Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/1 p. 14-19
  • “Yikwasị Ihe Agha nke Ìhè”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Yikwasị Ihe Agha nke Ìhè”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmegide Sitere n’aka Ndị Isi Okpukpe
  • Ịchọ Ọdịmma Nanị Onwe Onye na Mpako
  • ‘Ndị A Kpọpụtaworo n’Ọchịchịrị’
  • ‘Ọ Dịghị Ọchịchịrị Ọ Bụla Dị n’Ime Chineke’
  • Mmadụ Ọhụrụ ahụ
  • “N’ìhè Gị Ka Anyị Na-ahụ Ìhè”
  • Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ìhè ahụ Abịawo n’Ụwa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gbasoo Ìhè Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Olè Ndị Na-agbaso Ìhè Nke Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/1 p. 14-19

“Yikwasị Ihe Agha nke Ìhè”

“Chi ejimiwo, chi ọbụbọ dịkwa nso: ya mere ka anyị yipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị, ma ka anyị yikwasị ihe agha nke ìhè.” —NDỊ ROM 13:12.

1, 2. Olee ụzọ ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke narị afọ mbụ si nara “ezi ìhè ahụ,” nke a bụkwa n’agbanyeghị abamuru dịgasị aṅaa?

JISỌS KRAỊST bụ ‘ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọ bụla ìhè.’ (Jọn 1:9) Mgbe ọ bịara dị ka Mesaịa na 29 O.A., ọ bịakwutere mba nke Chineke họpụtaworo ịbụ ndị àmà Ya nke raarakwara onwe ya nye Jehova, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’aha. (Aịsaịa 43:10) Ọtụtụ n’ime ndị Israel anọwo na-echere Mesaịa ahụ, ụfọdụ n’ime ha maakwara ụfọdụ n’ime amụma ndị ga-eme ka a mara ya. Ọzọkwa, Jisọs mere nkwusa n’akụkụ nile nke Palestine, na-eme ihe ịrịba ama ebe ọtụtụ ìgwè mmadụ ga-ahụzu ya anya. Ìgwè mmadụ dị iche iche gbakọtara ige ya ntị, ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ kpalikwara mmasị ha.—Matiu 4:23-25; 7:28, 29; 9:32-36; Jọn 7:31.

2 Ma, n’ikpeazụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu ahụ jụrụ Jisọs. Oziọma Jọn na-asị: “Ọ bịakwutere ihe nke aka ya, ma ndị nke aka ya akpọbataghị ya.” (Jọn 1:11) N’ihi gịnị ka nke a ji mee? Azịza nye ajụjụ ahụ ga-enyere anyị aka izere imeghachi otu mmehie ihe ahụ ha mere. Ọ ga-enyere anyị aka ‘iyipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị ma yikwasị ihe agha nke ìhè,’ wee si otú a na-ezere ọmụma ikpe yiri nke ahụ Israel nke narị afọ mbụ nwetara.—Ndị Rom 13:12; Luk 19:43, 44.

Mmegide Sitere n’aka Ndị Isi Okpukpe

3. Olee ụzọ ndị ndú okpukpe ndị Juu si gosipụta onwe ha ịbụ “ndị ndú kpuru ìsì”?

3 N’Israel, ndị ndú okpukpe butere ụzọ n’ịjụ ìhè ahụ. N’agbanyeghị eziokwu ahụ nke bụ na ha bụ ndị ozizi ‘ndị maara iwu nke ọma,’ ha ebokwasịwo ụmụ mmadụ usoro ụkpụrụ iwu ndị na-emegidekarị Iwu Chineke. (Luk 11:45, 46) Otú a, ha ‘mere okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu site n’ozizi e nyere ha n’aka idebe.’ (Mak 7:13; Matiu 23:16, 23, 24) Ha bụ “ndị ndú kpuru ìsì,” na-egbochi ìhè ahụ inwubata.—Matiu 15:14.

4, 5. (a) Olee ụzọ ndị Farisii si meghachi omume mgbe ụfọdụ ndị Juu malitere iche ma Jisọs ọ̀ bụ Mesaịa ahụ n’ezie? (b) Àgwà obi ọjọọ dị aṅaa ka ndị Farisii ahụ gosipụtara?

4 N’otu oge mgbe ọtụtụ ndị Israel nọ na-eche ma Jisọs ọ̀ bụ Kraịst ahụ n’ezie, ndị Farisii ahụ egwu na-atụ zipụrụ ndị ozi ka ha jee jide ya. Ndị ozi ahụ gbaara aka lọghachi, na-asị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.” N’ịbụ ndị nke a na-emetụtaghị n’ahụ, ndị Farisii ahụ jụrụ ndị ozi ahụ, sị: “È duhiewokwa unu onwe unu? Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti ndị isi, ma ọ bụ n’etiti ndị Farisii, kwere na ya? Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ.” Nikọdimọs, onye so ná nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ, kwuru na o zighị ezi n’iwu ikpe mmadụ ikpe tupu a nụ olu ya. N’iwe, ndị Farisii ahụ wakwasịrị ya wee sị: “Gị onwe gị [ị̀] sikwa na Galili pụta? Nyochaa n’akwụkwọ nsọ, leekwa na ọ dịghị onye amụma si na Galili bilie.”—Jọn 7:46-52.

5 N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe nọ n’ime mba nke a raaraworo nye Chineke ji mee omume n’ụzọ dị otú ahụ? N’ihi na ha azụlitewo ọnọdụ obi dị njọ. (Matiu 12:34) Ụzọ mweda n’ala ha na-esi ele ndị nkịtị anya gosipụtara mpako ha. Nzọrọ ha nke bụ na ‘ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti ndị isi ma ọ bụ n’etiti ndị Farisii kwere na ya’ na-egosipụta echiche mpako ahụ nke bụ na Mesaịa ahụ ga-abụ nke ziri ezi nanị ma ọ bụrụ na ha akwadoo ya. Ọzọkwa, ha bụ ndị na-ejighi eziokwu eme ihe, na-agbalị ịkatọ Jisọs n’ihi na o si Galili bịa, ebe obere nnyocha gaara egosiworị na a mụrụ ya na Betlehem n’ezie, bụ́ ebe ahụ e buru n’amụma na a ga-anọ mụọ Mesaịa.—Maịka 5:2; Matiu 2:1.

6, 7. (a) Olee ụzọ ndị ndú okpukpe ahụ si meghachi omume ná mbilite n’ọnwụ nke Lazarọs? (b) Gịnị ka Jisọs kwuru iji kpughee ịhụnanya ndị ndú okpukpe ahụ nwere maka ọchịchịrị?

6 Oké mmegide ndị ndú okpukpe ndị a na-emegide ìhè ahụ pụtara ìhè n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka mgbe Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Nye onye na-atụ egwu Chineke, ihe omume dị otú ahụ ga-abụworị ihe nnwapụta na-egosi na Jisọs nwere nkwado Jehova. Ma, nanị ihe ndị ndú okpukpe ahụ pụrụ ịhụ bụ ihe yiri oyiyi egwu a na-eyi ọnọdụ ha nke dị elu. Ha sịrị: “Gịnị ka anyị na-eme? N’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” (Jọn 11:44, 47, 48) Ya mere, ha gbara izu igbu ma Jisọs ma Lazarọs, ma eleghị anya na-enwe olileanya na n’ụzọ dị otú a, ha ga-emenyụ ìhè ahụ.—Jọn 11:53, 54; 12:9, 10.

7 Ya mere, ịfụli onwe onye elu, mpako, emeghị ihe n’eziokwu nke nkà ihe ọmụma, na ọchịchọ ọdịmma onwe onye siri oké ike chụpụrụ ndị ndú okpukpe nke mba nke Chineke n’ebe ìhè ahụ dị. N’akụkụ ikpeazụ nke ije ozi ya, Jisọs kpughere amamikpe ha, na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ: n’ihi na unu onwe unu abataghị, unu adịghị ekwekwa ndị na-abata ka ha bata.”—Matiu 23:13.

Ịchọ Ọdịmma Nanị Onwe Onye na Mpako

8. Ihe ndị dị aṅaa ndị mere na Nazaret kpughere ọnọdụ ọjọọ nke obi nke ụfọdụ ndị n’ebe ahụ?

8 N’ozuzu ha, ndị Juu nke narị afọ mbụ yikwara nnọọ ndị ndú okpukpe ha n’ịjụ ìhè ahụ n’ihi ọnọdụ dị njọ nke obi ha. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, a kpọrọ Jisọs òkù ikwu okwu n’otu ụlọ nzukọ dị na Nazaret. Ọ gụrụ ma kọwaa otu ihe odide sitere n’Aịsaịa, ọgbakọ ahụ gekwara ya ntị ná mmalite. Ma mgbe o ji ihe ndị dị n’akụkọ ihe mere eme tụnyere ihe na-eme eme n’oge ahụ, bụ́ nke kpughere ọchịchọ ọdịmma nanị onwe onye na enweghị okwukwe ha, a kpasuru ha iwe ha wee nwaa igbu ya. (Luk 4:16-30) Tinyere àgwà ọjọọ ndị ọzọ, mpako gbochiri ha ịnara ìhè ahụ nke ọma.

9. Olee ụzọ e si kpughee nzube na-ezighị ezi nke otu ìgwè ndị Galili?

9 N’otu oge ọzọ, Jisọs ji ụzọ ọrụ ebube nye oké ìgwè mmadụ nri n’akụkụ Osimiri Galili. Ndị hụrụ ọrụ ebube nke a sịrị: “N’ezie onye a bụ onye amụma ahụ nke na-abịa n’ụwa.” (Jọn 6:10-14) Mgbe Jisọs ji ụgbọ mmiri gaa n’ebe ọzọ, ìgwè mmadụ ahụ sochiri ya. Otú ọ dị, Jisọs maara na ihe na-akpali ọtụtụ n’ime ha abụghị ịhụnanya maka ìhè ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu na-achọ m, ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ ihe ịrịba ama, kama ọ bụ n’ihi na unu riri ụfọdụ n’ime ógbè achịcha ahụ, afọ jukwa unu.” (Jọn 6:26) N’oge na-adịghị anya, a nwapụtara na ihe o kwuru ziri ezi mgbe ọtụtụ ndị nọbu na-eso ya laghachiri azụ baa n’ụwa. (Jọn 6:66) Àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye kpuchiri ìhè ahụ n’anya ha.

10. Olee ụzọ ihe ka ọtụtụ ná ndị Jentaịl si meghachi omume n’ebe ìhè ahụ dị?

10 Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị Juu kwere ekwe nọgidere were ìhè ahụ na-ejekwuru ndị ọzọ bụ ndị Juu, ma ọ bụ nanị ole na ole naara ha nke ọma. N’ihi ya, Pọl onyeozi na ndị ọzọ, ndị na-eje ozi dị ka “ìhè nke mba nile,” gbasara ozi ọma ahụ gaa n’ala ndị ọzọ. (Ọrụ 13:44-47) Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu naara ya nke ọma, ma mmeghachi omume zuru ebe nile dịrị otú ahụ Pọl kọwara ya: ‘Anyị na-ekwusa Kraịst, na a kpọgburu ya, ozi nke bụụrụ ndị mba ọzọ ihe nzuzu.’ (1 Ndị Kọrint 1:22, 23) Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-abụghị ndị Juu jụrụ ìhè ahụ n’ihi na nkwenkwe ụgha nke ndị na-ekpere arụsị ma ọ bụ nkà ihe ọmụma ụwa mere ka ha kpuo ìsì.—Ọrụ 14:8-13; 17:32; 19:23-28.

‘Ndị A Kpọpụtaworo n’Ọchịchịrị’

11, 12. Òle ndị naara ìhè ahụ nke ọma n’ime narị afọ mbụ ahụ, oleekwa ndị na-anara ya nke ọma taa?

11 N’ime narị afọ mbụ, n’agbanyeghị enweghị ezi nnabata zuru ebe nile, ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi bụ ndị ‘a kpọpụtara n’ọchịchịrị baa n’ìhè dị ebube nke Chineke.’ (1 Pita 2:9) Banyere ndị a, Jọn onyeozi dere, sị: “Ka ha hà, bụ́ ndị naara [Kraịst], ha ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ́ ndị kwere n’aha ya.” (Jọn 1:12) Malite na Pentikọst 33 O.A., e jiri mmụọ nsọ mee ndị a hụrụ ìhè ahụ n’anya baptism, ha wee ghọọ ụmụ nke Chineke na-enwe olileanya iso Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe ya.

12 N’oge anyị a, a chịkọtawo ndị nke ikpeazụ so n’ụmụ Chineke ndị ahụ e tere mmanụ, wee na-emezu amụma Daniel, ha “na-enwu ọcha dị ka onwunwu ọcha nke mbara igwe . . . na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume.” (Daniel 12:3) Ha ekwewo ka ìhè ha nwuo ruo n’ókè nke na ihe karịrị nde mmadụ anọ nke “atụrụ ọzọ” ahụ abụwo ndị a dọtara bịa n’eziokwu ahụ, ha na-eguzokwa dị ka ndị ezi omume n’ihu Chineke. (Jọn 10:16) Ndị a na-egosipụtakwa ìhè ahụ gburugburu ụwa, nke na ugbu a, ìhè ahụ na-enwu dị ka ọ na-enwutụbeghị na mbụ. N’oge anyị a, dị ka ọ dị n’ime narị afọ mbụ ahụ, “ọchịchịrị ahụ ejideghịkwa [ìhè ahụ].”—Jọn 1:5.

‘Ọ Dịghị Ọchịchịrị Ọ Bụla Dị n’Ime Chineke’

13. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jọn onyeozi nyere anyị?

13 Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla ịdọ aka ná ntị ahụ nke Jọn onyeozi: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ọchịchịrị ọ bụla dị n’ime ya. Ọ bụrụ na anyị asị na anyị na-eso ya nwekọọ ihe, ma anyị na-ejegharị n’ọchịchịrị, anyị na-ekwu okwu ụgha, anyị adịghị emekwa eziokwu.” (1 Jọn 1:5, 6) N’ụzọ doro anya, o kwere omume ndị Kraịst ịdaba n’otu ọnyà ahụ dị ka ndị Juu dabara, ịnọ na-abụ ndị àmà nke Chineke n’ọnụ, ma na-arụ ọrụ nke ọchịchịrị.

14, 15. Ọrụ dịgasị aṅaa nke ọchịchịrị pụtara ìhè n’ime ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?

14 N’eziokwu, nke a mere n’ime narị afọ nke mbụ. Anyị na-agụ banyere nkewa ndị e nwere na Kọrint. (1 Ndị Kọrint 1:10-17) Ọ dịkwara mkpa ka Jọn onyeozi dọọ ndị Kraịst e tere mmanụ aka ná ntị ka ha ghara ịkpọrịta ibe ha asị, ọ dịkwara mkpa ka Jemes nye ụfọdụ ndị ndụmọdụ ka ha ghara imenyere ndị ọgaranya ma na-emegbu ndị ogbenye. (Jemes 2:2-4; 1 Jọn 2:9, 10; 3 Jọn 11, 12) Tụkwasị na nke ahụ, mgbe Jisọs nyochara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor, dị ka a kọrọ ya n’akwụkwọ Mkpughe, ọ kọrọ banyere mwabata nke ọrụ nke ọchịchịrị, gụnyere ịdapụ n’ezi ofufe, ikpere arụsị, adịghị ọcha, na ịhụ ihe onwunwe n’anya. (Mkpughe 2:4, 14, 15, 20-23; 3:1, 15-17) N’oge mmalite ahụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, ọtụtụ ndị esiwo otú a hapụ ìhè ahụ, ụfọdụ ndị wee bụrụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, ndị ọzọ na-akpafukwa nnọọ banye “n’ọchịchịrị nke èzí.”—Matiu 25:30; Ndị Filipaị 3:18; Ndị Hibru 2:1; 2 Jọn 8-11.

15 Akụkọ ndị a nile sitere na narị afọ mbụ gosiri ụzọ dị iche iche ọchịchịrị nke ụwa Setan pụrụ isi mịbata n’ime echiche nke ndị Kraịst n’otu n’otu ma ọ bụ ọbụna n’ọgbakọ dum. Anyị kwesịrị ịnọ na nche ka ihe dị otú ahụ ghara ime anyị mgbe ọ bụla. Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

Mmadụ Ọhụrụ ahụ

16. Ezi ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Efesọs?

16 Pọl gbara ndị Efesọs ume ka ha ghara ‘ịgba ọchịchịrị n’echiche uche ha, bụrụkwa ndị e mere ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ ahụ dị, bụ́ nke dị n’aka Chineke.’ Ka ha wee ghara ịdabanyeghachi n’ọchịchịrị, ọ dị mkpa ka ha wulite àgwà ime obi nke dịịrị ìhè ahụ. Pọl sịrị: “Ka unu tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị; ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche unu, ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.”—Ndị Efesọs 4:18, 22-24.

17. Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere ịdabaghachi n’ọchịchịrị taa?

17 N’ebe a, Pọl na-enye ndụmọdụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ka e mee oké mgbanwe—igbubipụ ihe bụbu akụkụ ahụ anyị, mmadụ ochie anyị, ma kwere ka mmụọ dị nnọọ ọhụrụ wulite ịbụ ‘mmụọ nke uche anyị.’ Ọ bụghịkwa ndị nwere mmasị ọhụrụ ka ọ na-agwa okwu, kama ọ bụ ndị Kraịst meworo baptism. Mgbanwe nke ọdịdị mmadụ anyị agaghị akwụsị mgbe anyị mere baptism. Ọ bụ usoro nke na-anọgide na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ịzụlite ọdịdị mmadụ ọhụrụ ahụ, o yiri ka nke ochie ahụ ga-ebiliteghachi, ya na mpako, ịfụli onwe onye elu, na ịchọ ọdịmma onwe onye ya. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:21-25) Nke a pụrụ iduje n’ịlaghachi n’ọrụ nke ọchịchịrị.

“N’ìhè Gị Ka Anyị Na-ahụ Ìhè”

18, 19. Olee ụzọ Jisọs na Pọl si kọwaa ụzọ a na-esi amata “ụmụ nke ìhè”?

18 Cheta na anyị inweta ndụ ebighị ebi dabeere n’anyị ịbụ ndị Chineke na-amaghị ikpe, bụ́ ikpe nke dabeere n’ókè anyị hụruru ìhè ahụ n’anya. Mgbe o zosịrị aka n’eziokwu nke ikpeazụ nke a, Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya. Ma onye na-eme ihe bụ eziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.”—Jọn 3:19-21.

19 Pọl kwadoro echiche nke a mgbe o degaara ndị Efesọs akwụkwọ, sị: “Na-ejegharịnụ dị ka ụmụ nke ìhè (n’ihi na mkpụrụ nke ìhè ahụ dị n’ịdị mma na ezi omume na eziokwu nile).” (Ndị Efesọs 5:8, 9) Ya mere, ọrụ anyị nile na-egosi ma ànyị bụ ụmụ nke ìhè ma ọ bụ ụmụ nke ọchịchịrị. Ma ezi ọrụ pụrụ ibilite nanị site n’obi ziri ezi. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị chee obi anyị nche, na-elezi anya banyere mkpa nke ịnọgide na-eme ka ọdịdị mmadụ anyị dịghachi ọhụrụ, na-elezi anya banyere mmụọ ahụ nke na-eduzi uche anyị.—Ilu 4:23.

20, 21. (a) Olee ihe ịma aka pụrụ iche nke na-eche ụmụ ndị a mụrụ n’ezinụlọ ndị Kraịst ihu? (b) Olee ihe ịma aka nke na-eche ụmụ ndị Kraịst nile ihu?

20 N’ọnọdụ ụfọdụ, nke a abụwo ihe ịma aka pụrụ iche nye ụmụntakịrị ndị mụrụ ha bụ Ndịàmà Jehova raraworo onwe ha nye. N’ihi gịnị? Ee, n’otu akụkụ, ụmụ ndị dị otú ahụ nwere ngọzi dị ebube. Ịmara eziokwu ahụ site na mgbe a dị nnọọ na nwata pụtara na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dịrị mkpa ka onye ahụ nwee ahụmahụ n’onwe ya nke ịnọ n’ime ọchịchịrị nke ụwa Setan. (2 Timoti 3:14, 15) N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ụmụntakịrị nọ n’ọnọdụ ahụ adịghị eji eziokwu ahụ kpọrọ ihe dị mkpa, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ha na-amụta ịhụ ìhè ahụ n’anya n’eziokwu. Nke a bụ ọnọdụ dịrị n’ihe banyere ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke narị afọ mbụ. Ha tolitere n’ime mba nke a raraworo nye Jehova, ruokwa n’ókè ụfọdụ, ha nwere ihe ọmụma nke eziokwu ahụ. Ma ọ dịghị n’ime obi ha.—Matiu 15:8, 9.

21 Ndị mụrụ ụmụ bụ ndị Kraịst nwere ibu ọrụ n’ihu Chineke ịzụlite ụmụ ha n’ìhè ahụ. (Deuterọnọmi 6:4-9; Ndị Efesọs 6:4) Ma, n’ikpeazụ, ọ bụ nwa ahụ n’onwe ya ga-enwe ịhụnanya maka ìhè ahụ karịa ka o nwere maka ọchịchịrị. Ọ ghaghị ime ka ìhè nke eziokwu ahụ bụrụ nke aka ya. Ka ọ na-etolite, akụkụ ụfọdụ nke ụwa Setan pụrụ iyi ihe na-adọrọ adọrọ. Ụzọ ndụ na-enweghị nchegbu ma ọ bụ nke na-enweghịkwa ibu ọrụ nke ndị ọgbọ ya pụrụ iyi ihe na-akpali akpali. Ịrụ ụka nke a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ pụrụ iyi ihe na-adọrọ mmasị. Ma o kwesịghị ichefu mgbe ọ bụla na a hapụhaala ìhè ahụ, ‘ọchịchịrị na-ekpuchi elu ụwa dum.’ (Aịsaịa 60:2) N’ikpeazụ, ụwa nke a nke ọchịchịrị gbachiworo enweghị ezi ihe ọ bụla o nwere inye mmadụ.—1 Jọn 2:15-17.

22. Olee ụzọ Jehova na-esi agọzi ndị ahụ na-abịakwute ìhè ahụ ugbu a, oleekwa ụzọ ọ ga-esi gọzie ha n’ọdịnihu?

22 Eze Devid dere, sị: “N’ebe ị [Jehova] nọ ka isi iyi ndụ dị: n’ìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. Mee ka ebere gị dịgidere ndị maara gị.” (Abụ Ọma 36:9, 10) Ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya na-amara Jehova, nke a pụkwara ịpụtara ha ndụ. (Jọn 17:3) N’obi ebere ịhụnanya ya, Jehova na-akwado ha ugbu a, mgbe oké mkpagbu ahụ bịakwara, ọ ga-eburu ha gabiga banye n’ime ụwa ọhụrụ. Nke a pụrụ ịbụ ahụmahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị agbakụta ọchịchịrị nke ụwa Setan azụ ugbu a. N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-ewetaghachi ihe a kpọrọ mmadụ ná ndụ zuru okè n’ime Paradaịs. (Mkpughe 21:3-5) Ndị ahụ a na-amaghị ikpe ga-enwezi olileanya nke ịtụsara ahụ n’ìhè nke Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi. Lee nnọọ olileanya dị ebube nke ahụ bụ! Leekwa oké ihe mkpali ọ bụ ugbu a ‘iyipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị ma yikwasị ihe agha nke ìhè’!—Ndị Rom 13:12.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke oge Jisọs ji jụ ìhè ahụ?

◻ Ruo ókè ha aṅaa ka ìhè ahụ nọworo na-enwu n’oge ugbu a?

◻ Ịdọ aka ná ntị dịgasị aṅaa banyere ịchọ ọdịmma onwe onye na mpako ka ihe nlereanya dị iche iche nke narị afọ mbụ na-enye?

◻ Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide n’ìhè ahụ?

◻ Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya?

[Foto dị na peeji nke 14]

Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke oge Jisọs anaraghị ìhè ahụ nke ọma

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

N’ime ọtụtụ iri afọ gaworo aga, e jiwo ụzọ dị iche iche mee ihe ime ka ìhè ahụ nwuo n’ime ndị na-eso ụzọ

[Foto dị na peeji nke 18]

‘Yipụnụ mmadụ ochie unu, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya