Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
“Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], tookwa aha gị? n’ihi na nanị gị dị ọcha n’obi.”—MKPUGHE 15:4.
1, 2. (a) Olee otú Jehova si meghee window nile nke eluigwe n’afọ 1991? (b) Ahụmahụ ndụ dị aṅaa kpaliri otu onye ozi ala ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ikwu okwu ndụmọdụ ahụ bụ: “Tụọ egwu Jehova”? (Leekwa 1991 Yearbook, peji nke 187-189.)
JEHOVA ‘meghere window nile nke eluigwe, wụpụkwa nnọọ ngọzi ruo mgbe ọnọdụ na-ezughị ezu ịnagide ya.’ A pụrụ iji okwu ndị ahụ mee ihe ugboro ugboro banyere Ndịàmà Jehova n’oge ndị a. (Malakaị 3:10) Dị ka ihe atụ, n’ime afọ ije ozi 1991, ịnụ ọkụ n’obi nke Ndịàmà si esi bịa na ndị amaala bịara mgbakọ jupụtara ebe nile ná nnọkọ ndị Kraịst ná mgbakọ ndị pụrụ iche e nwere gburugburu ụwa—site ná Mgbakọ “Asụsụ Dị Ọcha” ndị e mere na Buenos Aires dị na South America; na Manila, Taipei, na Bangkok nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ; ruo na Mgbakọ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya” ndị e mere na Budapest, Prague, na Zagreb (August 16-18, 1991) n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe.
2 Lee ihe ọṅụ ọ bụ nye ndị si ofesi bịa izute Ndịàmà nọworo ogologo oge na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe ndị a! Dị ka ihe atụ, na Bangkok, Frank Dewar—onye bụ n’otu oge nanị onye nkwusa Alaeze na Thailand—kọrọ banyere 58 afọ nke ije ozi ala ọzọ ya. Ebe ndị ọ rụrụ ọrụ bụ site n’agwaetiti nile nke Pacific ruo Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, na ọbụna banye China. O zutewo ihe ize ndụ dị iche iche site n’ụgbọ ikpu n’ime mmiri, anụ ọhịa ndị bi n’oké ọhịa, ọrịa dị iche iche n’ala okpomọkụ, na ọchịchị obi ọjọọ nke ndị isi agha Japan. Mgbe a jụrụ ya banyere ndụmọdụ ọ ga-enye ndị bịara mgbakọ, nzaghachi ya bụ nke dị mfe: “Tụọ egwu Jehova!”
3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gosipụta egwu Chineke?
3 “Tụọ egwu Jehova!” Lee ka o si dị mkpa ka anyị nile zụlite egwu ahụ nke dị mma! “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (Abụ Ọma 111:10) Egwu nke a abụghị ụjọ na-akụnwụ ahụ maka Jehova, kama ọ bụ oké nkwanye ùgwù maka ịdị ukwuu ya dị ebube na ọdịdị Chineke ya dị iche iche, na-adabere ná nghọta anyị na-enweta site n’ọmụmụ Okwu Chineke. Ná Mkpughe 15:3, 4, abụ Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ na-akpọsa, sị: “Ọrụ gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], tookwa aha gị? N’ihi na nanị gị dị ọcha n’obi.” Site n’iguzosi ike n’ihe n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ, Jehova na-ahụ na e “deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” E ji ndụ ebighị ebi na-akwụghachi ha ụgwọ.—Malakaị 3:16; Mkpughe 20:12, 15.
Egwu Chineke Na-emeri
4. Mgbapụta oge ochie dị aṅaa kwesịrị ịgba anyị ume ịtụ egwu Jehova?
4 Mgbe Israel zọọrọ ije pụọ n’Ijipt Fero, Mosis gosipụtara nke ọma na ya na-atụ egwu nanị Jehova. Ngwa ngwa, ndị Israel tọrọ atọ n’etiti Osimiri Uhie na oké ìgwè ndị agha Ijipt. Gịnị ka ha pụrụ ime? “Mosis wee si ndị Israel, Unu atụla egwu, guzonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova, nke ọ ga-emere unu taa: n’ihi na ndị Ijipt ndị unu hụworo taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-eburu unu agha, ma unu onwe unu ga-agba nkịtị.” N’ụzọ ọrụ ebube, Jehova kewara mmiri ahụ. Ndị Israel si n’ala mmiri ahụ gabiga. Mgbe ahụ mmiri ndị ahụ lọghachiri n’ike ọzọ. E kpochapụrụ usuu ndị agha Fero. Jehova zọpụtara mba ahụ na-atụ egwu Chineke, n’otu oge ahụ na-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi Ijipt na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’otu aka ahụ taa, ọ ga-egosipụta iguzosi ike n’ihe n’ịgbapụta Ndịàmà ya na-atụ egwu Chineke site n’ụwa Setan.—Ọpụpụ 14:13, 14; Ndị Rom 15:4.
5, 6. Ihe ndị dị aṅaa mere n’oge Joshua na-egosi na anyị kwesịrị ịtụ egwu Jehova, ọ bụghị nke mmadụ?
5 Mgbe Ọpụpụ site n’Ijipt ahụ gasịrị, Mosis zipụrụ ndị nledo 12 gaa n’Ala Nkwa ahụ. Oké egwu tụrụ iri n’ime ha mgbe ha hụrụ ndị yiri ndị dike bi n’ime ya, ha wee nwaa ịrafu Israel pụọ n’ịbanye n’ala ahụ. Ma mmadụ abụọ ndị ọzọ, Joshua na Keleb, kọrọ, sị: “[Ọ] dị mma nke ukwuu nke ukwuu. Ọ bụrụ na ihe anyị atọọ Jehova ụtọ, ọ ga-emekwa ka anyị baa n’ala nke a, ọ ga-enyekwa anyị ya; bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Nanị, unu enupụkwala isi n’aka Jehova, unu onwe unu atụkwala egwu ndị ala ahụ; n’ihi na nri anyị ka ha bụ: ihe nchegide ha ewezụgawo onwe ya n’ahụ ha, ma Jehova nọnyeere anyị: unu atụla egwu ha.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:7-9.
6 Otú ọ dị, ndị Israel ahụ dabara n’ịtụ egwu mmadụ. N’ihi ya, ha erughị n’ala ahụ e kwere ná nkwa. Ma Joshua na Keleb, tinyere ọgbọ ọhụrụ nke ndị Israel, nwere ihe ùgwù nke ịbanye n’ọmarịcha ala ahụ wee rụọ ọrụ n’ubi vine na olive ya. N’okwu ikpeazụ ya ọ gwara ndị Israel ahụ zukọrọnụ, Joshua nyere okwu ndụmọdụ nke a, sị: “Na-atụnụ egwu Jehova, na-efekwanụ ya ofufe n’izu okè na n’eziokwu.” Joshua kwukwara, sị: “Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” (Joshua 24:14, 15) Lee okwu agbamume ọ bụ nye ndị isi ezinụlọ na ndị ọzọ nile ka ha tụọ egwu Jehova ka anyị na-akwadebe ịgabiga banye n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke!
7. Olee otú Devid si mesie mkpa ịtụ egwu Chineke dị ike?
7 Nwa okoro ahụ bụ onye ọzụzụ atụrụ bụ́ Devid gosipụtakwara egwu ọ na-atụ Jehova n’ụzọ kwesịrị ịbụ ihe nlereanya mgbe ọ mara Golaịat aka n’aha Chineke. (1 Samuel 17:45, 47) N’elu àkwà ọnwụ ya, Devid pụrụ ikwupụta, sị: “Mmụọ nke Jehova kwuru site n’ọnụ m, okwu ya dịkwa n’ire m. Chineke Israel sịrị, mụ ka Oké Nkume Israel gwara okwu: Onye na-achị mmadụ bụ onye ezi omume, ọ na-achị n’egwu Chineke. Ọ dịkwa ka ìhè ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-awa, bụ́ ụtụtụ igwe ojii na-adịghị.” (2 Samuel 23:2-4) N’ụzọ dị ịrịba ama egwu nke a nke Chineke abụrụwo ihe na-adịghị n’etiti ndị ọchịchị ụwa nke a, leekwa ka ihe ndị ọ na-arụpụta si bụrụ ihe ọdachi! Lee ka ọnọdụ ga-esi dịrị iche mgbe Jisọs, “Nwa Devid,” ga-achị elu ụwa n’egwu Jehova!—Matiu 21:9.
Ime Ihe n’Egwu Jehova
8. N’ihi gịnị ka Juda ji nwee ọganihu n’okpuru Jehoshafat, na-egosipụta gịnị banyere taa?
8 Ihe dị ka otu narị afọ mgbe Devid nwụsịrị, Jehoshafat ghọrọ eze na Juda. N’ebe a ọzọ ka e nwere eze nke jere ozi n’egwu Jehova. O weghachiri usoro ọchịchị Chineke na Juda, guzobe ndị ikpe gburugburu ala ahụ, nyekwa ha ntụziaka ndị a: “Ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe, kama ọ bụ Jehova; ọ nọnyekwaara unu n’okwu ikpe unu. Ma ugbu a ka oké egwu Jehova dịkwasị unu; lezienụ anya, mee ya: n’ihi na ọ dịghị ajọ omume, ma ọ bụ ịhụ mmadụ ihu ọma, ma ọ bụ ịnara ihe iri ngo, dị n’ime Jehova, bụ́ Chineke anyị. . . . Otú a ka unu ga-eme n’egwu Jehova, na n’ikwesị ntụkwasị obi, na n’obi zuru okè.” (2 Ihe Emere 19:6-9) Otú a, Juda nwere ọganihu n’egwu Jehova, dị nnọọ ka ndị Chineke taa na-erite uru site n’ije ozi nke ndị nlekọta nwere ọmịiko taa.
9, 10. Olee otú Jehoshafat si nwee mmeri n’egwu Jehova?
9 Otú ọ dị, Juda nwere ndị iro. Ndị a kpebiri ikpochapụ mba Chineke. Ìgwè ndị agha e jikọrọ ọnụ nke Amọn, Moab, na Ugwu Sia nuuru bata n’ókèala Juda ma yie Jerusalem egwu. Ọ bụ oké usuu ndị agha. Jehoshafat chigharịkwuuru Jehova n’ekpere mgbe “Juda nile na-eguzokwa n’ihu Jehova, ha na ụmụntakịrị ha, na ndị inyom ha, na ụmụ ha.” Mgbe ahụ, dị ka azịza nye ekpere ahụ, mmụọ Jehova dịkwasịrị Jahaziel bụ onye Livaị, bụ́ onye sịrị: “Otú a ka Jehova sịrị unu, Unu onwe unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba; n’ihi na ọ bụghị unu nwe agha nke a, kama ọ bụ Chineke nwe. Echi rịdanụ imegide ha: . . . ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha n’agha nke a: guzonụ onwe unu, guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ: echi pụkwurunụ ha; Jehova nọnyekwara unu.”—2 Ihe Emere 20:5-17.
10 N’ụtụtụ na-esonụ, ndị ikom Juda biliri n’oge. Ka ha ji nrubeisi na-apụ izute ndị iro ahụ, Jehoshafat biliri ọtọ ma kwuo, sị: “Nụrụnụ m, Juda, na ndị bi na Jerusalem; kwerenụ na Jehova, bụ́ Chineke unu, unu ga-ekwesịkwa ntụkwasị obi; kwerenụ ná ndị amụma ya, ihe ga-agakwara unu nke ọma.” Ka ha na-azọ ije na-aga n’ihu ndị ahụ ji ihe agha, ndị na-abụku Jehova abụ ji ịdị n’otu bụọ abụ, sị: “Keleenụ Jehova; n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị.” Jehova gosipụtara ebere ịhụnanya ahụ site n’itinye ndị iro ahụ n’oké mgbagwoju anya nke na ha gbuchapụrịtara onwe ha. Ka ndị ikom Juda bịarutere n’ụlọ nche ahụ dị n’ime ọzara, nanị ozu nwụrụ anwụ nke ndị iro ahụ fọdụrụ.—2 Ihe Emere 20:20-24.
11. Banyere egwu, olee otú mba dị iche iche si dị iche n’ebe ndị Chineke nọ?
11 Mgbe mba ndị gbara ha gburugburu nụrụ banyere mgbapụta nke a site n’ọrụ ebube, “oké egwu Chineke” wee dịkwasị ha. N’aka nke ọzọ, mba ahụ nke rubere isi n’ịtụ egwu Jehova nwere ugbu a ‘izu ike gburugburu.’ (2 Ihe Emere 20:29, 30) N’otu aka ahụ, mgbe Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe n’Amagedọn, mba nile ga-enwe oké egwu Chineke na nke Ọkpara ya Na-emezu Ihe O Kwuru, bụ́ Jisọs Kraịst, ha agaghịkwa enwe ike iguzo n’oké ụbọchị nke iwe Chineke.—Mkpughe 6:15-17.
12. Olee ụzọ e siworo nweta ụgwọ ọrụ maka ịtụ egwu Jehova n’oge gboo?
12 Egwu dị mma nke Jehova na-eweta ụgwọ ọrụ bara ụba. Noa gosipụtara ‘egwu Chineke ma dozie ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ ya.’ (Ndị Hibru 11:7) Banyekwara ndị Kraịst narị afọ mbụ, e dekọrọ na, mgbe otu oge mkpagbu malitere, ọgbakọ ahụ “nwere udo, ebe a na-ewuli ya elu dị ka ụlọ; ọ na-abakwa ụba, ebe ọ na-aga n’egwu Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na nkasi obi nke mmụọ nsọ”—dịkwa nnọọ ka ọ na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’oge a.—Ọrụ 9:31.
Hụ Ezi Ihe n’Anya, Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị
13. Ọ̀ bụ nanị n’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi nweta ngọzi Jehova?
13 Jehova dị mma n’akụkụ nile. N’ihi ya, “egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.” (Ilu 8:13) E dere banyere Jisọs, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị, n’ihi nke a Chineke, bụ́ Chineke gị, tere gị mmanụ obi ụtọ n’isi.” (Ndị Hibru 1:9) Ọ bụrụ na anyị, dị ka Jisọs, achọọ ngọzi Jehova, anyị aghaghị ịjụ ihe ọjọọ, omume rụrụ arụ, ime ihe ike, na anyaukwu nke ụwa Setan dị mpako. (Tụlee Ilu 6:16-19.) Anyị aghaghị ịhụ ihe Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ọ kpọrọ asị asị. Anyị aghaghị ịtụ egwu ime ihe ọ bụla na-adịghị atọ Jehova ụtọ. “Egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.”—Ilu 16:6.
14. Olee otú Jisọs si setịpụrụ anyị ihe ilereanya?
14 Jisọs hapụụrụ anyị ihe ilereanya nke na anyị kwesịrị ịgbaso nzọụkwụ ya n’ụzọ chiri anya. “Mgbe a na-ekwutọ ya, ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe ọ na-ahụ ahụhụ, ọ dịghị aba mba; kama ọ raara onwe ya nye n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:21-23) N’ịtụ egwu Jehova, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe ntachi obi ná nkọcha nile, mkparị, mkpagbu nile, nke ụwa Setan na-awụkwasị anyị.
15. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ egwu Jehova, ọ bụghị ndị ahụ pụrụ igbu ahụ?
15 Na Matiu 10:28 [NW], Jisọs nyere anyị ndụmọdụ sị: “Unu atụla egwu ndị ahụ na-egbu anụ ahụ ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi; kama nke ahụ, tụọnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma anụ ahụ n’ime Gehena.” Ọbụna ma ọ bụrụ na onye iro egbuo onye nke na-atụ egwu Jehova, ihe mgbu nile nke ọnwụ na-adịru nanị nwa oge. (Hosea 13:14) Mgbe a kpọlitere ya, onye ahụ ga-enwe ike ikwu, sị: “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị?”—1 Ndị Kọrint 15:55.
16. Olee otú Jisọs si gosipụta egwu Jehova, nyekwa ya otuto?
16 Jisọs n’onwe ya setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya maka ndị nile hụrụ ezi omume Jehova n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Egwu ya maka Jehova bụ nke e gosipụtara n’okwu ikpeazụ ndị ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, dị ka a na-ahụta na Jọn 16:33, sị: “Okwu ndị a ka m gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.” Ihe ndekọ Jọn na-aga n’ihu, sị: “Okwu ndị a ka Jisọs kwuru; o wee welie anya ya lee eluigwe, sị, Nna, oge hour abịawo; nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị wee nye gị otuto . . . emere m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa.”—Jọn 17:1-6.
Tụọ Egwu Jehova Nyekwa Ya Otuto
17. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jisọs?
17 Ànyị pụrụ taa iṅomi ihe nlereanya obi ike Jisọs? N’ezie anyị pụrụ ime otú ahụ n’egwu Jehova! Jisọs emeworị ka anyị mara oké aha na àgwà dị iche iche nke Jehova. Ịtụ egwu Jehova dị ka Eze Onyenwe anyị, anyị na-ebuli ya elu gabiga chi ndị ọzọ nile, gụnyere Atọ n’Ime Otu ahụ na-enweghị aha, nke bụ ihe omimi nke Krisendọm. Jisọs ji egwu dị mma jeere Jehova ozi, na-ajụ ịbụ onye e jidere n’ọnyà nke egwu ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. “Onye n’ụbọchị nke anụ ahụ ya, mgbe o [Kraịst] weresịịrị ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.” Dị ka Jisọs, ka anyị onwe anyị kwa tụọ egwu Jehova ka anyị na-anọgide na-amụta nrubeisi site n’ahụhụ ndị anyị na-enweta—na-enwe mgbe nile nzọpụta ebighị ebi dị ka ihe mgbaru ọsọ anyị.—Ndị Hibru 5:7-9.
18. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ịtụ egwu Chineke jeere Chineke ozi dị nsọ?
18 E mesịa n’akwụkwọ ozi ahụ nye ndị Kraịst bụ ndị Hibru, Pọl gbara ndị Kraịst e tere mmanụ ume, sị: “Ebe anyị na-anata alaeze nke a na-apụghị ime ka o mee mkpatụ, ka anyị nwee amara, ka anyị wee site na ya were egwu Chineke na ụjọ kpee ekpere n’ụzọ nke ga-atọ Chineke ụtọ.” Taa, “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-ekere òkè n’ije ozi ahụ dị nsọ. Gịnịkwa ka ọ gụnyere? Mgbe ọ tụlesịrị amara Jehova n’inye àjà nke Ọkpara Ya, bụ́ Jisọs Kraịst, Pọl na-ekwu, sị: “Ya mere, ka anyị site n’aka ya na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.” (Ndị Hibru 12:28; 13:12, 15) Iji gosipụta obi ekele maka amara Jehova, anyị kwesịrị ịchọ itinye hour ọ bụla anyị nwere ike itinye n’ije ozi ya dị nsọ. Dị ka ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-esonyere ndị fọdụrụnụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ, oké ìgwè mmadụ ahụ taa na-arụzu akụkụ ka nnọọ ukwuu nke ozi ahụ. Ndị a na-ekwupụta na nzọpụta dịịrị Chineke na Kraịst ka ha na-eguzo n’ụzọ ihe atụ n’ihu ocheeze Chineke, “na-efekwa ya ofufe ehihie na abalị.”—Mkpughe 7:9, 10, 15.
Nye Jehova Otuto ruo Mgbe Ebighị Ebi
19, 20. Ụdị ịtụ egwu abụọ dị aṅaa ga-apụta ìhè ‘n’ụbọchị Jehova’?
19 Ụbọchị ebube nke iwepụ Jehova n’ụta ji oké ọsọ na-erute! “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu; ndị nganga nile na onye ọ bụla nke na-eme ihe mmebi iwu ga-abụkwa ahịhịa ọka: ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Oge ọdachi ahụ bụ “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.” (Malakaị 4:1, 5) Ọ ga-akụnye “oké egwu” n’obi nke ndị ajọ omume, ndị a “agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—Jeremaịa 8:15; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.
20 Otú ọ dị, ụdị egwu dị iche na-akpali ndị Jehova. Mmụọ ozi ahụ nke e tinyere “ozi ọma ebighị ebi” n’aka ejiriwo oké olu kpọọ ha òkù, na-asị: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe ya abịawo.” (Mkpughe 14:6, 7) Anyị ga-eguzo n’ụjọ nke ikpe ahụ ka okpomọkụ nke Amagedọn na-erepịa ụwa Setan. A ga-edeba egwu dị mma maka Jehova n’ime obi anyị n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ. Ka anyị nweta amara mgbe ahụ ịchọta onwe anyị n’etiti ndị ‘a zọpụtara bụ́ ndị kpọkuworo aha Jehova’!—Joel 2:31, 32; Ndị Rom 10:13.
21. Ngọzi ndị dị aṅaa ka egwu Jehova na-eduba na ha?
21 Ngọzi ndị dị ebube ga-esochi, gụnyere “afọ ndụ” nke ga-agbatịrị ruo mgbe nile ebighị ebi! (Ilu 9:11; Abụ Ọma 37:9-11, 29) Ya mere, ma olileanya anyị ọ̀ bụ iketa Alaeze ahụ ma ọ bụ ije ozi n’ókèala ọchịchị ya n’elu ụwa, ka anyị nọgide ugbu a na-efe Chineke ofufe dị nsọ site n’egwu na ụjọ Chineke. Ka anyị nọgide na-enye aha nsọ ya otuto. Ọ̀ bụkwa ihe dị aṅaa a gọziri agọzi ka ọ ga-arụpụta? Obi ekele ruo mgbe ebighị ebi n’ihi na anyị ji ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya mee ihe, nke bụ ka a tụọ egwu Jehova mgbe nile!
Olee Otú Ị Ga-esi Aza?
◻ Gịnị ka “egwu Jehova” pụtara?
◻ Olee otú ịtụ egwu Chineke si wetara ndị ya n’oge ochie abamuru?
◻ Ihe ilereanya dị aṅaa nke egwu Chineke ka Jisọs hapụụrụ anyị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi na-eguzosi ike n’ezi ihe n’egwu Jehova?
[Foto dị na peeji nke 18]
N’akwụkwọ Mkpughe, a na-ahụ ụmụnna Jisọs ka ha na-abụ “abụ nke Mosis,” bụ́ abụ e ji eto Jehova
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị agha Jehoshafat na-enwe mmeri n’egwu Jehova
[Foto dị na peeji nke 23]
Afọ ndụ nke na-agbatịrị ruo mgbe nile ebighị ebi ga-abụ ụgwọ ọrụ nke ndị na-atụ Jehova egwu