Usoro Ndị Popu—Ọ̀ Bụ Kraịst Guzobere Ya?
“MALITE na Pita, bụ́ Bishọp mbụ nke Rom, ruo na popu anyị nwere ugbu a, bụ́ John Paul nke Abụọ, e nwere ogologo ahịrị nke ndị popu—ihe karịrị 260, n’ezie.” Otú ahụ ka onye brọda ndị Katọlik bụ́ Anthony Foy, kwuru n’ime The Southern Cross, bụ́ akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik na-ebipụta kwa izu n’ebe ndịda Africa. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ n’ebe usoro ndị popu nke a na-enwetụbeghị nkwụsị dị, ka anyị pụrụ iji obi ike zoo aka mgbe a gwara anyị ka anyị nye ihe nnwapụta na-egosi na ọ bụ Jisọs Kraịst guzobere Chọọchị Katọlik.”
À pụrụ iji obi ike kwuo na ogologo ahịrị nke a nke ndị popu malitere na Pita onyeozi? Dị ka nkà mmụta okpukpe ndị Katọlik si dị, e kwuru na ndị popu anọ, bụ́ Linus, Anacletus, Clement nke Mbụ, na Evaristus, sochiri Pita ruo n’afọ 100 O.A. Bible hotara otu onye Kraịst aha ya bụ Laịnọs nke biri na Rom. (2 Timoti 4:21) Otú ọ dị, ọ dịghị ihe ọ bụla nke na-egosi na Laịnọs, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ, sochiri Pita dị ka popu. Jọn onyeozi, onye dere akwụkwọ ise dị na Bible n’ime afọ iri nke ikpeazụ nke narị afọ mbụ ahụ, ezoghị aka ọ bụla n’ebe nke ọ bụla n’ime ndị a a sị na ha sochiri Pita nọ. N’eziokwu, a sị na ọ dị onye ọ bụla sochiri Pita, ọ̀ bụ na onye ezi uche dị n’ime ya ịhọpụta agaghị abụworị Jọn n’onwe ya.
N’ihe banyere nzọrọ ahụ nke bụ na Pita bụ bishọp mbụ nke Rom, e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi ọbụna na o jeruru obodo ahụ. N’eziokwu, Pita n’onwe ya na-ekwu na o dere akwụkwọ ozi mbụ ya site na Babilọn. (1 Pita 5:13) Arụmụka ahụ ndị Katọlik na-eme nke bụ na Pita jiri “Babilọn” mee ihe dị ka aha nzuzo nke Rom enweghị ihe ndabere ọ bụla. E nwere Babilọn nke dị adị n’ezie n’oge Pita. Ọzọkwa, Babilọn nwere òtù ndị Juu buru ibu nke bi na ya. Ebe Jisọs gwara Pita ka o mee ka nkwusa ya lekwasị anya n’ebe ndị Juu e biri úgwù nọ, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya ikwere na Pita jere Babilọn maka nzube nke a.—Ndị Galetia 2:9.
Rịbakwa ama na ọ dịghị mgbe ọ bụla Pita zoro aka n’ebe onwe ya nọ dị ka ihe ọ bụla karịrị otu n’ime ndị ozi Kraịst. (2 Pita 1:1) Ọ dịghị ebe ọ bụla n’ime Bible a kpọrọ ya “Nna Dị Nsọ,” “Pontiff Dị Ukwuu,” ma ọ bụ “Popu” (Latin, papa, bụ́ okwu ịhụnanya dịịrị “Nna”). Kama nke ahụ, o ji ịdị umeala n’obi rapagidesie ike n’okwu Jisọs ahụ dị na Matiu 23:9, 10: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ndị ndú, n’ihi na otu onye bụ Onye ndú unu, ya bụ Kraịst ahụ.” Pita anakwereghị ofufe. Mgbe ọchịagha onye Rom ahụ bụ Kọnilịọs ‘dara n’ala n’ụkwụ ya, kpọọ isiala nye ya, . . . Pita weliri ya elu, sị, Bilie; mụ onwe m bụkwa mmadụ.’—Ọrụ 10:25, 26.
N’ihe banyere 260 ndị ahụ a sị na ha bụ ndị popu, onye ụkọchukwu bụ Foy na-anakwere, sị: “Ọtụtụ n’ime ha abụwo ndị na-ekwesịghị ọkwa ahụ dị elu ha nwere.” N’ịnwa ịkọwa na nke a adịghị ihe o mere, akwụkwọ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Ihe dị mkpa maka nzube nke ịchị achị bụ ọkwá ahụ, ọ bụghị àgwà onwe onye nke onye ahụ bụ popu n’onwe ya. Ọ pụrụ ịbụworị n’onwe ya onye senti, onye na-adịchaghị mma ma ọ dịchaghịkwa njọ, ma ọ bụ ọbụna onye arụrụala.” Ma ì chere na Kraịst ga-eji ndị dị otú ahụ mee ihe ịnọchite anya ya?
Otú o sina dị, nzọrọ ahụ nke bụ na ọ bụ Kraịst guzobere usoro ndị popu enweghị nkwado ọ bụla n’ime Bible. Dị ka akwụkwọ Encyclopedia of Religion si kwuo, ọbụna ndị ọkà mmụta nke oge a bụ ndị Katọlik na-anakwere na “e nweghị ihe nkwado ọ bụla kpọmkwem dị n’ime Bible iji gosi na Jisọs guzobere usoro ndị popu dị ka ọkwá na-adịgide adịgide n’ime chọọchị.”