Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 12/1 p. 14-19
  • Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Chineke Dị Obi Umeala
  • Ihe Nlereanya Kraịst nke Obi Umeala
  • Pọl Onyeozi, Ihe Nlereanya Ọma nke Obi Umeala
  • Ihe Nlereanya Ndị nke Oge A
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 12/1 p. 14-19

Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi

“Umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.”—ABỤ ỌMA 18:35.

1. Ihe àmà dị aṅaa nke obi umeala ka a pụrụ ịhụ n’onye bụbu onye isi oche Watch Tower Society n’oge mbụ?

JOSEPH F. RUTHERFORD gbara agba, na-adị ihe karịrị 180 sentimita n’ogologo ma dị arọ ihe karịrị nnọọ 90 kilogram. O nwekwara olu dị ike, nke o jiri mee ihe ọ bụghị nanị ime ka a mara aha Jehova dị ka a na-emebeghị ka a mara ya mgbe ọ bụla ọzọ kamakwa ikpughe aghụghọ nke ndị ndú okpukpe Krisendọm, na-akpọ okpukpe ha “ọnyà na ihe e ji erigbu ndị mmadụ.” Ma n’agbanyeghị otú okwu ndị o kwuru si dị ike, mgbe o so ezinụlọ isi ụlọ ọrụ Betel kpee ekpere, olu ya na-ada nnọọ ka obere nwata nwoke na-agwa papa ya okwu, si otú a na-enye ihe àmà nke ma mmekọrịta chiri anya nke ya na Onye Mere ya na obi umeala ya. Ee, ọ dị umeala n’obi dị ka nwatakịrị.—Matiu 18:3, 4.

2. N’ihe banyere gịnị kpọmkwem ka ndị na-ejere Jehova ozi na-eguzopụ nnọọ iche site ná ndị mmadụ n’ụwa?

2 N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ezi ndị ohu nile nke Jehova Chineke dị umeala n’obi. N’akụkụ nke a ha na-eguzopụ iche site ná ndị ụwa. Taa, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, o jupụtara ná ndị nganga. Ndị ukwu na ndị dike, ndị ọgaranya na ndị gụrụ akwụkwọ, na ọbụna ọtụtụ ndị ogbenye na ndị ihe na-adabacharaghị n’ụzọ ndị ọzọ dị nganga.

3. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mkpụrụ nile nke nganga?

3 Nganga na-akpata oké esemokwu na nhụjuanya. N’ezie, ahụhụ nile dị n’eluigwe na ala malitere n’ihi na otu mmụọ ozi ghọrọ onye mpako, na-achọ ka e fee ya ofufe n’ụzọ dịịrị nanị Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. (Matiu 4:9, 10) Ọzọkwa, onye ahụ nke mere onwe ya Ekwensu na Setan, nwere ihe ịga nke ọma n’ịghọgbute nwanyị mbụ bụ́ Iv, site n’ịdọrọ nganga ya. O kwere ya nkwa na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, ọ pụrụ ịdị ka Chineke n’onwe ya, na-amara ezi ihe na ihe ọjọọ. À sị na ọ dị umeala n’obi, ọ gaara asị, ‘N’ihi gịnị ka m kwesịrị iji chọọ ịdị ka Chineke?’ (Jenesis 3:4, 5) Mgbe anyị tụlere ọnọdụ dị mwute ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya, n’ụzọ anụ ahụ, n’uche, na n’omume, lee ka nganga si ghara inwe ihe ngọpụ n’akụkụ ụmụ mmadụ! Ka a sịkwa ihe mere anyị na-agụ na Jehova kpọrọ “mpako na nganga” asị! (Ilu 8:13) N’ụzọ dịwaga nnọọ iche site ná ndị nganga nile bụ ihe atụ ndị nke obi umeala ndị a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

Jehova Chineke Dị Obi Umeala

4. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-egosi na Jehova dị obi umeala?

4 Jehova Chineke—Onye Kasị Ihe Nile Elu, Ọkaaka Eluigwe na Ala, Eze nke mgbe nile ebighị ebi—dị umeala n’obi. (Jenesis 14:22) Nke ahụ ọ̀ pụrụ ikwe omume? Ee, n’ezie! Eze Devid sịrị, dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 18:35: “I nyewokwa m ọta nzọpụta Gị: aka nri Gị na-akwagidekwa m, umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” N’ụzọ doro anya, Eze Devid toro obi umeala Jehova dị ka ihe mere ya, bụ́ Devid, ka ọ baa ụba. Ọzọkwa, anyị na-agụ n’Abụ Ọma 113:6 na Jehova “na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya.” Nsụgharị ndị ọzọ na-agụ sị, “na-ehulata ala ile,” (New International Version) “na-ehudata ala ileda anya ala.”—The New English Bible.

5. Ihe ndị dị aṅaa merenụ na-agba akaebe na Jehova dị obi umeala?

5 Jehova Chineke n’ezie mere onwe ya ka ọ dị ala n’ụzọ o si mesoo Abraham, na-enye Abraham ohere ịgba ya ajụjụ banyere ezi omume Ya n’izube ibibi obodo ọjọọ ndị ahụ bụ Sọdọm na Gọmọra.a (Jenesis 18:23-32) Mgbe Jehova kwupụtakwara uche ya ikpochapụ mba Israel—n’otu oge maka ikpere arụsị, oge ọzọ maka nnupụisi—Mosis n’oge nke ọ bụla sooro Jehova tụgharịa uche dị ka a ga-asị na ọ na-agwa mmadụ ọzọ okwu. N’oge nke ọ bụla Jehova zaghachiri nke ọma. Ya ịnakwere arịrịọ Mosis banyere ndị Israel gosipụtara ịdị obi umeala. (Ọpụpụ 32:9-14; Ọnụ Ọgụgụ 14:11-20) Ihe atụ ndị ọzọ nke Jehova iji obi umeala mesoo ụmụ mmadụ n’ọnọdụ nke otu onye na ibe ya, dị ka a pụrụ ikwu ya, ka a ga-ahụ ná mmekọrịta ya na Gideọn na Jona, dị ka e dekọrọ ná Ndị Ikpe 6:36-40 na Jona 4:9-11.

6. Mjimara dị aṅaa nke Jehova kpughekwuru obi umeala ya?

6 N’ezie, ọ dịkarịa ala ugboro itoolu, a sịrị na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.’b Jehova ịbụ onye na-enwe ogologo ntachi obi, na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, n’imeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè e kere eke ihe n’ọtụtụ puku afọ ndị na-agafenụ bụkwa ihe nnwapụta ọzọ nke ya ịdị umeala n’obi. Ndị nganga adịghị enwe ndidi, ha na-adị ngwa igosipụta ọnụma, dị nnọọ iche pụọ n’inwe ogologo ntachi obi. Lee ka obi umeala Jehova si mee ka nganga ụmụ mmadụ na-ezughị okè yie ihe nzuzu! Ebe a gwara anyị ịbụ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,” anyị aghaghị ịdị umeala n’obi dị ka ọ dị umeala n’obi.—Ndị Efesọs 5:1.

Ihe Nlereanya Kraịst nke Obi Umeala

7, 8. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere obi umeala Jisoṣ Kraịst?

7 Ihe nlereanya nke abụọ kasị dị ịrịba ama nke obi umeala anyị ga-eṅomi ka a kpọtụrụ uche na 1 Pita 2:21: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” Ogologo oge tupu ọ bịa n’ụwa dị ka mmadụ, e buru amụma banyere ya na Zekaraịa 9:9: “Tegharịa egwú ọṅụ nke ukwuu, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị ada Jerusalem: lee, eze gị na-abịakwute gị: onye ezi omume na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye e wedara n’ala, nke na-anọkwasịkwa n’ịnyinya ibu.” Á sị na Jisọs Kraịst dị nganga, ọ pụrụ ịnakwerewo onyinye Ekwensu nyere ya alaeze nile nke ụwa iji gbanwere otu omume nke ife ofufe. (Matiu 4:9, 10) O gosipụtakwara obi umeala ya site n’inye Jehova otuto nile maka nkụzi ya, na-asị: “Mgbe ọ bụla unu ga-eweliworị Nwa nke mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-amara na Mụ onwe bụ Ya, na ọ dịghịkwa ihe M na-eme n’Onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.”—Jọn 8:28.

8 Ọ pụrụ izi nnọọ ezi ịgwa ndị na-ege ya ntị, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.” (Matiu 11:29) Leekwa ihe nlereanya ọma o setịpụrụ site n’ịsa ụkwụ ndị ozi ya n’uhuruchi ikpeazụ ọ nọnyeere ha dị ka mmadụ! (Jọn 13:3-15) N’ụzọ kwesịrị ekwesị karịsịa, ná Ndị Filipaị 2:3-8, Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ inwe “obi dị umeala,” na-ezo aka n’ebe Jisọs Kraịst nọ dị ka ihe nlereanya: “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: Onye, ọ bụ ezie na Ọ dịrị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma Ọ gụghị ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama O mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee Ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara Onwe ya, wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” Mgbe ihe isi ike kasịnụ ná ndụ ya chere ya ihu, o ji obi umeala kpegara Nna ya ekpere, sị: “Ọ bụghị dị ka Mụ onwe m na-achọ, kama dị ka Gị onwe gị na-achọ.” (Matiu 26:39) N’enwetụghị ịrụ ụka ọ bụla, anyị iji bụrụ ndị na-eṅomi Jisọs Kraịst, na-agbasosi ijeụkwụ ya nile ike, anyị aghaghị ịdị umeala n’obi.

Pọl Onyeozi, Ihe Nlereanya Ọma nke Obi Umeala

9-12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl onyeozi setịpụrụ ihe nlereanya ọma nke obi umeala?

9 Pọl onyeozi dere, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) Pọl onyeozi ò ṅomiri Jisọs Kraịst site n’inwe obi dị umeala, si otú ahụ na-enye anyị ihe nlereanya ọzọ nke obi umeala nke a ga-eṅomi? Anaghị ajụ ya ajụ. Iji malite, o ji obi umeala nakwere na ya bụ ohu nke Jisọs Kraịst. (Ndị Filipaị 1:1) Ọ gwara ndị okenye Efesọs banyere ya ‘otú ya bụrụ ohu Onyenwe anyị n’obi dị umeala nile, na anya mmiri, na ọnwụnwa dị iche iche nke dakwasịrị ya n’ajọ izu nile nke ndị Juu.’ (Ọrụ 20:17-19) À sị na ọ dịghị umeala n’obi, ọ garaghị ede ma ọlị okwu ndị a na-achọta ná Ndị Rom 7:18, 19: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m . . . N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.”

10 Ihe ọzọ na-egosikwa obi umeala Pọl bụ ihe o degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint, dị ka e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 2:3: “Mụ onwe m nọkwa n’etiti unu n’adịghị ike, na n’egwu, na n’oké ịma jijiji.” N’iji obi umeala ezo aka n’ụzọ ọ gbasoro na mbụ tupu ọ ghọọ onye Kraịst, o dere, sị: “Abụ m onye na-ekwulu Chineke na mbụ, bụrụkwa onye nsogbu, na onye na-eme mmadụ ihe ihere. . . . Kraịst Jisọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie; ndị mụ onwe m bụ onye isi ha.”—1 Timoti 1:13, 15.

11 Ihe ọzọ na-egosikwu obi umeala ya bụ ya ito Jehova Chineke maka ihe ịga nke ọma nile ná mgbalị ya nile. O dere banyere ozi ya, sị: “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, Onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Ọ rịọkwara ụmụnna ya ka ha kpeere ya ekpere ka o wee nwee ike ịgba àmà dị mma, dị ka anyị na-agụ ná Ndị Efesọs 6:18-20: “Na-ekpe ekpere . . . n’ihi m, ka e wee nye m okwu . . . ka m wee kwuwaa okwu n’ime [ihe omimi nke ozi ọma ahụ], dị ka m na-aghaghị ikwu.”

12 Pọl gosikwara ịdị obi umeala n’ụzọ o si kwenyere ndị ozi ndị ọzọ: “Jemes na Kifas na Jọn . . . nara mụ na Banabas aka nri nke nnwekọ, ka anyị onwe anyị wee jekwuru ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha wee jekwurukwa ndị obibi úgwù.” (Ndị Galetia 2:9) O gosipụtakwuru ịdị njikere ya ikwenyere ndị okenye nke ọgbakọ Jerusalem site n’isoro ụmụ okorobịa anọ gaa n’ụlọ nsọ ahụ na ịkwụrụ ha ụgwọ ka ha na-emezu otu nkwa.—Ọrụ 21:23-26.

13. Gịnị mere ka obi umeala Pọl dị ịrịba ama nke ukwuu?

13 Obi umeala Pọl dị ịrịba ama karịsịa mgbe anyị rịbara ama ụzọ Jehova Chineke si jiri ya rụọ ọrụ n’ụzọ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na “Chineke na-arụkwa ọrụ dị ike site n’aka Pọl dị ka a na-ahụghị mgbe ọ bụla.” (Ọrụ 19:11, 12) Karịa nke ahụ, e nyere ya ọhụụ na mkpughe ndị karịrị ihe mmadụ hụtụworo. (2 Ndị Kọrint 12:1-7) Anyị ekwesịghịkwa ichezọ na e nyere ya ike mmụọ nsọ ide 14 n’ime 27 akwụkwọ (ndị bụ akwụkwọ ozi n’ezie) nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe ahụ dum ebughị ya isi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ nọgidere na-adị umeala n’obi.

Ihe Nlereanya Ndị nke Oge A

14-16. (a) Olee ụzọ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society si bụrụ ihe nlereanya ọma nke obi umeala? (b) Ihe nlereanya ya na-eguzopụ nnọọ iche site na nke olè ndị?

14 Ná Ndị Hibru 13:7, anyị na-agụ ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Na-echetanụ ndị isi unu, bụ́ mmadụ ndị gwara unu okwu Chineke; na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.” N’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ a, anyị pụrụ iwere onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society, Charles Taze Russell, onye anyị pụrụ iṅomi okwukwe ya, dị ka ihe atụ nke oge a. Ọ̀ bụ nwoke dị umeala n’obi? N’ezie ọ bụ! Dị ka a hụworo nnọọ, n’ihe odide dị n’akwụkwọ ya bụ́ Studies in the Scriptures, mpịakọta isii nke ihe dị ka 3,000 peji, o zoghị aka n’ebe onwe ya nọ ọbụna otu ugbo. Akwụkwọ nile nke Watch Tower Bible and Tract Society taa na-agbaso ụkpụrụ nke a n’adọrọghị uche gaa n’ebe ndị mmadụ nọ n’ime ka a mara ndị na-ede isiokwu dị iche iche.

15 N’ime Ụlọ Nche, Russell dere n’otu oge na ya amaghị ihe ọ bụla dị ka “iso ụzọ Russell” na “onye na-eso ụzọ Russell,” okwu ndị ndị na-emegide ya ji eme ihe ma bụrụ ndị ọ jụwapụrụ isi. O dere, sị: “Ọrụ anyị . . . abụwo iwekọta iberibe eziokwu dịsasịrị adịsasị eri ogologo oge na iche ha n’ihu ndị nke Onyenwe anyị—ọ bụghị dị ka ihe ọhụrụ, ọ bụghị dị ka nke anyị, kama dị ka nke Onyenwe anyị. . . . Ọrụ ahụ nke Onyenwe anyị nweworo mmasị iji onyinye anyị dị ala rụọ abụkebeghị nke ịmalite ihe kama ọrụ nke iwughachi, ịgbazigharị, ime ka a dị n’otu.” N’eziokwu, o kwupụtara echiche ndị nke Pọl onyeozi, dị ka a na-achọta ya ná 1 Ndị Kọrint 3:5-7.

16 Àgwà ya dịwaga iche na nke Charles Darwin. Ná mbipụta mbụ ya nke The Origin of Species na 1859, Darwin zoro aka ugboro ugboro ná nchepụta “m,” na-eleghara anya ihe ndị ọzọ bu ya ụzọ kwuworo banyere evolushọn. Otu onye a ma ama na-ede akwụkwọ na narị afọ ahụ, bụ́ Samuel Butler gwakasịrị Darwin ahụ, na-eme ka ọ pụta ìhè na ọtụtụ ndị ọzọ ebuwo ụzọ wepụta nchepụta ozizi evolushọn; ọ dịghị ụzọ o si bụrụ Darwin bụ onye mbụ.

17. Olee ihe nlereanya ndị ọzọkwa nke obi umeala Nwanna Rutherford?

17 Onye ọzọ ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi n’oge ndị a nke Jehova Chineke jiri mee ihe nke ukwuu bụ Joseph F. Rutherford, onye e hotara ná mmalite. Ọ bụ onye ji obi ike na-akpọsa eziokwu Bible na karịsịa aha Jehova. Ọ bụ ezie na a maara ya karịsịa dị ka Onyeikpe Rutherford, ọ bụ nwoke dị umeala n’obi n’ime obi ya. Dị ka ihe atụ, otu mgbe o kwuru okwu ụfọdụ nke nkwesi olu ike banyere ihe ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya ya na 1925. Mgbe ihe ndị mere na-akwadoghị ihe ọ tụrụ anya ya, o ji obi umeala gwa ezinụlọ Betel nke Brooklyn na ya emewo onwe ya onye nzuzu. Onye Kraịst e tere mmanụ nke ya na ya mekọrịtara ihe nke ukwuu gbara akaebe na ugboro ugboro na ya nụrụ ka Nwanna Rutherford rịọrọ mgbaghara na mmụọ nke Matiu 5:23, 24, ma n’ihu ọha ma ná nzuzo, n’ihi imejọwo onye Kraịst ibe ya site n’okwu ụfọdụ a na-echeghị echiche nke ọma kwuo. Ọ na-achọ obi umeala ka onye nọ n’ọnọdụ inwe ike rịọ ndị nọ n’okpuru ya mgbaghara. Nwanna Rutherford guzobere ihe nlereanya ọma maka ndị nlekọta nile, ma ọ bụ n’ime ọgbakọ, n’ọrụ njegharị, ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Society.

18. Okwu dị aṅaa nke na-ekpughe ọnọdụ uche nke obi umeala ka onye isi oche nke atọ nke Society kwuru?

18 Onye isi oche nke atọ nke Watch Tower Bible and Tract Society, Nathan H. Knorr, gosipụtakwara na, n’agbanyeghị ịbụ onye a ma ama n’etiti ndị Jehova, o bulighị onwe ya elu n’ihi ọnọdụ ya. Ọ bụ ezie na o nwere ikike n’enweghị atụ n’ịhazi ihe na ikwu okwu n’ihu ọha, o nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka ihe ndị ọzọ mere. Otú a, n’otu oge o letara otu onye nọ ná Ngalaba Ide Ihe n’ụlọ ọrụ ya ma kwuo, sị: “N’ebe a ka ọrụ kasị mkpa nakwa ọrụ kasị sie ike na-ewere ọnọdụ. Ọ bụ ya mere m ji arụ akụkụ dị nnọọ nta n’ime ya.” Ee, o ji obi umeala tinye ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Filipaị 2:3 n’ọrụ, na ‘site n’obi dị umeala mmadụ kwesịrị iwere ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma.’ Ọ ghọtara na n’agbanyeghị na ije ozi dị ka onye isi oche nke Society dị mkpa, ọrụ ndị ọzọ dịkwa mkpa. Ọ chọrọ obi umeala n’akụkụ ya inwe mmetụta dị otú ahụ na ikwupụta ya n’ụzọ doro nnọọ anya. Ọ bụ ihe nlereanya ọma ọzọ mmadụ nile ga-eṅomi, karịsịa ndị nọ n’ọnọdụ ịbụ ndị a ma ama nke inye nlekọta.

19, 20. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa nke obi umeala ka onye isi oche nke anọ nke Society setịpụrụ? (b) Enyemaka dị aṅaa ka isiokwu na-esonụ ga-enye banyere anyị igosipụta ịdị umeala n’obi?

19 Onye isi oche nke anọ nke Society, Fred W. Franz, bụkwa ihe nlereanya ọma nke obi umeala. Dị ka osote onye isi oche Society ruo ihe dị ka 32 afọ, o mere ihe ka ukwuu n’ide magazin na usoro ihe omume nke mgbakọ; ma n’ihe banyere nke a ọ na-eme onwe ya ka ọ ghara ịpụta ìhè ma nye, na-adịghị achọ ịnata otuto ya. A pụrụ izo aka n’ihe atụ oge ochie a pụrụ iji tụnyere ya. Mgbe Joab meriri ndị Amọn na Raba, ọ hụrụ na Eze Devid naara otuto maka mmeri ya.—2 Samuel 12:26-28.

20 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe nlereanya ọma, ndị oge ochie na ndị oge a, na-enye ihe ndị siri ike mere a ga-eji nwee obi umeala. Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere anyị ga-eji dị umeala n’obi, ndị a nakwa ihe ndị ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  A na-ejikarị “iwedata onwe onye ala” eme ihe ịpụta “ime ka onye ka ukwuu.” Ma ihe bụ isi ọ pụtara—nakwa ihe ọ pụtara na New World Translation—bụ “iwedatatụ aka,” “iwezụga ihe ùgwù nile nke ọkwá.”—Lee Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary.

b Ọpụpụ 34:6; Ọnụ Ọgụgụ 14:18; Nehemaịa 9:17; Abụ Ọma 86:15; 103:8; 145:8; Joel 2:13; Jona 4:2; Nehum 1:3.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụworo mkpụrụ nke nganga?

◻ Ònye setịpụworo ihe nlereanya kasị mma n’ịdị umeala n’obi?

◻ Gịnị na-egosipụta onye bụ ihe nlereanya nke abụọ kasịnụ nke obi umeala?

◻ Ihe nlereanya ọma dị aṅaa nke obi umeala ka Pọl onyeozi setịpụrụ?

◻ Ihe nlereanya ndị a ma ama dị aṅaa nke obi umeala n’oge ndị a ka anyị nwere?

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs mere ngosipụta ọma nke obi umeala

[Foto dị na peeji nke 16]

Pọl setịpụrụ ihe nlereanya ọma n’ịdị umeala n’obi

[Foto dị na peeji nke 17]

Nwanna Russell etoghị onwe ya maka ihe ndị o dere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya