Gbasoo Ìhè Nke Ụwa
“Onye na-eso m . . . ga-enwe ìhè nke ndụ.”—JỌN 8:12.
1. Ruo n’ókè hà aṅaa ka ìhè dịruru mkpa?
GỊNỊ ka anyị ga-eme n’enweghị ìhè? Cheedị echiche banyere iteta ụra kwa ụbọchị nke afọ na-enwe 24 hour nke ọchịchịrị. Cheedị echiche banyere ụwa nke àgwà na-adịghị na ya, n’ihi na ọ bụrụ na ìhè adịghị, àgwà agaghị adị. N’ezie, ọ bụrụ na ìhè adịghị, anyị agaghịkwa adị! N’ihi gịnị? N’ihi na, n’usoro ihe omume photosynthesis, ụmụ ahịhịa ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na-eji ìhè emepụta nri nke anyị na-eri—ọka, akwụkwọ nri, na mkpụrụ osisi. N’ezie, mgbe ụfọdụ anyị na-eri anụ nke ụmụ anụmanụ, ma anụmanụ ndị ahụ riri ahịhịa ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ ndị na-eri ahịhịa. Otu a, ndụ nkịtị anyị na-adị dabeere kpam kpam n’ìhè.
2. Isi iyi dị ike nke ìhè dịgasị anaa ka e nwere, gịnịkwa ka nke a na-agwa anyị banyere Jehova?
2 Ìhè anyị sitere n’anyanwụ, nke bụ kpakpando. Ọ bụ ezie na anyanwụ anyị na-enye ìhè dị ukwuu n’ọ̀tụ̀tụ̀, ọ ka bụ nanị kpakpando dị nta. Ọtụtụ karịrị ya nke ukwuu. Ìgwè kpakpando anyị bikwa na ya, ụyọkọ Milky Way, nwere ihe karịrị otu narị ijeri kpakpando. Tinyere nke ahụ, e nwere ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ná mbara igwe. Lee usoro dị ukwuu nke kpakpando ọ bụ! Lee ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ìhè si na ha apụta. Lee Isi Iyi dị ike nke ìhè Jehova bụ, bụ́ onye kere ihe ndị ahụ nile! Aịsaịa 40:26 na-ekwupụta, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ onye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ka ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike ya, na n’ihi na o nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”
Ụdị Ìhè Ọzọ
3. Ruo n’ókè hà aṅaa ka ìhè ime mmụọ nke sitere n’aka Jehova dịruru mkpa?
3 Jehova bụkwa Isi Iyi nke ụdị ìhè ọzọ, nke na-enyere anyị aka ịhụ ụzọ ime mmụọ, ime ka a mara ihe n’ụzọ ime mmụọ. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara “ime ka a mara ihe” n’ụzọ dị otú a: “Inye ihe ọmụma: izi ihe; inye nghọta ime mmụọ.” Ọ kọwara “ịbụ onye e mere ka ọ mara ihe” dị ka: “inwere onwe pụọ n’amaghị ihe na ihe ọmụma na-ezighị ezi.” A na-eme ka anyị nweta nghọta ime mmụọ site n’aka Jehova site n’ezi ihe ọmụma nke ihe dị n’Okwu ya, Bible. Nke ahụ bụ ihe na-enyere anyị aka ịmara onye Chineke bụ na ihe bụ nzube ya. “N’ihi na ọ bụ Chineke, onye sịrị, Ìhè ga-esi n’ime ọchịchịrị nwupụta, bụ onye nwubara n’ime obi anyị, iweta inye ìhè nke ọmụma nke ebube nke Chineke n’ihu nke Jisọs Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 4:6) Otú a, eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’amaghị ihe na ihe ọmụma na-ezighị ezi. Jisọs kwuru, sị: “Unu ga-amara eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.
4, 5. Olee otú ihe ọmụma sitere n’aka Jehova si eje ozi dị ka ìhè ná ndụ anyị?
4 Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ezi nghọta ime mmụọ, bụ “onye zuru okè n’ọmụma ihe.” (Job 37:16) Ọzọ, Abụ Ọma 119:105 na-ekwupụta banyere Chineke, si: “Okwu gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” Ọ bụghị nanị na ọ pụrụ inye ìhè ná nzọụkwụ nke na-esochi ná ndụ anyị kamakwa n’okporo ụzọ ahụ dị n’ihu. E wezụga nke ahụ, ndụ ga-adị ka ịkwọ ụgbọ ala n’okporo ụzọ gbagọrọ agbagọ n’abalị gbara ọchịchịrị n’enweghị ọkụ n’ụgbọ ala ahụ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. A pụrụ iji ìhè Chineke na-enye tụnyere ìhè nke ọkụ ihu ụgbọ ala na-enye. Ọkụ ahụ na-enye ìhè n’okporo ụzọ ahụ iji mee ka anyị hụ kpọmkwem ebe anyị na-aga.
5 Amụma ahụ dị n’Aisaia 2:2-5, na-egosi na n’oge anyị Chineke na-achịkọta site ná mba nile, ụmụ mmadụ ndị chọrọ ihe ọmụma ime mmụọ ka ha wee nwee ike ịmụta ofufe dị ọcha. Amaokwu nke 3 na-asị: “Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.” Amaokwu nke 5 na-akpọ ndị na-achọ eziokwu òkù, sị: “Bịanụ, ka anyị jegharịa n’ìhè Jehova.”
6. N’olè ebe ka ìhè ahụ sitere n’aka Jehova ga-emesị duje anyị?
6 Otu a, Jehova bụ isi iyi nke ụdị ìhè abụọ dị mkpa maka ndụ: ìhè nkịtị na nke ime mmụọ. Ìhè nkịtị na-enyere anụ ahụ anyị aka ịdị ndụ ugbu a, ma eleghị anya ihe dị ka afọ 70 ma ọ bụ 80 ma ọ bụ ihe yiri ya. Ma ìhè ime mmụọ na-eduje ná ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Ọ bụ dị ka Jisọs gwara Chineke n’ekpere, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
Ụwa Nọ n’Ọchịchịrị Ime Mmụọ
7. N’ihi gịnị ka inye ìhè ime mmụọ ji dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?
7 Taa, ìhè ime mmụọ dị anyị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Amụma dị iche iche nke Bible, dị ka Matiu isi 24 na 2 Timoti isi 3, na-egosi na anyị nọ nso n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Amụma ndị a na ndị ọzọ kwuru ihe dị egwu ndị meworo n’oge anyị, na-eme ka anyị mara na anyị nọ na “mgbe ikpeazụ.” N’ikwekọ n’amụma ndị ahụ, narị afọ nke a enwewo ahụmahụ nke ọtụtụ ọdachi. Mpụ na ime ihe ike etoruwo ọ̀tụ̀tụ̀ na-atụ ụjọ. Agha ewerewo ihe karịrị otu narị nde ndụ ndị mmadụ. Ọrịa dị iche iche, dị ka ọrịa AIDS ahụ a na-atụ ụjọ, na-eripịa ọtụtụ nde mmadụ, ebe ihe dị ka 160,000 nwụworo n’ihi AIDS na United States nanị. Ndụ ezinụlọ adakpọwo, a na-elekwa omume ọma nke mmekọahụ anya dị ka ihe oge ochie.
8. Ọnọdụ dị aṅaa na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu ugbu a, n’ihi gịnịkwa?
8 Onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke òtù United Nations, bụ́ Javier Pérez de Cuéllar sịrị: “Ọnọdụ ụwa na-enye ihe ama hibigara nne ókè na ịda ogbenye [na-atọsa] ihe nkekọ nke òtù dị iche iche.” O kwuru na “ihe karịrị otu ijeri ndị mmadụ ugbu a dara ogbenye ọnụ ntụ” nakwa na nke a “amụbawo ihe ndị na-akpata ịlụ ọgụ dị ilu.” “Ajọ ntaramahụhụ” ndị a, ka o kwuru, “na-eguzogide ihe ngwọta ọ bụla nke ndị ọchịchị pụrụ inye.” Onye isi nke otu òtù a ma ama kwupụtakwara, sị: “Nsogbu bụ isi nke na-eche ọha ihe a kpọrọ mmadụ ihu bụ na ọ ghọwo nke a na-apụghị ịchịkwa achịkwa.” Lee ka okwu ndị ahụ nke Abụ Ọma 146:3 si bụrụ eziokwu: “Atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.”
9. Olè ndị kachasị akpata ọchịchịrị na-ekpuchi ihe a kpọrọ mmadụ, ònye pụkwara ịtọhapụ anyị ná mmetụta nke a?
9 Ọnọdụ dị taa bụ nnọọ dị ka Aịsaịa 60:2 si buo n’amụma, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” Ọchịchịrị nke a na-ekpuchi ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa bụ n’ihi na ha adịghị amịrị ìhè ime mmụọ nke na-esite n’aka Jehova. Ọ bụkwa Setan bụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị iro bụ isi nke Chineke nke ìhè, kpatara ọchịchịrị ime mmụọ nke a. Ọ bụ ha bụ “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a.” (Ndị Efesọs 6:12) Dị ka 2 Ndị Kọrint 4:4 si kwuo, Ekwensu bụ “chi nke oge a,” onye “mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasi ha.” Ọ dịghị ọchịchị ọ bụla nke mmadụ nke pụrụ iwepụ mmetụta Setan n’ụwa. Nanị Chineke pụrụ ime ya.
“Ìhè Ukwu”
10. Olee otú Aịsaịa si buo amụma na ìhè ga-awakwasị ihe a kpọrọ mmadụ n’oge anyị?
10 Ma, ọ bụ ezie na oké ọchịchịrị na-ekpuchi ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ, Okwu Chineke bukwara amụma n’Aịsaịa 60:2, 3, sị: “N’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị. Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị.” Nke a kwekọrọ n’Aịsaịa isi 2, nke na-ekwe nkwa na ezi ofufe nke Jehova e mere ka ìhè mụkwasị bụ nke a ga-eguzobe na mgbe ikpeazụ ndị a, dịkwa ka amaokwu nke 2 na 3 na-ekwu, sị, “mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova,” ya bụ, gaa n’ofufe ya nke e mere ka ọ dị elu. Ya mere, ọ bụ ezie na Setan na-achị ụwa, a na-eme ka ìhè nke sitere n’aka Chineke wakwasị ụmụ mmadụ, ọ na-emekwa ka ọtụtụ ìgwè mmadụ nwere onwe ha pụọ n’ọchịchịrị.
11. Ònye ga-apụtakarịsị ìhè n’inwupụta ìhè nke Jehova, oleekwa otú Simeon si mee ka a mara onye ọ bụ?
11 Amụma ahụ dị n’Aịsaịa 9:2 buru amụma na Chineke ga-eziga otu onye n’ụwa inwupụta ìhè ya. Ọ na-asị: “Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.” “Ìhè ukwu” nke a bụ Ọnụ Na-ekwuru Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst. Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” (Jọn 8:12) Ụfọdụ matara nke a ọbụna mgbe Jisọs bụ nwata. Luk 2:25 na-asị na otu nwoke aha ya bụ Simeon bụ “onye ezi omume na onye na-atụ egwu Chineke,” na “mmụọ nsọ dịkwa n’ahụ ya.” Mgbe Simeon hụrụ nwata ahụ bụ Jisọs, o kwuru n’ekpere gwa Chineke, sị: “N’ihi na anya m ahụwo nzọpụta gị, nke i doziri n’ihu ndị nile; ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ.”—Luk 2:30-32.
12. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si malite iwepụ ihe mkpuchi nke ọchịchịrị nke kpuchiri ndị mmadụ?
12 Jisọs malitere iwepụ ihe mkpuchi nke ọchịchịrị n’anya ihe a kpọrọ mmadụ ngwa ngwa mgbe e mesịrị ya baptism. Matiu 4:12-16 na-agwa anyi na nke a mezuru Aịsaịa 9:1, 2, nke kwuru okwu banyere “ìhè ukwu” nke ga-amalite ịwakwasị ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị ime mmụọ. Matiu 4:17 na-asị: “Site na mgbe ahụ Jisọs malitere ikwusa, na ịsị, Chegahrịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” Site n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, Jisọs mere ka ndị mmadụ mara banyere nzube Chineke. O ‘sitere n’ozi ọma wepụta ndụ na emebighị emebi n’ìhè.’—2 Timoti 1:10.
13. Olee otú Jisọs si kọwaa onwe ya, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ iji obi ike dị otú ahụ mee ya?
13 Jisọs ji ikwesi ntụkwasị obi nwupụta ìhè nke Chineke. Ọ sịrị: “Mụ onwe m abịawo n’ụwa ịbụ ìhè, ka onye ọ bụla nke kwere na mụ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị. . . . Mụ onwe m ekwughị site n’onwe m; kama Nna nke zitere m, ya onwe ya enyewo m iwu, ihe m ga-ekwu, na otú m ga-ekwu ya. Amatakwara m na ihe o nyere n’iwu bụ ndụ ebighị ebi.”—Jọn 12:44-50.
“N’ime Ya Ka Ndụ Dị”
14. Olee otú e si mee ka a mara onye Jisọs bụ na Jọn 1:1, 2?
14 Ee, Jehova zitere Ọkpara ya n’ụwa ịbụ ìhè, iji gosi ụmụ mmadụ ụzọ nke ndụ ebighị ebi. Rịba ama otú e si gosi nke a na Jọn 1:1-16. Amaokwu nke 1 ruo 2 (NW) na-agụ, sị: “Okwu ahụ dị ná mmalite, Okwu ahụ nọnyekwaara Chineke, Okwu ahụ bụkwa chi. Onye nke a nọnyeere Chineke ná mmalite.” N’ebe a Jọn ji utu aha bụ “Okwu” na-akpọ Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ. Nke a na-egosipụta ozi o jere dị ka Ọnụ Na-ekwuru Jehova Chineke. Mgbe Jọn kwukwara na “Okwu ahụ dị ná mmalite,” ọ pụtara na Okwu ahụ bụ mmalite nke ọrụ okike nke Jehova, “isi [“mmalite,” NW] nke ihe nile Chineke kere.” (Mkpughe 3:14) Ọnọdụ ya kasị elu n’etiti ihe nile Chineke kere na-enye ezi ihe mere e ji kpọọ ya “chi,” onye dị ike. Aịsaịa 9:6 kpọrọ ya “Chineke nke bụ Dike,” ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.
15. Olee ihe ọmụma ọzọ nke Jọn 1:3-5 na-enye anyị banyere Jisọs?
15 Jọn 1:3 na-asị: “E kere ihe nile site n’aka ya; e keghịkwa otu ihe ọ bụla nke e keworo ma ọ nọghị ya.” Ndị Kọlọsi 1:16 na-asị na “n’ime ya ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa.” Jọn 1:4 na-asị na “n’ime ya ka ndụ dịrị; ndụ ahụ bụrụkwa ìhè nke mmadụ.” Ya mere, site n’Okwu ahụ, e kere ụdị ọzọ nile nke ndụ; sitekwa n’Ọkpara ya, Chineke na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie nke na-anwụkwa anwụ omume inweta ndụ ebighị ebi. N’ezie, Jisọs bụ dike ahụ nke Aịsaịa 9:2 na-akpọ “ìhè ukwu.” Jọn 1:5 na-asịkwa: “Ìhè ahụ wee na-amụ n’ọchịchịrị; ọchịchịrị ahụ ejideghịkwa ya.” Ìhè pụtara eziokwu na ezi omume, n’ụzọ megidere ọchịchịrị, bụ́ nke pụtara ezighị ezi na ajọ omume. Otú a Jọn na-egosi na ọchịchịrị ahụ agaghị emeri ìhè.
16. Olee otú Jọn Onye Na-eme Baptism si tụga aka n’idị ukwuu nke ọrụ Jisọs?
16 Jọn na-arụ ụka ugbu a n’amaokwu nke 6 ruo 9: “Otu nwoke pụtara, onye e zitere site n’ebe Chineke nọ, aha ya bụ Jọn [Onye Na-eme Baptism]. Onye ahụ bịara ịgba àmà, ka o wee gbaara ìhè ahụ àmà, ka mmadụ nile wee site n’aka ya kwere. Ya onwe ya [Jọn] abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ka o wee gbaara ìhè ahụ [Jisọs] àmà. Ezi ìhè ahụ dịrị, nke na-enye mmadụ ọ bụla nke na-abịa n’ime ụwa ìhè.” Jọn tụgara aka n’ebe Mesaịa ahụ na-abịanụ nọ ma nyefee ndị na-eso ụzọ ya n’aka Ya. Ka oge na-aga e nyere ụdị mmadụ nile ohere nke ịnabata ìhè ahụ. Ya mere, Jisọs abịaghị nanị maka abamuru ndị Juu kama maka abamuru nke ihe nile a kpọrọ mmadụ—ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, n’agbanyeghị agbụrụ.
17. Gịnị ka Jọn 1:10, 11 na-agwa anyị banyere ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Juu n’oge Jisọs?
17 Amaokwu nke 10 na 11 gara n’ihu, sị: “Ọ nọrịị n’ụwa, e kekwara ụwa site n’aka ya, ụwa amaghịkwa ya. Ọ bịakwutere ihe nke aka ya, ma ndị nke aka ya akpọbataghị ya.” N’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs abụrụwo onye e si n’aka ya kee ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ma mgbe ọ nọ n’ụwa, ihe ka ọtụtụ ná ndị nke aka ya, bụ́ ndị Juu, jụrụ ya. Ha achọghị ka e kpughee ịdị njọ na ihu abụọ ha. Ha họọrọ ọchịchịrị karịa ìhè ahụ.
18. Olee ụzọ Jọn 1:12, 13 si gosi na ụfọdụ pụrụ ịghọ ụmụ chineke ndị nwere ihe nketa pụrụ iche?
18 Jọn na-asị n’amaokwu nke 12 na 13, sị: “Ma ka ha hà, bụ́ ndị naara ya, ha ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ́ ndị kwere n’aha ya: ndị a mụrụ, ọ bụghị site n’ọbara, ọ bụghịkwa site n’ọchịchọ anụ ahụ, ọ bụghịkwa site n’ọchịchọ nwoke, kama site na Chineke.” Amaokwu ndị a na-egosi na ndị na-eso ụzọ Jisọs abụghị ụmụ nke Chineke ná mmalite. Tupu ọbịbịa Kraịst n’ụwa, ma ụdị ịbụ nwa dị otú ahụ ma olileanya nke eluigwe adịghị nke e mepere nye ụmụ mmadụ. Ma site n’uru nke àjà mgbapụta Kraịst nke ha gosiri okwukwe na ya, a nabatara ụmụ mmadụ ụfọdụ ịbụ ụmụ, ha sikwa otú a nwee ike inwe olileanya nke ndụ dị ka ndị ha na Kraịst ga-abụ eze n’Alaeze eluigwe Chineke.
19. N’ihi gịnị ka Jisọs ji nọrọ n’ọnọdụ kasị mma nke inwupụta ìhè nke Chineke dị ka e gosiri na Jọn 1:14?
19 Amaokwu nke 14 na-atụgharị uche, sị: “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ, bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, anyị kirikwara otuto ya, bụ́ otuto dị ka otú nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya.” N’ụwa, Jisọs gosipụtara otuto dị ka otú nanị Nwa mbụ nke Chineke pụrụ ime. Ya mere n’ụzọ pụrụ iche, ọ bụ onye kasị ruo eru ikpughere ụmụ mmadụ Chineke na nzube Ya.
20. Dị ka e dekọrọ na Jọn 1:15, gịnị ka Jọn Onye Na-eme Baptism na-agwa anyị banyere Jisọs?
20 Ọzọ, Jọn onyeozi na-ede n’amaokwu nke 15, sị: “Jọn [Onye Na-eme Baptism] na-agbara ya àmà, na-etikwa mkpu, sị, Onye a bụ onye m kwuru okwu banyere ya, sị, Onye ahụ nke na-abịa n’azụ m aghọwo onye buru m ụzọ: n’ihi na ọ bụrịị onye mbụ n’ebe m nọ.” A mụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism ihe dị ka ọnwa isii tupu a mụọ Jisọs dị ka mmadụ. Ma Jisọs rụrụ ọrụ dị nnọọ ukwuu karịa Jọn, nke mere na ọ bụ onye mbụ n’ebe Jọn nọ n’ụzọ ọ bụla. Jọn kwetakwara na Jisọs dịrị adị tupu ya onwe ya, ebe ọ bụ na Jisọs dịrị adị tupu ọ ghọọ mmadụ.
Onyinye Ndị Sitere n’Aka Jehova
21. N’ihi gịnị ka Jọn 1:16 ji kwuo na anyị anatawo “amara na-esochi amara”?
21 Jọn 1:16 na-atụgharị uche, sị: “Site ná njupụta ya ka anyị onwe anyị nile natara, ọbuna amara na-esochi amara.” Ọ bụ ezie na a mụrụ agbụrụ mmadụ ná mmehie n’ihi iketa nke ahụ n’aka Adam, Jehova na-ezube mbibi nke usoro ihe nke a, nlanarị nke ọtụtụ nde ụmụ mmadụ baa n’ụwa ọhụrụ, mkpọlite nke ndị nwụrụ anwụ, na mwepụ nke mmehie na ọnwụ, na-eme ka e nwee ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Ngọzi ndị a nile bụ nke na-erughịrị ụmụ mmadụ na-emehie emehie, nke ha na-arụtaghị n’ọrụ. Ha bụ onyinye ndị Jehova na-enye site n’aka Kraịst.
22. (a) Gịnị ka onyinye kachasị ukwuu nke Chineke nyere na-eme ka o kwe omume? (b) Ịkpọ òkù dị aṅaa ka a na-akpọ anyị n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible?
22 Gịnị bụ onyinye kachasị ukwuu nke mere ka ihe a nile kwe omume? “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ya mere, ezi ihe ọmụma banyere Chineke na Ọkpara ya, “Onye ahụ nke Na-eduba mmadụ ná ndụ,” dị mkpa nye ndị chọrọ ìhè ime mmụọ na ndụ ebighị ebi. (Ọrụ 3:15) Ọ bụ ya mere akwụkwọ ikpeazụ nke Bible ji na-akpọ ndị nile hụrụ eziokwu n’anya na ndị chọrọ ndụ òkù, sị: “Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.
23. Gịnị ka ndị yiri atụrụ ga-eme mgbe ha bịara n’ìhè ahụ?
23 Ndị dị umeala n’obi, ndị yiri atụrụ, abụghị nanị na ha ga-abịa n’ìhè nke ụwa kamakwa ha ga-agbaso ìhè ahụ: “Atụrụ ahụ na-esokwa ya: n’ihi na ha matara [ụda eziokwu nke] olu ya.” (Jọn 10:4) N’ezie ha na-enwe ọṅụ ‘n’iso ije ụkwụ ya nile’ n’ihi na ha matara na ime otú ahụ ga-apụtara ha ndụ ebighị ebi.—1 Pita 2:21.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Ụdị ìhè abụọ dị aṅaa na-esi n’ebe Jehova nọ abịa?
◻ N’ihi gịnị ka inye nghọta ime mmụọ ji dị oké mkpa n’oge a?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “ìhè ukwu”?
◻ Gịnị ka Jọn isi 1 na-agwa anyị banyere Jisọs?
◻ Onyinye ndị dịgasị aṅaa na-agara ndị ahụ na-agbaso ìhè nke ụwa?
[Foto dị na peeji nke 10]
Simeon kpọrọ Jisọs “ìhè a ga-ekpughere mba nile”