Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/1 p. 31
  • Ha Na-eme Ihe Ha Pụrụ Ime

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Na-eme Ihe Ha Pụrụ Ime
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onyinye A Na-ewetara Jehova”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Anyị Na-ekele Jehova Maka Ịhụnanya Unu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Amamihe na Uru Ndị Dị n’Ịhazi Ihe Onwunwe
    Teta!—1999
  • Gịnị Mere Anyị Ga-eji Enye Onye Nwe Ihe Niile Onyinye?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/1 p. 31

Ha Na-eme Ihe Ha Pụrụ Ime

Ọ bụ ezie na ha apụghị ịkwụghachi Jehova ụgwọ maka uru nile ha riteworo n’aka ya, ọtụtụ ndị na-eme ihe ha pụrụ ime iji kwadoo ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ Ndịàmà ya na-arụ. (Matiu 24:14; tụlee Mak 14:3-9.) Akwụkwọ ozi nke a nke sitere n’aka otu ezinụlọ bi na Minnesota, U.S.A. bụ ihe na-akpali mmasị n’ihe banyere nke a:

“Ezi Ụmụnna Anyị,

“Anyị na-ezitere unu onyinye nke a n’ọnụ ego bụ $——. Anyị na-arịọ ka e were ya mee ihe maka ịkwado ọrụ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụ tinye ya n’Ụtụ Ego Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ ná mkpa ọ bụla ọzọ nzukọ a nwere. . . .

“Anyị ji n’aka na a ga-eji ego nke a mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nzube [Jehova]. Ọ ga-amasị anyị iji ohere nke a mee ihe inye unu agbamume anyị ịnọgide n’ọrụ ọma ahụ, anyị na-ekelekwa unu karịsịa maka ihe nkiri vidio ahụ nke ọrụ [Watch Tower] Society na-arụ gburugburu ụwa. Ọ bụ ihe nkiri nke a mere ka anyị mara otú ọrụ ahụ haruru, o mekwara ka o doo anyị anya na onyinye afọ ofufo anyị bụ ihe a chọrọ. Tupu ugbu a, anyị ahapụworo ọgbakọ, sekit, na distrikt ọrụ nke izitere unu onyinye, ma anyị na-ekele Jehova ugbu a na o nwewo ndidi n’ebe anyị nọ maka nlepụ anyị na-elepụghị anya, jirikwa ịhụnanya gosi anyị mkpa ọ dị ka anyị na-enye aka n’onwe anyị n’iweta ego e ji akwado ọrụ nke a na-azọpụta ndụ, tụkwasị n’ụdị onyinye ndị ọzọ. Anyị na-ekpebikwa dị ka otu ezinụlọ, izite, ya dịkarịa ala, $—— kwa ọnwa . . . kpọmkwem gaa na New York.

“Ọzọkwa, anyị na-ekele unu maka ọrụ ọma unu nọworo na-arụrụ anyị, nakwa maka ikwesị ntụkwasị obi unu gosipụtaworo nye Jehova.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya