Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/15 p. 10-15
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ụfọdụ Ji Nwee Ya ma Ndị Ọzọ Enweghị Ya
  • Ọkpụkpọ Òkù Na-adọrọ Mmasị
  • Ị̀ Ga-etinye Mgbalị?
  • O Metụtara Obi Gị
  • Otú A Na-esi Akụnye Egwu Chineke n’Obi Anyị
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Uru Ndị Dị n’Ịtụ Ezi Chineke ahụ Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Tụọ Egwu Jehova, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/15 p. 10-15

Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova

“Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: egwu Jehova ka m ga-ezi unu.”—ABỤ ỌMA 34:11.

1. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi wepụ egwu, ma nke ahụ ọ̀ pụtara egwu nile?

NDỊ mmadụ n’ebe nile na-achọsi ike nnwere onwe pụọ n’egwu—egwu nke mpụ na ime ihe ike, egwu enweghị ọrụ, na egwu nke ọrịa siri ike. Lee oké ụbọchị ọ ga-abụ mgbe nnwere onwe ahụ ga-abụ ihe dị adị n’okpuru Alaeze Chineke! (Aịsaịa 33:24; 65:21-23; Maịka 4:4) Ma, ọ bụghị egwu nile ka a ga-ewepụ mgbe ahụ, anyị ekwesịghịkwa ịkwapụ egwu nile site ná ndụ anyị ugbu a. E nwere egwu dị mma na egwu dị njọ.

2. (a) Ụdị egwu dị aṅaa dị njọ, ụdị dịkwa aṅaa ka a na-achọ? (b) Gịnị bụ egwu Chineke, oleekwa otú akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche si egosi nke ahụ?

2 Egwu pụrụ ịbụ nsí uche, na-eme ka ikike mmadụ ịtụgharị uche ghara ịrụ ọrụ. Ọ pụrụ ịkụda obi ike ma bibie olileanya. Onye onye iro yiri egwu n’ụzọ anụ ahụ pụrụ inwe ụdị egwu dị otú ahụ. (Jeremaịa 51:30) Onye ọ na-adị oké mkpa inweta nnwapụta nke mmadụ ụfọdụ nwere ikike pụrụ inwe ya. (Ilu 29:25) Ma e nwekwara egwu dị mma, ụdị nke na-egbochi anyị ime ihe ọ bụla n’echeghị echiche, pụọ n’imerụ onwe anyị ahụ. Egwu Chineke na-agụnye ọbụna ihe karịrị nke ahụ. Ọ bụ inwe egwu siri ike nke Jehova, nsọpụrụ miri emi maka ya, tinyere egwu dị mma nke imejọ ya. (Abụ Ọma 89:7) Egwu nke a nke imejọ Chineke na-esite n’ekele e nwere maka ebere ịhụnanya na ịdị mma ya. (Abụ Ọma 5:7; Hosea 3:5) Ọ na-agụnyekwa nghọta nke na Jehova bụ Onye Ikpe Kasị Elu na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye nwere ike inye ndị na-adịghị erubere ya isi ntaramahụhụ, ọbụna ime ka ọnwụ dakwasị ha.—Ndị Rom 14:10-12.

3. Olee otú egwu Jehova si dị iche ná ndị ahụ e jikọtara ya na ụfọdụ chi ndị na-ekpere arụsị?

3 Egwu Chineke ziri ezi, ọ bụghị nke na-akụnwụ ahụ. Ọ na-akpali mmadụ ịkwụrụ chịm n’ihe ziri ezi, n’ekwenyeghị ekwenye site n’ime ihe na-ezighị ezi. Ọ dịghị ka egwu ahụ e jikọtara ya na chi ndị Grik oge ochie bụ́ Phobos, nke a kọwara dị ka chi arụrụala na-emenye ndị mmadụ ụjọ. Ọ dịghịkwa ka egwu ahụ e jikotara ya na chi nwanyị ndị Hindu bụ́ Kali, onye a na-egosipụta mgbe ụfọdụ dị ka nke ọbara na-agụ agụụ, na-eji ozu, agwọ, na okpokoro isi na-eme ihe dị ka ihe ịchọ mma. Egwu Chineke na-adọrọ adọrọ; ọ dịghị achụpụ achụpụ. E kekọtara ya na ịhụnanya na obi ekele. Ya mere, egwu Chineke na-adọta anyị nso n’ebe Jehova nọ.—Deuterọnọmi 10:12, 13; Abụ Ọma 2:11.

Ihe Mere Ụfọdụ Ji Nwee Ya ma Ndị Ọzọ Enweghị Ya

4. Dị ka Pọl onyeozi gosiri, n’ụdị ọnọdụ dị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ bịaruworo, gịnịkwa kpatara nke a?

4 Àgwà nke egwu Chineke adịghị akpali ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha. Ná Ndị Rom 3:9-18, Pọl onyeozi na-akọwa ókè ụmụ mmadụ siworo n’izu okè mbụ daa. Mgbe o kwusịrị na mmadụ nile nọ n’okpuru mmehie, Pọl hotara ihe dị n’Abụ Ọma, na-asị: “Ọ dịghị onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị otu onye ma ọlị.” (Lee Abụ Ọma 14:1.) Mgbe ahụ ọ kọwazuru ya site n’izo aka n’ihe ndị dị ka nleghara anya ihe a kpọrọ mmadụ leghaara ịchọ Chineke, ụkọ nke ha ime ihe ọma, okwu ha na-eduhie eduhie, ịkpọ iyi, na mwụsị ọbara. Lee nnọọ ka nke ahụ si na-akọwa ụwa nke taa n’ụzọ ziri ezi! Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ enweghị mmasị na Chineke na ná nzube ya dị iche iche. Ọtụtụ mgbe, ihe ọ bụla yiri ka ọ̀ bụ ime ihe ọma, bụ nke a na-edebere oge dị iche iche mgbe ọ dị ihe a ga-enweta site na ya. Ịgha ụgha na okwu rere ure juru ebe nile. A na-ewepụta mwụsị ọbara ọ bụghị nanị n’akụkọ kamakwa ná ntụrụndụ. Gịnị kpatara ọnọdụ dị otú ahụ? Ọ bụ eziokwu na anyị nile bụ ụmụ sitere n’Adam ahụ mere mmehie, ma mgbe ụmụ mmadụ gbasoro dị ka ụzọ ndụ ha ihe ndị ahụ Pọl onyeozi kọwara, ọ na-agụnye ihe karịrị nke ahụ. Amaokwu nke 18 na-akọwa ihe ọ bụ, na-asị: “Egwu Chineke adịghị n’anya ha.”—Lee Abụ Ọma 36:1.

5. N’ihi gịnị ka ndị ụfọdụ ji nwee egwu Chineke, ebe ndị ọzọ na-enweghị ya?

5 Otú ọ dị, gịnị mere ụfọdụ ndị ji nwee egwu Chineke, ebe ndị ọzọ na-enweghị? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ n’ihi na ụfọdụ ndị na-azụlite ya, ma ndị ọzọ adịghị. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị a mụkọtara ya na ya, ma anyị nile nwere ikike maka ya. Egwu Chineke bụ ihe dị anyị mkpa ịmụta. Mgbe ahụ, ka o wee bụrụ oké ike na-akpali akpali ná ndụ anyị, ọ dị anyị mkpa ịzụlite ya.

Ọkpụkpọ Òkù Na-adọrọ Mmasị

6. Ònye na-akpọ anyị òkù ahụ e dekọrọ n’Abụ Ọma 34:11, oleekwa otú akụkụ akwụkwọ nsọ a si na-egosi na a ghaghị ịmụta egwu Chineke?

6 A na-eme ka ọkpụkpọ òkù na-adọrọ mmasị ịmụta egwu Jehova ruo anyị aka n’Abụ Ọma nke 34. Nke a bụ abụ ọma Devid. Ònyekwa ka Devid sere onyinyo ya? Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Onyenwe anyi Jisọs Kraịst. E dekọrọ amụma nke Jọn onyeozi jiri mee ihe n’ebe Jisọs nọ kpọmkwem n’amaokwu nke 20 nke abụ ọma nke a. (Jọn 19:36) N’ụbọchị anyị, Jisọs bụ onye ahụ na-akpọ òkù dị ka nke ahụ dị n’amaokwu nke 11: “Bịanụ, ụmụ m, gee m ntị: egwu Jehova ka m ga-ezi unu.” Nke a na-egosi n’ụzọ doro anya na egwu Chineke bụ ihe a pụrụ ịmụta, Jisọs Kraịst rukwara eru n’ụzọ magburu onwe ya izi anyị banyere ya. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

7. N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ onye anyị ga-esi n’aka ya mụta egwu Chineke karịsịa?

7 Jisọs Kraịst maara ịdị mkpa nke egwu Chineke. Ndị Hibru 5:7 na-ekwu banyere ya, sị: “N’ụbọchị nke anụ ahụ Ya, mgbe O weresịrị ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta Ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke.” Ụdị egwu Chineke ahụ bụ àgwà Jisọs Kraịst gosipụtara ọbụna tupu o chee ọnwụ ihu n’elu osisi ịta ahụhụ. Cheta, n’Ilu isi nke 8, a kọwara Ọkpara Chineke dị ka ihe atụ zuru okè nke amamihe. N’Ilu 9:10 kwa, a gwara anyị, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” Ya mere egwu Chineke nke a bụ akụkụ bụ isi nke ụdị onye Ọkpara Chineke bụ ogologo oge tupu ọ bịa n’elu ụwa.

8. N’Aịsaịa 11:2, 3, gịnị ka anyị na-amụta banyere egwu Jehova?

8 Ọzọkwa, banyere Jisọs di ka Eze Mesaịa ahụ, Aịsaịa 11:2, 3 na-ekwu, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ Ya n’ahụ ya, bụ́ Mmụọ nke amamihe na nghọta, Mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, Mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” Lee ụzọ mara mma e si kwupụta nke ahụ! Egwu Jehova abụghị ihe na-adịghị atọ ụtọ. Ọ bụ ihe bara uru na ihe na-emezi ihe. Ọ bụ àgwà ga-ejupụta ebe nile Kraịst ga-achị dị ka Eze. Ọ na-achị achị ugbu a, nyekwa ndị nile a na-achịkọta dị ka ndị ọ na-achị, ọ na-enye ntụziaka n’egwu Jehova. N’ụzọ dị aṅaa?

9. Olee otú Jisọs Kraịst si na-akụziri anyị egwu Jehova, gịnịkwa ka ọ chọrọ ka anyị mụta banyere ya?

9 Site ná nzukọ anyị dị iche iche, mgbakọ nta, na mgbakọ ukwu, Jisọs, dị ka Onyeisi a họpụtara ahọpụta nke ọgbakọ a na dị ka Eze Mesaịa ahụ, na-enyere anyị aka ịghọta n’ụzọ doro anya ihe egwu Chineke bụ na ihe mere o ji baa uru nke ukwuu. Otú a ọ na-agbalị ime ka obi ekele anyị maka ya mie emie nke na anyị ga-amụta inwe ọṅụ n’ime egwu Jehova, dịkwa ka ya onwe ya na-eme.

Ị̀ Ga-etinye Mgbalị?

10. Mgbe anyị na-aga nzukọ ndị Kraịst, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta egwu Jehova?

10 N’ezie, anyị nanị ịgụ Bible ma ọ bụ ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze agajeghị ime ka e jide n’aka na anyị nwere egwu Chineke. Rịba ama ihe ọ dị mkpa ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta egwu Jehova n’ezie. Ilu 2:1-5 sịrị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ịtọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.” Ya mere mgbe anyị na-aga nzukọ, ọ dị anyị mkpa ige ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu, tinye ezi mgbalị itinye uche na icheta echiche ndị bụ isi, chemie echiche banyere otú ụzọ anyị si enwe mmetụta banyere Jehova kwesịrị isi emetụta omume anyị n’ebe ndụmọdụ e nyere dị—ee, meghee obi anyị. Mgbe ahụ anyị ga-aghọta egwu Jehova.

11. Iji zụlite egwu Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ijisi ike na-eme mgbe mgbe?

11 Abụ Ọma 86:11 na-adọrọ uche gaa n’ihe ọzọ dị mkpa, nke bụ́ ekpere. “Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị,” ka onye ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere. “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” Jehova nakweere ekpere ahụ, n’ihi na o mere ka e dekọọ ya n’ime Bible. Iji zụlite egwu Chineke, ọ dịkwa anyị mkpa ikpeku Jehova ekpere maka enyemaka ya, anyị ga-eritekwa uru site n’ikpesi ekpere ike mgbe nile.—Luk 18:1-8.

O Metụtara Obi Gị

12. Gịnị mere a na-aghaghị iji nye obi nlezianya pụrụ iche, gịnịkwa ka nke ahụ na-agụnye?

12 Ọ dịkwa ihe ọzọ anyị kwesịrị ịrịba ama n’Abụ Ọma 86:11. Onye ọbụ abụ ahụ adịghị arịọ maka nanị nghọta ọgụgụ isi nkịtị nke egwu Chineke. Ọ na-akpọtụ obi ya aha. Ịzụlite egwu Chineke na-agụnye obi ihe atụ, bụ́ nke chọrọ nlezianya pụrụ iche n’ihi na ọ bụ mmadụ ime ahụ dị ka ọ pụtara ìhè n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ ma gụnye echiche anyị, omume anyị, ọchịchọ anyị, mkpali anyị, ihe mgbaru ọsọ anyị.

13. (a) Gịnị pụrụ igosi na obi mmadụ kewara ekewa? (b) Ka anyị na-azụlite egwu Chineke, ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịrụ ọrụ iru?

13 Bible na-adọ anyị aka ná ntị na obi mmadụ pụrụ ikewa ekewa. Ọ pụrụ ịdị aghụghọ. (Abụ Ọma 12:2; Jeremaịa 17:9) Ọ pụrụ ịkpali anyị ikere òkè n’ọrụ ndị na-ewuli elu—ịga nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ na ịpụ ije ozi ubi—ma ọ pụkwara ịhụ akụkụ ụfọdụ nke ụzọ ịdị ndụ nke ụwa n’anya. Nke a pụrụ ime ka anyị laa azụ iwere mkpụrụ obi anyị dum na-akwalite ọdịmma nile nke Alaeze n’ezie. Mgbe ahụ obi ahụ dị aghụghọ pụrụ ịnwa ịrụgide anyị ikwere na, e kwuwerị, anyị na-eme ihe ruo ókè ọtụtụ ndị ọzọ na-eme. Ma ọ bụ, ma eleghị anya n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ ego anyị, egwu mmadụ pụrụ imetụta obi. Dị ka ihe si na ya pụta, n’ebe ndị ahụ anyị pụrụ ịla azụ ime ka a mara anyị dị ka Ndịàmà Jehova, anyị pụkwara ọbụna ime ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị maka ndị Kraịst. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, akọ na uche anyị na-enye anyị nsogbu. Nke ahụ abụghị ụdị mmadụ anyị chọrọ ịbụ. Ya mere, anyị na-esonyere onye ọbụ abụ ahụ na-ekpeku Jehova ekpere, sị: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” Anyị chọrọ ka mmadụ ime anyị nile, dị ka ọ na-apụta ìhè n’ihe nile anyị na-eme ná ndụ, nye ihe àmà na anyị ‘na-atụ egwu Chineke, na-edebekwa ihe nile O nyere n’iwu.’—Eklisiastis 12:13.

14, 15. (a) Mgbe ọ na-ebu amụma mweghachi nke Israel site ná ndọta n’agha na Babilọn, gịnị ka Jehova kwere nkwa inye ndị ya? (b) Gịnị ka Jehova mere iji kụnye egwu Chineke n’ime obi nke ndị ya? (ch) N’ihi gịnị ka Israel ji wezụga onwe ya pụọ n’ụzọ Jehova?

14 Jehova kwere nkwa na ọ ga-enye ndị ya ụdị obi dị otú ahụ nke na-atụ egwu Chineke. O buru amụma mweghachi nke Israel ma sị, dị ka anyị na-agụ na Jeremaịa 32:37-39: “M ga-emekwa ka ha lata n’ebe a, meekwa ka ha biri ná ntụkwasị obi: ha ga-abụkwara m otu ndị, Mụ onwe m ga-abụkwara ha Chineke: M ga-enyekwa ha otu obi na otu ụzọ, ịtụ egwu Mụ onwe m ụbọchị nile; ka o wee dịrị ha, dịkwara ụmụ ha ndị ga-anọchi ha, mma.” N’amaokwu nke 40, a na-emesi nkwa Chineke ike: “Egwu m ka M ga-etinye n’obi ha, ka ha wee ghara isi n’ebe M nọ wezụga onwe ha.” Na 537 T.O.A., Jehova mere ka ha lataghachi na Jerusalem dị ka o kweworo ná nkwa. Ma gịnị banyere ihe fọdụrụ ná nkwa ahụ—na ọ ga-enye ha ‘otu obi ịtụ egwu ya ụbọchi nile’? N’ihi gịnị ka mba Israel oge ochie ji chigharịa pụọ n’ebe Jehova nọ mgbe o mesịrị ka ha si na Babilọn lata, nke mere na e bibiri ụlọ nsọ ha na 70 O.A., bụrụ nke a na-agaghị ewughachi ọzọ ma ọlị?

15 Nke a abụghị n’ihi ọdịda ọ bụla n’akụkụ Jehova. N’ezie, Jehova weere nzọụkwụ dị iche iche iji tinye egwu Chineke n’obi ndị ya. Site n’ebere o gosiri n’ịzọpụta ha na Babilọn na iweghachi ha n’ala ha, o nyere ha ihe zuru ezu mere ha ga-eji jiri nsọpụrụ miri emi na-ele ya anya. Chineke jiri ihe ncheta dị iche iche, ndụmọdụ, na ịdọ aka ná ntị site ná ndị amụma bụ́ Hagaị, Zekaraịa, na Malakaị; site n’aka Ezra, bụ́ onye e ziteere ha dị ka onye ozizi; site n’aka onye ọchịchị bụ́ Nehemaịa; na site n’aka Ọkpara Chineke n’onwe ya, mesie ihe ndị ahụ nile ike. Mgbe ụfọdụ ndị ala ahụ gere ntị. Ha mere nke ahụ mgbe ha wughachiri ụlọ nsọ Jehova site n’ịgba ume nke Hagaị na Zekaraịa na mgbe ha chụpụrụ ndị nwunye ha bụ́ ndị ala ọzọ n’ụbọchị Ezra. (Ezra 5:1, 2; 10:1-4) Ma ọtụtụ mgbe karị ha erubeghị isi. Ha anọgideghị n’ige ntị mgbe nile; ha anọgideghị na-anara ndụmọdụ; ha emeghị ka obi ha ghere oghe. Ndị Israel adịghị azụlite egwu Chineke, dịkwa ka ihe si na ya pụta, ọ bụghị ikike dị ike na-akpali akpali ná ndụ ha.—Malakaị 1:6; Matiu 15:7, 8.

16. N’obi òle ndị ka Jehova kụnyeworo egwu Chineke?

16 Ma, nkwa Jehova itinye egwu Chineke n’obi nke ndị ya adaghị. O sooro Israel ime mmụọ, bụ́ ndị Kraịst ahụ o setịpụụrụ olileanya eluigwe n’ihu ha, gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Jeremaịa 31:33; Ndị Galetia 6:16) Na 1919, Chineke weghachiri ha site ná ndọta n’agha na Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’ime obi ha ọ kụnyewo egwu ya n’ụzọ siri ike. Nke a ewetawo ngọzi ndị bara ụba nye ha na “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya nke ndụ dị ka ndị Alaeze ahụ ga-achị n’elu ala. (Jeremaịa 32:39; Mkpughe 7:9) Egwu Jehova abịawokwa dịrị n’obi ha.

Otú A Na-esi Akụnye Egwu Chineke n’Obi Anyị

17. Olee otú Jehova siworo tinye egwu Chineke n’obi anyị?

17 Olee otú Jehova siworo kụnye egwu Chineke a n’ime obi anyị? Site n’ịrụ ọrụ nke mmụọ ya. Gịnịkwa ka anyị nwere bụ́ nke sitere ná mmụọ nsọ? Ọ bụ Bible, Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Site n’ihe o meworo n’oge gara aga, site ná mmeso ọ na-emeso ndị ohu ya ugbu a ná mmezu nke Okwu amụma ya, na site n’amụma dị iche iche nke ihe ndị gaje ịbịa, Jehova na-enye ezi ihe ndabere maka anyị nile iwulite egwu Chineke.—Joshua 24:2-15; Ndị Hibru 10:30, 31.

18, 19. Olee otú mgbakọ ukwu, mgbakọ nta, na nzukọ ọgbakọ si enyere anyị aka inweta egwu Chineke?

18 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na, dị ka a kọrọ na Deuterọnọmi 4:10, Jehova gwara Mosis, sị: “Kpọkọtaara m ndị m, M ga-emekwa ka ha nụ okwu m nile, ka ha wee mụta ịtụ egwu m ụbọchị nile nke ha onwe ha na-adị ndụ n’elu ala, ka ha wee ziekwa ụmụ ha.” N’otu aka ahụ taa, Jehova enyewo ọtụtụ ihe n’ụba iji nyere anyị aka ịmụta ịtụ ya egwu. Ná mgbakọ ukwu, mgbakọ nta nakwa ná nzukọ ọgbakọ anyị dị iche iche, anyị na-akọ ihe àmà nke ebere ịhụnanya Jehova na ịdị mma ya. Nke ahụ bụ ihe anyị na-eme mgbe anyị na-amụ akwụkwọ ahụ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Olee otú ọmụmụ ihe ahụ si metụta gị na àgwà gị n’ebe Jehova nọ? Ka ị na-ahụ akụkụ dị iche iche nke ọdịdị ukwu nke Nna ahụ bụ́ nke e gosipụtara n’Ọkpara ya, ọ̀ bụ na nke a ewusighị ọchịchọ gị ike ịghara imejọ Chineke mgbe ọ bụla?—Ndị Kọlọsi 1:15.

19 Ná nzukọ anyị dị iche iche, anyị na-amụkwa banyere akụkọ dị iche iche nke nnapụta Jehova napụtara ndị ya n’oge ndị gara aga. (2 Samuel 7:23) Ka anyị na-amụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible, anyị na-amụ banyere ọhụụ amụma dị iche iche ndị mezuworonụ na narị afọ nke 20 nke a na banyere ihe omume na-akpali ịtụ egwu ndị gaje ịbịa. Banyere ọrụ nile dị otú ahụ nke Chineke, Abụ Ọma 66:5 na-ekwu, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Chineke; Onye dị egwu ka Ọ bụ n’omume Ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” Ee, ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọrụ ndị a nke Chineke na-akụnye n’ime obi anyị egwu Jehova, nsọpụrụ miri emi. Otú a anyị pụrụ ịhụ otú Jehova Chineke si na-emezu nkwa ya: “Egwu m ka M ga-etinye n’obi ha, ka ha wee ghara isi n’ebe M nọ wezụga onwe ha.”—Jeremaịa 32:40.

20. Iji mee ka egwu Chineke bamie n’ime obi anyị, gịnị ka a chọrọ n’akụkụ nke anyị?

20 Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na egwu Chineke ahụ adịghị adị n’ime obi anyị n’emereghi ya ezi mgbalị n’akụkụ nke anyị. Ihe ndị na-esi na ya apụta adịghị abịa n’aka nke onwe ha. Jehova na-eme òkè nke ya. Anyị aghaghị ime nke anyị site n’ịzụlite egwu Chineke. (Deuterọnọmi 5:29) Israel anụ ahụ emeghị nke ahụ. Ma site n’ịdabere na Jehova, ndị Israel ime mmụọ na ndị na-esonyere ha amaliteworị inweta ọtụtụ n’ime abamuru ndị na-abịara ndị na-atụ egwu Chineke. Anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime abamuru ndị a n’isiokwu na-esonụ.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị bụ egwu Chineke?

◻ Olee otú e si na-ezi anyị ịchọta obi ụtọ n’egwu Jehova?

◻ Iji nwee egwu Chineke, mgbalị dị aṅaa ka a chọrọ n’akụkụ nke anyị?

◻ N’ihi gịnị ka inwe egwu Chineke ji agụnye akụkụ nile nke obi ihe atụ anyị?

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Iji ịdị uchu na-amụ ihe ka a chọrọ iji ghọta egwu Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya