Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/1 p. 3
  • Bible—Ọ̀ Dị Nsọ n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible—Ọ̀ Dị Nsọ n’Ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Dere Bible?
  • Olee Otú Chineke Si Duzie Odide Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Chepụtara Baịbụl?
    Teta!—2008
  • ‘Mmụọ Nsọ Duru Ha’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Ò Si “n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke” n’Eziokwu?
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/1 p. 3

Bible—Ọ̀ Dị Nsọ n’Ezie?

MMADỤ ole taa na-ele Bible anya dị ka Okwu Chineke, nke dị nsọ? N’ọgbọ nke a nke ịrụ ụka, ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka ihe na-ekwesịkwaghị oge a na ihe na-abaghị uru, na-arụ ụka ma ọ̀ bụ ihe dị nsọ n’ezie. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị ndú okpukpe Krisendọm na-akụzi na Bible jupụtara n’akụkọ ifo na akụkọ ihe na-emeghị eme n’ezie. Ha na-arụ ụka ‘ma nkọwa Bible nke akụkọ ihe mere eme ọ̀ bụ ihe onye nwere uche pụrụ ịnakwere.’—The Interpreter’s Dictionary of the Bible, Mpịakọta 2, peji 611.

Ndị ọkà mmụta a ma ama na-akụnye mkpụrụ nke ịrụ ụka banyere izi ezi nke izo aka n’ebe Bible dị dị ka Okwu Chineke. Otu n’ime ha kwuru na “ọ bụrụ na mmadụ achọọ iji asụsụ nke yiri Okwu nke Chineke mee ihe, aha kwesịịrị Bible bụ Okwu nke Israel, Okwu nke ụfọdụ ndị Kraịst oge gboo a ma ama.” (The Bible in the Modern World, nke James Barr dere) Gịnị ka i chere? Bible ọ̀ bụ Okwu Chineke? Ọ̀ dị nsọ n’ezie?

Ònye Dere Bible?

A na-ekwukarị na onye dere Jenesis, bụ́ akwụkwọ mbụ nke Bible, bụ Mosis, onye Hibru nke dịrị ndụ ihe dị ka 3,500 afọ gara aga. Dị ka Bible n’onwe ya si kwuo, ihe dị ka 40 ndị ikom ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ, keere òkè n’ide akụkụ ndị ọzọ nke Akwụkwọ nsọ, na-arụpụta nchịkọta nke 66 akwụkwọ ndị ahụ, ma ọ bụ nkewasị nta dị iche iche, nke Bible. Otú ọ dị, ndị ikom ndị a eleghị onwe ha anya dị ka ndị nwe ihe e dere na Bible n’ezie. Otu n’ime ndị ahụ so dee ya sịrị: “Ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Otu onye ọzọ dere banyere ndị so dee Bible, sị: “Mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 Pita 1:21.

Nke a debere ndị ahụ dere ya n’ọkwá nke ndị na-eme ndepụta, ma ọ bụ ndị odeakwụkwọ, ndị Chineke chịkwara ma ọ bụ duzie. Dị ka Bible kwuru, a na-enyekarị onye ahụ na-ede ihe ohere ịhọrọ okwu ndị ọ ga-eji kwupụta ihe ọmụma ndị ahụ Chineke na-enye ya. (Habakuk 2:2) Ọ bụ ya mere e ji nwee ụdị dị iche iche nke ide ihe n’ime Bible. Ma ọ bụ Chineke duziri ihe nile e dere.

N’ezie, nanị na ndị ahụ dere ya kwuru na ọ bụ mmụọ Chineke kpaliri ha abụghị ihe nnwapụta nke na-egosi na Bible bụ ozi Onye Okike ahụ ziteere ihe a kpọrọ mmadụ. Otú o sina dị, e kwesịrị ịhụ ma Bible ò sitere n’aka Onye ahụ Kasị Ihe Nile Elu ma ọ bụ na o siteghị site n’iji nlezi anya nyochaa akwụkwọ ahụ n’onwe ya n’enweghị mkpebi ọ bụla e buworo ụzọ mee. Bible ọ̀ na-enye ihe àmà nke ịbụ ihe sitere n’obi Chineke? N’eziokwu, ànyị pụrụ iji obi ike kwuo na Bible bụ ihe dị nsọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya