Ihe Ọghọm—Akara Aka Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ndabara?
KA Cristina, bụ́ otu ọmarịcha nwa agbọghọ ọrụ ya bụ igosipụta uwe ndị ọhụrụ, na-agafe okporo ụzọ na-ekwo ekwo, bụ́ Nove de Julho Avenue nke dị na São Paulo, Brazil, ọ hụghị bọọsụ ahụ nke na-abịanụ. Onye draịva ahụ gbalịsiri ike ịkwụsị ụgbọ ala ya, ma ihe emebiela emebie. Ọ rịrị Cristina elu, gbuokwa ya.
Ajọ Ihe ọghọm nke a bụ nke e buru akụkọ ya n’ihu akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ O Estado de S. Paulo. (July 29, 1990) Ma ọ bụkwa nanị otu n’ime 50,000 ndị na-anwụ n’ihe mberede okporo ụzọ kwa afọ na Brazil. Ọ bụkwa ezie na ọtụtụ puku ndị ọzọ na-ebute nkwarụ site n’ihe ọghọm ndị dị otú ahụ, ndị ọzọ na-alanarị n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla. Ya mere, n’ihi gịnị ka nwa agbọghọ nke a na-ejighị lanarị? Ọ̀ bụ akara aka ya ịnwụ n’ụbọchị ahụ?
Ọtụtụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ ga-arụ ụka na ọ dị otú ahụ. Ha kwenyere n’akara aka, na a dịworị mbụ kpebie ihe omume ndị bụ isi, dị ka oge ọnwụ mmadụ. Nkwenkwe nke a arụpụtawo okwu ndị dị ka: “A naghị ehichapụ akara aka ehichapụ.” “Oge ya eruola,” ma ọ bụ “Ihe e dere na ọ ga-eme aghaghị ime.” È nwere eziokwu ọ bụla dị n’okwu ndị a na-anụkarị dị ka ndị a? Ànyị bụ nanị ndị ohu na-enweghị ike ọ bụla, ndị akara aka pụrụ iji mere ihe masịrị ya ma tụpụ anyị mgbe ọ masịrị ya?
Ikwere n’akara aka, ma ọ bụ echiche ahụ bụ na a na-ebu ụzọ kaa ihe nile na-emenụ aka tupu ha emee, dịrị n’etiti ndị Grik na ndị Rom oge ochie. Ọbụna taa, echiche ahụ ka siri ike n’ọtụtụ okpukpe. Dị ka ihe atụ, okpukpe Alakụba na-arapagidesi ike n’okwu ahụ dị na Koran, bụ́: “Ọ dịghị mkpụrụ obi ọ bụla nke pụrụ ịnwụ, ọ gwụlakwa ma Allah o kwere ka ọ nwụọ, ọ bụkwa n’oge a kara aka.” Ikwere n’akara aka bụkwa ihe a na-ahụkarị n’ime Krisendọm, a zụlitewokwa ya site n’ozizi nke ọdịnihu e buru ụzọ kaa aka, nke John Calvin kụziri. N’ihi ya, ọ bụ ihe a na-ahụkarị, bụ́ ndị ụkọchukwu ịgwa ndị ikwu na-eru újú na ihe ọghọm bụ “uche Chineke.”
Otú ọ dị, echiche ahụ bụ na ihe ọghọm sitere n’akara aka megidere ụkpụrụ iche echiche, ahụmahụ mmadụ na-enwe, na ihe ezi uche dị na ya. Otu ihe bụ na ihe ọghọm ụgbọ ala apụghị nnọọ ịbụ ihe sitere n’aka Chineke, ebe ọ bụ na nnyocha e leziri anya mee ga-egosi ihe kpatara ya nke a pụrụ ịghọta aghọta. Ọzọkwa, ihe ndekọ ndị e nwere na-egosi na ime ihe nchebe onwe onye ụfọdụ ndị ezi uche dị na ha—dị ka ikenye belt oche moto—na-ebelata ọnwụ a na-anwụ n’ihe mberede n’ụzọ dị ukwuu. Ọ̀ dị ihe nchebe ọ bụla nke pụrụ n’ezie igbochi uche Chineke nke e buworo ụzọ kpebie?
Ma, ikwere n’akara aka na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ahụ onye kweere na ya. Ọ̀ bụ na ọ dịghị agba ume omume nzuzu ndị dị ka ilefuru iwu metụtara ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ na ihe àmà okporo ụzọ dị iche iche anya ma ọ bụ ịkwọ ụgbọ ala mgbe mmanya na-egbu ma ọ bụ mgbe ọgwụ ọjọọ na-akpa ike n’ahụ mmadụ? Nke ka njọ bụ na ikwere n’akara aka na-akpali ụfọdụ ndị ịta Chineke ụta mgbe ihe ọghọm metụtara ha. N’ịbụ ndị na-ewe iwe, na-enwekwa mmetụta nke enweghị ihe a pụrụ ime banyere ya, n’ịbụkwa ndị kwenyesiri ike na ihe banyere ha adịghị emetụ Chineke n’obi, ha pụrụ ọbụna ịkwụsị inwe okwukwe. Onye ahụ na-ede abụ, bụ́ Emerson kwuru n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Ihe ilu kasị njọ ná ndụ bụ ikwere n’Akara Aka ma ọ bụ Ọdịnihu E Bu Ụzọ Kaa Aka nke nwere obi ọjọọ.”
Ma gịnị ka Bible na-ekwu banyere ihe mberede na ihe ọghọm? Ọ̀ na-akụzi n’ezie na ihe ndị a bụ ihe ndị sitere n’akara aka? Tụkwasị na nke ahụ, gịnị ka ọ na-ekwu banyere olileanya anyị maka nzọpụta? Ànyị nwere ohere ọ bụla ime nhọrọ n’okwu ahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ihe ilu kasị njọ ná ndụ bụ ikwere n’Akara Aka ma ọ bụ Ọdịnihu E Bu Ụzọ Kaa Aka nke nwere obi ọjọọ.”—Ralph Waldo Emerson