Atụmatụ Ụmụ Mmadụ Maka Ịnọ ná Ntụkwasị Obi nke Mba Nile
“Mgbe ihe a nile gafechara, anyị chọrọ ịbụ ndị na-agwọ ọrịa. Anyị chọrọ ime ihe nile anyị pụrụ ime iji hụ na e nwetara ihe m pụrụ iji olileanya dị mma kpọọ usoro ụwa ọhụrụ.” —Onye isi ala mba U.S. bụ́ George Bush, January 1991, nwa mgbe nta mgbe agha ha na Iraq malitesịrị.
“Echiche Onye isi ala bụ́ Bush banyere Usoro Ụwa Ọhụrụ na-emesi ike mkpa ọ dị ikwe ka iwu bụrụ ihe na-eduzi ihe ndị na-emenụ nakwa ikwere na mba nile nwere ibu ọrụ ha jikọrọ aka nwee maka nnwere onwe na ikpe ziri ezi. Ebe Agha Nzuzo ahụ kwụsịworo, ọgbọ ọhụrụ na-amalite.” —Onye nnọchianya mba U.S. n’Australia, August 1991.
“N’anyasị a, ka m na-ahụ ihe ndị metụtara ọchịchị onye kwuo uche ya ka ọ na-amalite iwere ọnọdụ gburugburu ụwa, ma eleghị anya—ma eleghị anya anyị nọ nso ụwa ọhụrụ ahụ karịa otú ọ bụla anyị nọtụworo ya nso na mbụ.” —Onye isi ala mba U.S. bụ́ George Bush, September 1991.
ỌTỤTỤ ndị ndú ụwa, dị ka President Bush, ji olileanya dị mma na-ekwu okwu banyere ọdịnihu. È nwere ezi ihe mere ha ga-eji nwee olileanya dị mma otú ahụ? Ihe ndị na-eme kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ hà na-enye ihe ndabere maka olileanya ọma dị otú ahụ? Ì chere na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-enwe ike iweta ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile?
Oké Atụmatụ nke Mmadụ
“N’ime afọ abụọ ndị ikpeazụ nke agha ụwa nke abụọ,” ka ihe nkiri telivishọn ahụ bụ́ Goodbye War kọwara, “a nọ na-egbu ihe karịrị otu nde mmadụ kwa ọnwa.” N’otu mgbe ahụ, mba nile nwere mmetụta nke mkpa dị oké ngwa ime atụmatụ nke ga-egbochi agha dị otú ahụ ịdapụta ọzọ. Mgbe agha ahụ ka nọ na-aga n’ihu, ndị nnọchianya nke 50 mba dị iche iche mepụtara atụmatụ ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile nke kasị ukwuu mmadụ mepụtatụworo mgbe ọ bụla: Akwụkwọ Iwu e ji guzobe òtù United Nations. Okwu mmeghe dị n’Akwụkwọ Iwu ahụ kwupụtara mkpebi siri ike e mere “iji chebe ọgbọ ndị na-abịa n’ihu site n’ihe otiti nke agha.” Ndị gaje ịghọ ndị òtù United Nations bụ ndị a tụrụ anya ka ha “jikọọ ike [ha] iji mee ka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile dịgide.”
Iri ụbọchị anọ na otu mgbe nke a gasịrị, otu ụgbọ elu tụrụ otu bọmbụ atọm na Hiroshima, Japan. Ọ gbawara n’elu etiti obodo ukwu ahụ, na-egbu ihe karịrị 70,000 mmadụ. Mgbawa bọmbụ ahụ, na nke sochiri ya mgbe ụbọchị atọ gasịrị na Nagasaki, wetara agha ahụ e so Japan na-alụ ná njedebe n’ụzọ dị irè. Ebe ndị ha na Japan nọ n’otu akụkụ, bụ́ Germany chịliworo aka elu na May 7, 1945, Agha Ụwa nke Abụọ si otú a bịaruo ná njedebe. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ bụ ọgwụgwụ nke agha nile?
Ee e. Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ihe a kpọrọ mmadụ ahụwo ihe karịrị 150 agha ndị dị nta karị, ndị gbuworo ihe karịrị 19 nde mmadụ. O doro anya na oké atụmatụ UN ahụ ewetabeghị ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile. Gịnị bụ ihe gahierenụ?
Agha Nzuzo Ahụ
Ndị mere atụmatụ inwe òtù UN elepụghị anya n’ihu iji hụ nsọrịta mpì nke bilitere ngwa ngwa n’etiti ndị bụbu ndị enyi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ahụ. Ọtụtụ Mba dị iche iche dụnyeere akụkụ dị iche iche úkwù na ndọrọ ndọrọ ike ọchịchị nke a, bụ́ nke e mesịrị kpọọ Agha Nzuzo ahụ, nke bụkwa, n’otu akụkụ, ndọrọ ndọrọ dị n’etiti usoro ọchịchị Kọmunism na nke ndị aka ji akụ. Kama ijikọta ike ha iji kwụsị agha, òtù mba abụọ ahụ kwadoro akụkụ dị iche iche ndị na-emegiderịta onwe ha n’esemokwu ógbè dị iche iche, wee si otú a busorịta onwe ha agha n’Asia, Africa, nakwa n’Ugwu na Ndịda Kọntinenti America.
N’akụkụ ikpeazụ nke afọ ndị 1960, Agha Nzuzo ahụ malitere ịjụlata oyi. Njụlata oyi ahụ bịara n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na 1975 mgbe 35 Mba dị iche iche bịanyere aka n’ihe ahụ a kpọrọ Nkwekọrịta nke Helsinki. Ndị so bịanye aka gụnyere Soviet Union na United States, tinyere ndị ha na ha bụrịta enyi na Europe. Ha nile kwere nkwa ịrụ ọrụ iji nweta “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi” nakwa “ịhapụ . . . iyi egwu ma ọ bụ iji ike mee ihe megide nguzosi ike nke ókèala ma ọ bụ nnwere onwe nke ọchịchị Mba ọ bụla, ma ọ bụ site n’ụzọ ọ bụla ọzọ na-ekwekọghị ná nzube nile nke òtù United Nations.”
Ma echiche ndị a nile amịpụtaghị mkpụrụ. Ka ọ na-eru mmalite afọ ndị 1980, ndọrọ ndọrọ dị n’etiti mba ndị ahụ bụ dike maliteghachikwara ikpo ọkụ. Ihe dịrị njọ nke ukwuu nke na n’afọ 1982, odeakwụkwọ ukwu ahụ a họpụtara ọhụrụ nke òtù United Nations, bụ́ Dr. Javier Pérez de Cuéllar nabatara ọdịda nke òtù ya, dọọkwa aka ná ntị banyere “ọnọdụ ọhụrụ nke enweghị iwu na-achị achị ná mba nile.”
Ma n’agbanyeghị nke ahụ taa, odeakwụkwọ ukwu òtù UN na ndị ndú ndị ọzọ na-ekwupụta olileanya ọma ha nwere. Mgbasa akụkọ dị iche iche na-ezo aka ‘n’oge nke dị mgbe Agha Nzuzo ahụ gasịworo.’ Olee otú e si nwee mgbanwe nke a?
“Oge nke Dị Mgbe Agha Nzuzo ahụ Gasịworo”
Otu ihe e kwesịrị ịrịba ama bụ Nzukọ Banyere Ịnọ ná Ntụkwasị Obi na Mmekọrịta Ihe nke 35 mba dị iche iche zukọrọ wee mee na Europe. Na September 1986, ha bịanyere aka n’ihe a kpọrọ Akwụkwọ Stockholm ahụ, na-ekwusighachi ike na ha kwenyere ná Nkwekọrịta Helsinki ahụ nke 1975.a Akwụkwọ Stockholm ahụ nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị ga-eduzi otú a ga na-esi achịkwa ihe omume ndị metụtara agha. “Ihe a rụpụtaworo n’ime afọ atọ gara aga na-agba ume, ọ̀tụ̀tụ̀ e siwokwara tinye ha n’ọrụ na-amalite ịkarị ihe ndị e dere ede Akwụkwọ Stockholm ahụ chọrọ n’aka ha,” ka òtù SIPRI (Stockholm International Peace Research Institute) kọrọ n’akwụkwọ Yearbook 1990 ya.
E mesịa, na 1987, mba ndị ahụ bụ dike mere nkwekọrịta kwesịrị ịrịba ama, nke chọrọ ha n’aka ibibisị akụ ụta missile ha nile ndị a na-esi n’ala agbapụ, ndị pụrụ iferu ihe dị n’agbata 500 na 5,500 kilomita. “Mbibi nke akụ ụta missile ndị ahụ na ebe ndị a na-anọ agbapụ ha n’ụzọ a na-ahụ anya na-aga dị ka e si mee atụmatụ ya, akụkụ nke ọ bụla na-agbasozukwa ihe nkwekọrịta ndị ahụ kwuru,” ka SIPRI kwuru.
E mewo ihe ndị ọzọ iji belata ihe ize ndụ nke agha nuklia. Dị ka ihe atụ, na 1988, mba ndị ahụ bụ dike bịanyere aka n’akwụkwọ banyere “akụ ụta missile ndị na-efe efe, bụ́ ndị pụrụ isi n’otu kọntineti ruo na kọntinenti ọzọ na akụ ụta missile ndị nke a na-esi n’ụgbọ okpuru mmiri na-agbapụ.” Tupu a na-agbapụ ngwá agha ndị dị otú ahụ, akụkụ nke ọ bụla aghaghị ibu ụzọ gwa akụkụ nke ọzọ “ihe na-adịghị ala karịa 24 hour tupu a gbapụ ya, na-agwa ha ụbọchị a na-akwado ịgbapụ ya, ebe a ga-anọ gbapụ ya, na ebe ọ ga-ada.” Dị ka òtù SIPRI si kwuo, nkwekọrịta ndị dị otú ahụ “fọrọ nnọọ nke nta ka o wepụchasịa ọnọdụ nke pụrụ ime ka ihe mere n’otu ebe mụbaa wee ghọọ agha nuklia zuru ụwa ọnụ.”
Ka ọ dị ugbu a, a nọgodị na-eme atụmatụ oké ngwa ngwa banyere imeziwanye ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile. Na May 1990, n’otu oge mba ndị ahụ bụ dike nwere nzukọ na Washington, D.C., onye bụbu onye isi ala mba Soviet bụ Mikhail Gorbachev kwupụtara aro nke bụ ka akụkụ abụọ nke mba Europe ndị ahụ bịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta nke udo. Na July, mba Ọdịda Anyanwụ Ụwa 16 ndị so n’òtù NATO (North Atlantic Treaty Organization) mere nzukọ na London. Nzaghachi ha nye aro Mikhail Gorbachev bụ ka akụkụ abụọ ahụ bịanye aka ná “nkwupụta e jikọrọ aka mee, nke anyị nile ga-ekwusi ike na anyị abụkwaghị ndị iro ọzọ, mesiekwa ya ike, bụ́ ọchịchọ anyị izere iyi egwu ma ọ bụ iji ike eme ihe.” Otu isiakụkọ dị n’otu akwụkwọ akụkọ si Africa kọwara nke a dị ka “Oké Nzọụkwụ nke Na-eduje n’Udo Ụwa.”
Mgbe ahụ, nwa mgbe nta tupu e nwee otu nzukọ mba ndị bụ dike na Helsinki, Finland, otu onye na-ekwuchitere ọchịchị mba U.S. ọnụ ya kwuru na “eziokwu ahụ nke bụ na agha pụrụ ịdapụta [n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa] na-eme ka e nwee atụmatụ ọhụrụ e jikọrọ aka mee maka udo ụwa.” Udo enwetawo ihe ndọla azụ mgbe Iraq wabanyere na Kuwait, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ dum yikwara ka ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ebe agha gbasazuru. Ma n’okpuru ikike òtù United Nations, usuu ndị agha mba dị iche iche, nke United States nọ n’isi ya, chụghachiri usuu ndị agha mwabata ahụ ná mba nke aka ha. Ịdị n’otu nke mba dị iche iche e gosipụtara n’agha ahụ gbara ụfọdụ ndị ume inwe olileanya na oge ọhụrụ nke mmekọrịta ihe abịawo.
Eri mgbe ahụ, ihe ndị na-eme n’ụwa agawo n’ihu. Karịsịa, ọdịdị nke ihe ahụ bụbu Soviet Union n’onwe ya mere oké mgbanwe. E nyere Mba Baltic ndị ahụ ohere ikwupụta na ha enwerewo onwe ha, mba ndị ọzọ dị na Soviet Union mekwara otu ihe ahụ. Oké ọgba aghara ndị agbụrụ dị iche iche bilitere ná mba ndị yiburu ndị dị nnọọ n’otu n’ụzọ siri ike n’okpuru otu ọchịchị ndị Kọmunist. Ná ngwụsị nke afọ 1991, n’ụzọ iwu kwadoro Soviet Union akwụsịwo ịdị adị.
Oké mgbanwe ndị a na-enwe n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa emegheworo òtù United Nations ụzọ nke ohere ime ihe. N’ihe banyere nke a, akwụkwọ akụkọ The New York Times kwuru: “Njụlata oyi nke esemokwu ndị zuru ụwa ọnụ na mmụọ ọhụrụ nke imekọrịta ihe n’etiti United States na Soviet Union pụrụ ịpụtara òtù ụwa ahụ ohere inwe ọnọdụ ọhụrụ nke siri ike karị n’ihe omume nke mba nile.”
Oge ò mesịwo ruo ka òtù ahụ nke gbaworo 47 afọ gosi ihe ọ pụrụ ime? Ànyị na-abanye n’ezie ihe ahụ United States kpọrọ “narị afọ ọhụrụ, puku afọ ọhụrụ nke udo, nnwere onwe na ihe ịga nke ọma”?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nkwekọrịta nke a bụ nke mbụ, nke kasịkwa mkpa n’usoro nkwekọrịta ndị Canada, United States, Soviet Union, na 32 mba ndị ọzọ nọrọ na Helsinki bịanye aka na ha. Aha e ji mara nkwekọrịta nke bụ isi bụ Iwu Ikpeazụ nke Nzukọ Banyere Ịnọ ná Ntụkwasị Obi na Mmekọrịta Ihe na Europe. Nzube bụ isi o nwere bụ iji belata esemokwu mba na mba n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ.—World Book Encyclopedia.