Jehova Na-anụ Mkpo̩ku Dị Oké Ngwa Anyị Na-akpọku Ya Maka Enyemaka
A CHỌRỌ enyemaka ngwa ngwa. Nke ahụ doro anya site n’oké mgbarụ ihu nke onye na-eburu eze ihe ọṅụṅụ. Mgbe a jụrụ ya ihe bụ nsogbu, obu ihe ọṅụṅụ ahụ kwupụtara obi ilu ya banyere ọnọdụ ịtọgbọrọ n’efu nke Jerusalem na mgbidi ya nile. E wee jụọ ajụjụ ahụ bụ: ‘Gịnị ka ị na-achọ i nweta?’ Obu ihe ọṅụṅụ ahụ bụ Nehemaịa mesịrị dee sị, “M wee kpeere Chineke nke eluigwe.” Nke ahụ bụ mkpu dị oké ngwa, e tiri ọsọ ọsọ n’ekwupụtaghị okwu, maka enyemaka Jehova. Gịnịkwa ka ọ rụpụtara? Ee eze Peasia bụ Ataksakses wee nye Nehemaịa ikike ozugbo ahụ iwughachi mgbidi Jerusalem!—Nehemaịa 2:1-6.
Ee, Chineke na-anụ arịrịọ dị oké ngwa nke ndị hụrụ ya n’anya. (Abụ Ọma 65:2) Ya mere ọ bụrụ na ọnwụnwa yiri ka ọ dị ukwuu karịa otú ị ga-enwe ike ịnagide, ị pụrụ ikpe ekpere dị ka onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid mere n’Abụ Ọma 70, mgbe ọ chọrọ enyemaka Chineke ozugbo. Ihe e dere n’elu abụ nke a na-egosi na nzube ya bụ “ime ka e cheta.” Site n’ime mgbanwe ụfọdụ, o kwughachiri ihe dị n’Abụ Ọma 40:13-17. Ma olee otú Abụ Ọma nke 70 pụrụ isi nyere anyị aka dị ka ndị Jehova?
Arịrịọ maka Nnapụta Ozugbo
Devid ji arịrịọ a malite: “Chineke, bịa ọsọ ọsọ ịnapụta m; Jehova, bịa ọsọ ọsọ inyere m aka.” (Abụ Ọma 70:1) Mgbe a nọ n’ihe isi ike, anyị pụrụ ikpe ekpere ka Chineke bịa nyere anyị aka ngwa ngwa. Jehova adịghị eji ihe ọjọọ anwa anyị, ‘ọ makwaara ka e si adọpụta ndị na-asọpụrụ Chineke site n’ọnwụnwa.’ (2 Pita 2:9; Jemes 1:13) Ma gịnị ma ọ bụrụ na o kwere ka ọnwụnwa dịgide, ma eleghị anya iji zie anyị otu ihe? Mgbe ahụ anyị pụrụ ịrịọ ya maka amamihe iji nagide ya. Ọ bụrụ na anyị arịọ site n’okwukwe, ọ na-enye anyị amamihe. (Jemes 1:5-8) Chineke na-enyekwa anyị ume dị anyị mkpa iji nagide ọnwụnwa anyị nile. Dị ka ihe atụ, ọ ‘na-akwado anyị n’elu ihe ndina nke ahụ esighị ike.’—Abụ Ọma 41:1-3; Ndị Hibru 10:36.
Ọnọdụ mmehie anyị ketara eketa, nakwa ịbụ ndị e kpughepụrụ mgbe nile nye ọnwụnwa na mgbalị nile nke Ekwensu iji mebie mmekọrịta anyị na Jehova, kwesịrị ịkwali anyị ikpe ekpere maka enyemaka Chineke kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 51:1-5; Ndị Rom 5:12; 12:12) Okwu ndị a nke ekpere ihe nlereanya Jisọs kwesịrị ịrịba ama: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa, kama dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Ee, anyị pụrụ ịrịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mbà mgbe a nwara anyị inupụrụ ya isi, ka o gbochiekwa Setan, “ajọ onye ahụ,” imeri anyị. Ma ka anyị jikọọ mkpu ákwá anyị na-eti maka nnapụta na nzọụkwụ dị iche iche iji zeere ọnọdụ ndị na-ekpughepụkarị anyị nye ọnwụnwa na ọnyà nile nke Setan.—2 Ndị Kọrint 2:11.
Ndị Ahụ Na-asị, “Ehee!”
A pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na ndị iro na-akwa anyị emo n’ihi okwukwe anyị na-egosipụta. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, tụgharịa uche n’okwu ndị Devid kwuru: “Ka ihere mee ha, ka ha nweekwa ihu ihere, bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m: ka ha laghachi azụ, ka e tinyekwa ha n’ọnọdụ ihere, bụ́ ndị ihe ọjọọ dakwasịrị m na-atọ ụtọ. Ka ha lagachi azụ n’ihi ihere ha, bụ́ ndị na-asị, Ehee, ehee!” (Abụ Ọma 70:2, 3) Ndị iro Devid chọrọ ka ọ nwụọ; ha ‘na-achọ mkpụrụ obi ya,’ ma ọ bụ ndụ ya. Otú ọ dị, kama ịdị na-anwa imegwara, o gosipụtara okwukwe na Chineke ga-eme ha ihe ihere. Devid kpere ekpere ka ‘ihere mee ndị iro ya, ka ha nweekwa ihu ihere’—nwee mmechuihu, ijuanya, ahụ erughị ala, nkụda mmụọ n’ịnwa imezu atụmatụ obi ọjọọ ndị ha nwere. Ee, ka ndị ahụ na-achọ ka o merụọ ahụ na ndị na-enwe obi ụtọ n’ọdachi bịakwasịrị ya nwee mgbagwoju anya, bụrụkwa ndị e wedara n’ala.
Ọ bụrụ na ọ dịwo mgbe anyị nwere ihe a pụrụ ịkpọ ọṅụ arụrụala mgbe onye iro nwere ọdachi, anyị ga-aza Jehova ajụjụ banyere mmehie anyị. (Ilu 17:5; 24:17, 18) Otú ọ dị, mgbe ndị iro kọchara Chineke na ndị ya, anyị pụrụ ikpe ekpere ka, n’ihi aha nsọ ya, Jehova ‘mee ka ha laghachi azụ n’ihi ihere’ n’ihu ndị ha na-achọ isi n’aka ha nweta otuto. (Abụ Ọma 106:8) Ịbọ ọ́bọ̀ dịịrị Chineke, ọ pụkwara iwetara ndị iro ya na ndị iro anyị mgbagwoju anya, wedaa ha ala. (Deuterọnọmi 32:35) Dị ka ihe atụ, onye ndụ Nazi bụ Adolf Hitler gbalịrị ikpochapụ Ndịàmà Jehova na Germany. Lee ka o si daa nnọọ ajọ ọdịda, n’ihi na ọtụtụ puku n’ime ha ugbu a na-akpọsa ozi Alaeze ahụ n’ebe ahụ!
Site n’ọchị ịkwa emo, ndị iro anyị pụrụ ịsị: “Ehee, ehee!” Ebe ha na-ata Chineke na ndị ya ụta, ka ndị mmehie ndị ahụ “laghachi azụ n’ihi ihere ha,” na-enwe mmechuihu. Mgbe anyị na-ekpe ekpere maka nke a, ka anyị jigide nnọgidesi ike anyị n’ezi ihe ma mee ka obi Jehova ṅụrịa, ka o wee zaghachi Setan na onye ọ bụla ọzọ na-ata Ya ụta okwu. (Ilu 27:11) Anyị ekwesịghịkwa ịtụ ndị iro anyị na-afụli onwe ha elu ụjọ mgbe ọ bụla, n’ihi na “onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.” (Ilu 29:25) Eze Babilọn dị mpako bụ́ Nebukadneza, bụ́ onye dọọrọ ndị Chineke n’agha laa, nwetara mmechuihu, mesịakwa kweta na ‘Eze nke eluigwe pụrụ ime ka ndị dị mpako dị ala.’—Daniel 4:37.
“Ka Chineke Dị Ukwuu!”
Ọ bụ ezie na ndị iro pụrụ ịkpatara anyị nsogbu, ka anyị soro ndị ofufe ibe anyị too Jehova mgbe nile. Kama ikwere ka obi ilu rikpuo ya nke ukwuu nke na o bulighị Chineke elu, Devid sịrị: “Ka obi tọọ ndị nile nke na-achọ gị ụtọ, ka ha ṅụrịakwa ọṅụ n’ime gị; ee, ka ndị na-ahụ nzọpụta gị n’anya na-asị mgbe nile, Ka Chineke Dị Ukwuu.” (Abụ Ọma 70:4) Ndị Jehova na-anọgide na-enwe nnọọ ọṅụ n’ihi ‘obi na-atọ ha ụtọ, ha na-aṅụrịkwa ọṅụ’ n’ime ya. Dị ka Ndịàmà ya raara onwe ha nye, e mekwara baptism, ha nwere oké ọṅụ nke na-esite n’iso ya nwee mmekọrịta chiri anya. (Abụ Ọma 25:14) Ma, a pụrụ ile ha anya dị ka ndị ji umeala n’obi na-achọ Chineke. N’ihi ịbụ ndị kwere ekwe na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, ha na-anọgide na-achọkwu ihe ọmụma banyere ya na Okwu ya.—Eklisiastis 3:11; 12:13, 14; Aịsaịa 54:13.
Ka Ndịàmà Jehova na-akpọsa ozi ọma ahụ, ihe ha na-ekwu kpọmkwem bụ: “Ka Chineke dị ukwuu!” Ha na-eto Jehova, na-edebe ya n’ọnọdụ kasị elu. N’ụzọ na-enye ọṅụ, ha na-enyere ndị na-achọ eziokwu aka ịmụta banyere Chineke nakwa ito ya. N’adịghị ka ndị ụwa na-ahụ ihe ụtọ n’anya, ndị Jehova ‘na-ahụ nzọpụta ya n’anya.’ (2 Timoti 3:1-5) N’iburu ọnọdụ mmehie ha ketara eketa n’uche, ha nwere ekele dị ukwuu maka ndokwa ịhụnanya Jehova Chineke mere maka nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi, nke kwere omume site n’àjà ịnata ihu ọma nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8; 1 Jọn 2:1, 2) Ị̀ na-eme ka Chineke dị ukwuu ma na-egosi na ị ‘hụrụ nzọpụta ya n’anya’ site n’ife ezi ofufe iji nye ya otuto?—Jọn 4:23, 24.
Tụkwasị Onye Na-emeghe Ụzọ Mgbapụ Obi
Mgbe Devid kwupụtara obi ya n’abụ ọma nke a, ọ nọ n’oké mkpa nke na ọ sịrị: “Ma mụ onwe m bụ onye e wedara n’ala na ogbenye; Chineke, bịakwute m ọsọ ọsọ: onye inye aka m na Onye na-eme ka m gbapụ ka ị bụ; Jehova, anọla ọdụ.” (Abụ Ọma 70:5) N’ihi ịnata ule ndị na-ewetara ndị kwere ekwe mgbakasị ahụ—ihe otiti ndị dị ka mkpagbu, ọnwụnwa, na mwakpo site n’aka Setan—anyị pụrụ iyi “ogbenye.” Ọ bụ ezie na ma eleghị anya anyị enweghị ọrụsị, ọ na-eyi ka ọ bụ na anyị enweghị nchebe megide ndị iro akọ na uche ha nwụrụ anwụ. Otú ọ dị, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova pụrụ ịzọpụta anyị dị ka ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ ga-emekwa otú ahụ.—Abụ Ọma 9:17-20.
Jehova bụ ‘Onye Na-emeghe ụzọ mgbapụ’ mgbe ọ dị anyị mkpa. Ngahie nke onwe anyị pụrụ iwebawo anyị n’ọnọdụ ule. Ma ọ bụrụ na ‘uche gbagọrọ agbagọ ekpuwo ụzọ anyị ihu,’ ka obi anyị ghara ‘ịdị ọkụ megide Jehova.’ (Ilu 19:3) Ọ bụghị ya ka ụta dịịrị, ọ dịkwa njikere inyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị jiri okwukwe kpegara ya ekpere. (Abụ Ọma 37:5) Gịnị ma ọ bụrụ na anyị na-agba mgba izere mmehie? Mgbe ahụ ka anyị kpọọ okwu ahụ aha n’ekpere, na-arịọ maka enyemaka Chineke iji nọgide na-agbaso ụzọ ezi omume. (Matiu 5:6; Ndị Rom 7:21-25) Chineke ga-aza ekpere sitere n’obi anyị, anyị ga-abakwa ụba n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị edoo onwe anyị n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ ya.—Abụ Ọma 51:17; Ndị Efesọs 4:30.
Mgbe a nọ n’oké ihe mgbu nke ule nke okwukwe, ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ̀ bụ na anyị apụghị ịnagide ya ogologo oge karị. Ebe anụ ahụ anyị na-emehie emehie na-adịghị ike, ọ pụrụ ịchọ ka a napụta ya ọsọ ọsọ. (Mak 14:38) Ya mere anyị pụrụ ịrịọ, sị: “Jehova, anọla ọdụ.” Karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nwere nchegbu banyere nkọcha nye aha Chineke, a pụrụ ịkpali anyị ikpe ekpere dị ka Daniel onye amụma mere, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], nụrụ: Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], gbaghara: Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], ṅaa ntị mee ihe: anọla ọdụ: n’ihi gị onwe gị, Chineke m, n’ihi na aha gị ka a kpọkwasịworo . . . ndị gị.” (Daniel 9:19) Anyị pụrụ inwe okwukwe na Nna anyị nke eluigwe agaghị anọ ọdụ, n’ihi na Pọl onyeozi nyere okwu imesi obi ike nke a, sị: “Ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara, ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.”—Ndị Hibru 4:16.
Echefula mgbe ọ bụla na Jehova bụ Onye Na-emeghe ụzọ mgbapụ. Dị ka ndị na-ejere ya ozi, ọ ga-adịrị anyị mma icheta nke a na okwu nile nke ekpere dị n’Abụ Ọma 70. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ikpe ekpere ugboro ugboro maka otu ihe nke anyị na-echegbu onwe anyị banyere ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ọ pụrụ iyi ka ọ̀ bụ na e nweghị ihe ngwọta nye otu nsogbu kpọmkwem, ụzọ mgbapụ ọ bụla adịghị n’oké ihe isi ike anyị. Ma Nna anyị na-ahụ n’anya nke Eluigwe ga-eme ka anyị nwee ume, ọ gaghịkwa ekwe ka e lee anyị ule gabiga ihe anyị pụrụ ịnagide. Ya mere, adala mba mgbe ọ bụla ịga n’ihu ocheeze nke Eze Ebighị Ebi ahụ site n’ekpere sitere n’ala ala obi. (1 Ndị kọrint 10:13; Ndị Filipaị 4:6, 7, 13; Mkpughe 15:3) Jiri okwukwe kpee ekpere, tụkwasịkwa ya obi kpam kpam, n’ihi na Jehova na-anụ mkpu ákwá anyị na-eti maka enyemaka.