Atụmatụ Ndị A Na-eme Maka Ịnọ ná Ntụkwasị Obi nke Mba Nile Hà Ga-aga nke Ọma?
“AGHA Nzuzo ahụ, nke jibidoworo ụwa dum ruo ihe karịrị 40 afọ yiri ka ọ̀ kwụsịwo site n’ebere Chineke,” ka One World kwuru, bụ́ magazin ndị òtù WCC (World Council of Churches) na-ebipụta. “Ihe omume ndị e kwesịrị ịrịba ama ndị na-ewere ọnọdụ n’Etiti na n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe . . . yiri ka hà na-agba àmà ọma maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na Europe nakwa n’akụkụ ụwa ndị ọzọ,” ka onye edemede Anglican, bụ́ John Pobee dekwara, onye so n’Atụmatụ Maka Ọzụzụ Nkà Mmụta Okpukpe nke òtù WCC.
Ọ bụghị nanị ndị nnọchianya òtù WCC na-ejikọta Chineke na atụmatụ ụmụ mmadụ na-eme maka ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile. N’April 1991, nwa mgbe nta mgbe agha ógbè Persian Gulf ahụ gasịrị, Pope John Paul zijeere onye bụ odeakwụkwọ ukwu òtù UN n’oge ahụ, bụ́ Javier Peréz de Cuéllar ozi, bụ́ nke o kwuru n’ime ya, sị: “Ndị bishọp nke Chọọchị Katọlik ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nwere obi ike n’ọrụ òtù United Nations na-arụ . . . Ha nwere olileanya na, site n’òtù United Nations na òtù nta ya dị iche iche ndị nwere ọrụ ndị pụrụ iche, mmadụ ndị agha ahụ a lụrụ n’oge na-adịbeghị anya gara aga mere ka ha banye n’ọnọdụ oké mkpa aghaghị inweta mmetụta na nkwado site ná mba nile.”
N’ịga n’ihu, Vatican bụ otu n’ime 35 Mba ndị ahụ depụtara ma bịanye aka ma ná Nkwekọrịta Helsinki nke 1975 ahụ ma n’Akwụkwọ Stockholm nke 1986 ahụ. Mgbe òtù United Nations kwupụtara na 1986 ga-abụ “Afọ Udo nke Mba Nile,” popu zaghachiri site n’ịkpọ ndị nnọchianya nke okpukpe ụwa ndị bụ isi ka ha bịa kere òkè n’ememe nke “Ụbọchị Ekpere Ụwa Maka Udo.” N’October 1986, ndị nnọchianya nke okpukpe ndị Buddha, Hindu, Alakụba, Shinto, Anglican, Lutheran, Greek Orthodox, ndị Juu, na nke okpukpe ndị ọzọ nọkọrọ n’Assisi, Itali, kerekwa òkè ná nsochi ná nsochi n’ikpe ekpere maka udo ụwa.
Mgbe afọ ole na ole gasịrị, n’otu okwuchukwu o kwuru na Rom, onye Archbishop of Canterbury nke ndị Anglican chetaghachiri ihe omume ahụ e hotara n’elu. “N’Assisi,” ka ọ sịrị, “anyị hụrụ na Bishọp nke Rom [popu ahụ] pụrụ ịchịkọta Chọọchị ndị Kristian n’otu. Anyị pụrụ ikpekọ ekpere, kwukọọ okwu, mekọọkwa ihe maka udo na ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ . . . Ná mkpali ikpe ekpere ahụ maka udo ụwa, enwere m mmetụta nke ịnọ n’ihu Chineke, onye sịrị ‘Lee ana m eme ihe ọhụrụ.’”
Okpukpe ndị ọzọ, ọ bụ ezie na a nọchiteghị anya ha n’Assisi, nwekwara olileanya ọma banyere atụmatụ ụmụ mmadụ na-eme maka ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile. Otu ihe odide uche akwụkwọ akụkọ nke dị na Die Kerkbode, bụ́ akwụkwọ Dutch Reformed Church nke South Africa na-ebipụta, kwuru, sị: “Anyị na-ahụ ngabiga banye n’usoro ụwa ọhụrụ. Ihe yiri ihe a na-apụghị icheta n’echiche n’afọ ole na ole gara aga na-ewere ọnọdụ n’ihu anyị ugbu a. Ndozi okwu nke na-ewere ọnọdụ n’ụzọ metụtara ụwa dum n’etiti Soviet Union na Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye ógbè ụwa dị iche iche. N’akụkụ ụwa nke anyị, ndị na-emegide ibe ha na ndị bụ ndị iro kpọrọ ibe ha asị nke ukwuu na-ekwurịtazi okwu, mkpali a na-enwe maka ‘udo’ na-apụtakwa ìhè n’ebe nile . . . Dị ka ndị Kristian si ele ihe anya, e kwesịrị ịnabata mgbalị nile a na-eme iweta udo n’etiti ndị mmadụ. Anyị pụrụ ikpe ekpere maka udo n’oge anyị.”
Chineke ọ̀ na-agọzi atụmatụ ụmụ mmadụ na-eme maka ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile?
Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
N’ihe banyere ịdabere ná mgbalị nile nke ụmụ mmadụ, Bible na-enye ịdọ aka ná ntị pụtara ìhè: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:3, 4) Ọganihu a na-enwe n’oge a inweta udo pụrụ iyi ihe na-agba ume. Ma anyị aghaghị iche ihe bụ eziokwu ihu. Ike ụmụ mmadụ nwere bụ ihe a kpaara ókè. Ọtụtụ mgbe, ihe ndị na-eme eme buru ibu karịa ha. Ọtụtụ mgbe, ha adịghị ahụta ihe ndị na-aga n’okpuru, ikike ndị zoro ezo, ndị na-emebisị atụmatụ ndị kasị mma ha mere.
Narị afọ asaa tupu oge Jisọs, n’oge onye amụma bụ Aịsaịa, ndị ndú ndị Juu nọ na-eme atụmatụ maka ịnọ ná ntụkwasị obi site ná nkwekọrịta mba na mba nke ha na mba ndị gbara ha gburugburu n’ụzọ a pụrụ iji tụnyere ihe ndị na-eme taa. N’oge ndị ahụ kwa, ndị ndú okpukpe kwadoro ihe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nọ na-eme. Ma Aịsaịa dọrọ aka ná ntị, sị: “Dụrịtanụ onwe unu ọdụ, ma a ga-emebi ya; kwuonụ okwu, ma ọ gaghị eguzosi ike.” (Aịsaịa 8:10) Atụmatụ ha mesịrị bụrụ ihe kụrụ nnọọ afọ n’ala n’ụzọ na-eweta ọdachi. Otu ihe ahụ ọ̀ pụrụ ime taa?
Ee, ọ pụrụ ime, ebe ọ bụ na site n’ọnụ otu onye amụma ahụ, Chineke mara ọkwa na Ya nwere ụzọ nke Ya ọ ga-esi weta ịnọ ná ntụkwasị obi n’elu ala. Ọ gaghị abụ site n’òtù ụmụ mmadụ ọ bụla, kama ọ bụ site n’onye sitere n’usoro ọmụmụ nke eze Israel bụ Devid. (Aịsaịa 9:6, 7) Onye nketa nke a nke Eze Devid bụ Jisọs Kraịst, onye, mgbe Pọntiọs Paịlet na-agba ya ajụjụ, nakweere na ya bụ Eze, ma kwuo, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” (Jọn 18:36; Luk 1:32) N’eziokwu, Alaeze Jisọs gaje ịbụ nke eluigwe. Ọ bụkwa ya—ọ bụghị òtù United Nations ma ọ bụ mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla dị n’ụwa—gaje iweta ịnọ ná ntụkwasị obi a pụrụ ịdabere na ya, nke na-adịgide adịgide n’elu ala nke a.—Daniel 2:44.
Jisọs Kraịst buru amụma na Alaeze ya ga-amalite ịchị achị n’eluigwe n’oge mgbe a ga-enwe “agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche,” mgbe ‘mba ga na-ebili megide mba ọzọ, alaeze na-ebilikwa megide alaeze ọzọ.’ Mmezu nke amụma kara 1914 akara dị ka oge mgbe nke ahụ mere, meekwa ka a mara afọ ndị dị kemgbe ahụ dị ka ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.’—Matiu 24:3, 6-8.
Gịnị ka nke a pụtara? Na oge fọdụụrụ usoro ihe dị n’ụwa ugbu a bụ nke a kpaara ókè, ọ ga-agwụsịkwa n’oge na-adịghị anya. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ga-akpata nchegbu ma ọ bụ mwute? Ọ gaghị abụ otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị echeta omume obi ọjọọ, ikpe na-ezighị ezi, mkpagbu, ibu agha, na ịta ahụhụ nile nke kaworo usoro ihe nke a akara. Ọ ga-abụ n’ezie ihe ntụsara ahụ ịnọ n’okpuru onye ọchịchị ahụ nke Okwu Chineke, bụ́ Bible kwuru okwu banyere ya, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ ya n’ahụ ya, bụ́ mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova.”—Aịsaịa 11:2.
Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ụwa
N’ikwu eziokwu, ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-enwe ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’elu ụwa ruo mgbe, n’okpuru Alaeze Chineke, a ga-emezu amụma Aịsaịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: agaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịsaịa 65:17) N’agbanyeghị ekpere ole ndị ndú okpukpe kpere n’ihi ụwa nke a, atụmatụ ụmụ mmadụ maka ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile apụghị ịnọchi ọnọdụ ụzọ nke Chineke maka iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi.
Ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ, nke na-adịgide adịgide nke Alaeze Chineke ga-ewebata ga-adị ebube. Nke a bụ nanị otu n’ime nkọwa ya ndị a na-ahụ n’ime Bible: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma oge, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:3, 4.
Ọ bụ nanị ịnọ ná ntụkwasị obi nke Chineke n’onwe ya kwere nkwa ya ga-adịgide adịgide, bụrụkwa ihe a pụrụ ịtụkwasị obi. N’ihi ya, kama ịtụkwasị obi ná ndị a maara aha ha, gịnị mere i tinyeghị ntụkwasị obi gị n’ebe ọ nọ? Mgbe ahụ, ị ga-ahụ na okwu onye ọbụ abụ ahụ bụ eziokwu, bụ́: “Onye ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” New World Translation] ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: onye meworo eluigwe na ụwa, na oké osimiri, na ihe nile nke dị n’ime ha; onye na-edebe eziokwu ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 146:5, 6.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Chọọchị Katọlik na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Mba Nile
“Ọ bụ ezie na Kraịst kwuru na alaeze ya ‘esiteghị n’ụwa nke a,’ ndị ndú okpukpe ndị nọ n’ọkwa dị elu na usoro ndị popu dị ka otu òtù etinyesiwo aka ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na esemokwu mba na mba na nke mba dị iche iche kemgbe oge Constantine.”—The Catholic Church in World Politics, nke Professor Eric Hanson nke Jesuit Santa Clara University dere.