Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—Akụ Na-enweghị Atụ
N’EBE mgbada mgbada nke Wadi Qumran, n’akụkụ ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ, e nwere ụfọdụ mkpọmkpọ ebe oge ochie. N’ịbụ ndị e chere na ha bụ ihe fọdụrụ n’otu ebe e wusịrị ike nke ndị agha Rom, ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala elebaraghị ha anya nke ukwuu. Otú ọ dị, nchọta a chọtara Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa na 1947 kpaliri ntụleghachi nke ebe ahụ.
N’oge na-adịghị anya, ndị ọkà mmụta ghọtara na ụlọ ndị ahụ bụ nke otu òtù okpukpe ndị Juu. Ihe e chere ozugbo ahụ bụ na ndị a ezowo akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ n’ime ọ́gbà ndị dị n’etiti oké nkume ndị ahụ dị nso. Ma nchọpụta ndị e mere mgbe oge ụfọdụ gasịrị yiri ka ò wetara ihe mere a ga-eji rụọ echiche ahụ ụka.
Ihe Nchọta Na-enweghị Atụ
Ndị Bedouin mụ anya ịmata uru nke ihe odide ochie ndị ahụ ha chọtaworo. Ya mere, na 1952, mgbe otu agadi nwoke kọrọ na mgbe ya dị n’okorobịa, na ya chụụrụ otu nnụnụ partridge e merụrụ ahụ ruo mgbe ọ banyere n’ime otu oghere nke dị n’ihu oké nkume, bụ́ ebe ya hụrụ ite ụrọ na oriọna ụfọdụ e ji mmanụ na-amụnye ọkụ, a malitere ime nchọgharị ọhụrụ.
Agadi nwoke ahụ ka nwere ike ịchọta ọnụ nke ọ́gbà ahụ n’etiti ndagwurugwu ndị ahụ dị omimi ndị dị n’etiti oké nkume ndị ahụ. E mesịrị chọpụta na ọ bụ ọ́gbà nke mmadụ wuru, wee kpọọ ya aha bụ Cave 4. N’ebe ahụ, ndị Bedouin chọtara iberibe ihe odide ochie dị iche iche n’ebe dị ihe dị ka otu mita n’okpuru ebe ala dị n’oge ahụ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime iberibe ndị ahụ e chebeworo n’ime ite, ya mere, ihe ka ọtụtụ n’ime ha eretọwo nke ukwuu, dị oji, na-agbarisịkwa ngwa ngwa. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, a chọtara 40,000 iberibe ihe odide dị iche iche nke mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 400 ihe odide ochie dị iche iche. Akwụkwọ nile dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma e wezụgakwa Esta, dị na ya n’etiti otu narị ihe odide Bible ochie ndị ahụ. E bipụtabeghị ihe dị ukwuu n’ihe a chọtara na Cave 4.
Otu n’ime ihe odide ochie ndị ka mkpa bụ nke akwụkwọ abụọ nke Samuel, ndị e depụtara n’otu ogologo akwụkwọ mpịakọta. Ihe odide ya n’asụsụ Hibru, bụ́ nke e chebere na 47 kọlọm n’ime ihe e chere na ọ pụrụ iru 57, nwere myirịta dị ukwuu n’etiti ya na nke ahụ ndị sụgharịrị nsụgharị Septuagint nke Grik ji mee ihe. E nwekwara iberibe akwụkwọ n’asụsụ Grik nke Septuagint ahụ site na Levitikọs na Ọnụ Ọgụgụ, ndị e dere laa azụ na narị afọ nke mbụ T.O.A. Ihe odide ochie nke Levitikọs ahụ jiri IAO mee ihe maka יהוה Hibru ahụ, bụ́ aha nsọ nke Chineke, kama iji okwu Grik bụ Kyʹri·os, “Onyenwe anyị.”a
N’otu iberibe akwụkwọ sitere na Deuterọnọmi, ihe odide Hibru ahụ gụnyere akụkụ ahụ sitere n’isi 32, amaokwu 43, nke dị na Septuagint ahụ nke e hotakwara ná Ndị Hibru 1:6, sị: “Ka ndị mmụọ ozi nile nke Chineke kpọọkwa isiala nye ya.” Nke a bụ nke mbụ a na-ahụ ahịrị okwu nke a n’ihe odide ochie ọ bụla nke e dere n’asụsụ Hibru, na-egosi na nke a bụ ihe odide nke a dabeere na ya wee mee nsụgharị Grik ahụ. Ndị ọkà mmụta esiwo otú a nweta nghọta ọhụrụ banyere ihe odide nke Septuagint ahụ, bụ́ nke a na-ehotakarị okwu site na ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
E kwuwo na mgbe e dere otu akwụkwọ mpịakọta nke akwụkwọ Ọpụpụ bụ n’ime iri afọ abụọ na ise nke atọ nke narị afọ nke atọ T.O.A., otu nke Samuel bụkwa n’ọgwụgwụ nke otu narị afọ ahụ, na otu akwụkwọ mpịakọta nke Jeremaịa bụkwa n’agbata afọ 225 na 175 T.O.A. A chọtawo ihe zuru ezu site na narị afọ nke atọ ruo na nke mbụ T.O.A. iji mata ihe banyere mgbanwe n’ụzọ ide ihe nakwa ná mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche nke asụsụ Hibru na Aramaic, bụ́ ihe bara oké uru n’ịchọpụta mgbe e dere ihe odide ochie dị iche iche.
Ihe Ịtụnanya nke Cave 11
Ma ndị Bedouin bi n’ebe ahụ ma ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwutere n’ala emesịwo mee nchọgharị zuru ezu n’akụkụ nile gbara Qumran gburugburu. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, otu ụbọchị na 1956, ụfọdụ ndị Bedouin hụtara ụsụ ndị si n’oghere dị iche iche dị n’ihu oké nkume ndị ahụ na-efepụtasị, n’akụkụ ebe ugwu nke Cave 1. Ha rịgoro n’ebe ahụ wee hụkwa ọ́gbà ọzọ, bụ́ nke e mechiri ebe e si abanye ya emechi. Ọ dịrị mkpa ibupụsị tọn abụọ nke nkume ndị dara ada iji wee meghee ebe ahụ. Ihe a chọtara n’ime ya dị ịtụnanya—ihe odide ochie abụọ zuru ezu na nnukwute akụkụ ise dị iche iche nke ndị ọzọ.
Ihe kasị mkpa a chọtara n’ebe ahụ bụ akwụkwọ mpịakọta mara mma nke Abụ Ọma. Isi ike nke akpụkpọ anụ e ji dee ya na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụ akpụkpọ nwa ehi kama ịbụ akpụkpọ ewu. Ngụkọta nke ibe akwụkwọ ise, ibe akwụkwọ anọ ndị a pụrụ iwepụta iche, na iberibe anọ mere ka ịdị ogologo ya karịa 4 mita. Ọ bụ ezie na e chebere ebe elu nke akwụkwọ mpịakọta nke a nke ọma, ọnụ ọnụ ya nke ebe ala eretọwo nnọọ nke ukwuu. Mgbe e dere ya bụ n’ọkara nke mbụ nke narị afọ mbụ O.A., o nwekwara akụkụ dị iche iche nke 41 abụ ọma dị iche iche. E dere Tetragrammaton ahụ ihe dị ka 105 ugbo ná mkpụrụ akwụkwọ oge ochie nke paleo-Hebrew, na-eme ka o guzopụta iche n’etiti ihe odide asụsụ Hibru ahụ ndị nwere akụkụ anọ nke okwu ndị dị ha gburugburu.
Ihe odide ochie ọzọ, nke Levitikọs, bụ nke e dere kpam kpam n’ihe odide Hibru oge ochie, ma a kọwachabeghị nke ọma ihe mere nke a ji dị otú a. Ọ bụ ihe odide kasị ogologo e nwere nke e ji ụdị ihe odide nke a mee ihe na ya, bụ́ nke e ji na-eme ihe n’oge ndị Juu jere ná ndọta n’agha na Babilọn n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke asaa T.O.A.
A hụtakwara otu akwụkwọ Targum, bụ́ ndegharị e mere n’asụsụ Aramaic nke akwụkwọ Job. Ọ bụ otu n’ime Targum ndị kasị mee ochie e dere ede. A chọtakwara nkọwa dị iche iche banyere akwụkwọ Bible ndị ọzọ n’ime ọ́gbà dị iche iche. Olee otú e si zoo akwụkwọ mpịakọta ndị a nke ọma otú a n’ime ọ́gbà ndị a?
Dị ka e hotara na mbụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị bi na Qumran zoro ụfọdụ n’ime ha. Ma site n’ihe àmà e nwere, o yikarịrị ka ọ̀ bụ na ọ bụ ndị Juu na-agbalaga mgbe ndị Rom na-awakwasị Judia n’afọ 68 O.A. tinyere ọtụtụ n’ime ha n’ebe ahụ, tupu mbibi ikpeazụ nke Jerusalem mgbe afọ abụọ gasịrị. Ọzara nke Judia bụ ebe dị nnọọ mma izo ihe odide ochie ndị a dị oké ọnụ ahịa, ọ bụghị nanị n’ime ọ́gbà ndị ahụ dị nso Qumran, kamakwa n’ime ọtụtụ maịlụ ndị ahụ dị n’ebe ugwu nakwa gburugburu Jeriko, nakwa n’ebe ndịda, na nso Masada. Lee nnọọ ka anyị si nwee ekele na e chebere ha! Ha na-enyekwu ihe àmà nke enweghị mgbanwe dị n’Okwu Jehova nke sitere n’ike mmụọ nsọ. N’eziokwu, “okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Reference Bible, Appendix 1C (5) na nkọwa ala ala peji maka Levitikọs 3:12, ebe e zoro aka n’ihe odide ochie nke a dị ka 4Q LXX Lev/b.
[Igbe dị na peeji nke 13]
À GA-ENWETA IHE NDỊ ỌZỌ N’ISI NSỌ?
Ọ bụ ezie na a chọtara ha kemgbe ọtụtụ iri afọ gara aga, e bipụtabeghị akụkụ dị ukwuu nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ. Akwụkwọ akụkọ The New York Times nke December 23, 1990, katọrọ nke a wee sị: “Ọbụna foto nke ihe ha dị ka ya dị n’aka otu òtù ndị ọkà mmụta na-ezochi ihe nke ukwuu, ndị na-agbakụtakwa ndị ọkà ibe ha azụ, ma jụ ibipụta ihe dị ukwuu n’ihe ha ji.” Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ na e mere mgbanwe ná ndị na-arụ ọrụ n’òtù mbipụta akwụkwọ ahụ n’oge na-adịghị anya gara aga, bụ́ nke pụrụ ịbụ nzọụkwụ gaa n’ịkwụsị “nzochi ihe nke gbara akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ gburugburu . . . , ụwa ga-amarakwa ihe dị ukwuu karị banyere ọgbọ ahụ pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme.”
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 12]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.