Ahụ Ike na Obi Ụtọ—Hà Pụrụ Ịbụ nke Gị?
ERI mgbe a nọworo na-enwe ndị ikom na ndị inyom na-ezughị okè, ha enwewo ọchịchọ maka ahụ ike na obi ụtọ. Ọ bụ ezie na ndị a bụ n’ezie ọchịchọ abụọ ndị kasị mkpa mmadụ nwere, ha abụwo ihe na-ekweghị iru aka.
Ụmụ mmadụ echebawo echiche nke ukwuu, nyekwa ndụmọdụ dị ukwuu banyere ọchịchọ nke a a na-achọ. Dr. Dennis Jaffe kwuru, sị: “Taa, isi ihe dị n’inweta ahụ ike na ọgwụgwọ na-adịgide adịgide na-adaberekarị n’akparamagwa nke gị onwe gị.” Abraham Lincoln kwuru n’otu oge, sị: “O yiri nnọọ ka ụmụ mmadụ hà na-enwe obi ụtọ ruo n’ókè ha kpebiri inweru ya.” Ì kwenyere na nke ahụ? Ruo ókè ha aṅaa ka ị na-achọsi ike inwe obi ụtọ? Ruo ókè ha aṅaa ka inweta ya na-adabere n’inwe ezi ahụ ike?
Ụmụ mmadụ achọwo obi ụtọ n’ebe nile, na-agbaso ọtụtụ ihe dị iche iche. Ha elebawo anya na nkà ihe ọmụma, nkà mmụta akparamagwa mmadụ, na nkà ihe ọmụma dị elu. N’ọchịchọ ha na-achọ obi ụtọ, ụfọdụ ndị elebawo anya na nkà mmụta sayensị, nkà mmụta ndị ọzọ, na egwú otiti. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe a na-adịghị arụ ụka nke ukwuu na akụkụ dị ukwuu nke ezi obi ụtọ nwere njikọ dị n’etiti ya na inwe ezi ahụ ike. “Ọ bụrụ na i nwere ezi ahụ ike, ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na i nwezuwo ihe nile,” ka otu mkpọsa a ma ama na telivishọn na-ekwu.
N’ịgbaso ụzọ nke a, ọtụtụ ndị anwalewo ụdị dị iche iche nke nchepụta echiche ndị metụtara ahụ ike, ma ndị ọha mmadụ na-eji eme ihe ma ndị ha na-adịghị eji eme ihe. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe ndebe akwụkwọ ọha na eze ọ bụla na-egosi ọtụtụ ihe dị iche iche a pụrụ ime banyere usoro iri ihe na usoro ọgwụgwọ dị iche iche. “E dewo ọtụtụ akwụkwọ banyere ahụ ike, malite n’ogologo oge gara aga,” ka onye ọkà ahụ a ma ama n’ihe banyere ọrịa obi, bụ́ Dr. Paul Dudley White kwuru. “Otu n’ime ndị kasị mma bụ Regiment of Helthe nke e dere n’ihe dị ka otu puku afọ gara aga.”
N’agbanyeghị ihe a nile, ọchịchọ a na-achọ ahụ ike na obi ụtọ abụwo nke a na-enwetaghị ihe a na-achọ na ya nye ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ. Nke ahụ ọ̀ bụụrụ gị ihe ijuanya, n’iche echiche banyere otú e chere na mmepeanya anyị agaruwo n’ihu? Ọ bụ ihe doro anya na nkà mmụta sayensị ewepụbeghị ọrịa, ịka nká, na ọnwụ.
Ma, ọ̀ ga-abụkwuru gị ihe ijuanya ịmara na ọ dịghị ụzọ ọ bụla anyị nwere iji mee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ obi ụtọ, na anyị enweghịkwa ezi nkọwa ọ bụla nke ihe ọ bụ? N’otu okwu ihu ọha nke na-atụle “Ntụgharị Uche Banyere Obi Ụtọ,” Pierre Teilhard de Chardin kwubiri, sị: “Ruo ọtụtụ narị afọ, nke a abụwo isiokwu a tụlere n’ọtụtụ akwụkwọ, nnyocha, nnwale ndị mmadụ mere n’otu n’otu ma ọ bụ n’ìgwè, otu gasịa ibe ya esochie; ọ bụkwa ihe dị mwute ịkọ na ha nile enwebeghị nnọọ ike inwe nkwekọrịta ma ọlị. Nye ọtụtụ n’ime anyị, ihe si na ya pụta bụ na nanị nkwubi okwu ezi uche dị na ya a pụrụ inweta site ná ntụle nile ahụ bụ na ọ baghị uru ịnọgide n’ọchịchọ ahụ a na-achọ.”
Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ị na-eche banyere obi ụtọ? Jụọ onwe gị ajụjụ onwe onye ụfọdụ ndị na-achọpụta ihe bụ eziokwu. Ì nwere obi ụtọ n’ezie ugbu a? Ka à pụrụ inweta ezi obi ụtọ nanị n’eluigwe? È nwere olileanya ọ bụla e ji n’aka na anyị pụrụ inweta ma ahụ ike ma obi ụtọ, na anyị pụrụ inwe ndị a ọbụna n’elu ala ebe a?