Ihe Ịma Aka nke Ịkụ Mkpụrụ Alaeze n’Ebe Ndịda Chile
LEE ka o si bụrụ ihe na-enye ọṅụ ịgabiga ụzọ ime obodo n’ebe ndịda Chile! N’udo, ìgwè ehi nọ na-ata nri n’ubi ndị osisi kwụrụ n’ahịrị n’ahịrị na ha n’akụkụ oké ugwu volcano ndị snow kpuchiri ọnụ ọnụ ha. Ị pụrụ ịnụ olu nnụnụ ndị na-eme mkpọtụ na akwụkwọ osisi ndị na-eme ụṅara n’ikuku. N’agbanyeghị otú ọnọdụ ebe a si yie nke dị mma, e nwere ọtụtụ ihe ịma aka n’ebe a nye ndị na-akụ mkpụrụ eziokwu Alaeze ahụ.
Ị̀ ga-achọ izute ụfọdụ n’ime ndị ọsụ ụzọ anyị, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile nke Alaeze ahụ? Gịnị banyere isonyere ha ruo otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ ka ha na-ekwusa ozi ọma ahụ? Na mbụ, ka anyị gee Jaime na Oscar ntị ka ha na-akọwa ọṅụ na ihe ịma aka dị iche iche nke ụbọchị dị otú ahụ n’ebe ndịda Chile.
Otu Ụbọchị n’Ọrụ Nkwusa ahụ
“Anyị na-amalite imegharị ahụ ma na-amata banyere oyi nke bataworo n’ụlọ nta anyị bi. Ka o yi sọks e ji ajị́ anụ kpaa ma ka kpuru okpu n’isi ya, Oscar na-arịtu n’àkwà. Ọ na-emenwu ọkụ, mụnye ọkụ n’ìgwè ọkụ nta na-eme ka ụlọ kpoo ọkụ iji chụọ oyi dị n’ime ụlọ ahụ, mgbe ahụ ọ laghachi n’àkwà ya nke na-ekpotụ ọkụ. Ọ ka gbara ọchịchịrị n’èzí, anyị pụkwara ịnụ ụzụ mmiri nke nọworo na-ezo ogologo abalị dum. Anyị elepụ anya na windo ma lerịta onwe anyị anya. Oo, lee ka ọ ga-esi dị mfe ịhapụ ọrụ taa! Mgbe ahụ anyị wee cheta atụmatụ anyị maka ụbọchị ahụ na mkpa ọ dị ịrụ ọrụ n’ókèala dịpụrụ adịpụ nke a na-agaghị na ya ma ọlị n’afọ gara aga. A kwaliri anyị ịmalite ime ihe.
“Mgbe anyị na-aga tupu elekere asatọ, anyị gasiri ije ike na-enwe olileanya na mmadụ ga-eji moto bupụtụ anyị ma ọ bụ na bọs ga-agbafeta, ka njem anyị wee dị ngwa ngwa karị irute n’ụzọ ndị na-aga ebe ndị dịkpuru n’ime ndị na-eduje n’ebe obibi ndị ahụ dịpụrụ adịpụ na ime obodo nta dị iche iche nke ókèala anyị. Otu ụgbọ e ji akọ ugbo rutere, bụ́ nke na-adọkpụ azụ gwongworo nke a na-arụlighị akụkụ ya elu, o bukwa ndị ọrụ ụfọdụ. Draịva ya kwụsịrị ma kwere ka anyị rịgote. Obi dị anyị ụtọ na n’ihi mmiri zoro n’abalị gara aga, taa anyị enwetaghị ahụmahụ nke ntụ́ ikpo anyị mgbe anyị na-aga njem. Ka anyị wụụrụ na-aga, anyị sooro ndị ọrụ ubi ahụ kerịta ozi ọma. Mgbe oge ruru iritu, anyị nyere ha magazin ole na ole. Lee ka anyị si nwee ekele maka enyemaka ahụ nke zọpụtara anyị n’iji ụkwụ gaa njem maịlụ asaa ahụ!
“Ọ ga-abụ ụbọchị dị ogologo mgbe anyị na-agagharị n’ime obodo ahụ na-achọ ndị kwesịrịnụ. N’oge mbụ mgbe anyị malitere ọrụ e kenyere anyị, anyị apụghị ịghọta ihe mere ndị mmadụ ji na-ekwere ihe anyị na-ekwu ma yie ka hà na-ala azụ ịnakwere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Anyị chọpụtara na ọtụtụ mgbe nke a bụ n’ihi na ha apụghị ịgụ akwụkwọ. Ya mere ọ bụụrụ anyị ihe bara uru ịkọwapụta na akwụkwọ anyị bụ onyinye dị ebube maka ụmụ na ndị ikwu ha, bụ́ ndị ga-emesịa soro ha kerịta ihe dị na ha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị anyị gwara okwu abaghị ọgaranya. Ma ebe ha nwere obi ụtọ iso ndị ọzọ kerịta ihe ha nwere, mgbe ha nataworo akwụkwọ Bible, ọtụtụ mgbe ha enyewo anyị àkwá, ji bekee, beet, yabasị, agwa, lentil, na agwa garbanzo.”
Jaime amụtawo ịtụ aro mgbe onye nwe ụlọ chọrọ inye ihe maka akwụkwọ Bible e nyere ha. N’ihi gịnị? N’otu oge, ndị ọsụ ụzọ ahụ chị akwụkwọ nri ịdị arọ ya bụ kilogram 15 lọta, onye nke ọzọ ya na ya so ji akpa akwụkwọ ya buru ọkụkọ dị ndụ n’ogologo ụbọchị ahụ dum! Jaime na-atụkarị aro merquén, bụ́ ihe ụtọ e ji eme ka nri tọọ ụtọ nke e ji ose na-ekpo ekpo na ihe ndị na-esi ísì ụtọ mee. Akụkọ ahụ na-aga n’ihu:
“N’ịgafe ala ubi ndị ahụ, anyị na-erute na ruca [ebe obibi] ụfọdụ nke ndị amaala Mapuche [nke pụtara, “Ndị ala nke a”]. O siri ike ịgwa ndị Mapuche meworo agadi okwu, n’ihi ọtụtụ na-asụ nanị asụsụ ala ha. Mgbe ndị bụ nwata karị nọ nso, ha na-ejekarị ozi dị ka ndị nsụgharị okwu. Ka anyị na-abamikwu n’ime obodo ahụ, anyị na-ezute ndị ọ na-adịbeghị mgbe ha hụrụ Bible ma ọ bụ jee obodo ukwu dị ka Temuco, bụ́ isiala nke ógbè ahụ. Nke a na-eweta ihe ịma aka nke inyere ha aka ịghọta otú ọnọdụ ụwa si na-adakpọ. Anyị aghaghị iji nwayọọ nwayọọ na-eme nke a, na-egosi ha otú nsogbu ndị e nwere n’ógbè ahụ si egosipụta ihe na-eme n’ebe ndị ọzọ.
“Ka ụbọchị na-aga, ụkwụ anyị ike gwụworo na-achọ izuru ike. E nwewo oké anwụ otiti na mmiri ozuzo nke kuru oké ikuku nke na-eme ka mbrọda anyị ghara ịba uru. Ugbo ndị a ka kọrọ ọhụrụ emewo ka ụrọ nyakọjuo n’akpụkpọ ụkwụ anyị. Mgbe anyị nụrụ okwu ndị bụ Pase no más (Batawa), anyị na-eji obi ekele banye na kichin ma nara okpomọkụ nke ekwu ọkụ ahụ, otu iko ‘kọfị’ e ji mkpụrụ ihe ọkụkụ mee, cheese e ji mmiri ara ehi mee, na breedi a ka mere ọhụrụ n’ụlọ. Aa, lee ka ísìsì ọma nke breedi ahụ e mere ọhụrụ si dị ụtọ!
“N’ibu ndị nwetaghachiri ume, anyị na-aga n’ihu ruo mgbede, na-agabiga ubi ndị a na-adịghị ejikarị ogige akpara ókè, ọ bụ ezie na ị ga-ahụ ugbo ọka ụfọdụ e ji osisi nta a na-akpọ pica-pica gbaa gburugburu, bụ́ osisi nta na-enwe flawa na-acha edo edo, bụkwa nke na-adịghị ada akwụkwọ. Ebe ọchịchịrị ga-amalite mgbe na-adịghị anya, anyị aghaghịkwa irute n’ụzọ ukwu ọzọ iji banye na bọs ikpeazụ na-aga n’obodo ukwu, njem ụkwụ anyị dị 20 kilomita ga-agwụsị n’oge na-adịghị anya.
“Anyị lọtara n’udo, ike gwụrụ anyị ma anyị nwere obi ụtọ, n’ihi na anyị na ndị yiri atụrụ enwewo ọtụtụ mkparịta ụka na-enye ọṅụ. Mgbe anyị ritusịrị nri, anyị tụleghachiri ihe mere n’ụbọchị ahụ wee tụkwasị ahụ anyị ike gwụrụ n’elu àkwà.
Ije Leta Chiloé
Ìgwè agwaetiti nke Chiloé bụ nke ọtụtụ agwaetiti nta mejupụtara. Agwaetiti ya bụ isi dị 180 kilomita n’ogologo, nweekwa ugwu ndị ahịhịa jupụtara na ndị e ji ọdọ mmiri ndị dị nta kewasịa. Leekwa ịma mma na-adọrọ adọrọ na obodo nta mara mma a na-akụ azụ ị pụrụ ịhụ n’ebe ọ bụla ị gara!
N’obodo ukwu bụ Achao, nke dị nnọọ ná mpụga agwaetiti ahụ bụ isi, anyị hụrụ Rubén na Cecilia. Mgbe ha rutere na March 1988, ụkọchukwu e nwere n’ebe ahụ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị ‘ka ha ghara ịṅa di na nwunye na-agagharị n’agwaetiti ahụ dum na-ekwu okwu banyere Bible ntị.’ Okwu ya ndị na-ezighị ezi mechiri uche ụfọdụ ndị ma kpalie ọchịchọ ndị ọzọ nwere maka ịmata ihe. Mgbe oge na-aga, Rubén na Cecilia na-eduzi 28 ọmụmụ Bible. Ọtụtụ n’ime ọmụmụ ihe ndị ahụ bụ maka ndị nkụzi, anọ n’ime ha na-eji akwụkwọ Watch Tower bipụtara bụ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial” na Akwukwọm nke Akukọ Bible na-ezi ihe n’oge a na-akụzi banyere okpukpe n’ụlọ akwụkwọ.
Jehova na-elekọta ndị ọsụ ụzọ ndị a na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị na-aga ije ruo 34 kilomita kwa ụbọchị n’ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Otu ụbọchị, Rubén na Cecilia na-aga ije n’ọwara ụzọ nke dị n’ụsọ osimiri mgbe ha hụrụ na oge mmiri talatara, ọ pụrụ ịdị mfe ịtụtụta ọtụtụ chorito (otu ụdị ejula mmiri). Rubén malitere ikpokọta ha, ma olee otú ha ga-esi bulaa ha ụlọ? Cecilia gboro mkpa ahụ. Sọks ya abụọ ghọrọ akpa. Ugbu a ndị ọsụ ụzọ ahụ enwewo ihe na-atọ ụtọ e wetara ná mmiri nke ha ga-eji sie nri!
Kpọmkwem n’ebe ugwu nke Achao, ndị nkwusa oge nile abụọ nke Alaeze, bụ́ ndị a maara dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-esonyere otu ọgbakọ nta dị na Linao. Ọrụ nkwusa ahụ malitere n’ebe ahụ na 1968, e mekwara Onyeàmà mbụ nke Jehova na Linao baptism na 1970. Ruo afọ anọ ọ bụ nanị nwanna nke a na-arụ ọrụ nkwusa ahụ, ọ nagidekwara ịkwa emo site n’aka ndị ezinụlọ ya na ndị enyi. N’ikpeazụ, na 1974, nwunye ya naara eziokwu Bible, e meekwa ya baptism. Baptism nke ndị ikom anọ ndị nne ji ha na ya, ụmụnne ya ndị inyom anọ, ụmụnne nna ya anọ, ụmụ ụmụnne ya isii, na otu ọgọ ya nwoke na nwunye ya. Ọgbakọ e guzobere ebe ahụ bụ otu nnukwute ezinụlọ. Mgbe oge na-aga, atọ n’ime ụmụnne ndị ikom ise ahụ malitere ije ozi dị ka ndị okenye, otu dịkwa ka ohu na-eje ozi.
Luis na Juan bụ ndị nkwusa oge nile bụ́ ndị tụkwasịrị uche ha n’ịkụ mkpụrụ Alaeze na Quemchi, bụ́ obodo nta dị 30 kilomita site Linao. Kwa ụbọchị, ha na-arịfe ogige dị iche iche, gafee ugbo ndị jupụtara n’akwụkwọ ndụ, gbagoo ma gbadata ugwu nta dị iche iche, ebe ikuku na mmiri ozuzo na-etikwasị ya mgbe mgbe. Iji ruo agwaetiti ndị dị nso, ha na-eji ụgbọ nta na-aga n’agwaetiti Chiloé ugbo abụọ ma ọ bụ atọ kwa izu. Ha na-anọgide n’otu agwaetiti ruo ụbọchị ole na ole. Ịga njem site n’otu agwaetiti ruo n’ọzọ pụrụ ime ka agbọ na-eru onye mmiri na-amarabeghị ahụ, ma àgwà ile ọbịa nke ọma nke ndị bi n’agwaetiti ahụ na-ewepụ mmetụta ahụ kpam kpam. Onye nkwusa ọzọ nke Alaeze sonyeere Luis na Juan, ha wee jikọọ aka ọnụ na-agbalị ijekwuru 11,500 ndị bi n’ókèala ha. Ọ bụ ezie na mmụba ahụ adịghị ngwa, Luis na Juan nwere oké ọṅụ inwe 36 mmadụ bịara Ememe Ncheta nke afọ 1989.
Ịlaghachi Obodo Ukwu
Ịnọgide na-eche ihu n’ebe ugwu, anyị gabigara ọwa mmiri Chacao ma rute n’obodo ukwu. N’ógbè a, ndị ọsụ ụzọ bụ́ Ramón na Irene na-arụ ọrụ n’ókèala buru ibu nke gụnyere ìgwè ndị dịpụrụ adịpụ na Maullín, Carelmapu, na Pargua. Ndịàmà nọ n’agwaetiti Chiloé na-aga ije ruo otu hour wee banyezịa transbordador (ụgbọ epeepe) iji gafere ọwa mmiri ahụ ma gaa nzukọ ndị Kraịst na Pargua. Ramón na-eji bọs gaa njem otu hour na 20 minit site Maullín iji duzie nzukọ ndị ọnụ ọgụgụ karịrị ndị nkwusa okpukpu abụọ na-abịakarị. Gịnị mere o ji ewe ogologo oge otú a ịga njem dị nanị 38 kilomita? N’ihi na bọs ndị ahụ na-akwụsị ọtụtụ ebe n’ụzọ iji buru ndị njem bujupụtara akpa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, akpa ji bekee na yabasị, na mgbe ụfọdụ ọbụna ézì na ọkụkọ ndị dị ndụ. Ihe ọ bụla a na-apụghị ịtụkwasị n’elu bọs na-abata n’ime. Ihe ọ na-akpata bụ ogologo njem na ísìsì dị iche iche, ịhụ ihe dị iche iche, na ụzụ ihe dị iche iche.
Ebe ole na ole ndị ọsụ ụzọ ndị a nwere ụgbọ ala, bọs nke na-agba site n’otu obodo ruo obodo ọzọ ịganahụ mmadụ na-apụta iji ụkwụ gaa ogologo njem, ọ gwụla ma o nwere onye bupụtụrụ ha. Ka otu ọkwọ ụgbọ ala buuru Ramón na onye ọ na-eduziri ọmụmụ Bible na-aga, ọ jụrụ, sị: “Olee otú ndị mmadụ si anara ọrụ unu?” Ka ọ hụrụ ka ha si na-elegharị onwe ha anya n’ijuanya, ọ sịrị: “Abụ ụkọchukwu e nwere n’ógbè a, unu bụ Ndịàmà Jehova. Amatara m ọrụ unu nke ọma, enwekwara m mmasị na magazin unu.” E nwere nnọọ nnọkọ ajụjụ na azịza tupu ọ kwụsị ha na Pargua kpọmkwem n’oge maka nzukọ. Ọ ghaghị ịbụ na a zara ụkọchukwu ahụ ajụjụ ndị ọzọ ka ọ nọgidere na-agụ akwụkwọ anyị.
Ọ dịghị adịkarịrị Ramón na Irene mfe iru 20 ebe obibi ndị ahụ ha na-eduzi ọmụmụ Bible. Ụfọdụ dị n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Maullín ma ọ bụ n’obodo nta dịpụrụ adịpụ ebe ndị a na-akụ azụ, a ghaghịkwa iji ụgbọ nta ruo ha. Ọ bụ ezie na oké mmiri ozuzo ndị ahụ pụrụ ịbụ ihe nkụda aka, o doro anya na ntachi obi ha na ndị nkwusa Alaeze 18 ndị ọzọ nọ gburugburu ime obodo nke a na-egosipụta na-amịpụta mkpụrụ mgbe 77 mmadụ zukọrọ maka Ememe Ncheta.
Na Los Muermos, ndị nkwusa Alaeze oge nile bụ́ Juan na Gladys eduziwo 23 ọmụmụ Bible. A na-enye nkwụghachi ụgwọ maka ịga ije ogologo oge n’ájá ụrọ mgbe mkpụrụ Alaeze gbara mkpọrọgwụ n’obi ndị a pụrụ izi ihe. N’otu ógbè dịpụrụ adịpụ n’ugwu ụsọ osimiri dị nso Estaquilla, Juan na Gladys rụrụ ọrụ n’ókèala a na-ejebeghị na mbụ. Ha jụrụ otu onye ha na-eduziri ọmụmụ Bible ma ọ̀ ga-enyetụ ha ịnyịnya ya maka ụbọchị ahụ. Ọ zaghachiri, sị, “Eenụ. M̀ pụrụ isoro unu?” N’oge na-adịghị anya, Juan ghọtara na nke a aghaghị ịbụwo site ná nduzi Jehova. Ọ gaara adịwo mfe ifu n’oké ọhịa ahụ, ma onye ahụ nwere mmasị maara ókèala ahụ nke ọma, wee duga ha n’ebe obibi ndị a na-apụghị ịhụ site n’ọwara ụzọ ndị dị n’ugwu ahụ. Ka ahụ malitere ịfụ ha ụfụ mgbe hour 9 nke ịga ije na ịnọkwasị ịnyịnya gasịrị, otu n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche jụrụ onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ Bible otú ahụ dị ya. Nwoke ahụ zaghachiri: “Nanị ihe m na-arịọ bụ ka unu kpọrọ m n’oge ọzọ.” Onye a nwere ekele nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ, e meekwa ya baptism na January 1988. E mere nwunye ya baptism n’oge na-adịghị anya ná mgbakọ sekit.
N’oge nleta onye nlekọta sekit, ndị nkwusa 11 nọ n’Estaquilla nwere ọṅụ inwe 110 mmadụ ndị bịara maka okwu ihu ọha. N’otu obodo nta nke nwere 1,000 mmadụ ndị bi na ya, bụ́ nke dị nso karị na Los Muermos, 66 mmadụ zukọrọ maka Ememe Ncheta. Ya mere e nwere ọtụtụ ihe ime n’ubi nke a buru ibu.—Matiu 9:37, 38.
Ná mgbago mgbago nke ebe ugwu, anyị hụrụ ndị ọsụ ụzọ bụ Alan na Fernando. Ka ha na-aga ije n’ụzọ ntụ́ juru n’otu ụbọchị, otu draịva buuru ha n’azụ gwongworo ya. Mgbe ha rịturu, ha chịrị ọchị n’ihi na ntụ́ dị ukwuu juru ha n’ahụ site n’isi ruo n’ụkwụ. Ime ihe ọchị na ọṅụ n’ihi iduzi 20 ọmụmụ Bible ebe obibi na-enye aka imeri ihe ndị dị otú ahụ na-agbakasị ahụ. Cheekwa echiche ọṅụ ha nwere mgbe 65 bịara Ememe Ncheta na mgbe mmadụ abụọ mbụ ndị si n’ógbè ahụ sonyeere ha n’ọrụ nkwusa ahụ n’ọnwa na-esonụ!
Ịgafe Osimiri Bío-Bío
Iji rute ndị yiri atụrụ n’ebe ndị ka nso n’Oké Ugwu Andes, ọ dị mkpa ịgafere otu nnukwute olulu nke mmiri ndị na-eme ụzụ nke Osimiri Bío-Bío dị 50 mita gbadaa ala, si na ya na-agafe. Ebe e si agafere bụ n’elu osisi dị pekepeke nke e kedoro n’okpotokpo waya dị ogologo nke gabigara olulu ahụ. N’egwu, ị ga-arịkwasị ya ma kpaa ihe e ji jide ya aka, bụ́ nke ga-eme ka ọ kpọree n’elu waya ahụ. Ị ga-ejigide aka ya aka mgbe i ji ọsọ na-akpọre gabiga etiti olulu ahụ, bụ́ ebe ị na-akwụsị. Mgbe i kurusịịrị ume, ị kpaakwa ihe njide ọzọ aka ihu na azụ, jiri nwayọọ kpọrere gabiga ọkara nke ọzọ. Ọ dịghịrị onye obi na-esighị ike ma ọlị! Ma, otu nwanna nwanyị na-eme nke a kwa izu iji rute otu onye yiri atụrụ nke bi n’obodo nta dị anya nke dị n’elu ugwu!
Ezi ihe nlereanya ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ na-esetịpụ na-agba ndị nwere mmasị bụ́ ndị nwere obi ekele, ume itinye mgbalị dịkwa otú ahụ iji bịa nzukọ nile nke ndị Kraịst. (Ndị Hibru 10:24, 25) Otu ezinụlọ na-eji ịnyịnya gaa njem 40 kilomita ruo Osimiri Bío-Bío werezịa ụkwụ gaa kilomita 12 ọzọ iji ruo Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Gịnị ka ndị ọsụ ụzọ ahụ na-echeta mgbe ha leghachiri anya azụ n’afọ ndị ahụ? Ọ̀ bụ ugwu volcano bụ́ ndị snow kpuchiri, ubi ndị mara mma, na osimiri ndị na-ekwo ekwo? Ntụ́ ahụ, mmiri ozuzo, ụrọ, na ogologo ije? Ee, ma ha na-echetakarị ndị ahụ nwere omume enyi bụ́ ndị nakweere ozi ọma ahụ nke ọma. Ndị a yiri atụrụ na-eme ka mgbalị ahụ dum nyeghachi ụgwọ ọrụ n’ezie. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịkụ mkpụrụ Alaeze n’ebe ndịda Chile!