Ihe Ọ̀ Na-adịwanye Mma n’Ezie?
“Mgbidi [Berlin] ahụ pụrụ inwe ọtụtụ oghere dị iche iche karị ka mmekọrịta dị n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ na-amụbawanye. Ma ọ ga-ewe ọtụtụ afọ, ọbụna ọtụtụ ọgbọ, tupu a kwatuo ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Germany abụọ ahụ ga-abụghachi otu ọzọ.” Otú ahụ ka otu magazin akụkọ ndị America a ma ama dere na March 1989.
Mgbe ihe na-erughị 250 ụbọchị—ọ bụghị afọ, ma ya fọdụkwa ịbụ ọgbọ—gasịrị, mgbidi ahụ malitere ịdakpọsị. N’ime izu ole na ole, ọtụtụ puku iberibe ya ndị bụzi ihe ncheta ugbu a, bụ ndị e ji mere ihe ịchọ mma n’elu table dị iche iche gburugburu ụwa.
ÁKWÀ Mgbochi Ígwè nke taworo nchara emesịwo meghee, na-eme ka a malite inwe olileanya na udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ụwa emesịwo dị nso n’ezie. Ọbụna Agha Ógbè Gulf ahụ a lụrụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ebelataghị olileanya e nwere na nsọrịta mpi ahụ nọworo ogologo oge n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ Ụwa akwụsịwo, na ọnọdụ ụwa ọhụrụ dịkwa ezi nso.
Ịgbakwunye Akụkụ Ọhụrụ
Kemgbe agha ụwa nke abụọ, ọ pụtala ìhè na e nwere mgbalị a na-eme iji mee ka Europe bụrụ ebe dị n’otu. Na 1951, mba ndị Ọdịda Anyanwụ Europe guzobere òtù European Coal and Steel Community. E sochiri nke a na 1957 site n’iguzobe usoro nzụrịta ahịa bụ European Common Market. Na 1987, mba 12 dị n’òtù mba dị iche iche nke a (ndị nwere 342 nde mmadụ n’ime ha ugbu a) setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị dị n’otu n’ihe banyere usoro akụ na ụba ha ka ọ na-eru 1992. Ọbụna ugbu a, o yiri ka ịdị n’otu zuru ezu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ̀ bụ ihe a pụrụ inweta enweta. Lee nnọọ mgbanwe na-enye ume ọhụrụ nke a bụ site n’akụkọ ihe mere eme nke Europe n’afọ ndị gara aga, bụ́ nke jupụtara ná mwụfu ọbara!
Ma, n’iburu n’uche ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị mere n’oge na-adịbeghị anya, 1992 na-aghọwanye afọ dị oké mkpa. Echiche a na-enwe amụbawo na mba Ọwụwa Anyanwụ Europe ndị ahụ na-agbasobu usoro ọchịchị ndị Kọmunist pụkwara imesị sonye na Europe nke dị n’otu.
Ò Nwere Nkwado Chineke?
Òtù okpukpe ụfọdụ, n’ịgbakụta ụkpụrụ ahụ metụtara nnọpụiche ndị Kraịst azụ, kwere ka mkpagbu ahụ e nyeworo okpukpe n’Ọwụwa Anyanwụ Europe ruo ọtụtụ iri afọ mee ka ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụzọ pụtara ìhè. N’ikwu banyere nke a, akwụkwọ akụkọ ahụ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Germany, bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung kwuru na “ntinye aka ndị Kristian tinyeworo n’iweta mgbanwe ndị e nweworo n’Ọwụwa Anyanwụ Ụwa abụghị ihe a na-arụ ụka,” na-ekwukwa na “òkè ha kerewooro bụ ihe a na-ekwesịghị ileda anya.” Ọ kọwara, sị: “Dị ka ihe atụ, na Poland, okpukpe jikọrọ onwe ya n’ebe mba ahụ dị, chọọchị ghọkwara ihe na-eme isi ike nke na-eguzogide òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-achị achị; n’ime GDR [nke bụbu East Germany] chọọchị nyere ndị na-enupụrụ ọchịchị isi ohere, kwekwa ka ha jiri ụlọ chọọchị dị iche iche mee ihe maka nzube dị iche iche nke nhazi; na Czechoslovakia, ndị Kristian na ndị na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya zutere onwe ha n’ụlọ mkpọrọ, malite inwe mmasị n’ebe ibe ha nọ, mesịakwa jikọọ aka.” Ọbụna na Romania, ebe “chọọchị dị iche iche gosipụtara onwe ha ịbụ ndị nkwado kwesịrị ntụkwasị obi nke ọchịchị Ceauşescu,” ọ bụ oyiyi egwu ahụ e yiri ijide onye ụkọchukwu bụ Laszlo Tökes kpaliri mgbanwe ọchịchị ahụ.
Aka Vatican dịkwa na ya. Magazin Time kwuru na December 1989, sị: “Ọ bụ ezie na ụkpụrụ ọchịchị Gorbachev nke bụ iwepụ aka n’ihe omume ụmụ mmadụ bụ ihe a hụrụ anya nke kpatara usoro mmeghachi ihe ahụ nke nnwere onwe bụ́ nke gabigaworo Ọwụwa Anyanwụ Europe n’ime ọnwa ole na ole gara aga, ọ bụ John Paul kwesịrị ịnata ekele ka ukwuu maka ya. . . . N’ime afọ nile nke 1980, okwu ndị o kwuru mesiri ya ike, bụ́ echiche nke Europe dị n’otu site n’oké osimiri Atlantic ruo n’usoro ugwu Ural, bụ́ nke okwukwe ndị Kristian kpaliri.” Otú a, dị ka ọ na-emebu, mgbe ọ na-eleta Czechoslovakia n’April 1990, popu ahụ kwupụtara olileanya na ọbịbịa ya ga-emeghe ụzọ ndị ọhụrụ n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọ mara ọkwa maka nzukọ synod e mere atụmatụ ya nke ndị bishọp bụ ndị Europe iji setịpụ ụkpụrụ a ga-eji mezuo nzube ya nke inwe “Europe dị n’otu n’ihe ndabere nke mkpọrọgwụ ndị Kristian ya.”
Ọ̀ bụ na Germany nke dị n’otu n’ime usoro ihe nke Europe dị n’otu apụghị ịbụ mgba àmà bu ụzọ nke Europe nke dị n’otu n’ụzọ zuru ezu, nakwa ọbụna nke ụwa dị n’otu? Ntinye aka okpukpe na-etinye ọ́ dịghị egosi na nke a bụ ihe Bible kwere ná nkwa? N’ụzọ doro anya, ebe ndị ndú okpukpe nọ ma n’Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-esozi ndị ọchịchị na-arụkọ ọrụ ugbu a iji nweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, ọ̀ bụ na anyị apụghị ịtụ anya na n’oge na-adịghị anya, nke a gaje ịbụ ihe dị adị n’ezie? Ka anyị lee.
[Map/Foto dị na peeji nke 4]
Nikolai Chọọchị nke ndị Protestant ahụ dị na Leipzig—ihe atụ nke ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị na Germany
Mba ndị so n’òtù azụmahịa European Common Market