Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 31
  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Teta!—2000
  • Ị̀ Dị Njikere Ịga?
    Teta!—2005
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 31

Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?

N’ime afọ gara aga, ihe karịrị mmadụ 8,700,000 n’ụwa nile gara Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke Ndịàmà Jehova. Ị̀ ga-aga otu n’ime Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke”? E ji ọṅụ na-akpọ gị òkù.

N’ọtụtụ ebe, mgbakọ ahụ ga-eji usoro ihe omume nke olu ụtọ malite na 9:20 n’ụtụtụ Friday. Nnọkọ mmeghe ga-ewepụta okwu na-agba ume bụ́ “Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?” Nke a ga-agụnye ihe ọmụma anyị pụrụ iji nyere ọtụtụ nde ndị ọzọ aka ime ihe Chineke na-achọ.

Okwu a ga-ekwu n’ehihie bụ́ “Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ” ga-akwadebe ndị bịara mgbakọ ikere òkè n’ụzọ dị irè karị n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, usoro isiokwu nwere akụkụ abụọ bụ́ “Kpachara Anya Maka Ọnyà Ndị Zoro Ezo nke Ntụrụndụ” ga-adọ aka ná ntị banyere ọnyà ndị mmụọ ọjọọ a ga-ezere. Usoro ihe omume nke Friday ga-eji okwu dị mkpa bụ́ “Iji Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-akwado Izi Ezi nke Okwu Chineke” mechie.

Nnọkọ ụtụtụ Saturday ga-eji usoro isiokwu nwere akụkụ atọ bụ́ “Ndị Ozi Na-eweta Ozi Ọma nke Udo” mesie ịdị mkpa nke ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ike. Okwu ikpeazụ nke nnọkọ ahụ ga-abụ nke nraranye na baptism, ime ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism ga-esochikwa.

Okwu a ga-ekwu n’ehihie Saturday bụ́ “Na-atụle Echiche Jehova n’Ihe Dị Iche Iche” ga-aza ajụjụ ọtụtụ ndị jụworo n’isiokwu ndị dị ọhụrụ. Ị ga-anụ ụtọ usoro isiokwu ahụ na-ekpo obi ọkụ nwere akụkụ abụọ bụ́ “Chineke nke Udo Na-elekọta Gị.” Mgbe ahụ a ga-anụ ụtọ ihe pụrụ iche n’oge okwu mmechi nke nnọkọ ahụ, “Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ.”

Usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke ụtụtụ Sunday, bụ́ “Ịmata Ụdị Ndị Ozi Bụ Ndị Ọma Ya,” ga-eme ka isiokwu mgbakọ ahụ pụta ìhè site n’iwepụta ihe mmụta dị n’ihe nlereanya nke ndị amụma Bible. Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-emechi site n’ihe nkiri a ga-eji ejiji zuru ezu mee, bụ́ nke ga-ewepụta ihe mmụta bara uru site n’ihe ndekọ Bible banyere Onyeikpe Gideọn.—Ndị Ikpe 6:11–8:28.

Nnọkọ ikpeazụ nke mgbakọ ahụ n’ehihie Sunday ga-enwe okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Ezi Udo n’Ikpeazụ!—Site n’Olee Ebe?” N’ikpeazụ, a ga-eji okwu na-akpali akpali bụ́ “Ịga n’Ihu Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke” mechie mgbakọ ahụ.

Ebe ọ bụ na e dokwara 104 mgbakọ na Nigeria, o yikarịrị ka a ga-eme otu na nso nso ebe i bi. Jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị maka oge na ebe a ga-enwe mgbakọ nke dịkarịsịrị gị nso. Mbipụta Teta! nke June 8, depụtasịrị ebe ndị a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya