Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/15 p. 27-30
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ịdị Umeala n’Obi?
  • Ọ Ghaghị Ịbụ nke Ziri Ezi
  • Ụzọ Jehova Si Ele Ihe Anya
  • Chineke na Kraịst Na-egosipụta Ya
  • Abamuru nke Ịdị Umeala n’Obi
  • Ịdị Umeala n’Obi na Nzukọ Chineke
  • Ịdị Umeala n’Obi na Inye Ọzụzụ
  • Nọgide Na-eyikwasị Ịdị Umeala n’Obi
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/15 p. 27-30

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?

ONYE America ahụ na-ede akwụkwọ, bụ́ Edgar Allan Poe ka gụsịịrị ndị enyi ya ụfọdụ akụkọ ọhụrụ o dere. Ha ji ụzọ egwuregwu gwa ya na o jiri aha onye a kọrọ akụkọ banyere ya mee ihe ọtụtụ ugbo. Olee ụzọ Poe si meghachi omume? Otu n’ime ndị enyi ya chetaghachiri, sị: “Mmụọ ya nke dị mpako enweghị ike ịnagide nkatọ ihu ọha dị otú ahụ, ya mere, n’oké iwe, tupu ndị enyi ya enwee ike igbochi ya, ọ tụbara ibe akwụkwọ nile ahụ n’ime ọkụ na-enwu enwu.” Otú ahụ ka e si tụfuo akụkọ nke “na-atọ ochị nke ukwuu, nke na-enweghị àgwà ahụ e ji mara ya . . . bụ obi ịda mbà.” Inwe obi umeala gaara azọpụtaworị akụkọ ahụ.

Ọ bụ ezie na ịdị mpako na-eme ka ụmụ mmadụ mee ihe amamihe na-adịghị na ha, o jupụtara ebe nile n’elu ụwa. Ma ndị ohu Jehova agaghị adị otú ahụ. Ha aghaghị iyikwasị uwe ahụ a kwara nke ọma nke inwe obi umeala.

Gịnị Bụ Ịdị Umeala n’Obi?

Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ọmarịcha uwe ndị Kraịst ahụ nke bụ ịdị umeala n’obi dị mgbe o degaara ndị kwere ekwe ibe ya nọ n’obodo oge ochie ahụ bụ Kọlọsi akwụkwọ. Ọ gbara ha ume, sị: “Dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.

Ee, ịdị umeala n’obi bụ “obi dị umeala.” Ọ bụ “inwe uche dị umeala; adịghị mpako; iweda onwe onye ala.” Onye dị umeala n’obi dị “nwayọọ ná mmụọ; adịghị mpako.” Ọ “na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’ụzọ dị omimi.” (The World Book Dictionary, Mpịakọta I, peji 1030) Ịdị umeala n’obi abụghị ịbụ onye ụjọ ma ọ bụ onye na-adịghị ike. N’eziokwu, mpako na-egosipụta adịghị ike, ebe igosipụta umeala n’obi na-achọkarị obi ike na ike.

N’ime Akwụkwọ nsọ, okwu Hibru nke a sụgharịrị ịbụ ‘weda onwe gị n’ala’ pụtara n’ụzọ nkịtị ‘zọda onwe gị.’ Otú a, onye amamihe ahụ nke dere akwụkwọ Ilu nyere ndụmọdụ, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na . . . e jiwo okwu nile nke ọnụ gị nwụde gị . . . napụta onwe gị, jee, kwee ka a zọtọọ gị n’ụkwụ [“weda onwe gị n’ala,” NW], rịọchie mmadụ ibe gị ntị.” (Ilu 6:1-3) Ya bụ, wezụga mpako, nakwere mmejọ i meworo, doziekwa okwu.

Ọ Ghaghị Ịbụ nke Ziri Ezi

Ọ bụghị ndị nile yiri ka hà nwere obi umeala dị umeala n’obi n’ezie. Ụfọdụ ndị na-eme ka à ga-asị na ha nwere obi umeala pụrụ ịbụ n’ezie ndị dị mpako, ndị ga-emekwa ihe nile ha nwere ike ime iji nweta ihe ha na-achọ. Ọzọkwa, e nwere ndị na-eyikwasị ihe oyiyi ụgha nke ịdị umeala n’obi iji kpalie mmasị ndị ọzọ n’ebe ha nọ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi zutere ụfọdụ ndị gosipụtara ‘ịdị umeala n’obi ụgha,’ o gosikwara na onye ọ bụla nke na-eme nke a bụ n’ezie “onye uche nke anụ ahụ ya na-afụli elu n’efu.” Onye dị otú ahụ chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ya inweta ihu ọma Chineke dabeere n’eziokwu ahụ nke bụ ma ò riri, ṅụọ, ma ọ bụ bitụ ihe ụfọdụ dị iche iche aka ma ọ bụ debe ụbọchị okpukpe dị iche iche ma ọ bụ na o meghị ihe ndị ahụ. N’eziokwu, ọ pụrụ iyiworị onye na-eme nsọ nsọ, onye nwekwara obi dị umeala, ma ịdị umeala n’obi ụgha ya abaghị uru ọ bụla. (Ndị Kọlọsi 2:18, 23) N’eziokwu, o dujere ya n’iche na ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ bụ nke a na-enye ndị jụrụ ihe onwunwe. Ọ na-emekwa ka e nwee otu ụdị zoro ezo nke ịhụ ihe onwunwe n’anya n’ihi na mgbochi nile nke ihe ụtọ nke ahụ na-elekwasị anya n’ihe onwunwe ndị onye ahụ na-ekwupụta na ya enweghị mmasị na ha.

N’aka nke ọzọ, ezi ịdị umeala n’obi na-egbochi mmadụ igosipụta ịdị mkpa nke onwe onye n’uwe oyiyi, ihe ịchọ mma, na ụzọ ịdị ndụ. (1 Jọn 2:15-17) Mmadụ nke yikwasịrị uwe nke ịdị umeala n’obi adịghị adọrọ uche bịa n’ebe onwe ya nọ ma ọ bụ n’ihe ndị ọ pụrụ ime. Kama nke ahụ, ịdị umeala n’obi na-enyere ya aka imeso ndị ọzọ n’ụzọ na-egosi ichebara ha echiche nakwa ịhụ onwe ya dị ka Chineke si ahụ ya. Gịnị bụkwa ụzọ dị otú ahụ?

Ụzọ Jehova Si Ele Ihe Anya

Mgbe Samuel onye amụma na-akwadebe ite eze ọhụrụ mmanụ maka mba Israel, o chere na nwa Jesi bụ Elaịab bụ onye Jehova họpụtara. Ma Chineke gwara Samuel, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: n’ihi na Jehova [“Chineke,” NW] adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya n’ahụ, ma Jehova na-ele obi.” A jụrụ ụmụ ndị ikom asaa nke Jesi. Onye Chineke họpụtara bụ Devid, onye gosiri onwe ya ịbụ nwoke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye dịkwa umeala n’obi.—1 Samuel 13:14; 16:4-13.

Uwe nke ịdị umeala n’obi na-echebe anyị pụọ n’ịdị mpako, na idebe onwe anyị n’ebe anyị na-erughị—ịbụ ndị Chineke na-anwapụtaghị. Ọ “na-edo onwe ya imegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (Jemes 4:6) E gosipụtara ụzọ o si ele ihe anya n’okwu ndị ahụ nke onye ọbụ abụ: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.” (Abụ Ọma 138:6; 1 Pita 5:5, 6) Ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka ndị ohu ya pụtara ìhè site n’ajụjụ ndị a nke a jụrụ na Maịka 6:8: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”

Chineke na Kraịst Na-egosipụta Ya

Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji na-atụ anya ka anyị gosipụta ịdị umeala n’obi! Ọ bụ otu n’ime àgwà ndị ya onwe ya nwere. Mgbe Chineke napụtasịrị ya site n’aka ndị iro ya, Devid bụrụ abụ, sị: “Ị [Jehova] nyewokwa m ọta nzọpụta gị: . . . Umeala n’obi nke gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (Abụ Ọma 18:35; 2 Samuel 22:1, 36) Ọ bụ ezie na Jehova nọ n’ebe kasị dịrị elu n’eluigwe, ọ “na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu; ime ka ya na ndị a maara aha ha nọkọọ.” (Abụ Ọma 113:5-8) Chineke na-egosi ịdị umeala n’obi site n’igosi ụmụ mmadụ na-emehie emehie obi ebere. Ụzọ o si emeso ndị mmehie na onyinye o nyere Ọkpara ya dị ka ihe ịchụ àjà maka mmehie bụcha ngosipụta nke ịdị umeala n’obi, ịhụnanya na àgwà ya ndị ọzọ.—Ndị Rom 5:8; 8:20, 21.

Jisọs Kraịst, onye bụ “onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi,” setịpụrụ ihe nlereanya kasị ukwuu nke ịdị umeala n’obi dị ka mmadụ. (Matiu 11:29) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; onye ọ bụla nke ga-ewedakwa onwe ya, a ga-eweli ya elu.” (Matiu 23:12) Nke ahụ abụghị okwu efu. N’anyasị nke ụbọchị ahụ tupu ọnwụ ya, Jisọs sara ụkwụ ndị ozi ya, na-eje ozi nke ọ bụ ndị ohu na-ejekarị. (Jọn 13:2-5, 12-17) Jisọs jiri obi umeala jeere Chineke ozi tupu ọ bịa n’elu ala, o gosipụtawokwa ịdị umeala n’obi eri mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa n’ọnọdụ dị elu n’eluigwe. Ya mere, Pọl nyere ndị kwere ekwe ibe ya ndụmọdụ ka ha ‘na-ele ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ha onwe ha mma,’ ka ha nweekwa àgwà obi umeala ahụ Jisọs Kraịst nwere.—Ndị Filipaị 2:3, 5-11.

Ebe Chineke na Kraịst na-egosipụta ịdị umeala n’obi, ndị ahụ chọrọ nnwapụta Chineke aghaghịkwa igosipụta àgwà nke a. Ọ bụrụ na anyị afụliwo onwe anyị elu n’oge ụfọdụ, ọ ga-abụ ihe amamihe iweda onwe anyị ala ma rịọ maka mgbaghara Chineke. (Tụleee 2 Ihe Emere 32:24-26.) Kamakwa inwe echiche dị elu banyere onwe anyị, ọ dị mkpa ka anyị tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, nke bụ: “Unu atụkwasịla uche n’ihe dị elu, kama ka ndị ọnọdụ ha dị ala na-adọrọ unu iso ha.” (Ndị Rom 12:16) Ma, olee ụzọ ịdị umeala n’obi pụrụ isi baara anyị na ndị ọzọ uru?

Abamuru nke Ịdị Umeala n’Obi

Otu abamuru nke ịdị umeala n’obi bụ na ọ na-egbochi anyị ịnya isi banyere onwe anyị. Anyị na-esi otú a na-aghara ịkpasu ndị ọzọ iwe, zerekwa imenye onwe anyị ihere ma ọ bụrụ na ihe ndị anyị mezuru akpalighị mmasị ha. Anyị kwesịrị ịnya isi n’ebe Jehova nọ, ọ bụghị n’ebe anyị onwe anyị nọ.—1 Ndị Kọrint 1:31.

Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka inweta nduzi Chineke. Jehova dunyere otu mmụọ ozi ka o wejere Daniel otu ọhụụ n’ihi na onye amụma ahụ wedara onwe ya ala n’ihu Chineke mgbe ọ na-achọ nghọta. (Daniel 10:12) Mgbe Ezra na-akwadebe iduru ndị Jehova pụọ na Babilọn, na-eburu ọlaedo na ọlaọcha dị ukwuu maka iji chọọ ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem mma, ọ kpọsara obubu ọnụ ka ha wee nwee ike iweda onwe ha ala n’ihu Chineke. Gịnị si na nke a pụta? Jehova chebere ha site ná mwakwasị ndị iro n’ogologo njem ahụ dị ize ndụ. (Ezra 8:1-14, 21-32) Dị ka Daniel na Ezra, ka anyị gosipụta obi dị umeala, chọọkwa nduzi Jehova kama ịnọ na-agbalị ịrụzu ọrụ ndị Chineke nyere anyị site n’amamihe na ike nke onwe anyị.

Ọ bụrụ na anyị eyikwasị uwe nke ịdị umeala n’obi, anyị ga na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Dị ka ihe atụ, ụmụntakịrị ndị dị umeala n’obi na-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù, na-erubekwara ha isi. Ndị Kraịst nwere obi dị umeala na-akwanyekwara ndị kwere ekwe ibe ha ùgwù, bụ́ ndị si ná mba ndị ọzọ, ndị nwere ụcha akpụkpọ ahụ dị iche, na ndị nwere ụdị nzụlite dị iche, n’ihi na ịdị umeala n’obi na-eme ka anyị ghara ịdị na-ele mmadụ anya n’ihu.—Ọrụ 10:34, 35; 17:26.

Ịdị umeala n’obi na-akwalite ịhụnanya na udo. Onye nwere obi dị umeala adịghị alụso ndị kwere ekwe ibe ya ọgụ ná mgbalị ọ na-eme iguzobe ihe ndị o chere na ha bụ ihe ndị ruuru ya. Pọl mere nanị ihe na-ewulite mmadụ elu, ọ dịghị emekwa ihe ọ bụla ga-enye akọ na uche nwanna ya nsogbu. (Ndị Rom 14:19-21; 1 Ndị Kọrint 8:9-13; 10:23-33) Ịdị umeala n’obi na-enyekwara anyị aka ịkwalite ịhụnanya na udo site n’ịgbaghara ndị ọzọ mmehie ha megide anyị. (Matiu 6:12-15; 18:21, 22) Ọ na-akpali anyị ijekwuru onye anyị kpasuru iwe, nakwere mmejọ anyị, rịọ mgbaghara ya, meekwa ihe anyị pụrụ ime iji mezie ihe ọ bụla anyị pụrụ imejọworị. (Matiu 5:23, 24; Luk 19:8) Ọ bụrụ na onye anyị kpasuru iwe abịakwute anyị, inwe obi umeala na-akpali anyị idozi okwu ahụ n’udo na ná mmụọ nke ịhụnanya.—Matiu 18:15; Luk 17:3.

Nzọpụta na-adabere n’igosipụta obi dị umeala. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere Chineke, e kwuru, sị: “Ị ga-azọpụtakwa ndị e wedara n’ala: ma anya gị abụọ dịkwasị ndị dị elu, ka i wee mee ka ha dị ala.” (2 Samuel 22:28) Mgbe Eze Jisọs Kraịst ‘na-agba ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume,’ ọ ga-azọpụta ndị ahụ na-eweda onwe ha ala n’ihu ya na Nna ya. (Abụ Ọma 45:4) Ndị ahụ na-egosipụta ịdị umeala n’obi pụrụ ịchọta nkasị obi n’okwu ndị ahụ bụ: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe o kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:3.

Ịdị Umeala n’Obi na Nzukọ Chineke

Ịdị umeala n’obi na-eduru ndị Chineke gaa n’inwe ekele maka nzukọ ya, nọgidekwa na ya dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (Tụlee Jọn 6:66-69.) Ọ bụrụ na e nyeghị anyị ihe ùgwù ije ozi anyị nwere olileanya inweta, ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ikwenyere ndị ahụ nwere ibu ọrụ n’ime ọgbakọ. Anyị ijikwa obi dị umeala na-ekwenye na-esetịpụ ezi ihe nlereanya.

N’aka nke ọzọ, inwe obi dị umeala na-echebe anyị pụọ n’igosipụta mpako n’ihe banyere ihe ùgwù ije ozi ndị anyị nwere n’etiti ndị Jehova. Ọ na-egbochi anyị ịchọ otuto maka ọrụ ndị anyị nweworo ihe ùgwù ịrụ n’ime nzukọ Chineke. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị na-eje ozi dị ka ndị okenye, ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka iji nwayọọ na-emeso ìgwè atụrụ Chineke.—Ọrụ 20:28, 29; 1 Pita 3:8.

Ịdị Umeala n’Obi na Inye Ọzụzụ

Uwe nke ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ịnara ọzụzụ ma ọ bụ ahụhụ. Ndị dị umeala n’obi adịghị ka Eze Uzaịa nke Juda, onye obi ya fụliri elu nke ukwuu nke na o weghaara ọrụ onye isi nchụaja. O ‘mekpuru emekpu megide Jehova, wee baa n’ụlọ ukwu ahụ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụ àjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.’ Mgbe oké iwe were Uzaịa megide ndị nchụaja ahụ maka ịgbazi ya olu, e ji ọrịa ekpenta tie ya ihe otiti. Lee nnọọ oké ụgwọ nke ahụ bụ ịkwụ maka adịghị umeala n’obi! (2 Ihe Emere 26:16-21; Ilu 16:18) Eyikwala Uzaịa mgbe ọ bụla wee kwere ka mpako gbochie gị ịnara ọzụzụ sitere n’aka Chineke site n’Okwu ya na nzukọ ya.

N’ihe banyere nke a, Pọl gwara ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ndị Hibru, sị: “Unu echezọsịwokwa okwu nkasi obi ahụ, nke na-agwa unu okwu dị ka à na-agwa ụmụ ndị ikom, sị, Nwa m, agụla ya n’ihe nta, bụ́ ozizi Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-ezi gị site n’inye gị ahụhụ, adakwala mba mgbe ọ na-atụ gị mmehie gị n’anya; n’ihi na onye Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] hụrụ n’anya ka ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ, ọ na-apịakwa nwa ọ bụla ọ na-anata ụtarị. . . . Ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e wereworo ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:5-11) Chetakwa na “ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ.”—Ilu 6:23.

Nọgide Na-eyikwasị Ịdị Umeala n’Obi

Lee ka o si dị mkpa ka ndị Kraịst nọgide na-eyikwasị uwe nke ịdị umeala n’obi! Ọ na-akpali anyị ịnọgidesi ike dị ka ndị nkwusa Alaeze, jiri obi dị umeala na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-achọ ndị ahụ ‘e doziworo ịnata ndụ ebighị ebi.’ (Ọrụ 13:48; 20:20) N’eziokwu, ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere Chineke isi n’ụzọ nile, ọ bụ ezie na ndị mmegide dị mpako na-akpọ ụzọ ezi omume anyị asị.—Abụ Ọma 34:21.

N’ihi na ịdị umeala n’obi na-akpali anyị ‘ịtụkwasị Jehova obi anyị nile,’ ọ na-eme ka okporo ụzọ anyị nile guzozie. (Ilu 3:5, 6) N’eziokwu, ọ bụ nanị ma ànyị yikwasịrị ezi àgwà nke a ka anyị pụrụ iso Chineke jee ije n’ezie, nwetakwa nnwapụta na ngọzi ya. Dị ka Jemes onye na-eso ụzọ dere: “Wedanụ onwe unu n’ihu Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], ọ ga-ewelịkwa unu elu.” (Jemes 4:10) Ya mere, ka anyị yikwasị ịdị umeala n’obi, bụ́ ọmarịcha uwe ahụ nke Jehova Chineke haziri.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya