Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—Ihe Nchọta Bara Oké Uru
N’EBE dị ihe dị ka 24 kilomita na ndịda ọwụwa anyanwụ Jerusalem, Wadi En-Nar, bụ́ ọwa mmiri dị akọrọ gbatịrị gaa n’ọwụwa anyanwụ ruo n’Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ogologo ahịrị nke oké nkume gbatịrị n’azụ ọzara ahụ dị n’ụsọ oké osimiri ahụ. N’ọzara nke a, n’oge ehihie ndị na-ekpo ọkụ nakwa anyasị ndị na-ajụ oyi nke oge mgbụsị akwụkwọ osisi, ndị agbụrụ Ta‘amireh Bedouin na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ ha.
Na 1947, mgbe ọ na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ, otu nwa okoro onye Bedouin tụbara nkume n’otu oghere nta nke dị n’ihu otu oké nkume. O nwere ihe ijuanya n’ihi ụzụ o mere, ma eleghị anya site n’itiwa otu ite ájá. O ji ụjọ gbalaga, ma mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ọ bịaghachiri wee rịgoo ihe dị ka 100 mita isi n’otu oghere nke buru ibu karị, dịkwa elu karị, banye. Mgbe ọchịchịrị dị n’ime ebe ahụ maara ya ahụ, ọ hụrụ ogologo ite iri dị n’ahịrị ná mgbidi nke ọ́gbà ahụ, e nwekwara ọtụtụ iberibe ite wara awa ndị ghasa n’ala, ha na nkume ndị dara ada.
Ihe ka ọtụtụ n’ite ndị ahụ enweghị ihe dị n’ime ha, ma e nwere akwụkwọ mpịakọta atọ n’ime otu, nke e ji ákwà fụchie abụọ n’ime ha. Ọ chịịrị akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ laghachi n’ogige ndị Bedouin ha ma hapụ ha n’ebe ahụ ruo ihe dị ka otu ọnwa, na-etinye ha n’ime akpa nke e kokwasịrị n’osisi ụlọ ntu. N’ikpeazụ, ụfọdụ ndị Bedouin ji akwụkwọ ndị ahụ jee Betlehem ịhụ ego ole a pụrụ ireta ha. Mgbe ndị Bedouin ahụ ruru n’otu ụlọ ndị mọnk, a gwara ha ka ha laa, na-agwa ha na akwụkwọ ndị ahụ abaghị uru ọ bụla. Otu onye ahịa ọzọ gwara ha na ihe odide ochie ndị ahụ abaghị uru ọ bụla n’ihe banyere nkà mmụta ihe mgbe ochie, ọ na-echekwa na ọ bụ site n’otu ụlọ nzukọ ndị Juu ka e si zuru ha. Lee nnọọ ka o si bụrụ na ihe o kwuru ezighị ezi! N’ikpeazụ, mgbe otu onye Siria na-arụzi akpụkpọ ụkwụ nọrọ dị ka onye ngabita, a chọtara ezi ọnụ ahịa ha. N’oge na-adịghị anya, a chọtakwara ọnụ ahịa ihe odide ochie ndị ọzọ.
Ụfọdụ n’ime ihe odide ochie ndị a nyere nghọta ọhụrụ banyere ihe omume nke òtù okpukpe ndị Juu dị iche iche n’ihe dị ka n’oge nke Kraịst. Ma ọ bụ ihe odide ochie nke Bible nke amụma Aịsaịa kpaliri ụwa dum. N’ihi gịnị?
Ihe ahụ nke Bara Oké Uru
Akwụkwọ mpịakọta ahụ a chọtara ọhụrụ nke Aịsaịa dịbu ihe dị ka 7.5 mita n’ogologo. Ihe mejupụtara ya bụ ibe 17 nke akpụkpọ anụ e meziri emezi nke ọ fọrọ nke nta ka ọ dịruo mma ka parchment. N’ịbụ nke e dere na 54 kọlọm ndị nwere nkezi nke 30 ahịrị n’otu n’otu, e jiwo nlezianya kaa ahịrị na ya. Onye ọkà ndepụta ihe ahụ edekwasịwo mkpụrụ akwụkwọ nke ihe odide ahụ n’elu ahịrị ndị a, na-ede ha na paragraf dị iche iche.—Lee foto.
A fụkọtaghị akwụkwọ mpịtakọta ahụ n’osisi, ọ dịkwa oji karị n’ebe etiti, ebe ọtụtụ aka jideworo ya maka ọgụgụ. E jiwo ya mee ihe ruo ogologo oge, e jiwokwa nkà mezigharịa ya, o nwekwara ebe ndị e mere ka o siwanye ike. Ezi nchebe ya bụ n’ihi na e kwuchigidere ya nke ọma n’ime ite. Ruo ókè ha aṅaa ka ọ baara onye mmụta Bible uru, baakwara anyị nile?
Ihe odide ochie Aịsaịa nke a ji ihe dị ka otu puku afọ dịrị ochie karịa nke ọ bụla dịnụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe dị n’ime ya adịkebeghị iche. Professor Millar Burrows, bụ́ editọ nke ihe odide ahụ e bipụtara na 1950 kwuru, sị: “Ihe odide Aịsaịa nke dị n’akwụkwọ nke a, nke nwere ọdịiche ndị pụtara ìhè n’otú e si sụpee mkpụrụ okwu ụfọdụ nakwa n’ụtọ asụsụ nakwa ụzọ dị iche iche e si agụ ha, bụ ndị na-adịghị akpalicha mmasị na ndị na-adịghị oké mkpa, bụ́, n’ụzọ bụ isi, otu ihe ahụ e depụtara mgbe ogologo oge gasịrị na MT [Masoretic Hebrew Text] ahụ.”a Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama bụ nnọgide ọ nọgidere na-eji Tetragrammaton ahụ, יהוה, bụ́ aha nsọ Chineke, bụ́ Jehova n’asụsụ Hibru, na-eme ihe.
Ihe Odide Ochie Ndị Ọzọ Bara Uru
Aha Chineke ahụ pụtakwara n’otu ihe odide ochie ọzọ a chọtara n’otu ọ́gbà nke a, nke a maara ugbu a dị ka Cave 1. N’otu nkọwa e nyere banyere akwụkwọ Habakuk, Tetragrammaton pụtara ugbo anọ ná mkpụrụ akwụkwọ paleo-Hebrew, bụ́ ụdị ochie nke dị iche n’ụzọ a ma ama karị nke ide okwu Hibru, bụ́ nke na-enwe akụkụ anọ.—Lee nkọwa ala ala peji maka Habakuk 1:9, Reference Bible.
A chọtakwara akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ mpịakọta ọzọ nke Aịsaịa n’ime ọ́gbà ahụ, tinyere iberibe akpụkpọ anụ dị iche iche nke akwụkwọ Bible bụ Daniel. Otu n’ime ha chebere mgbanwe ahụ site n’asụsụ Hibru gaa n’asụsụ Aramaic na Daniel 2:4, dị ka a hụrụ ya n’ihe odide ochie ndị e dere mgbe otu puku afọ gasịrị.
Obere akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ e chebere nke ọma dị ugbu a na Jerusalem, n’ebe ahụ a maara dị ka Shrine of the Book. Ebe ndebe ihe mgbe ochie nke a dị n’okpuru ala, ya mere, ka ị na-eje n’ebe ahụ, ọ na-adị ka ị na-abanye n’ime ọ́gbà. Akụkụ elu nke ụlọ ahụ dị n’ụdị ihe nkwuchi nke ite ájá ahụ ebe a chọtara Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa. Ma ihe ị na-ahụ bụ nanị ihe oyiyi nke ihe odide Aịsaịa ahụ. Ndị mbụ ahụ, ndị dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu nọ ná nchebe n’otu ụlọ nkwakọba ihe dị nso n’ebe ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ n’ime ihe ndị ka mkpa e dere n’ime ya ka e hotara n’ime New World Translation of the Holy Scriptures—With References n’Aịsaịa 11:1; 12:2; 14:4; 15:2; 18:2; 30:19; 37:20, 28; 40:6; 48:19; 51:19; 56:5; 60:21. Aha a kpọrọ akwụkwọ mpịakọta ahụ ná nkọwa ala ala peji dị iche iche bụ 1QIs/a.
[Ebe e si Nweta Foto ndị dị na peeji 10]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
A natara ikike n’aka The British Museum
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 11]
Israel Antiquities Authority; The Shrine of the Book, Israel Museum; D. Samuel and Jeanne H. Gottesman Center for Biblical Manuscripts