, wee sorokwa Kraịst ketakọọ ihe n’Alaeze eluigwe ahụ. Ọ bụ nhọpụta nke Jehova bụ ihe dị mkpa. N’Israel oge ochie, ọ bụ Chineke na-ahọpụta ndị ga-eje ozi dị ka ndị nchụaja ya, o gbukwara Kora maka iji mpako chọọ ọkwá onye nchụaja, bụ́ nke Chineke debere n’ezinụlọ Erọn. (Ọpụpụ 28:1; Ọnụ Ọgụgụ 16:4-11, 31-35; 2 Ihe Emere 26:18; Ndị Hibru 5:4, 5) N’otu aka ahụ, ọ ga-ewute Jehova ma ọ bụrụ na mmadụ echee onwe ya n’ihu ya dị ka onye a kpọrọ iso ná ndị eze na ndị nchụaja eluigwe ahụ mgbe Chineke na-enyebeghị ya ọkpụkpọ dị otú ahụ.—Tụlee 1 Timoti 5:24, 25.

Mmadụ pụrụ iche n’ụzọ na-ezighị ezi na ya nwere ọkpụkpọ nke eluigwe n’ihi oké mkpali nke sitere n’oké ihe isi ike ndị o nweworo. Ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye mmadụ ma ọ bụ ihe ọdachi ọzọ pụrụ ime ka mmadụ tụfuo mmasị o nwere n’ịdị ndụ n’elu ala. Ma ọ bụkwanụ, onye ya na mmadụ na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya pụrụ ikwu na ya so ná ndị e tere mmanụ, onye ahụ wee chọọ ka ọ dịkwara ya otú ahụ. Ihe ndị ahụ pụrụ ime ka o chee na ndụ nke eluigwe dịịrị ya. Ma nke a abụghị ụzọ Chineke na-esi enye onye ọ bụla mmụọ nke ịbụ nwa. Ọ ga-egosi enweghị ekele maka nzube Chineke banyere elu ala ma ọ bụrụ na mmadụ achọọ ije eluigwe n’ihi ọnọdụ ndị na-adịghị mma ma ọ bụ ahụhụ nke mmetụta uche ndị e jikọrọ ha na ndụ elu ala.

Echiche okpukpe ndị mmadụ nwere na mbụ pụkwara ime ka mmadụ kwubie n’ụzọ na-ezighị ezi na ya nwere ọkpụkpọ nke eluigwe. Ma eleghị anya, ọ na-esobu okpukpe ụgha nke na-edebe ndụ eluigwe dị ka nanị olileanya dịịrị ndị kwesịrị ntụkwasị obi. N’ihi nke a, ọ dị mkpa ka onye Kraịst nọrọ na nche megide ịbụ onye mkpali na echiche ndị na-ezighị ezi e nweburu na mbụ megharịrị anya.

Ọ Dị Oké Mkpa Iji Nlezianya Mee Nnyocha

Pọl onyeozi mere ka otu isi ihe dị oké mkpa pụta ìhè mgbe o dere, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eri achicha ahụ ma ọ bụ ṅụọ iko ahụ nke Onyenwe anyị mgbe ọ na-ekwesịghị, ikpe ahụ na ọbara nke Onyenwe anyị ga-ama ya. Ma ka mmadụ nwapụta onwe ya, otú a ka o riekwa n’ime achicha ahụ, ṅụọkwa n’ime iko ahụ. N’ihi na onye na-eri na-aṅụkwa, ọ na-eri na-aṅụkwa ikpe nye onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ tụleghị ahụ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 11:27-29) N’ihi ya, onye Kraịst meworo baptism, onye malitere n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga na-eche na ya anatawo ọkpụkpọ eluigwe ahụ kwesịrị iji ekpere na nlezianya chebara okwu ahụ echiche nke ọma.

Onye dị otú ahụ pụkwara ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ̀ bụ ndị ọzọ kpaliri m ịmalite inwe echiche nke ndụ eluigwe?’ Nke a ga-abụ ihe na-ezighị ezi, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla Chineke nyere ọrụ ịkpọkọta ndị ọzọ maka ihe ùgwù dị otú ahụ. Inwekarị echiche nke ihe ndị na-adịghị adị n’ezie agaghị abụ ihe ngosipụta nke otite mmanụ site n’aka Chineke, ọ dịghị etekwa ndị nketa Alaeze mmanụ site n’ime ka ha na-anụ olu dị iche iche ndị na-ezi ha ozi banyere ya.

Ụfọdụ ndị pụrụ ịjụ onwe ha, sị: ‘Tupu m ghọọ onye Kraịst, m̀ tinyere aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ? Ọ̀ dị ọgwụ ndị m na-aṅụ ugbu a ndị na-emetụta mkpali echiche m? Ọ̀ dịwo mgbe m natara ọgwụgwọ n’ihi ọrịa uche ma ọ bụ nke mmetụta?’ Ụfọdụ ndị ekwuwo na ha bu ụzọ lụsoo ihe ha chere na ọ bụ olileanya nke eluigwe ahụ ọgụ. Ndị ọzọ ekwuwo na ruo ogologo oge ụfoḍụ, Chineke napụrụ ha olileanya nke elu ala ma mesịa nye ha nke eluigwe. Ma usoro ahụ megidere otú Chineke na-esi eme ihe. Karịsịa, okwukwe abụghị ihe a na-ejighị n’aka; ọ bụ ihe e ji n’aka.—Ndị Hibru 11:6.

Mmadụ pụkwara ịjụ onwe ya, sị: ‘Àna m achọ ịbụ onye a ma ama? Ènwere m oké ọchịchọ maka inwe ọnọdụ nke ịchị achị ugbu a ma ọ bụ dị ka otu n’ime ndị eze na ndị nchụaja ha na Kraịst ga-anọkọ?’ N’ime narị afọ mbụ O.A., mgbe ọkpụkpọ òkù ahụ ghere oghe nye mmadụ nile ịbụ ndị a nabatara n’Alaeze eluigwe ahụ, ọ bụghị ndị Kraịst nile e tere mmanụ jicha ọkwá ọrụ dị ka ndị so n’òtù na-achị isi ma ọ bụ dị ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị inyom, ha enweghịkwa ike ọ bụla pụrụ iche; ịbụ onye mmụọ ahụ tere mmanụ adịghị ewetakwa nghọta ọ bụla pụrụ iche nke Okwu Chineke, n’ihi na Pọl hụrụ na ọ dị mkpa inye ụfọdụ ndị e tere mmanụ ntụziaka na okwu ndụmọdụ. (1 Ndị Kọrint 3:1-3; Ndị Hibru 5:11-14) Ndị nwere ọkpụkpọ nke eluigwe adịghị ele onwe ha anya dị ka mmadụ ndị a ma ama, ha adịghị adọrọkwa uche ndị ọzọ bịa n’ebe ha nọ dị ka ndị e tere mmanụ. Kama nke ahụ, ha na-egosipụta obi dị umeala nke a tụrụ anya ya n’ụzọ ziri ezi n’aka ndị ahụ nwere “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Ha na-aghọtakwa na ndị Kraịst nile aghaghị imezu ụkpụrụ ezi omume ndị Chineke chọrọ ha n’aka, ma olileanya ha ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala.

Mmadụ ikwu na ya nwere ọkpụkpọ nke eluigwe adịghị ewetara onye ahụ mkpughe ndị pụrụ iche. Chineke nwere ụzọ nke o si na-enye nzukọ elu ala ya nri ime mmụọ. (Matiu 24:45-47) Ya mere, ọ dịghị onye kwesịrị iche na ịbụ onye Kraịst e tere mmanụ na-eme ka o nwee amamihe dị elu karịa nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ ndị nwere olileanya elu ala. (Mkpughe 7:9) Ịbụ onye dị irè n’ịgba àmà, ịza ajụjụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche nke ọma, ma ọ bụ ikwu okwu ndị dabeere na Bible abụghị ihe ndị na-egosi na mmadụ bụ onye e tere mmanụ, n’ihi na ndị Kraịst nwere olileanya elu ala na-emekwa nke ọma n’akụkụ ndị a. Dị ka ndị e tere mmanụ, ha na-adịkwa ndụ bụ ezi ihe nlereanya dị ka ndị Kraịst. E kwuwerị, Samsọn na ndị ọzọ dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst nwere mmụọ Chineke, ha jupụtakwara n’ịnụ ọkụ n’obi na nghọta. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ‘oké ìgwè ndịàmà’ ahụ nke nwere olileanya eluigwe.—Ndị Hibru 11:32-38; 12:1; Ọpụpụ 35:30, 31; Ndị Ikpe 14:6, 19; 15:14; 1 Samuel 16:13; Ezikiel 2:2.

Cheta Onye Na-eme Nhọrọ ahụ

Ọ bụrụ na onye kwere ekwe ajụọ ajụjụ banyere ọkpụkpọ eluigwe ahụ, onye okenye a họpụtara ahọpụta ma ọ bụ onye Kraịst ọzọ tozuru okè pụrụ iso ya tụlee okwu ahụ. Ma otu onye apụghị imere onye ọzọ mkpebi nke a, ọ bụkwa Jehova na-akụnye olileanya eluigwe ahụ n’ime mmadụ. Ọ dịghị mkpa ka mmadụ nke nwere ọkpụkpọ eluigwe ahụ n’ezie jụọ ndị Kraịst ma yà nwere olileanya dị otú ahụ. Ndị e tere mmanụ bụ ‘ndị a mụworo ọzọ, n’abụghị site ná mkpụrụ pụrụ imebi emebi, kama site na nke a na-apụghị imebi emebi, site n’okwu Chineke, nke dị ndụ, nke na-adịgidekwa adịgide.’ (1 Pita 1:23) Site ná mmụọ na Okwu ya, Chineke na-akụnye “mkpụrụ” ahụ nke na-eme ka onye ahụ ghọọ “onye e kere ọhụrụ,” nke nwere olileanya eluigwe. (2 Ndị Kọrint 5:17) Ee, ọ bụ Jehova na-eme nhọrọ ahụ.

Ya mere, mgbe a na-eduziri ndị ọhụrụ ọmụmụ Bible, ọ dịghị mma ịgwa ha ka ha gbalịa ikpebi ma hà nwere ọkpụkpọ eluigwe ahụ. Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye Kraịst e tere mmanụ aghọọ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, o wee dị mkpa idochi anya ya? Mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị n’ime ya ikwubi na Chineke ga-ewere ọkpụkpọ eluigwe ahụ nye onye nke gosiworo ezi ihe nlereanya n’ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi nye Nna anyị nke eluigwe ruo ọtụtụ afọ.

Taa, ihe bụ isi n’ozi Chineke abụghị ka ndị mmadụ ghọọ ndị òtù nke nwanyị eluigwe ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ. Kama nke ahụ, “mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ [na-asị], Bịa.” Nke a bụ ọkpụkpọ òkù maka ịdị ndụ n’ime paradaịs elu ala. (Mkpughe 22:1, 2, 17) Ka ndị ahụ e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’ọrụ nke a, ha na-egosipụta “obi dị umeala,” na-arụkwa ọrụ ‘iji mee ka ọkpụkpọ na nhọpụta ha na-eguzosi ike.’—Ndị Efesọs 4:1-3; 2 Pita 1:5-11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya