Ùnu Abịala ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè”
N’ỤBỌCHỊ okike nke mbụ ka e kere ìhè elu ala. Anyị na-agụ na Jehova Chineke sịrị: “Ka ìhè dị: ìhè wee dị.” (Jenesis 1:3) Nke ahụ kwekọrọ n’ihe Jọn onyeozi dere: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ọchịchịrị ọ bụla dị n’ime ya.”—1 Jọn 1:5.
Ebe Ọkpara Chineke na Nna ya dị n’otu, ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs n’otu mgbe kwuru, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa.” (Jọn 9:5) Anyị pụrụ isi n’ọchịchịrị pụta ma banye n’ìhè site n’inwe okwukwe n’ebe Jehova Chineke na Ọkpara ya nọ. Jisọs kwukwara, sị: “Mụ onwe m abịawo n’ụwa ịbụ ìhè, ka onye ọ bụla nke kwere na mụ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.” (Jọn 12:46) Ya mere, n’ụzọ ziri ezi, Jisọs Kraịst kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Menụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:14, 16.
Lee aha ngọzi ọ bụ inweta eziokwu ahụ, nghọta nke Okwu Chineke dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-eme ka ọ pụta ìhè! (Matiu 24:45-47) Anyị adịghịkwa enwe ihe mgbagwoju anya site na nkwenkwe Atọ n’Ime Otu; anyị anọghịkwa n’ihe ijuanya banyere ihe mere Chineke onye pụrụ ime ihe nile na nke na-ahụ n’anya ga-eji kwee ka ajọ omume na ime ihe ike dịrị; anyị anọghịkwa n’ihe ịrụ ụka banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ìhè ahụ enyewo anyị olileanya, olileanya Alaeze. O kpugheworo anyị ụdị Chineke dị ebube Onye Okike bụ. Ìhè nke eziokwu enyewo anyị nzube ná ndụ, imezu nzube e ji kee anyị na mbụ, nke bụ inye Onye Mere anyị, bụ́ Jehova Chineke otuto. Ihe ndị a ka anyị ga-eme site n’ịbụ ndị na-enye ìhè ahụ. Ịbụ ndị na-enye ìhè bụ ihe ùgwù na nsọpụrụ dị ukwu, kama ọ bụkwa ibu ọrụ siri ike. Iji rụzuo ibu ọrụ ahụ nke ọma, ọ dị anyị mkpa iji ihe enyemaka nke Jehova na-enye eme ihe. Ya mere lee otú o si bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na mgbakọ distrikti anyị nke afọ 1992 kwesịrị ka a kpọọ ya Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè”!
Iji mee ka nkà anyị na ịmata ọrụ anyị dị ka ndị na-enye ìhè dịwanye mma, anyị ga-achọ ịga ọ dịkarịsịa nta otu n’ime mgbakọ ndị a, ịnọ anọ maka abụ mmeghe ma nọrọ ruo mgbe e kpere ekpere mmechi. Anyị ga-achọkwa ige ntị n’ihe nile a na-ekwu n’ikpó okwu, n’okwu dị iche iche, ịgba ajụjụ ọnụ, ahụmahụ, ma ọ bụ ihe nkiri. Idetu ihe a na-ekwu abụghị nanị na ọ na-eme ka anyị nwee ihe anyị ga-ezo aka na ya ma e mesịa iji chetaghachiri anyị ihe anyị chefuru echefu kama ọ na-enyere anyị aka nke ukwu ịtụkwasị uche n’ihe a na-eme. Ee, n’oge nile usoro ihe omume mgbakọ ahụ na-aga n’ihu, anyị ga-achọ ‘ilezi anya otú anyị si anụ ntị.’—Luk 8:18.
Ebe A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1992
NOVEMBER 6-8, 1992
AKURE 1 (Yoruba)
BENIN CITY 1 (Edo)
KADUNA (Bekee, Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 1 (Igbo)
OTTA 1 (Yoruba)
ULI 1 (Igbo)
NOVEMBER 13-15, 1992
AKURE 2 (Yoruba)
BENIN CITY 2 (Bekee, Owan)
IGWURUTA ALI 1 (Abua, Igbo)
IKOT AKAN 1 (Efịk)
JOS (Bekee, Hausa)
MGBOKO UMUORIA 2 (Igbo)
OTTA 2 (Yoruba)
UBOGO 1 (Urhobo)
ULI 2 (Igbo)
NOVEMBER 20-22, 1992
AKURE 3 (Bekee)
BENIN CITY 3 (Edo)
IGWURUTA ALI 2 (Bekee, Ogoni)
IKOT AKAN 2 (Efịk)
MGBOKO UMUORIA 3 (Igbo)
OKITIPUPA 1 (Yoruba)
OTTA 3 (Yoruba)
UBOGO 2 (Urhobo)
ULI 3 (Igbo)
DECEMBER 4-6, 1992
AGBOR 1 (Bekee)
AKURE 4 (Yoruba)
BENIN CITY 4 (Bekee, Ishan)
CALABAR 1 (Efịk)
IGWURUTA ALI 3 (Bekee)
IKOT EKPENE 1 (Efịk)
MGBOKO UMUORIA 4 (Igbo)
OKITIPUPA 2 (Yoruba)
OTTA 4 (Bekee)
UBOGO 3 (Urhobo)
ULI 4 (Igbo)
DECEMBER 11-13, 1992
AGBOR 2 (Bekee)
AKURE 5 (Yoruba)
CALABAR 2 (Bekee)
IGWURUTA ALI 4 (Bekee)
IKOT EKPENE 2 (Efịk)
MGBOKO UMUORIA 5 (Igbo)
OTTA 5 (Bekee)
OYEDE 1 (Isoko)
UBOGO 4 (Ijaw, Okpe)
ULI 5 (Igbo)
DECEMBER 18-20, 1992
AGBOR 3 (Igbo)
CALABAR 3 (Efịk)
IKOT EKPENE 3 (Efịk)
MGBOKO UMUORIA 6 (Igbo)
OTTA 6 (Yoruba)
OYEDE 2 (Isoko)
UBOGO 5 (Bekee, Itsekiri)
ULI 6 (Igbo)
JANUARY 1-3, 1993
BADAGRY (Gun)
MGBOKO UMUORIA 7 (Igbo)
OTTA 7 (Yoruba)
ULI 7 (Igbo)
UYO 1 (Bekee)
JANUARY 8-10, 1993
IBADAN 1 (Bekee)
ILESHA 1 (Yoruba)
KATSINA ALA (Bekee, Tiv)
MGBOKO UMUORIA 8 (Igbo)
OTTA 8 (Yoruba)
ULI 8 (Bekee)
UYO 2 (Efịk)
JANUARY 15-17, 1993
IBADAN 2 (Yoruba)
ILESHA 2 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 9 (Bekee)
OTTA 9 (Bekee)
UYO 3 (Efịk)
JANUARY 22-24, 1993
IBADAN 3 (Yoruba)
ILESHA 3 (Yoruba)
OTTA 10 (Bekee)
UYO 4 (Efịk)