Inwe Onwe Dị Ebube n’Isi Nso Maka Ụmụ Chineke
“E doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu . . . n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—NDỊ ROM 8:20, 21.
1. Olee otú e si mee ihe atụ àjà Jisọs n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie?
JEHOVA nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya dị ka àjà mgbapụta nke na-emeghe ụzọ gaa ná ndụ eluigwe maka mmadụ 144,000 nakwa olileanya ebighị ebi n’elu ala maka ihe a kpọrọ mmadụ ndị ọzọ. (1 Jọn 2:1, 2) Dị ka a rịbara ama n’isiokwu bu nke a ụzọ, àjà Jisọs maka ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta bụ nke e mere ihe atụ ya mgbe onyeisi nchụàjà Israel na-achụ otu oké ehi n’àjà dị ka àjà mmehie maka onwe ya, ezinụlọ ya, na ebo Livaị n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ. N’otu ụbọchị ahụ, ọ chụrụ ewu n’àjà dị ka àjà mmehie maka ndị Israel ndị ọzọ nile, ọbụna dị ka àjà Kraịst ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya uru. N’ụzọ ihe atụ ewu dị ndụ na-ebufu mmehie nile nke ndị mmadụ nke afọ gara aga, na-efunyụ anya n’ọzara.a—Levitikọs 16:7-15, 20-22, 26.
2, 3. Gịnị ka e bu n’uche n’okwu Pọl e dekọrọ ná Ndị Rom 8:20, 21?
2 Mgbe o kwupụtasịrị olileanya nke ndị mmadụ ga-aghọ “ụmụ ndị ikom Chineke” n’eluigwe, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Olileanya siri ike nke ihe nile e kere eke na-echesi mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke ike. N’ihi na e doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi Onye ahụ Nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:14, 17, 19-21) Gịnị ka okwu a pụtara?
3 Mgbe e kere nna nna anyị bụ́ Adam dị ka mmadụ zuru okè, ọ bụ “nwa Chineke.” (Luk 3:38) N’ihi ime mmehie, ọ banyere ‘n’ịbụ ohu mmebi’ ma bufeere agbụrụ mmadụ ọnọdụ a. (Ndị Rom 5:12) Chineke kwere ka a mụọ ụmụ mmadụ ịbụ ndị “ihe efu” na-eche ihu n’ihi ezughị okè ha e ketara eketa, ma o nyere olileanya site ná “mkpụrụ” ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jenesis 3:15; 22:18; Ndị Galetia 3:16) Mkpughe 21:1-4 na-arụtụ aka n’oge mgbe ‘ọnwụ, iru újú, ịkwa ákwá, na ahụ mgbu na-agaghị adịkwa ọzọ.’ Ebe nke a bụ nkwa e kwere “ihe a kpọrọ mmadụ,” ọ na-emesi anyị obi ike na ọha mmadụ ọhụrụ n’elu ala bụ́ ndị na-ebi n’okpuru ọchịchị Alaeze ga-enweta mweghachi nke uche na ahụ gaa n’ezigbo ahụ ike na ndụ ebighị ebi dị ka “ụmụ Chineke” nke elu ala. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ụmụ mmadụ na-erube isi ‘ga-apụ n’ịbụ ohu mmebi.’ Mgbe ha guzosiri ike n’ihe nye Jehova n’oge ule ikpeazụ, a ga-eme ka ha pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ e ketara eketa ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 20:7-10) Ndị nọ n’elu ala ga-enwezi ‘ọnọdụ inwe onwe nke ebube ụmụ Chineke.’
Ha Na-asị “Bịa”
4. Gịnị ka ‘ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu’ pụtara?
4 Lee olileanya magburu onwe ya e setịpụrụ n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ! Ka a sịkwa ihe mere na ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta ka nọ n’elu ala ji ịnụ ọkụ n’obi na-ebute ụzọ n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya! Dị ka ndị ga-aghọ akụkụ nke “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” nke Nwa Atụrụ ahụ e meworo ka ọ dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ so ná mmezu nke okwu amụmụ ndị a: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 21:2, 9; 22:1, 2, 17) Ee e, uru nke àjà mgbapụta Jisọs adịghịrị nanị 144,000 ahụ e tere mmanụ. Mmụọ Chineke na-anọgide na-arụ ọrụ site ná ndị fọdụrụnụ n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nọ n’elu ala n’ịsị “Bịa.” A na-akpọ onye ọ bụla na-anụ ya bụ́ onye akpịrị ezi omume na-akpọ nkụ òkù ka ọ na-asị “Bịa,” na-eji ndokwa dị ukwuu nke Jehova mere maka nzọpụta na-eme ihe.
5. Ndị ole ka Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ inwe n’etiti ha?
5 Ndịàmà Jehova nwere okwukwe ná ndokwa Chineke maka ndụ site na Jisọs Kraịst. (Ọrụ 4:12) Obi dị ha ụtọ inwe n’etiti ha ndị obi ha ziri ezi bụ́ ndị na-achọ ịmụ banyere nzube Chineke ma mee uche ya. Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ghere oghe nye ndị nile chọrọ ‘ịbịa nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu’ na “mgbe ọgwụgwụ” a.—Daniel 12:4.
Mgbanwe Ka Oge Na-agafe
6. Olee otú mmụọ Chineke siworo rụọ ọrụ n’ahụ ndị ohu Jehova n’oge dị iche iche?
6 Chineke nwere oge ọ ga-eji mezuo nzube ya, nke a na-emetụtakwa mmeso ọ na-emeso ụmụ mmadụ. (Eklisiastis 3:1; Ọrụ 1:7) Ọ bụ ezie na mmụọ Chineke bịakwasịrị ndị ohu ya biri tupu oge ndị Kraịst, a mụghị ha dị ka ụmụ ime mmụọ ya. Otú ọ dị, na-amalite na Jisọs, oge Jehova abịawo ijiri mmụọ nsọ mụta ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye gaa ná nketa eluigwe. Gịnịkwa banyere oge anyị? Otu mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ‘n’atụrụ ọzọ’ nke Jisọs, ma ọ dịghị akpali n’ime ha olileanya na ọchịchọ maka ndụ eluigwe. (Jọn 10:16) N’inwe ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs dị ka olileanya Chineke nyeworo ha, ha ji ọṅụ na-akwado ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’ịgba àmà n’oge a a ga-esite n’ụwa ochie gafee n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.—2 Pita 3:5-13.
7. Olee ọrụ owuwe ihe ubi Ndị Mmụta Bible rụrụ, ma gịnị ka ha maara banyere paradaịs?
7 Chineke malitere ‘ikubata ọtụtụ ụmụ ndị ikom n’ebube’ site n’ịwụpụ mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., o dokwara anya na o setịpụrụ oge maka ịkpọzu “Israel nke Chineke” ime mmụọ dị 144,000 ná ngụkọta. (Ndị Hibru 2:10; Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 7:1-8) Malite na 1879, mgbe mgbe e kwuru ihe banyere ọrụ owuwe ihe ubi metụtara ndị Kraịst e tere mmanụ na magazin a. Ma Ndị Mmụta Bible (ndị a na-akpọ ugbu a Ndịàmà Jehova) makwaara na Akwụkwọ Nsọ na-esetịpụ olileanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs. Dị ka ihe atụ, mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke July 1883 sịrị: “Mgbe Jisọs guzobesịrị alaeze ya, kee ihe ọjọọ agbụ, meekwa ihe ndị ọzọ, ụwa a ga-aghọ paradaịs, . . . ndị nile nọkwa n’ili ha ga-abata n’ime ya. Sitekwa n’irube isi n’iwu ya ha pụrụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime ya.” Ka oge na-agafe, iwe ndị ahụ e tere mmanụ n’ubi dalatara, nke nta nke nta kwa e were ndị na-enweghị olileanya eluigwe n’ubi baa ná nzukọ Jehova. Ka ọ dị mgbe ahụ, Chineke nyere ndị ohu ya e tere mmanụ, ndị Kraịst a mụrụ ọzọ, nghọta dị ịrịba ama.—Daniel 12:3; Ndị Filipaị 2:15; Mkpughe 14:15, 16.
8. Olee otú nghọta nke olileanya elu ala si bilite ná mmalite nke afọ ndị 1930?
8 Ọ bụ karịsịa kemgbe 1931 ka ndị ahụ nwere olileanya elu ala soworo ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta. N’afọ ahụ, Jehova nyere ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta nghọta ịhụ na Ezikiel isi nke 9 na-ezo aka n’òtù elu ala nke a, bụ́ ndị a na-aka akara maka nlanarị baa n’ụwa ọhụrụ Chineke. Na 1932 e kwubiri na enyi Jihu bụ́ Jonadab (Jehonadab) bụ ihe atụ ndị dị otú ahụ yiri atụrụ n’oge a. (2 Ndị Eze 10:15-17) Na 1934 e mere ka o doo anya na “ndị Jonadab” kwesịrị “ido,” ma ọ bụ ịrara, onwe ha nye Chineke. Na 1935 a matara “oké ìgwè mmadụ”—ndị e chebu na ha bụ ndị òtù ime mmụọ nke abụọ ndị ga-abụ “ndị enyi” nwanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ n’eluigwe—dị ka atụrụ ọzọ nwere olileanya elu ala. (Mkpughe 7:4-15; 21:2, 9; Abụ Ọma 45:14, 15) Ọ bụkwa karịsịa kemgbe 1935 ka ndị ahụ e tere mmanụ nọworo na-ebute ụzọ n’ọchịchọ a na-achọ ndị ziri ezi ọ na-agụsi ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.
9. Mgbe 1935 gasịrị, n’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst ji kwụsị ikere òkè n’ihe nnọchianya ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
9 Mgbe 1935 gasịrị ụfọdụ ndị Kraịst nọworo na-ekere òkè n’achịcha na mmanya ná Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kwụsịrị ikere òkè. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ghọtara na olileanya ha bụ nke elu ala, ọ bụghị nke eluigwe. Otu nwanyị e mere baptism na 1930 sịrị: “Ọ bụ ezie na e lere [ikere òkè] anya dị ka ihe ziri ezi ime, karịsịa maka ndị ozi oge nile na-anụ ọkụ n’obi, ọ dịghị mgbe obi siri m ike na m nwere olileanya eluigwe. Mgbe ahụ, na 1935, e mere ka o doo anyị anya na a na-achịkọta oké ìgwè mmadụ nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ọtụtụ n’ime anyị ṅụrịrị ọṅụ ịghọta na anyị bụ akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ, anyị kwụsịkwara ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ.” Ọbụna mbipụta ndị Kraịst gbanwere ọdịdị ha. Ebe e mere ndị nke afọ ndị gara aga n’ụzọ bụ isi maka ụmụazụ Jisọs e ji mmụọ nsọ mụta, malite na 1935 gaa n’ihu Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” nyere nri ime mmụọ kwesịrị mkpa nke ma ndị e tere mmanụ ma ndị enyi ha nwere olileanya elu ala.—Matiu 24:45-47.
10. Olee otú a pụrụ isi dochie onye e tere mmanụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi?
10 Were ya na otu onye e tere mmanụ ghọrọ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi. À ga-edochi ya? Pọl gosiri ihe dị otú ahụ n’okwu ya banyere osisi olive ihe atụ ahụ. (Ndị Rom 11:11-32) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e dochie onye e ji mmụọ nsọ mụta, o yikarịrị ka Chineke ọ ga-enye onye okwukwe ya bụworo ihe nlereanya n’ijere ya ozi dị nsọ ruo ọtụtụ afọ ọkpụkpọ eluigwe ahụ.—Tụlee Luk 22:28, 29; 1 Pita 1:6, 7.
Ọtụtụ Ihe Mere A Ga-eji Nwee Ekele
11. N’agbanyeghị ihe bụ olileanya anyị, banyere gịnị ka Jemes 1:17 na-emesi anyị obi ike?
11 Ebe ọ bụla anyị nọ na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, ọ ga-egbo mkpa na ọchịchọ anyị ndị ziri ezi. (Abụ Ọma 145:16; Luk 1:67-74) Ma anyị nwere ezi olileanya eluigwe ma olileanya anyị ọ̀ bụ nke elu ala, anyị nwere ọtụtụ ihe dị mma mere anyị ga-eji ekele Chineke. Ọ na-eme ihe maka ọdịmma kasị mma nke ndị nile hụrụ ya n’anya mgbe nile. Jemes onye na-eso ụzọ sịrị na “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye si n’elu bịa, ebe o si n’aka Nna nke ìhè rịdata,” bụ́ Jehova Chineke. (Jemes 1:17) Ka anyị rịba ama ole na ole n’ime onyinye na ngọzi ndị a.
12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova enyewo nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi olileanya magburu onwe ya?
12 Jehova enyewo nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi olileanya magburu onwe ya. Ọ kpọwo ụfọdụ gaa ná ndụ eluigwe. Nye ndị àmà ya biri tupu oge ndị Kraịst, Jehova nyere olileanya dị mma nke mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ ebighị ebi n’elu ala. Dị ka ihe atụ, Abraham nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ ma na-ele anya “obodo ahụ nke nwere ntọala”—Alaeze eluigwe bụ́ nke a ga-anọ n’okpuru ya kpọlite ya n’ọnwụ gaa ná ndụ elu ala. (Ndị Hibru 11:10, 17-19) Ọzọkwa, na mgbe ọgwụgwụ a, Chineke na-enye ọtụtụ nde olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43; Jọn 17:3) N’ezie, onye ọ bụla Jehova nyeworo ụdị olileanya ahụ dị ebube kwesịrị inwe ekele dị ukwuu maka ya.
13. Olee otú mmụọ nsọ Chineke siworo rụọ ọrụ n’ahụ ndị ya?
13 Jehova na-enye ndị ya mmụọ nsọ ya dị ka onyinye. E ji mmụọ nsọ tee ndị Kraịst e nyere olileanya eluigwe mmanụ. (1 Jọn 2:20; 5:1-4, 18) Ma, ndị ohu Chineke nwere olileanya elu ala nwere enyemaka na nduzi mmụọ nsọ ahụ. N’ime ndị a bụ Mosis, onye nwere mmụọ Jehova, dị ka ndị ikom 70 ahụ a họpụtara inyere ya aka nwere. (Ọnụ Ọgụgụ 11:24, 25) N’okpuru ike mmụọ nsọ, Bezalel jere ozi dị ka ezi onye ọkà n’ihe metụtara ụlọikwuu Israel. (Ọpụpụ 31:1-11) Mmụọ Chineke bịakwasịrị Gideọn, Jefta, Samson, Devid, Elaịja, Elaịsha, na ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na a gaghị ekubata ndị oge gboo a n’ebube eluigwe ma ọlị, mmụọ nsọ duziri ma nyere ha aka, dị ka a na-eme atụrụ ọzọ nke Jisọs taa. Ya mere, inwe mmụọ Chineke apụtachaghị na anyị nwere ọkpụkpọ eluigwe. Ma, mmụọ Jehova na-enye nduzi, na-enyere anyị aka ime nkwusa na ịrụzu ọrụ ndị ọzọ Chineke nyere, na-enye anyị ọkịka nke ike, na-amịpụtakwa n’ime anyị mkpụrụ ya nke ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. (Jọn 16:13; Ọrụ 1:8; 2 Ndị Kọrint 4:7-10; Ndị Galetia 5:22, 23) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ekele maka onyinye ọma a sitere n’aka Chineke?
14. Olee otú anyị si erite uru site n’onyinye ihe ọmụma na amamihe nke Chineke?
14 Ihe ọmụma na amamihe bụcha onyinye sitere n’aka Chineke ndị anyị kwesịrị iji maka ha nwee ekele, ma olileanya anyị ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala. Ezi ihe ọmụma nke Jehova na-enyere anyị aka ‘ịnwa ihe ha na ibe ha dị iche’ na ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.’ (Ndị Filipaị 1:9-11; Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Amamihe Chineke na-eje ozi dị ka ihe nchebe na ihe nduzi ná ndụ. (Ilu 4:5-7; Eklisiastis 7:12) Ezi ihe ọmụma na amamihe dabeere n’Okwu Chineke, a na-adọtakwa ole na ole ndị e tere mmanụ fọdụrụnụ karịsịa n’ihe ọ na-ekwu banyere olileanya eluigwe ha. Otú ọ dị, ịhụnanya maka Okwu Chineke na ezi nghọta ya abụghị ụzọ Chineke si egosi na a kpọwo anyị gaa ná ndụ eluigwe. Ndị ikom dị ka Mosis na Daniel ọbụna dere akụkụ ụfọdụ nke Bible, ma a ga-akpọlite ha n’ọnwụ gaa ná ndụ n’elu ala. Ma olileanya anyị ọ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, anyị nile na-anata nri ime mmụọ site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke Jehova kwadoro. (Matiu 24:45-47) Lee ka anyị nile si nwee ekele maka ihe ọmụma anyị siworo otú a nweta!
15. Gịnị bụ otu n’ime onyinye ndị kasị ukwuu nke Chineke, oleekwa otú i si ele ya anya?
15 Otu n’ime onyinye kasị ukwuu nke Chineke bụ ndokwa ịhụnanya nke àjà mgbapụta Jisọs, nke na-abara anyị uru ma anyị nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ olileanya elu ala. Chineke hụrụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ n’anya “otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ịhụnanya Jisọs kpalikwara ya ‘iwere ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Dị ka Jọn onyeozi kọwara, Jisọs Kraịst “bụkwa ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie nile anyị [ndị nke ndị e tere mmanụ]; ma Ọ bụghị ihe ịjụrụ Ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama Ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) N’ihi ya, anyị nile kwesịrị inwe ekele dị ukwuu maka ndokwa ịhụnanya a maka nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi.b
Ị̀ Ga-anọ Ya?
16. Olee ihe omume dị ịrịba ama a ga-echeta mgbe anyanwụ dasịrị n’April 11, 1998, ndị olekwa kwesịrị ịnọ ya?
16 Ekele maka ihe mgbapụta nke Chineke nyere site n’Ọkpara ya kwesịrị ịkpali anyị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ndị ọzọ Ndịàmà Jehova ga-ezukọ mgbe anyanwụ dasịrị n’April 11, 1998, iji mee Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Mgbe o so ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi guzobe ememe a n’abalị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya, Jisọs sịrị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19, 20; Matiu 26:26-30) Ole na ole ndị e tere mmanụ fọdụrụnụ ga-ekere òkè n’achịcha na-ekoghị eko, nke na-anọchite anya ahụ mmadụ na-enweghị mmehie nke Jisọs, na mmanya uhie a na-agwaghị ihe ọ bụla, nke na-anọchi anya ọbara ya ọ wụsịrị n’àjà. Nanị ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụta kwesịrị ikere òkè n’ihi na nanị ha nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa n’ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ, nweekwa ihe àmà na-enweghị ngọpụ nke mmụọ nsọ Chineke na olileanya ha bụ nke eluigwe. Ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-anọ ya dị ka ndị ji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-emenụ bụ́ ndị nwere ekele maka ịhụnanya Chineke na Kraịst gosiworo n’ihe metụtara àjà Jisọs nke na-eme ka ndụ ebighị ebi kwee omume.—Ndị Rom 6:23.
17. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere iji mmụọ nsọ ete mmanụ?
17 Echiche okpukpe ndị e nweburu, mmetụta uche siri ike nke na-esite n’ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, ihe isi ike nke ya na ndụ elu ala na-eso, ma ọ bụ mmetụta nke ịbụ onye nwetaworo ụfọdụ ngọzi pụrụ iche site n’aka Jehova pụrụ iduje ndị ụfọdụ iche n’ụzọ hiere ụzọ na ndụ eluigwe bụ maka ha. Ma anyị nile kwesịrị icheta na Akwụkwọ Nsọ adịghị enye anyị iwu ka anyị kere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta iji gosi ekele anyị maka àjà mgbapụta Kraịst. Ọzọkwa, ịbụ onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ‘abụghị nke onye na-achọ, ọ bụghịkwa nke onye na-agba ọsọ, kama ọ bụ nke Chineke,’ Onye ahụ mụtara Jisọs dị ka Ọkpara ime mmụọ nakwa onye na-ekubata nanị ụmụ ndị ikom 144,000 ọzọ n’ebube.—Ndị Rom 9:16; Aịsaịa 64:8.
18. Maka ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ejere Jehova ozi taa, olee ngọzi ndị na-abịa n’ihu?
18 Ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs bụ olileanya nke Chineke na-enye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ mmadụ na-ejere Jehova ozi na mgbe ikpeazụ a. (2 Timoti 3:1-5) N’isi nso, ha ga-enweta paradaịs a magburu onwe ya. Mgbe ahụ ndị isi ga-eduzi ihe omume elu ala n’okpuru ọchịchị eluigwe. (Abụ Ọma 45:16) Ọnọdụ udo ga-adị ka ndị bi n’elu ala na-eme ihe kwekọrọ n’iwu Chineke ma na-amụtakwu ihe banyere ụzọ Jehova. (Aịsaịa 9:6, 7; Mkpughe 20:12) A ga-enwe ọtụtụ ọrụ a ga-arụ, na-ewu ebe obibi ma na-ebuda ụwa n’okpuru mmadụ. (Aịsaịa 65:17-25) Cheekwa banyere njikọghachi obi ụtọ nke ezinụlọ ka ndị nwụrụ anwụ na-alọghachi ná ndụ! (Jọn 5:28, 29) Mgbe ule ikpeazụ gasịrị, ajọ omume nile ga-agwụsị. (Mkpughe 20:7-10) Ruo mgbe ebighị ebi ma nke ahụ gasịa, ụwa ga-ejupụta n’ụmụ mmadụ zuru okè bụ́ ndị ‘ga-apụ n’ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke.’
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 225-226.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ka ‘ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu’ pụtara?
◻ Ma olileanya anyị ọ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, n’ihi ihe ndị dị aṅaa ka anyị ga-eji nye Chineke ekele?
◻ Ememe dị aṅaa a na-eme kwa afọ ka anyị nile kwesịrị ịga?
◻ Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị Jehova, gịnị ka ọdịnihu ga-eweta?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọtụtụ nde amalitewo ‘ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ Ì so n’ime ha?