Jee Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya”!
ỤBỌCHỊ atọ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nke ọzụzụ sitere na Bible na-echere gị. Nọrọ n’ebe ahụ n’elekere 9:20 n’ụtụtụ Friday mgbe mgbakọ ahụ ga-eji olu ụtọ malite. Rite uru n’okwu mmeghe ahụ bụ, “N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Leba Anya n’Iwu Zuru Okè nke Nnwere Onwe?,” na akụkụ mmechi nke nnọkọ ụtụtụ ahụ, bụ́ okwu bụ isi nke isiokwu ya bụ: “Nzube na Iji Nnwere Onwe Chineke Nyere Anyị Na-eme Ihe.”
N’ehihie Friday, a ga-enye ndị Kraịst ndụmọdụ ka ha rụzuo ọrụ ha dị ka ndị na-ejere Chineke ozi. “Iji Ọrụ n’Aka—n’Ọrụ Nile Nwụrụ Anwụ ka ọ̀ bụ n’Ozi Jehova?” na “Ndị Nweere Onwe Ha ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ” bụ abụọ n’isiokwu ndị a ga-atụle. A ga-enye agbamume mmadụ iji nnwere onwe ya mee ihe n’ijere Jehova ozi site n’otu ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri zuru ezu mee. Ọ ga-adabere n’ahụmahụ Ezra na ndị ya na ha so, bụ́ ndị si Babilọn lọghachite na Jerusalem na 468 T.O.A. ime ka ụlọ nsọ Chineke maa mma.
Nnọkọ ụtụtụ Saturday ga-enwe otu usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke isiokwu ya bụ, “Nnwere Onwe nke Nwere Ibu Ọrụ n’Ime Ezinụlọ.” Mgbe e kwusịrị okwu ahụ na-enyocha obi nke bụ “Mee Ka I Nwere Onwe Gị Ijere Jehova Ozi,” a ga-ekwu okwu metụtara nraranye na ime baptism ndị Kraịst. N’ehihie, ọtụtụ ndị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-echere okwu ahụ bụ “Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?” Nnọkọ ahụ ga-eji otu isi ihe nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ ga-enye ndị nile hụrụ nnwere onwe n’anya ọṅụ, wee mechie.
I kwesịrị ịnọ ya n’ụtụtụ Sunday ịnụrụ usoro isiokwu ahụ nwere akụkụ atọ nke bụ “Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ.” Nke a ga-atụle ilu Jisọs nke ụgbụ na azụ ahụ, tụleekwa òkè anyị pụrụ ikere n’imezu ya. Nnọkọ nke ụtụtụ ga-emechi site n’isiokwu ndị ahụ dị mkpa, bụ́ “Ịmụrụ Anya na ‘Mgbe Ọgwụgwụ’” na “Ònye Ga-agbanarị ‘Mgbe Ahụhụ’?” E mesịa, n’ehihie, ị gaghị achọ ka okwu ihu ọha ahụ gafenahụ gị, nke isiokwu ya bụ “Ịnabata Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Nnwere Onwe.” Tupu e kwuo okwu mmechi na-akpali akpali, a ga-enwe ntụle nke isiokwu Ụlọ Nche a ga-amụ maka izu ahụ. Jiri mbipụta magazin gị nke a ga-amụ n’izu ahụ bịa.
N’ime ọnwa November na December 1991, na January 1992, e mere ndokwa inwe 66 mgbakọ n’ime Nigeria nanị, ya mere, a ga-enwe nke na-adịghị anya site n’ebe i bi. Jụta Ndịàmà Jehova bi n’ógbè unu oge na ebe a ga-anọ mee nke kasị dịrị gị nso.
Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1991
NOVEMBER 8-10, 1991
IKOT AKAN 1 (Efik)
MGBOKO UMUORIA 1 (Igbo)
OTTA 1 (Bekee)
OYEDE 1 (Isoko)
ULI 1 (Igbo)
NOVEMBER 15-17, 1991
AKURE 1 (Yoruba)
IKOT AKAN 2 (Efik)
KADUNA (Bekee, Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 2 (Igbo)
OTTA 2 (Yoruba)
OYEDE 2 (Isoko)
ULI 2 (Igbo)
NOVEMBER 22-24, 1991
AKURE 2 (Yoruba)
JOS (Bekee, Hausa)
MGBOKO UMUORIA 3 (Bekee)
OTTA 3 (Bekee)
ULI 3 (Igbo)
DECEMBER 6-8, 1991
AKURE 3 (Yoruba)
BADAGRY (Gun)
IBADAN 1 (Yoruba)
IGWURUTA ALI 1 (Bekee, Ikwerre)
IKOT EKPENE 1 (Efik)
MGBOKO UMUORIA 4 (Igbo)
OTTA 4 (Yoruba)
ULI 4 (Igbo)
DECEMBER 13-15, 1991
AKURE 4 (Bekee)
BENIN CITY 1 (Edo, Owan)
CALABAR 1 (Efik)
IBADAN 2 (Yoruba)
IGWURUTA ALI 2 (Bekee)
IKOT EKPENE 2 (Efik)
ILESHA 1 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 5 (Igbo)
OTTA 5 (Bekee)
UBOGO 1 (Bekee, Okpe)
ULI 5 (Igbo)
UYO 1 (Bekee)
DECEMBER 20-22, 1991
AGBOR 1 (Kwale, Aniocha)
BENIN CITY 2 (Edo, Ishan)
CALABAR 2 (Efik)
IBADAN 3 (Bekee)
IGWURUTA ALI 3 (Abua, Ogoni)
IKOT EKPENE 3 (Efik)
ILESHA 2 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 6 (Igbo)
OKITIPUPA 1 (Yoruba)
OTTA 6 (Yoruba)
UBOGO 2 (Ijaw, Itsekiri)
ULI 6 (Bekee)
UYO 2 (Efik)
JANUARY 3-5, 1992
AGBOR 2 (Bekee, Ika)
BENIN CITY 3 (Bekee)
CALABAR 3 (Bekee)
ILESHA 3 (Yoruba)
KATSINA ALA (Bekee, Tiv)
MGBOKO UMUORIA 7 (Igbo)
OKITIPUPA 2 (Yoruba)
OTTA 7 (Bekee)
UBOGO 3 (Urhobo)
ULI 7 (Igbo)
UYO 3 (Efik)
JANUARY 10-12, 1992
BENIN CITY 4 (Bekee)
KATSINA ALA (Bekee)
MGBOKO UMUORIA 8 (Igbo)
OTTA 8 (Yoruba)
UBOGO 4 (Urhobo)
UYO 4 (Efik)
JANUARY 17-19, 1992
OTTA 9 (Yoruba)