Ofufe nke Chi Nne Ọ̀ Ka Dị Adị?
OFUFE nke chi nne ka na-aga n’ihu n’oge ndị Kraịst mbụ. Pọl onyeozi zutere ya n’Efesọs nke dị n’Asia Minor. Dị ka ọ dị n’Atens, bụ́ obodo ọzọ nke na-efe chi nwanyị ofufe, ọ gbawo àmà nye “Chineke onye kere ụwa,” bụ́ Onye Okike ahụ dị ndụ, onye ‘na-eyighị ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha, ma ọ bụ nkume, ihe a pịrị apị site na nkà na ihe dị n’obi mmadụ.’ Nke a karịrị ihe ndị Efesọs ahụ ga-anakwere, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-efe chi nne ahụ bụ Artemis. Ndị na-achọta ihe ha ga-eri site n’imebe ụlọ arụsị nta nke chi nwanyị ahụ kpaliri ọgba aghara. Ruo ihe dị ka hour abụọ, ìgwè mmadụ tiri mkpu, sị: “Daịana [“Artemis,” NW] nke ndị Efesọs dị ukwuu.”—Ọrụ 17:24, 29; 19:26, 34.
Artemis nke Efesọs
Ndị Grik fekwara otu ụdị Artemis ofufe, ma a pụrụ ikwu nanị na o yitụrụ Artemis nke ahụ a na-efe n’Efesọs. Artemis nke ndị Grik bụ chi nwanyị na-amaghị nwoke nke ịchụ nta na ịmụ nwa. Artemis nke Efesọs bụ chi nwanyị nke ike ọmụmụ nwa. E lere nnukwute ụlọ nsọ ya dị n’Efesọs anya dị ka otu n’ime ihe ebube asaa dị n’ụwa. Ihe ọkpụkpụ ya, nke e chere na o si n’eluigwe daa, sere onyinyo ya dị ka ihe bụ ezi ihe atụ nke ike ọmụmụ nwa, n’ihi na obi ya jupụtara n’ọtụtụ ahịrị nke ara ndị nwere ọdịdị nke àkwá. Ọdịdị pụrụ iche nke ara ndị a emewo ka e nye nkọwa dị iche iche, dị ka nke bụ na ha nọchiri anya ụyọkọ àkwá dị iche iche ma ọ bụ ọbụna mkpụrụ amụ oké ehi. N’agbanyeghị ihe bụ nkọwa ya, o doro anya na o sere onyinyo ike ọmụmụ nwa.
N’ụzọ na-akpali mmasị, dị ka akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica si kwuo, ihe ọkpụkpụ mbụ nke chi nwanyị nke a “bụ nke e ji ọlaedo, osisi ebony, ọlaọcha, na nkume ojii, mee.” Otu ihe ọkpụkpụ a ma ama nke Artemis nke Efesọs ahụ, nke sitere na narị afọ nke abụọ O.A., gosiri ya dị ka nke nwere ihu, aka, na ụkwụ, dị ojii.
A na-ebu ihe oyiyi nke Artemis na-agagharị n’okporo ụzọ dị iche iche. Onye ọkà mmụta Bible bụ R. B. Rackham dere, sị: “N’ime ụlọ nsọ [nke Artemis ka] a kwakọbara . . . ihe oyiyi, ihu arụsị, na arịa nsọ dị iche iche nke ya, ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha mee, ndị a na-eburu n’oge oké ememe dị iche iche gaa n’ime obodo, lọghachikwa, n’oké ememe nke ịkwụ n’ahịrị.” Ememe ndị a na-adọta ọtụtụ narị puku ndị na-abịa njem ofufe site n’Asia Minor dum. Ha na-azụrụ ihu arụsị nta dị iche iche nke chi nwanyị ahụ, na-enyekwa ya otuto dị ka nke dị ukwuu, nne ha ukwu, eze nwanyị, nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, “onye na-anụ, na-anarakwa ekpere.” Na gburugburu ebe dị otú ahụ, ọ chọrọ obi ike dị ukwuu ka Pọl na ndị Kraịst oge ochie ndị ahụ nwee ike ito “Chineke onye kere ụwa,” kama ito chi nwoke na chi nwanyị dị iche iche ndị e jiri “ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha, ma ọ bụ nkume,” mee.
Site na Chi Nne gaa na “Nne nke Chukwu”
Ọ bụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs ka Pọl onyeozi buuru amụma banyere ndapụ n’ezi ofufe. Ọ dọrọ aka ná ntị na ndị dapụrụ n’ezi ofufe ga-ebilite ma kwuo “ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ.” (Ọrụ 20:17, 28-30) Otu n’ime ihe ize ndụ ndị nọgidere na-adị n’Efesọs bụ nlaghachi gaa n’ofufe nke chi nne. Nke a ò mere eme n’ezie?
Anyị na-agụ n’akwụkwọ New Catholic Encyclopedia, sị: “Dị ka ebe bụ isi a na-aga njem ofufe, e lere Efesọs anya dị ka ebe e liri Jọn [onyeozi]. . . . Omenala ọzọ, nke nzukọ Kansụl nke Efesọs ahụ (431) hụtakwara, jikọrọ Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Dị Nsọ na St. Jọn. A kpọrọ ụlọ ukwu basịlịka ahụ a nọ n’ime ya mee nzukọ Kansụl ahụ, Chọọchi nke Meri.” Akwụkwọ ndị Katọlik ọzọ (Théo—Nouvelle encyclopédie catholique) kwuru okwu banyere “omenala nke ọ pụrụ ịbụ na o mere eme” nke bụ na Meri soro Jọn bịa n’Efesọs, bụ́ ebe ọ nọgidere ruo mgbe ọ nwụrụ. N’ihi gịnị ka njikọ nke a e chere na ọ dị n’etiti Efesọs na Meri ji dị anyị mkpa taa?
Ka akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica zaa: “Oké nsọpụrụ a na-enye nne nke Chukwu natara nkwado ya mgbe Chọọchị ndị Kristian ghọrọ chọọchị nke ọchịchị nke dị n’okpuru Constantine, mgbe ìgwè ndị ọgọ mmụọ nubatakwara na chọọchị. . . . Omume nsọ nsọ ha na echiche ha n’ihe banyere okpukpe abụwo nke e wulitere ruo ọtụtụ puku afọ site n’ofufe nke chi ‘nne ukwu’ ahụ na ‘nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke nke bụ chi,’ bụ́ ihe omume nke malitere ịdị adị laarị azụ site n’okpukpe ochie ndị a ma ama nke Babylonia na Asiria.” Olee ebe ọzọ ka mma a pụrụ inwe karịa Efesọs maka ime ka ofufe nke chi nne “ghọọ nke ndị Kristian”?
Otú a, ọ bụ n’Efesọs, na 431 O.A., ka ihe ahụ a kpọrọ nzukọ okpukpe nke atọ kwupụtara na Meri bụ “Theotokos,” bụ́ okwu Grik nke pụtara “onye mụrụ Chukwu,” ma ọ bụ “Nne nke Chukwu.” Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ojiji Chọọchị ahụ jiri aha nke a na-eme ihe nyere oké mkpali maka ito uto e nwere na narị afọ ndị sochirinụ nke ozizi na nsọpụrụ ndị metụtara Meri.”
A ka pụrụ ịhụ mkpọmkpọ ebe nke “Chọọchị nke Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke” taa, bụ́ ebe a nọrọ nwee nzukọ kansụl ahụ, n’ebe ahụ Efesọs oge ochie dịbu. A pụkwara ije leta otu ụlọ ekpere nke, dị ka otu omenala si kwuo, bụ ụlọ ebe Meri biri, nọrọkwa wee nwuo. Pope Paul nke Isii jere leta ihu arụsị ndị a nke Meri n’Efesọs na 1967.
Ee, Efesọs bụ ebe bụ isi maka mgbanwe nke ofufe chi nne nke ndị ọgọ mmụọ, bụ́ ụdị ahụ Pọl zutere n’ime narị afọ mbụ, gaa n’oké nsọpụrụ a na-enye Meri dị ka “Nne nke Chukwu.” Ọ bụ n’ụzọ bụ isi site ná nsọpụrụ a na-enye Meri ka ofufe chi nne jiworo nọgide n’ala dị iche iche nke Krisendọm.
Ofufe nke Chi Nne Ka Dị Adị
Akwụkwọ Encyclopædia of Religion and Ethics hotara na onye ọkà mmụta Bible bụ́ W. M. Ramsay na-ekwu na n’ime “narị afọ nke ise, nsọpụrụ a na-enye Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke n’Efesọs bụ ụdị [e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ] nke ofufe Anatolia ochie nke ndị ọgọ mmụọ nke Nne bụ Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke.” Akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology kwuru, sị: “Echiche ndị Katọlik nke ‘nne nke Chukwu’ na nke ‘eze nwanyị nke eluigwe,’ ọ bụ ezie na ọ dị ọhụrụ karịa A[gba] Ọ[hụrụ], na-ezo aka ná mmalite nke gbanyere mkpọrọgwụ n’okpukpe na akụkọ ihe mere eme ndị meworo ochie karị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. . . . N’oké nsọpụrụ a na-enye Meri mgbe oge gasịrị, e nwere ihe dị iche iche yiri ofufe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nke nne bụ chi.”
Myirịta ndị ahụ hiri nne nke ukwuu, bụrụkwa ndị metụtara akụkụ ihe dị iche iche nke ukwuu nke na ọ bụghị ihe ndaba efu. Myirịta dị n’etiti ihe ọkpụkpụ nne na nwa nke Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke na ihe ọkpụkpụ nke chi nwanyị dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ, dị ka nke Isis, apụghị ịdị ma bụrụ nke mmadụ na-ahụtaghị. Ọtụtụ narị ihe ọkpụkpụ na ihe osise nke Madonna Ojii ahụ dị na chọọchị Katọlik dị iche iche gburugburu ụwa aghaghị nnọọ ime ke e cheta ihe ọkpụkpụ nke Artemis. Akwụkwọ ahụ bụ Théo—Nouvelle encyclopédie catholique kwuru banyere Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Ojii ndị a, sị: “O yiri ka hà bụ ụzọ e si ebufere Meri ihe fọdụrụ n’ofufe ahụ ọha mmadụ na-enye Daịana [Artemis] . . . ma ọ bụ Cybele.” Ịkwụ n’ahịrị n’Ụbọchị Mbugo n’Eluigwe nke Ahụ Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nwekwara ihe ha yiri n’ịkwụ n’ahịrị ndị a na-eme iji sọpụrụ Cybele na Artemis.
Utu aha ndị ahụ a na-enye Meri na-echetara anyị chi nne dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ. A kpọrọ Ishtar “Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Dị Nsọ,” “Nne m Ukwu,” na “nne dị ebere onye na-anụ ekpere.” A kpọrọ Isis na Astarte “Eze Nwanyị nke Eluigwe.” A kpọrọ Cybele “Nne nke ndị nile Dị Ngọzi.” A kpọchara Meri utu aha ndị a, na-enwe ụmụ obere nhazigharị dị iche iche.
Nzukọ Vatican nke Abụọ gbara ume ofufe nke “Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Dị Ngọzi.” Pope John Paul nke Abụọ bụ onye a maara nke ọma maka oké nsọpụrụ ọ na-enye Meri. N’ọtụtụ njem ndị ọ gara, ọ dịghị ekwe ka ohere ọ bụla gafenahụ ya nke ije leta ihu arụsị dị iche iche nke Meri, gụnyere nke Madonna Ojii ahụ dị na Czestochowa, na Poland. O tinyere ụwa dum n’aka Meri. N’ihi ya, ọ bụghị ihe iju anya na n’okpuru isiokwu bụ “Chi Nne,” Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica dere, sị: “E jiwokwa aha ahụ mee ihe banyere ihe oyiyi ndị dịgasị nnọọ iche iche dị ka ndị ahụ a kpọrọ Venus Dị Iche Iche nke Oge Ochie na Meri Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke.”
Ma, ọ bụghị nanị ofufe ndị Roman Katọlik na-enye Meri bụ ụzọ ofufe chi nne siworo nọgide ruo n’oge anyị a. N’ụzọ na-akpali ọchịchọ ịmara ihe, ndị na-akwado òtù ọdịmma ndị inyom ebipụtawo ọtụtụ akwụkwọ banyere ofufe chi nne dị iche iche. Ha na-eche na a kpagbuwo ndị inyom n’ụzọ dị njọ nke ukwuu n’ime ụwa nke a nke ndị ikom na-achị n’aka ike, na ofufe nke na-eche ihu n’ebe ndị inyom nọ na-egosipụta ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ maka ụwa nke na-enweghị ime ihe ike hie nne. O yikwara ka hà na-eche na ụwa nke oge a ga-abụ ebe dị mma karị, dịrịkwa n’udo karị ma a sị na ọ na-eche echiche karị n’ihe banyere ọdịmma ndị inyom.
Otú ọ dị, ofufe nke chi nne ewetaghị udo n’ime ụwa oge ochie, ọ gaghị ewetakwa udo taa. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị karị n’oge a, n’ezie ọtụtụ nde mmadụ ndị so Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, kwenyesiri ike na ọ bụghị Meri ga-azọpụta ụwa nke a, n’agbanyeghị otú ha si na-akwanyere ya ùgwù, hụkwa ya n’anya dị ka nwanyị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ, onye nwere ihe ùgwù dị ebube nke ịmụ na ịzụlite Jisọs. Ndịàmà Jehova ekwenyeghịkwa na Òtù Ntọhapụ Ndị Inyom pụrụ iweta ụwa nke dị n’udo, ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ihe ndị ọ na-achọ ka e mee ziri ezi. Maka ime nke ahụ, ha na-elegara Chineke ahụ anya, nke Pọl kọwaara ndị Atens na ndị Efesọs, bụ́ “Chineke onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya.” (Ọrụ 17:24; 19:11, 17, 20) Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nke a, onye aha ya bụ Jehova, ekwewo nkwa ụwa ọhụrụ dị ebube nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya,’ anyị pụkwara iji obi ike dabere ná nkwa ya.—2 Pita 3:13.
N’ihe banyere ihe bụ echiche Bible banyere ọnọdụ onye bụ nwanyị n’ihu Chineke na mmadụ, a ga-elebakwuru isiokwu nke a anya n’ime magazin nke a.
[Foto dị na peeji nke 5]
ASHTỌRET Chi nwanyị nke ndị Kenean nke mmekọahụ na agha
[Ebe e si Nweta Foto]
Musée du Louvre, Paris
[Foto dị na peeji nke 6]
ARTEMIS Chi nwanyị ike ọmụmụ nwa nke Efesọs
[Ebe e si Nweta Foto]
Musei dei Conservatori, Rome
[Foto dị na peeji nke 7]
“NNE NKE CHUKWU” nke Krisendọm
[Ebe E Si Nweta Foto]
Chartres Cathedral, France