Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/1 p. 8-13
  • Ugbu A Bụ Oge Ịchọ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ugbu A Bụ Oge Ịchọ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị ahụ Enyemaka Dị Mkpa
  • Oge Maka Ịnụ Ọkụ n’Obi na Ịrụsi Ọrụ Ike
  • Enyemaka Dị Aṅaa A Hụrụ Anya Ka Anyị Pụrụ Inye?
  • Jehova Ruru Eru Ka A Chọọ Ya
  • Ị̀ Na-ajụ, Sị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Otú Jehova Si Abịaru Anyị Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Jehova Na-eche Banyere Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ịdị n’Otu nke Ofufe n’Oge Anyị—Gịnị Ka Ọ Pụtara?
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/1 p. 8-13

Ugbu A Bụ Oge Ịchọ Jehova

“Jehova siri n’eluigwe lekwasị ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ̀ dị onye nwere uche, nke na-achọ Chineke [“Jehova,” NW].”—ABỤ ỌMA 14:2.

1, 2. (a) Olee ụzọ ọtụtụ ndị na-esi ele ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, anya? (b) Olee ụzọ anyị si mara na Jehova maara banyere enweghị mmasị nke ihe a kpọrọ mmadụ?

TAA, ndị na-ekwenyeghị na Chineke, ndị na-amaghị ma è nwere Chineke dịnụ, ndị na-efe chi ụgha dị iche iche, na ọtụtụ nde ndị na-ekwu na ha kwere na Chineke ma na-agọnarị ya site n’ọrụ ha, ajụwo ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. (Taịtọs 1:16) Ọtụtụ ndị kweere ihe ahụ onye Germany ahụ bụ ọkà ihe ọmụma na narị afọ nke 19 bụ Nietzsche kwuru na “Chineke anwụwo.” Ọ̀ bụ na Jehova amaghị banyere oké enweghị mmasị nke a? Ee e, n’ihi na mmụọ ya kpaliri Devid ide, sị: “Onye nzuzu asịwo n’obi ya, Ọ dịghị Chineke [“Jehova,” NW] ọ bụla dị. Ha ebibiwo onwe ha, ha emewo ka omume ha bụrụ ihe arụ; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe.”—Abụ Ọma 14:1.

2 Devid gara n’ihu, sị: “Jehova siri n’eluigwe lekwasị ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ̀ dị onye nwere uche, nke na-achọ Chineke [“Jehova,” NW].” Ee, Eze Onyenwe anyị maara banyere ndị ahụ na-achọ ịmara ya na ijere ya ozi. Otú a, anyị ịchọsi ya ike ugbu a dị oké mkpa. Ọ ga-akpata ọdịiche dị n’etiti ndụ ebighị ebi na mkpochapụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 14:2; Matiu 25:41, 46; Ndị Hibru 11:6.

3. Ohere dị aṅaa ka e nwere maka ọdịnihu?

3 Ya mere, anyị pụrụ ịhụ ihe mere o ji dị mkpa otú a na anyị ga-enyere ndị ọzọ aka ịchọ Jehova ugbu a. E nwere ọtụtụ ndị mmadụ ndị na-ahụtụbeghị otu n’ime Ndịàmà Jehova ma ọ bụkwanụ nụ ‘ozi ọma alaeze ahụ.’ Anyị amaghịkwa ihe ga-emesịa bụrụ ọnụ ọgụgụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ tupu “oké mkpagbu” ahụ abịa. Ma n’ezie, e nwere ohere nke na ọtụtụ ndị ọzọ ga-achọ ma chọta Jehova Chineke n’ọdịnihu na-adịghị anya tupu oge agabiga. Ajụjụ e nwere ugbu a bụ, Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịchọta Chineke?—Matiu 24:14; Mkpughe 7:9, 14.

4, 5. N’ọchịchọ ha na-achọ inwe chi, gịnị na-amasị ọtụtụ ndị karị?

4 Ọtụtụ ndị bi n’ụwa taa na-achọgharị ihe, ma gịnị ka ha na-achọ? Ọ bụ nanị ole na ole na-achọ otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Ọ na-akara ọtụtụ ndị mma inwe chi nke kwekọrọ n’ọchịchọ nile na echiche nile na-ezighị ezi nke onwe ha. Otu onye ọkà n’ịjụta echiche ọha mmadụ ná mba U.S., bụ́ George Gallup, Jr., kwuru, sị: “Ị dịghị ahụkebe ọdịiche dị n’etiti ndị na-eje chọọchị na ndị na-adịghị eje chọọchị n’ihe banyere ịghọ aghụghọ, izere ịkwụ ụtụ isi, na izu ohi, karịsịa n’ihi na e nwere ọtụtụ okpukpe ndị dabeere n’echiche ọha mmadụ.” O kwukwara na “ihe ọtụtụ ndị na-eme bụ nanị iguzobe okpukpe nke ga-enye ha ntụsara ahụ, na-enyekwa ha mkpali na-atọ ụtọ . . . Otu onye kpọrọ ya okpukpe nke onye ọ bụla ga-ahọrọ nke masịrị ya.”

5 Ndị ọzọ ga-asị, “Okpukpe m dị m mma.” Ma n’ezie, ajụjụ ahụ kwesịrị ịbụ, “Okpukpe m ọ̀ dị Chineke mma?” N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na Krisendọm na okpukpe Hindu nwere afọ ojuju n’ife ihe oyiyi na arụsị ha dị iche iche ofufe. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akpọ onwe ha ndị Kristian na-ewere chi Atọ n’Ime Otu nke na-enweghị aha dị ka nke zuuru ha. Ihe karịkwara 900 nde ndị Alakụba kweere n’Allah. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị na-ekweghị na Chineke na-ekwu na e nweghị Chineke dịnụ.

Ndị ahụ Enyemaka Dị Mkpa

6. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-agụ Ụlọ Nche chọpụtaworo?

6 Ma gịnị banyere ndị ahụ n’ime anyị, bụ́ ndị na-agụchi magazin nke a anya? Anyị achọwo ezi Chineke ahụ, anyị achọtawokwa ya. Anyị egosiwo na okwu e kwuru na Jemes 4:8 bụ eziokwu, nke na-asị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nsọ.” Site n’isoro ọgbakọ ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike, anyị abịaruwo Chineke nso, anyị enwewokwa ahụmahụ n’onwe anyị nke otú Jehova si na-abịaru anyị nso.—Jọn 6:44, 65.

7. Ànyị si aṅaa mara na e nwere ọtụtụ ndị ka nwere mmasị ịghọ ndị na-arụsi ọrụ ike n’eziokwu ahụ?

7 Otú ọ dị, anyị maara na a ka nwere ọtụtụ ndị ọ na-amasị isonyere Ndịàmà Jehova site n’oge ruo n’oge, ma ka ọ dị ugbu a, ha emebeghị ihe a hụrụ anya iji bịaruo Jehova nso site n’ịrara onwe ha nye ya na ime baptism. Olee otú anyị si mara nke a? Na 1990, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ iri bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs. Ma ọ̀ bụ mmadụ ole n’ezie na-arụsi ọrụ ike n’ịkpọsa ozi ọma Alaeze ahụ? Ọ bụ ihe ji nanị nke nta karịa nde mmadụ anọ. Nke a pụtara na anyị nwere ihe dị ka nde mmadụ isii bụ ndị enyi nke eziokwu ahụ, ndị na-enwe mmasị isonyere anyị mgbe ụfọdụ, ma ha amalitebeghị ịkọrọ ndị ọzọ abamuru nke asụsụ ahụ dị ọcha nke eziokwu site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na n’oge ụfọdụ o mere ndapụta, ọtụtụ na-ekwu okwu iji kwadoo Jehova na ọchịchị Alaeze ya. Otú ọ dị, ha emebeghị ka a mara ha nke ọma dị ka Ndịàmà Jehova. Anyị chọkwara inyere ndị a aka.—Zefanaịa 3:9; Mak 13:10.

8, 9. (a) Gịnị ka Jehova na-agba anyị ume ime? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe na-adịghị na ya ilefuru ndụmọdụ Jehova anya?

8 Anyị chọrọ ịgba ndị a ume ka ha ghọọ Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ, ndị na-arụsi ọrụ ike n’akụkụ ikpeazụ nke oké ọrụ ahụ a na-arụzu ugbu a gburugburu ụwa. Biko rịba ama òkù Jehova ji ịhụnanya na-akpọ n’Ilu 1:23, sị: “Laghachinụ n’ịba mba m: lee, m ga-awụpụrụ unu mmụọ m, m ga-eme ka unu mara okwu m nile.” (Tụlee Jọn 4:14.) Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịmara na Jehova ga-azaghachi ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị pụtara ìhè ịbụ ndị e jiri aha ya na ofufe ya mara! N’ezie, anyị achọghị ka a gụnyekọọ anyị n’etiti ndị ahụ a kọwara n’Ilu 1:24, 25, sị: “Akpọwo m òkù, unu wee jụ; esetịpụwo m aka m, ma ọ dịghị onye na-aṅa ntị; unu wee wezụga ndụmọdụ m nile, unu achọghịkwa ịba mba m.”

9 Ndị ahụ na-elefuru ndụmọdụ Jehova anya, bụ́ ka ha chọọ ya mgbe ha ka pụrụ ịchọta ya, ndị na-echere ime mkpebi nanị mgbe ha hụrụ mkpagbu ukwu ahụ ka ọ na-amalite ga-achọpụta na oge aganarịwo ha. Ịgbaso ụzọ dị otú ahụ ga-egosipụta enweghị okwukwe na amamihe, ọ ga-abụkwa ejighị obi ebere na-erughịrị mmadụ nke Jehova na-egosi kpọrọ ihe.—2 Ndị Kọrint 6:1, 2.

10. N’ihi gịnị ka enweghị mmasị na inwe omume nke onye ihe na-emetụtaghị ji bụrụ ihe ize ndụ?

10 Iji mee ihe atụ mkpa ọ dị ime ihe ozugbo, ị̀ ga-agbaso ezi aro onye dọkịta tụrụ nanị mgbe oyi banyesịworo gị n’ahụ? Ka ọ̀ bụ mgbe i nwetara ihe àmà mbụ nke ọrịa? Ya bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka i ji nọgide na-egbu oge ikewapụ onwe gị site n’ụwa Setan nke nọ n’ọrịa ma sonyere Jehova na Ndịàmà ya? E mere ka ihe enweghị mmasị, omume nke onye ihe na-emetụtaghị na nlefuru anya, ga-arụpụta pụta ìhè n’Ilu 1:26-29, sị: “Mụ onwe m kwa, ná nhụjuanya unu m ga-achị ọchị; m ga-akwa emo mgbe oké egwu unu na-abịa; . . . mgbe ahụ ka ha ga-akpọku m, ma m gaghị aza; ha ga-achọsi m ike, ma ha agaghị achọta m: n’ihi na ha kpọrọ ihe ọmụma asị, na n’ihi na ọ bụghị egwu Jehova ka ha họpụtara.” Ya bụrụkwa na a gaghị achọta anyị dị ka ndị ‘na-achọ Jehova’ mgbe oge gabigasịworo!

11. Enyemaka dị aṅaa dịịrị ndị ahụ na-achọ ijere Chineke ozi?

11 Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị na-agụ magazin nke a ka nọ na-achọ ezi Chineke ahụ. Obi dị anyị ụtọ na unu anọgidewo n’ọchịchọ ahụ unu na-achọ. Ekpere anyị bụ ka ihe ọmụma Bible unu kpalie unu imekwu ihe pụtara ìhè iji guzosie ike n’akụkụ nke eziokwu ahụ. Jide n’aka na ọgbakọ ọ bụla nke Ndịàmà Jehova dị njikere inyere gị aka n’ọchịchọ ị na-achọ.—Ndị Filipaị 2:1-4.

Oge Maka Ịnụ Ọkụ n’Obi na Ịrụsi Ọrụ Ike

12, 13. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mee ihe banyere ezi ofufe?

12 N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nile mee ihe iji bụrụ ndị a maara dị ka ndị nọ n’akụkụ Jehova Chineke na ezi ofufe ya? N’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa na-eru ọgwụgwụ ha. Ihe akụkọ ndị na-emenụ na-eme oké ngwa ngwa nke na mmadụ apụghị ịghọta ha. Ugbu a abụghị oge ịnọ n’etiti ụzọ abụọ ma ọ bụ ịdị ṅaraṅara. Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Onye na-adịghị n’akụkụ m na-emegide m; onye na-adịghị esokwa m ikpokọta ihe na-achụsa achụsa.” O kwukwara, sị: “Onye ọ bụla ihere mụ onwe m na okwu m nile ga-eme, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ, mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke aka ya, na ebube nke Nna ya, na ebube nke ndị mmụọ ozi ya dị nsọ.”—Matiu 12:30; Luk 9:26.

13 Ugbu a bụ oge maka ịnụ ọkụ n’obi na ịrụsi ọrụ ike! Anyị matara ebe ihe ndị na-eme n’ụwa na-eche ihu, Amagedọn na-erukwa oké nso. Ya mere, òkù a na-akpọ bụ ka a chọọ Jehova ugbu a tupu ‘ụbọchị iwe ya’ abịa, mgbe a ka nwere ike ịchọta ya. Mgbe mkpagbu ukwu ahụ malitere, oge ga-agabigaworị.—Zefanaịa 2:2, 3; Ndị Rom 13:11, 12; Mkpughe 16:14, 16.

14. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịchọ Chineke?

14 N’ezie, ihe nile a kpọrọ mmadụ kwesịrị ịdị na-achọ ihu ọma Chineke ugbu a. Pọl onyeozi kọwara ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’Ọrụ Ndị Ozi 17:26-28, sị: “[Chineke] wee site n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile, mgbe o debesịrị oge ha a kaworo aka na ókè nile nke ebe obibi ha; ka ha wee chọọ Chineke, ma eleghị anya ha ga-asọ ìsì, wee chọta ya, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị: n’ihi na ọ bụ n’ime ya onwe ya ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa.” Okwu nke ikpeazụ ahụ, bụ́ “n’ihi na ọ bụ n’ime ya onwe ya ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa,” na-enye anyị ihe zuru ezu mere anyị ga-eji chọọ Chineke. Ọ bụ n’ihi obi ebere Jehova nke na-erughịrị mmadụ ka anyị ji dịrị na gburugburu ebe obibi nke ihe ndị dị ndụ n’elu ụwa nke a dị nta ma bụrụ nke dị mkpa nke ukwuu. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inye Eze Onyenwe eluigwe na ala ekele? Ọ̀ bụkwa na anyị ekwesịghị igosipụta obi ekele anyị nye ya n’ụzọ a na-ahụ anya?—Ọrụ 4:24.

15. (a) Gịnị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Arnold Toynbee chere na ọ bụ nzube nke okpukpe ka elu? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nwee ike inye Chineke otuto?

15 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Arnold Toynbee dere n’otu oge, sị: “Ezi nzube nke okpukpe ka elu bụ itinye ndụmọdụ ime mmụọ na eziokwu dị iche iche, bụ́ ihe ndị bụ isi na ya, n’ime ọtụtụ mkpụrụ obi ndị ọ pụrụ irute, ka mkpụrụ obi ọ bụla n’ime ndị a nwee ike, n’ihi ya, imezu ezi nzube nke Mmadụ. Ezi nzube nke Mmadụ bụ inye Chineke otuto na inwe obi ụtọ n’ime Ya ruo mgbe ebighị ebi.” (An Historian’s Approach to Religion, peji 268-269) Iji wee nye Chineke otuto, anyị aghaghị ibu ụzọ chọọ ya, nwetakwa ezi ihe ọmụma banyere ya na nzube ya nile. N’ihi nke a, òkù ahụ Aịsaịa kpọrọ kwesịrị nnọọ ekwesị, nke bụ: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta ya, kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:6, 7.

Enyemaka Dị Aṅaa A Hụrụ Anya Ka Anyị Pụrụ Inye?

16. (a) Ihe ịma aka dị aṅaa na-eche ọgbakọ ndị Kraịst ihu? (b) N’ụzọ dị aṅaa pụtara ìhè ka anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ijere Jehova ozi?

16 Ọtụtụ nde ndị nwere mmasị, ndị na-abụbeghị ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike na-eche anyị nile ihe ịma aka n’ihu. Gịnị ka anyị na-eme n’ụzọ pụtara ìhè dị ka ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, ndị ọsụ ụzọ, na ndị nkwusa iji nyere ndị ahụ aka, bụ́ ndị bụ enyi eziokwu ahụ ịghọ ndị so anyị na-ekere òkè n’ụzọ dị irè n’ezi ofufe? Otu ụzọ e si enye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ebe ọ dị mkpa bụ ịga n’ebe obibi ha iji kpọrọ ha gaa nzukọ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ka ha onwe ha nwetakwa abamuru nile nke mmụọ Jehova n’ụzọ chiri anya. Ndụmọdụ Pọl nyere ndị Hibru, n’isi 10, amaokwu 24 na 25, dị oké mkpa taa dị ka ọ dị n’oge ahụ: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike [“na-agbarịta ibe anyị ume,” NW]; ka anyị mekarịakwa otú a, n’ụzọ ha otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” Anyị na-agba ndị nile chọrọ ịbụ ndị ihe ha dị Jehova ezi mma ume ka ha sonyere Ndịàmà Jehova mgbe nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’ógbè ha.

17. Ka anyị wee nwee ike inyere ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible aka inwe ọganihu n’ọchịchọ ha na-achọ Jehova, ajụjụ dịgasị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a zaa?

17 Ọ bụrụ na anyị na-eduziri mmadụ ọmụmụ Bible, bụ́ onye na-abịa nzukọ dị iche iche mgbe nile, à pụrụ inyere onye ahụ aka iru eru dị ka onye nkwusa nke ozi ọma ahụ? (Lee Organized to Accomplish Our Ministry, peji 97-99.) Ozugbo onye ahụ ghọkwara onye nkwusa na-emebeghị baptism, à kpọwo ya òkù ka ọ na-esonyere anyị mgbe nile n’ọrụ nkwusa ihu ọha nakwa n’oge ụfọdụ anyị na-eje iduzi ọmụmụ ihe na ime nletaghachi? (Lee mbipụta December 1, 1989, nke Ụlọ Nche, peji 31.) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ozugbo ndị ọhụrụ dị otú ahụ ruru eru, ànyị na-agba ha ume site n’ime ka ha hụ n’onwe ha ụfọdụ n’ime ihe ndị dị mma a na-arụpụta site n’ọrụ nkwusa anyị?—Matiu 28:19, 20.

Jehova Ruru Eru Ka A Chọọ Ya

18. Olee ụzọ Jehova siworo gosi obi ebere ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ?

18 N’ihi àjà mgbapụta ahụ nke Kraịst Jisọs, Jehova adịghị ejigide mmehie na nlefuru anya ndị anyị meworo n’oge gara aga imegide anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa ma tinye okwukwe. Rịba ama okwu Devid kwuru: “Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka o meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka o mesoworo anyị. N’ihi na dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. Dị ka ihu anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ, otú a ka o meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—Abụ Ọma 103:10-14; Ndị Hibru 10:10, 12-14.

19. Agbamume dị aṅaa ka e nwere nye ndị ahụ ọ pụrụ ịbụ na ha esiwo n’eziokwu ahụ kpafuo?

19 Jehova bụ n’ezie Chineke nke obi ọma na obi ebere. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi dị umeala na nchegharị bịakwute ya, ọ na-agbaghara anyị ma chefuokwa ihe anyị mere ya. Ọ dịghị ebugide ihe ọjọọ n’obi ruo mgbe ebighị ebi, na-enwe ọkụ hell nke na-adịru ebighị ebi dị ka ntaramahụhụ dịịrị ya. Ee e, ọ bụ dị ka Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m, ọbụna mụ onwe m, bụ onye ahụ nke na-ehichapụ njehie gị nile n’ihi mụ onwe m; m gaghị echetakwa mmehie gị nile.” Lee oké ihe agbamume nke ahụ kwesịrị ịbụrụ ndị kpafuworo site n’eziokwu ahụ ma lefuru mmekọrịta ha na Jehova anya! A na-agbakwa ha ume ịchọ Jehova ugbu a ma lọghachite n’isoro ndị a kpọkwasịworo aha ya na-emekọ ihe n’ụzọ dị irè.—Aịsaịa 43:25.

20, 21. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa nke na-enye agbamume ka anyị nwere na Juda oge ochie? (b) Gịnị ka ọ dịrị mkpa ka ndị bi na Juda mee iji nweta ngọzi Jehova?

20 N’ihe banyere nke a, anyị nwere Eze Esa nke Juda oge ochie dị ka ihe atụ nke na-enye agbamume. O kpochapụsịrị ofufe ụgha site n’alaeze ya, ma ụfọ ihe dị iche iche site n’ihe ndị e ji ekpere arụsị nọgidere na-adị. Ihe ndekọ dị na 2 Ihe Emere 15, amaokwu 2 ruo 4, na-agwa anyị ihe onye amụma bụ Azaraịa gwara Esa dị ka ihe ncheta, sị: “Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere ya; ọ bụrụkwa na unu achọọ ya, ọ ga-eme ka unu chọta ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu. Ma ọtụtụ ụbọchị ka Israel nọ n’enweghị Chineke nke eziokwu . . . Ha wee chigharịkwute Jehova, bụ́ Chineke Israel, n’ime mkpagbu dịịrị ha, wee chọọ ya, o wee mee ka ha chọta ya.”

21 Jehova anọghị na-ezogharị ma na-eme ka Eze Esa na-achọgharị ya, kama ‘o mere ka a chọta ya.’ Olee otú eze ahụ si meghachi omume n’ozi nke a? N’otu isiakwụkwọ ahụ, amaokwu 8 na 12 na-aza, sị: “Ma mgbe Esa nụrụ okwu ndị a, . . . o mere onwe ya ka ọ dị ike, wee mee ka ihe arụ nile si n’ala [ahụ] . . . gabiga; o meekwa ka ebe ịchụaja Jehova dị ọhụrụ, bụ́ nke dị n’ihu ụzọ mbata Jehova. [Juda] wee baa n’ime ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ iwere obi ha nile na mkpụrụ obi ha nile chọọ Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha.” Ee, ha chọsiri Jehova ike site ‘n’obi ha nile na mkpụrụ obi ha nile.’ Gịnị ka ọ rụpụtaara mba ahụ? Amaokwu 15 na-agwa anyị, sị: “Juda nile wee ṅụrịa ọṅụ n’ọṅụṅụ iyi ahụ: n’ihi na ha weere obi ha nile ṅụọ iyi, werekwa otú ọ na-atọzu ha ụtọ chọọ ya; o wee mee ka ha chọta ya: Jehova wee mee ka ha zuru ike gburugburu.”

22. Gịnị na-agba anyị ume ịrụsi ọrụ ike ugbu a n’ijere Jehova ozi?

22 Ugbu a, ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị ihe agbamume nye anyị nile ka anyị rụsie ọrụ ike banyere ofufe Jehova nke dị ọcha? Anyị maara na ohere dị nye ọtụtụ nde ndị ọzọ ito Jehova. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ọtụtụ n’ime ndị a na-eme mgbanwe dị iche iche ná ndụ ha ka ha wee ruo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Akwụkwọ nsọ maka ijere Jehova ozi. Ndị ọzọ na-etolite n’inwe nghọta na okwukwe, na-achọ Jehova, n’oge na-adịghị anya, a ga-akpalikwa ha iso ndị ọzọ na-ekerịta asụsụ ahụ dị ọcha site n’iwejere ha nghọta dị omimi nke eziokwu ahụ banyere Jehova na Alaeze ya. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị nile chọọ Jehova ugbu a mgbe a pụrụ ịchọta ya? N’ihi na ụwa ọhụrụ ahụ o kwere ná nkwa dị ezi nso!—Aịsaịa 65:17-25; Luk 21:29-33; Ndị Rom 10:13-15.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ndị na-egosi enweghị mmasị n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova nọ?

◻ Ruo n’ókè ha aṅaa ka okpukpe na-emetụtakarị akparamagwa?

◻ Ohere dị aṅaa ka e nwere maka ịba ụba ná Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike?

◻ N’ihi gịnị ka ugbu a ji bụrụ oge maka ịnụ ọkụ n’obi na ịrụsi ọrụ ike?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji ruo eru ka a chọọ ya?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọtụtụ ndị enyi Ndịàmà Jehova ndị na-abịa Ememe Ncheta pụrụ ịghọ ndị ohu Chineke

Ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta 1990: 9,950,058

Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa na 1990: 4,017,213

[Foto dị na peeji nke 12]

N’oge Eze Esa, mba ahụ chigharịkwutere Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya