Ịchụso Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Setịpụrụ Mgbe M Dị Afọ Isii
DỊ KA SANDRA COWAN SI KỌỌ
Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-ahọtara ụmụ ha ọrụ ha ga-arụ ná ndụ, dị ka iti egwú ma ọ bụ ite egwú ballet, ma malite ịzụ ha mgbe ha ka dị nnọọ ntakịrị. Nke a bụ nnọọ ihe nne m meere m. Malite na mgbe m dị izu abụọ, a kpọ m jee nzukọ ndị Kraịst nile, kpọrọkwa m jee ozi ubi.
MGBE m dị afọ anọ, Nne m chere na etoruwo m nanị m ije kwusaa ozi ọma. Ana m echeta nnọọ nke ọma mgbalị mbụ m mere. Anyị ejiwo moto ruo n’otu nnukwu ụlọ dị n’ubi, mgbe Nne m na ndị ọzọ na-echerekwa n’ime moto, apụtara m wee jee n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. Otu nwanyị nwere obi ọma gere ntị mgbe m chere ya akwụkwọ nta iri n’ihu. Iji kwụọ ụgwọ maka ha, o nyere m otu nnukwute ógbè ncha. O were aka m abụọ iji jigide ya. O nyere m obi ụtọ nke ukwuu!
N’otu afọ ahụ, bụ́ 1943, ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead meghere maka ịzụ ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile maka ọrụ ije ozi ala ọzọ. Nne m gbara m ume ime ka ije ozi ala ọzọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ. N’oge ahụ, Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-aga n’ihu na Europe, Nne m na-agwakwa m banyere Ndịàmà na-eto eto, bụ́ ndị a kpọnaara ndị mụrụ ha. Ọ chọrọ ka m guzosie ike ruo n’ókè nke ịnagide ụdị ule ọ bụla.
N’oge okpomọkụ nke 1946, e mere m baptism ná mgbakọ mba nile nke e mere na Cleveland, Ohio. Ọ bụ ezie na adị m nanị afọ isii, ekpebisiri m ike imezu nrara m raara onwe m nye Jehova. N’oge okpomọkụ ahụ, ejere m ozi dị ka onye ọsụ ụzọ na nke mbụ ya. Echetara m otu ụtụtụ mgbe m tinyere 40 magazin n’aka ndị nọdụrụ ala n’ụlọ ahụ bụ The Plaza nke dị na San Diego, California. Eji m n’aka na ịbụ onye pere mpe na onye na-ekwu ọtụtụ okwu nyere aka imezu nke a.
Ọtụtụ mgbe, anyị kwusara ozi ọma n’ebe dị nso Beth-Sarim, nke bụ ebe onye isi oche Watch Tower Society ahụ nke nọ n’ọrịa, bụ́ Nwanna Rutherford, na-anọ n’oge oyi tupu ọnwụ ya na 1942. Anyị jere nleta, sorokwa ndị ozi oge nile nọ n’ebe ahụ rikọọ nri ọtụtụ ugbo. Nleta obi ụtọ ndị dị otú ahụ mere ka m kpebie na nke a bụ n’ezie ụdị ndụ m chọrọ. Mgbe ahụ, emere m ka ije Ụlọ Akwụkwọ Gilead na ije ozi ala ọzọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ.
N’afọ na-eso ya, ndị mụrụ m gbara alụkwaghị m, ma ọnọdụ ezinụlọ ahụ nke gbanweworonụ emeghị ka ọnọdụ ime mmụọ anyị danyụọ. Nne m bụ onye ọsụ ụzọ, na-echegbukwa onwe ya nke ukwuu banyere ọzụzụ mụ na nwanne m nwoke na-enweta. Ụmụnna nwoke na ndị nwanyị bụ ndị Kraịst na-abịa nleta n’ụlọ anyị nke bụ obere ụlọ ụgbọ ala na-adọkpụgharị. Nne m na-emesi mgbalị ike ịhụ na mụ na ndị jesịrị ụlọ akwụkwọ Gilead na-ezute. Abụọ n’ime ndị dị otú ahụ jesịrị ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Lloyd na Melba Barry, ndị na-eme nleta n’ọrụ njegharị n’oge ahụ mgbe ha nọ na-echere ije ebe e zijere ha ije ozi ala ọzọ na Japan. Ha wepụtara ohere iji gbaa m ume—nwa agbọghọ nta onye ọ na-agụsi ike ịbụ onye ozi ala ọzọ—nke ahụ metụkwara m n’obi.
Mgbe m dị afọ iri, Nne m lụrụ di otu ezi Onyeàmà nke bụkwa onye na-eje ozi ọsụ ụzọ. Ọ nabatara mụ na nwanne m nwoke dị ka ụmụ ya, ọ bụghị nanị n’akwụkwọ, kamakwa n’obi ya. Ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ na ịnụ ọkụ n’obi ya maka ije ozi a bụ nnọọ ihe na-efe efe.
Mama na Papa rụkọrọ ọrụ iduzi anyị bụ ụmụntakịrị abụọ gabiga afọ ihe isi ike ndị ahụ dị n’agbata afọ ndụ nke iri na atọ na nke iri na itoolu. Ụlọ anyị bụ ebe ntụrụ ndụ ime mmụọ nke m na-eji obi ụtọ echeta. Ha ịnọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na nwa ego nta ha na-akpata mgbe ha nọ na-azụlite ụmụ abụọ adịghị mfe; o were iji onwe onye chụọ àjà. Ma Mama na Papa dabeere n’ebe Jehova nọ, debekwa ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ.
Lee nnọọ ka m si na-echeta mgbakọ mba nile ahụ nke ọma, bụ́ nke e mere na New York City na 1950! Papa gbazitere ego n’ụlọ akụ, anyị butekwara ndị njem ga-akwụ ụgwọ na moto anyị iji nye aka ná mmefu a ga-eme. Mama, Papa, mụ na nwanne m nwoke nọkọrọ n’oche ihu ogologo njem ahụ dum site na San Diego ruo New York, ebe ndị ọzọ nọ n’azụ. N’ihi na onye Papa na-arụrụ ọrụ jụrụ inye ya izu abụọ nke ezumike site n’ọrụ ya, ije mgbakọ ahụ mere ka a kwụsị ya ọrụ. Ma, dị ka Papa mesiri anyị obi ike, Jehova ga-elekọta mkpa anyị nile, O mekwara otú ahụ. Papa rere moto ahụ iji kwụghachi ego ahụ ọ gbazitere n’ụlọ akụ, mgbe nke ahụ gasịrị o nwetakwara ọrụ ka mma. Nke a na ahụmahụ ndị yiri nke ahụ baara m oké uru mgbe ọtụtụ afọ gasịrị mgbe mụ na di m chere ọnọdụ ihe isi ike dị iche iche ihu.
Mgbe anyị nọ na-alọghachite site na New York, anyị jere leta Kingdom Farm, ebe m hụrụ Ụlọ Akwụkwọ Gilead nke mbụ ya. Echetara m iguzo n’ime otu n’ime ụlọ klasị ndị dị na ya ma na-agwa onwe m, sị: ‘Eruchabeghị m 11 afọ. Ọ dịghị mgbe m ga-abịa ebe a. Amagedọn ga-abịa tupu m nwee ike ịbịa.’ Ma nleta ahụ mere ka m kpebisikwuo ike karịa otú m mere na mbụ ime ka Gilead bụrụ ihe mgbaru ọsọ m.
Ịrụ Ọrụ Iji Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ M
N’oge ezumike ụlọ akwụkwọ ọ bụla a na-enwe n’oge okpomọkụ, site na klasị nke mbụ gaa n’ihu, arụrụ m ọrụ ọsụ ụzọ. Mgbe ahụ, mgbe izu abụọ gasịrị mgbe m gụsịrị akwụkwọ na kọleji na June 1957, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile.
Nzukọ e nwere ná mgbakọ distrikti maka ndị nwere mmasị n’ije Gilead ná mgbakọ Los Angeles ahụ na 1957 bụụrụ m nke pụrụ iche. Ka m na-abanye n’ụlọ ntu ebe a nọ na-eme nzukọ ahụ, mụ na Bill zutere, bụ́ nwanna nwa okoro nke m mawooro kemgbe m dị afọ isii. Ruo otu afọ tupu mgbe ahụ, ọ nọwo na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Louisiana. Ọ bụụrụ anyị ihe ijuanya ịhụ otú anyị abụọ si nwechaa nnọọ oké mmasị n’ije ozi ala ọzọ. Mgbe ọnwa isii gasịrị, anyị kpebiri ime ya ọrụ anyị ga-arụkọ n’otu. Anyị depụụrụ Society akwụkwọ, na-arịọ ka ha kenye anyị ebe anyị ga-arụ ọrụ, otu ọnwa tupu agbamakwụkwọ anyị, anyị natara ebe e kenyere anyị ọrụ na Romney, West Virginia.
Anyị kwafere ebe ahụ mgbe anyị nọ n’ụzọ na-eje mgbakọ ahụ e nwere na New York na 1958. Mgbe anyị nọ ná mgbakọ ahụ, anyị jere nzukọ ndị nwere mmasị ije Gilead. E nwere ọtụtụ narị ndị bịaranụ. N’ile ìgwè mmadụ ahụ anya, anyị chere na ohere anyị nwere ịbụ ndị a kpọrọ ịbịa Gilead dị nnọọ nta n’ezie. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị tinyere akwụkwọ nke mbụ a na-etinye, ọ bụ ezie na anyị alụwo di na nwunye nanị izu 11. N’afọ na-esonụ, ná mgbakọ distrikt e nwere na Philadelphia, anyị tinyere akwụkwọ nke abụọ.
Na Romney, mụ na Bill mụtara ịdabere na Jehova inyere anyị aka gabiga ọnọdụ ndị siri ike. Romney bụ obodo nke nwere ihe dị ka 2,000 ndị bi na ya. Ọ bụ ihe a na-apụghị ime eme ịchọta ọrụ. Anyị biri n’ụlọ ụgbọ ala na-adọkpụgharị dị 16 amaụkwụ, bụ́ nke anyị rụrụ n’onwe anyị, nke e bukwa ọnọdụ ihu eluigwe nke California n’uche wee rụọ. Anyị enweghị mmiri na-agba agba, anyị enweghị ihe na-enye okpomọkụ n’ụlọ, anyị enweghị ígwè njụoyi e ji echekwa ihe oriri. Ime ụlọ na-ajụ oyi nke ukwuu nke na anyị na-akụwasị ice nke dị n’ime bọket iji nweta mmiri. Ụmụnna nyeere anyị aka ruo ókè ha nwere ike, na-ekenye anyị anụ ndị ha chụtaworo ná ntá. Anyị riri anụ ele, raccoon, na ọsá. Ihe karịrị otu mgbe, anyị chere na anyị agaghị enwe ihe anyị ga-eri maka ụbọchị ahụ, mgbe ahụkwa, mgbe anyị si ozi ọma lọta, anyị na-ahụ mkpụrụ osisi apple ma ọ bụ cheese a kwasara n’ihu ọnụ ụzọ anyị.
Anyị nọgidere na-adọlị ruo ọnwa itoolu, na-ebi ndụ ọtụtụ ugbo mgbe ego nta anyị nwere na-afọdụ nke nta ka ọ ghara izuru anyị ma ọlị. N’ikpeazụ, anyị kpebiri na ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkwafe Baltimore, Maryland, ebe Bill nwere ike ịchọta ọrụ. Mgbe anyị gwara ụmụnna banyere mkpebi anyị, ha kwara ákwá, anyị kwakwara ákwá. Ya mere, anyị kpebiri ịnọgidetụkwu ruo nwa oge.
Ozugbo nke ahụ gasịrị, otu Onyeàmà nke bụ onye na-elekọta ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị na Westernport, Maryland, nke dị ihe dị ka 60 kilomita site n’ebe ahụ nyere Bill ọrụ nwa oge. N’ime otu ọnwa ahụ, otu n’ime ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible nyere anyị otu obere ụlọ e doziri edozi nke nwere nnukwute stovu nke na-eji unyi kol enwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka Malakaị 3:10 ghọrọ akụkụ akwụkwọ nsọ kasị amasị m. Jehova awụpụworo anyị ngọzi karịa otú anyị tụrụ anya ya.
Anyị Emesịa Jee Gilead!
Otu n’ime ụbọchị ndị kasị enye anyị ọṅụ ná ndụ bụ ụbọchị ahụ, na November 1959, mgbe anyị natara ọkpụkpọ òkù anyị ije Gilead. A kpọrọ anyị ịbịa klasị nke 35, bụ́ nke ikpeazụ a nọ na Kingdom Farm nwee. Mgbe m guzoro n’otu ime ụlọ klasị ahụ m bịaworo ileta mgbe m bụ nwata, enwere m ezi mmetụta obi ụtọ nke okwu ọ bụla na-apụghị ịkọwa nke ọma.
Gilead bụ ebe ahịhịa ndụ nke dị n’etiti ọzara n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị nnọọ ka ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ruo ọnwa ise. Ọ bụghị ọtụtụ mgbe ná ndụ ka anyị na-echere ogologo oge maka otu ihe wee hụ na ihe ahụ dị mma karịa otú anyị tụrụ anya ya. Ma Gilead dị otú ahụ kpọmkwem.
E nyere anyị ọrụ n’India, ma e mesịrị jụ inye anyị akwụkwọ njem visa. Ya mere, mgbe otu afọ nke ichere na New York City gasịrị, Watch Tower Society nyere anyị ọrụ ọzọ na Morocco, n’Ebe Ugwu Africa.
Ndị Ozi Ala Ọzọ na Morocco
Anyị nọrọ 24 afọ ndị na-enye ọṅụ na Morocco, na-enwe ịhụnanya maka ndị ebe ahụ ozugbo anyị bịarutere. Anyị mụtara ma French ma Spanish, bụ́ asụsụ ndị nyeere anyị aka iso ndị si n’ọtụtụ mba dị iche iche ndị bi n’ebe ahụ, nwee mkparịta ụka. Ọ bụkarị ndị si ná mba ndị ọzọ bịa na-anara ozi Alaeze ahụ.
Otu nwanyị mụ na ya so mụọ Bible bụ onye na-ete egwú flamenco nke ndị Spain, onye e were n’ọrụ n’otu ụlọ oriri cabaret dị na Casablanca. Mgbe ọ mụtasịrị ụkpụrụ Bible dị iche iche, ọ hapụrụ onye nwe òtù egwú cabaret ahụ, bụ́ onye ya na ya nọworo na-ebikọ, wee laghachi Spain. N’ebe ahụ, ọ gbaara ndị nile nọ n’ezinụlọ ya àmà, ụfọdụ n’ime ha nakwerekwara eziokwu Bible ndị ahụ ya na ha so kerịta. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ lọghachiri Casablanca, bụ́ ebe ọ nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo mgbe ọ nwụrụ na 1990.
N’afọ ole na ole mbụ anyị nọrọ na Morocco, e nwere mmụba n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze. Otú ọ dị, mgbe ọ ghọrọ ihe siri ike ndị si ala ọzọ inweta ikike ibi ebi na ịrụ ọrụ, e nwere nnupụ nke Ndịàmà gaa Europe. Ụfọdụ ndị anyị na ha mụrụ ihe bi ugbu a na New Zealand, Canada, United States, Bulgaria, Russia, na France, ụfọdụ n’ime ha na-ekerekwa òkè n’ije ozi oge nile.
Na mberede, n’April 1973, a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu na Morocco. Lee nnọọ oké ihe otiti ọ bụ! N’otu uhuruchi ụbọchị Thursday, anyị ka nwesịrị nnọkọ obi ụtọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-akpa nkata ruo mgbe a gbanyụsịrị ọkụ iji mee ka anyị mara na oge ụla eruwo. Anyị amaghị na ọ dịghị mgbe ọzọ anyị ga-ahụ ìhè dị otú ahụ ka ọ na-enwu ná nnọkọ ihu ọha nke ndị Kraịst. N’okpuru ọnọdụ nke mmachibido iwu, nzukọ dị iche iche na mgbakọ sekit ndị anyị na-enwe bụ nke nanị ìgwè nta dị iche iche na-eme n’ụlọ ndị mmadụ. Iji jee mgbakọ distrikt, Ndịàmà ahụ na-eje France ma ọ bụkwanụ Spain.
Ka ọnụ ọgụgụ anyị na-adalata, Ndịàmà ole na ole fọdụrụ na Morocco nwere mmekọrịta chiri anya karị n’ebe ibe ha nọ. Ya mere, mgbe Watch Tower Society mesịrị kpebie imechi alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe ahụ ma nye anyị ọrụ n’ebe ọzọ, anyị nile kwara ákwá nke ukwuu.
Anyị Wee Jee Central Africa
Ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ bụ na Central African Republic. Lee nnọọ oké mgbanwe ọ bụ site n’Ebe Ugwu Africa! Ebe Morocco nwere ọnọdụ ihu eluigwe yiri nke ebe ndịda California, anyị hụrụ onwe anyị ugbu a n’etiti ebe okpomọkụ, nke na-akpatakwa ọsụsọ.
E nwere ihe isi ike ndị ọhụrụ a ga-eche ihu. Dị ka ihe atụ, ọ dịrị mkpa ka m chịkwaa egwu m na-atụ ihe ndị na-arịgharị arịgharị. Ugbo atọ, ngwere adakwasịwo m n’isi ka m si n’ọnụ ụzọ na-achọ ịgafe. Mgbe ụfọdụ, mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible, otu òké ga-ekpebi isonyere anyị! Ọ bụ ezie na ana m achọ ịmali elu ma gbapụ, amụtara m ijide onwe m, n’adịghị mgbe ọ bụla m wepụrụ anya m n’ahụ Mazị Òké, hụkwa na akpa akwụkwọ m na ụkwụ m adịghị n’ala ruo mgbe o kpebiri ịpụ. Achọpụtara m na ihe ọ bụla pụrụ ịmara gị ahụ ma ọ bụrụhaala na ị nọgide na ya.
Mgbe anyị nọworo ọnwa isii n’ebe ahụ, a mara ọkwa na redio na a machibidowo ọrụ anyị iwu. Ya mere, e mechịsịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, a gwakwara ndị ozi ala ọzọ ka ha laa. Nanị anyị na otu di na nwunye ọzọ nwere ike ịnọgide n’alaka ụlọ ọrụ ahụ ruo afọ atọ ọzọ. Mgbe ahụ, n’otu ụtụtụ Sunday, mgbe anyị na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ndị uwe ojii bucha égbè bịara wee kpụrụ anyị jee n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ha tọhapụrụ ndị inyom na ụmụntakịrị, ma ha jigidere 23 ụmụnna ndị nwoke, gụnyere di m, bụ́ Bill. Mgbe ụbọchị isii gasịrị, ha hapụrụ ya ka ọ laa jee kwakọta ibu ya; mgbe ụbọchị atọ gasịrị, site n’iwu gọọmenti nyere, anyị hapụrụ mba ahụ na May 1989. Ọ bụkwa oge ọzọ nke iji anya mmiri ala n’ọdụ ụgbọ elu ahụ ebe ụmụnna anyị ndị hụrụ anyị n’anya bịara ịsị anyị gaa nke ọma.
N’Ikpeazụ, Anyị Ejee Sierra Leone
Ebe anyị nọ na-arụ ọrụ ugbu a bụ Sierra Leone, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, bụ́ mba mara mma nke nwere ọmarịcha ụsọ oké osimiri ebe ájá uzuzu ọcha juru. Ụmụ mmadụ nwere omume enyi nke ukwuu, ije ozi ubi bụkwa ihe obi ụtọ. A na-akpọ anyị òkù ịnọdụ ala n’ụlọ nke ọ bụla, nke na-abụkarị n’okpuru ndò nke osisi mango ma ọ bụ akị bekee. Ọ na-amasị ndị mmadụ ikwu okwu banyere Chineke na iweta Bible nke aka ha iji na-eso mgbe anyị na-agụ.
Ma mụ ma Bill na-arụ ọrụ n’Ụlọ Betel nke dị na Freetown. Ana m eje ozi dị ka onye nnabata ndị ọbịa, na-arụkwa ọrụ ndị metụtara ụtụ magazin na ihe ndekọ ego ọgbakọ dị iche iche. Mgbe afọ 16 nke ije ozi n’ala ebe ndị a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu gasịrị, ọ bụ ihe magburu onwe ya ịnọ n’ala ebe ọrụ ahụ nweere onwe ya, na-agakwa n’ihu.
June 1991 mezuru ya 30 afọ m nọworo n’ozi ala ọzọ. N’ezie, Nne m setịpụrụ n’ihu m ihe mgbaru ọsọ bara nnọọ uru! A sị na ọ ka dị ndụ, ọ gaara amasị m ịgwa ya ọzọ, sị, “I meela, Mama!” Obi dị ụtọ na m ka nwere ike ịsị, “I meela, Papa!”
[Foto dị na peeji nke 28]
Mgbakọ New York, 1958
[Foto dị na peeji nke 29]
35th class—July, 1960
[Foto dị na peeji nke 30]
Bill na Sandra Cowan, 1991