Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 20-24
  • Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmụta Eziokwu Bible
  • Ime Omume Dị Ka Ihe Ha Mụtara Si Dị
  • Ịkụziri Anyị Eziokwu Ahụ
  • Ndị Mwakpo na Selma
  • Ịga Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ozi Ala Ọzọ nke Gilead
  • Mụ na Nne na Nna M Agaa Ozi Ala Ọzọ
  • Ilekọta Nne na Nna Anyị
  • Ihe Nketa Ndị Kraịst nke Dị Ụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị Bara Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ahụ́ Adịghị Mama M ma Ọ Bụ Papa M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ịgbaso Nzọụkwụ nke Ndị Mụrụ M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 20-24

Nne na Nna Anyị Kụziiri Anyị Ịhụ Chineke n’Anya

DỊ KA ELIZABETH TRACY SI KỌỌ

Ndị ikom bucha ngwá ọgụ, bụ́ ndị buworo ụzọ duru otu ìgwè ndị mwakpo bịa wakpoo anyị n’otu ụbọchị ahụ, manyere mama m na papa m ka ha si n’ụgbọala ha rịtuo. N’ịbụ ndị a hapụrụ nanị ha n’oche azụ, mụ na nwanne m nwanyị nọ na-eche ma ànyị ka ga-ahụkwa nne na nna anyị anya ọzọ. Gịnị dugara n’ahụmahụ a na-atụ ụjọ na nso Selma, Alabama, U.S.A., na 1941? Njikọ dịkwa aṅaa ka ihe nne na nna anyị kụziiri anyị na nke a nwere?

Ọ BỤ onye ikwu anyị nke bi n’otu ugbo dị na Texas zụlitere nna m, bụ́ Dewey Fountain, mgbe nne na nna ya nwụrụ n’oge ọ ka bụ nwa ọhụrụ. E mesịa, ọ gara ịrụ ọrụ n’ógbè ebe a na-egwupụta mmanụ. Na 1922, mgbe ọ dị afọ 23, ọ lụrụ Winnie, bụ́ ọmarịcha onye Texas na-eto eto, ma malite ime atụmatụ ịnọrọ otu ebe ma zụlite ezinụlọ.

O wuru ụlọ n’ala osisi nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Texas na nso obodo nta bụ́ Garrison. N’ebe ahụ, ọ kụrụ ihe ọkụkụ dị iche iche, gụnyere ogho na ọka. Ọ zụlitekwara ụdị anụmanụ nile a na-akpa akpa. Ka oge na-aga, a mụrụ anyị bụ́ ụmụaka—Dewey junior na May 1924, Edwena na December 1925, a mụkwara mụ onwe m na June 1929.

Ịmụta Eziokwu Bible

Mama m na papa m chere na ha ghọtara Bible, ebe ọ bụ na ha na-ekpe Church of Christ. Ma na 1932, G. W. Cook hapụụrụ nwanne papa m nke nwoke bụ́ Monroe Fountain akwụkwọ ndị bụ́ Deliverance na Government, nke Watch Tower Society bipụtara. N’ịbụ onye ọ dị ọkụ n’obi isoro nne na nna m kerịta ihe ọ na-amụta, Monroe na-abịakarị n’ụlọ anyị n’oge nri ụtụtụ, gụọ otu isiokwu site n’Ụlọ Nche, ma ‘chefuzie’ magazin ahụ. Mgbe e mesịrị, mama m na papa m ga-agụ ya.

Otu ụtụtụ Sunday, Deede Monroe kpọrọ papa m òkù ka ọ bịa n’ụlọ otu onye agbata obi anyị maka ọmụmụ Bible. O mesiri ya obi ike na Maazị Cook pụrụ ịza ajụjụ ya nile site na Bible. Mgbe papa m si n’ọmụmụ ihe ahụ lọta, o ji mkpali gwa ezinụlọ anyị, sị: “A zara ajụjụ m nile ma nyekwuo m ihe ọmụma! Echere m na m maara ihe nile, ma mgbe Maazị Cook malitere ịkọwa banyere hel, mkpụrụ obi, nzube Chineke banyere ụwa, na otú Alaeze Chineke ga-esi mezuo ya, amalitere m inwe mmetụta na ọ dịghị ihe ọ bụla m maara n’ezie banyere Bible!”

Ụlọ anyị yiri ebe nzukọ ọha. Ndị ikwu na ndị enyi na-abịa eleta anyị, mee switi na popcorn, na-abụkwa abụ ka mama m na-akpọ piano. Nke nta nke nta, a na-eji nkwurita okwu nke isiokwu Bible edochi ihe omume ndị a. Ọ bụ ezie na anyị bụ́ ụmụaka apụghị ịghọtacha ihe nile ha na-ekwurịta, ịhụnanya siri ike nne na nna anyị nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe Bible dị pụtara nnọọ ìhè nke na onye ọ bụla n’ime anyị bụ́ ụmụaka zụlitere ịhụnanya yiri nke ahụ n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe Okwu ya dị.

Ezinụlọ ndị ọzọ nabatakwara anyị n’ebe obibi ha maka ikwurịta ihe ndị dị na Bible kwa izu, bụ́ ndị na-adaberekarị n’otu isiokwu dị na magazin Ụlọ Nche kasị ọhụrụ. Mgbe a ga-anọ na nke ezinụlọ ndị bi n’obodo ndị dị anyị nso bụ́ Appleby na Nacogdoches nwee nzukọ ndị ahụ, anyị na-enubanye n’ime ụgbọala anyị bụ́ Model A Ford ma gaa n’ebe ahụ, ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha.

Ime Omume Dị Ka Ihe Ha Mụtara Si Dị

O weghị nne na nna anyị oge ịhụ mkpa ọ dị ime ihe. Ịhụ Chineke n’anya chọrọ ka e soro ndị ọzọ kerịta ihe a mụtara. (Ọrụ 20:35) Ma nzọụkwụ a nke ịkpọsa okwukwe mmadụ n’ihu ọha bụ ihe ịma aka, karịsịa ebe ọ bụ na nne na nna anyị bụ ndị na-eme ihere na ndị dị umeala site n’ọmụmụ. Ma, ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ kwaliri ha, nke a n’aka nke ya nyeere ha aka ịkụziri anyị ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ miri emi. Nna m si otú a kwuo ya: “Jehova si n’etiti ndị ọrụ ugbo na-enweta ndị nkwusa!” Na 1933, mama m na papa m gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova site na baptism ime mmiri n’otu ọdọ mmiri a na-azụ azụ̀ na ya dị nso na Henderson, Texas.

Ná mmalite 1935, papa m degaara Watch Tower Society akwụkwọ ma jụọ ọtụtụ ajụjụ banyere olileanya ndị Kraịst nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 14:2; 2 Timoti 2:11, 12; Mkpughe 14:1, 3; 20:6) Ọ natara nzaghachi kpọmkwem site n’aka Joseph F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche Society mgbe ahụ. Kama ịza ajụjụ ya, Nwanna Rutherford kpọrọ papa m òkù ka ọ bịa mgbakọ Ndịàmà Jehova ga-enwe na Washington, D.C., na May.

‘Ọ gaghị ekwe omume!’ ka papa m chere. ‘Anyị bụ ndị ọrụ ugbo nwere hekta 26 a kụrụ akwụkwọ nri. A ghaghị ịkpata ha nile ma ree ha n’oge ahụ.’ Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, idei mmiri bịara ma buru ihe ndị ahụ o ji maka ha ghara ịchọ ịga—ihe ọkụkụ, ogige, na àkwà mmiri. Ya mere anyị sonyeere Ndịàmà ndị ọzọ n’otu bọs ụlọ akwụkwọ a ṅụtara aṅụta bụ́ nke bu anyị gaa kilomita 1,600 n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ ruo ná mgbakọ ahụ.

Ná mgbakọ ahụ, papa m na mama m nwere mkpali ige ntị ná nkọwa doro anya banyere njimara nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ́ ndị ga-alanarị “oké mkpagbu” ahụ. (Mkpughe 7:9, 14, King James Version) Ná ndụ ha fọdụrụnụ, olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala kwaliri mama m na papa m, ha gbakwara anyị bụ́ ụmụaka ume ‘ijide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ bụ́ nke pụtaara anyị ndụ ebighị ebi n’elu ala, nke Jehova na-enye. (1 Timoti 6:19; Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụ ezie na adị m nanị afọ ise, enwere m ọṅụ n’ezie iso ezinụlọ m nọrọ n’oge ihe omume obi ụtọ a.

Mgbe anyị si ná mgbakọ ahụ lọta, ezinụlọ anyị kụghachiri ihe ọkụkụ ndị ahụ, anyị mesịkwara wee owuwe ihe ubi kasịnụ anyị wetụrụla. Nke a nyere aka n’ezie ime ka mama m na papa m kwenyesie ike na ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu agaghị abụ nke a na-agaghị akwụghachi ụgwọ ọrụ. Ha malitere ụdị pụrụ iche nke ọrụ ime nkwusa bụ́ nke onye nke ọ bụla n’ime ha nakweere itinye awa 52 n’ọnwa n’ozi. E mesịa, mgbe oge ịkọ ihe ọzọ ruru, ha rere ihe nile—ụlọ, na ugbo! Papa m nwere otu ụlọ a na-adọkpụ adọkpụ nke dị mita 6 n’ogologo na mita 2.4 n’obosara bụ́ nke a rụrụ maka anyị ise ibi n’ime ya, ọ zụtakwara ụgbọala Ford ọhụrụ ga na-adọkpụ ya. Deede Monroe mere otu ihe ahụ, ya onwe ya kwa na ezinụlọ ya kwabara n’ime otu ụlọ a na-adọkpụ adọkpụ.

Ịkụziri Anyị Eziokwu Ahụ

Papa m na mama m malitere ịsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ozi oge nile, n’October 1936. Dị ka ezinụlọ, anyị malitere ime nkwusa n’ógbè ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Texas bụ́ ndị ozi Alaeze ahụ na-agazubeghị. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ, anyị gara site n’otu ebe gaa n’ọzọ, ma n’ozuzu ya, anyị nụrụ ụtọ ndụ a n’ezie. Mama m na papa m kụziiri anyị site n’okwu na ihe nlereanya ha ịdị ka ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị wepụtara onwe ha ịgwa ndị ọzọ eziokwu Bible.

Anyị bụ́ ụmụaka nwere mmasị karịsịa n’ebe nne anyị nọ maka àjà ndị ọ chụrụ site n’ịhapụ ebe obibi ya. Otú ọ dị, e nwere otu ihe ọ na-enweghị ike ịhapụ, nke ahụ bụkwa ígwè ịkwa ákwà ya. Ọ bụkwa ezi ihe. N’ịbụ onye nwere nkà dị ka ọkwa ákwà, ọ na-eme ka anyị na-eyipụta uwe. Ná mgbakọ nke ọ bụla, anyị na-enwe uwe ndị ọhụrụ mara mma anyị ga-eyi.

Ana m echeta nke ọma mgbe Herman G. Henschel na ezinụlọ ya ji ụgbọala Watch Tower Society nke nwere ígwè okwu bịa n’ógbè anyị. Ha na-akwụsị moto ahụ n’ebe ndị mmadụ jupụtara, kpọọ mkpirikpi okwu e kwubanyere na tepụ, e mesịakwa ha eleta ndị mmadụ iji nyekwuo ha ihe ọmụma. Ọ tọrọ Dewey junior ụtọ iso nwa Herman nke nwoke bụ́ Milton, bụ́ onye nọ n’etiti afọ iri na ụma ya, na-akpakọrịta. Ugbu a Milton bụ onyeisi oche nke Watch Tower Society.

Ná mgbakọ ahụ e nwere na 1937 na Columbus, Ohio, e mere Edwena baptism, e nyekwara papa m na mama m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’oge ahụ, ọrụ ahụ chọrọ itinye ma ọ dịkarịa ala awa 200 n’ọrụ nkwusa ahụ n’ọnwa. Ka m na-eleghachi anya azụ, ana m amata ókè ezi ihe nlereanya mama m nyeruuru m aka n’ịkwado di m n’ọrụ onye Kraịst ya.

Mgbe papa m maliteere otu ezinụlọ ọmụmụ Bible, ọ na-akpọrọ anyị bụ́ ụmụaka eje iji nye ụmụ ha ezi ihe nlereanya. Ọ na-eme ka anyị sapeta ma gụọ akụkụ Bible ma zaa ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị bụ́ isi. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eto eto anyị mụụrụ ihe na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo taa. N’ezie, a tọkwaara anyị ntọala siri ike iji nọgide na-ahụ Chineke n’anya.

Ka Dewey junior na-etolite, o siiri ya ike isoro ụmụnne ya nwanyị abụọ ndị ọ tọrọ biri n’ebe dị mkpagide otú ahụ. Ya mere na 1940, ọ họọrọ ịhapụ ụlọ ma soro Onyeàmà ọzọ rụwa ọrụ ọsụ ụzọ. N’ikpeazụ, ọ lụrụ Audrey Barron. N’ihi ya, nne na nna anyị kụzikwaara Audrey ọtụtụ ihe, ọ bịakwara hụ mama m na papa m n’anya nke ukwuu. Mgbe Dewey junior gara mkpọrọ na 1944 maka nnọpụiche ya dị ka onye Kraịst, Audrey bịara binyere anyị ruo oge ụfọdụ n’ụlọ anyị dị mkpagide nke ụgbọala na-adọkpụ.

Ná mgbakọ ukwu e nwere na St. Louis, Missouri, na 1941, Nwanna Rutherford gwara ụmụaka ndị dị afọ 5 ruo 18 okwu kpọmkwem, bụ́ ndị nọdụrụ ala n’otu akụkụ pụrụ iche n’ihu. Mụ na Edwena gere ntị n’olu okwu ya dị jụụ ma dị sam; o yiri nna na-ahụ n’anya nke na-enye ụmụ ya ntụziaka n’ụlọ. Ọ gbara ndị nne na nna ume, sị: “Taa, Kraịst Jisọs akpọkọtawo ndị ya na ha gbara ndụ n’ihu ya, n’ụzọ kasịkwa sie ike ọ na-agwa ha ka ha na-ezi ụmụ ha ihe n’ụzọ nke ezi omume.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Debe ha n’ụlọ ma na-akụziri ha eziokwu ahụ!” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, nne na nna anyị mere otú ahụ!

Ná mgbakọ ahụ, anyị natara akwụkwọ nta ọhụrụ bụ́ Jehovah’s Servants Defended, bụ́ nke tụleghachiri okwu ikpe ndị Ndịàmà Jehova meriworo, gụnyere ndị nke e kpere n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. Papa m sooro anyị mụọ ya dị ka ezinụlọ. Anyị amaghị na a na-akwadebe anyị maka ihe mere izu abụọ mgbe nke ahụ gasịrị na Selma, Alabama.

Ndị Mwakpo na Selma

N’ụtụtụ nke ụbọchị ahụmahụ ahụ na-atụ ụjọ, papa m nyere onye sheriff, onyeisi obodo, na onyeisi ndị uwe ojii nọ na Selma akwụkwọ ozi ndị kọwara na ọ bụ ihe ruuru anyị n’ụzọ iwu ịnọgide na-ekwusa ozi anyị n’okpuru nchebe nke iwu. Otú o sina dị, ha kpebiri ịchụpụ anyị n’obodo ahụ.

N’uhuruchi, ndị ikom ise bucha ngwá ọgụ bịarutere n’ụlọ anyị ụgbọala na-adọkpụ ma jichie mama m, nwanne m nwanyị, na mụ onwe m. Ha gara n’ihu inyocha ihe nile dị n’ime ụlọ, na-achọ ma e nwere ihe na-agba ọchịchị mgba okpuru ha ga-ahụ. Papa m nọ n’èzí, ha nyekwara ya iwu ka o kegide ụlọ ahụ a na-adọkpụ adọkpụ n’ụgbọala, na-atụdo ya egbe n’oge a nile. N’oge a, ụjọ atụghị m. O yiri ihe na-atọ nnọọ ọchị na ndị ikom ndị a chere na anyị dị ize ndụ nke na mụ na nwanne m nwanyị dapụrụ n’ọchị. Otú ọ dị, anyị mechikwara ọnụ ngwa ngwa mgbe papa m gwuru anyị anya.

Mgbe anyị jikeere ịhapụ, ndị ikom ahụ chọrọ ka mụ na Edwena soro ha n’ụgbọala nke ha. Papa m jụwapụrụ isi. “Ọ gwụla ma m nwụrụ anwụ!” ka o kwuru. Mgbe e nwesịrị nkwurịta okwu ụfọdụ, ha kwere ka ezinụlọ anyị mekọọ njem ọnụ, ebe ndị ikom ahụ bucha ngwá ọgụ na-eso anyị n’azụ n’ụgbọala ha. N’ihe dị ka kilomita 25 ná mpụga nke obodo ahụ, ha sịrị anyị kwụsị n’akụkụ okporo ụzọ awara awara ahụ, ha kpọkwaara mama m na papa m pụọ. N’otu n’otu, ndị ikom ahụ nwara ime ka ha kwenye, na-asị: “Hapụnụ okpukpe ahụ. Laghachinụ n’ugbo ahụ, ma zụlite ụmụ agbọghọ unu nke ọma!” Papa m nwara isoro ha tụgharịa uche ma o nweghị isi.

N’ikpeazụ, otu nwoke sịrị: “Laanụ, unu bịaghachikwa n’Obodo Dallas, anyị ga-egbu unu nile!”

N’ịbụ ndị nwere ahụ efe na ndị nọkọkwara ọnụ ọzọ, anyị mere njem ruo ọtụtụ awa ma kwụsịzie iji nọọ ọnọdụ abalị. Anyị rịbara nọmba laịsensị moto ha ama. Papa m kọọrọ Watch Tower Society ihe nile n’egbughị oge, ọnwa ole na ole mgbe e mesịkwara, a chọpụtara ndị ikom ahụ ma jide ha.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ozi Ala Ọzọ nke Gilead

Edwena natara ọkpụkpọ òkù ịbịa klas nke 7 nke Watchtower Bible School of Gilead dị na South Lansing, New York, na 1946. Albert Schroeder, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi ya, kọọrọ onye ya na ya sụkọburu ụzọ bụ́ Bill Elrod, bụ́ onye na-eje ozi mgbe ahụ na Betel, isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, banyere àgwà ọma Edwena.a Edwena na Bill matara onwe ha, n’ihe dịkwa ka otu afọ Edwena gụsịrị akwụkwọ na Gilead, ha lụrụ. Ruo ọtụtụ afọ ha nọgidere n’ozi oge nile, gụnyere ijekọ ozi ọnụ na Betel ruo afọ ise. E mesịa otu ụbọchị na 1959, Nwanna Schroeder gwara klas nke 34 nke Gilead na ezigbo enyi ya aghọwo nna nke ụmụ ejima, otu nwoke na otu nwanyị.

Ka m so nne na nna m na-eje ozi na Meridian, Mississippi, ná ngwụsị 1947, anyị atọ natara ọkpụkpọ òkù ịbịa klas nke 11 nke Gilead. Nke a juru anyị anya n’ihi na dị ka ihe a chọrọ si dị, adị m nnọọ obere, mama m na papa m emeekwala nnọọ agadi ịga. Ma a gbasoghị nke ahụ, anyị nwetakwara ihe ùgwù ahụ pụrụ iche bụ́ ntụziaka Bible dị elu.

Mụ na Nne na Nna M Agaa Ozi Ala Ọzọ

Ebe e kenyere anyị ozi ala ọzọ bụ Colombia, n’Ebe Ndịda America. Otú ọ dị, ọ bụ na December 1949, ihe karịrị otu afọ anyị gụsịrị akwụkwọ, ka anyị bịarutere Bogotá n’otu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ bụ́ ebe mmadụ atọ ndị ọzọ birịị. Na mbụ, ọ fọrọ nke nta ka papa m kpebie na ọ ga-aka mfe ịkụziri ndị ahụ Bekee karịa ya ịmụ Spanish! Ee, anyị nwetara ule dị iche iche, ma ewoo, lee ka ngọzi ndị si na ha pụta si dị ukwuu! E nwere ihe na-erughị otu narị Ndịàmà na Colombia na 1949, ma ugbu a e nwere ihe karịrị nnọọ 100,000!

Mgbe anyị jesịrị ozi na Bogotá ruo afọ ise, e zigara mama m na papa m n’obodo Cali. Ka ọ dịgodị, na 1952, alụrụ m Robert Tracy, bụ́ onye ozi ala ọzọ ibe m nọ na Colombia.b Anyị nọgidere na Colombia ruo 1982, bụ́ mgbe e zigara anyị Mexico, bụ́ ebe anyị nọworo na-eje ozi kemgbe ahụ. N’ikpeazụ, na 1968, nne na nna m aghaghị ịlaghachi United States maka nlekọta ahụ ike. Mgbe ha gbakesịrị, ha nọgidere na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ná nso Mobile, Alabama.

Ilekọta Nne na Nna Anyị

Ka afọ nọ na-agafe, ikike mama m na papa m malitere ibelata, ha chọkwara nkwado na nlekọta karị. E kenyere ha ije ozi n’ebe dị nso n’ebe Edwena na Bill nọ n’Athens, Alabama, dị ka ha si rịọ. E mesịa, nwanne anyị nwoke bụ́ Dewey junior, chere na ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ezinụlọ anyị ibidewe onwe anyị na South Carolina. N’ihi ya Bill kpọọrọ ezinụlọ ya tinyere mama m na papa m kwaga Greenwood. Mgbanwe a e mere n’ịhụnanya mere ka o kwe mụ na Robert omume ịnọgide na-eje ozi ala ọzọ anyị na Colombia, na-amara na a na-elekọta nne na nna anyị anya nke ọma.

E mesịa, na 1985, papa m rịara strok nke mere ka ọ gharakwa ikwu okwu na inwe ike ibili n’elu àkwà. Ezinụlọ anyị zukọrọ iji tụlee otú kasị mma anyị ga-esi na-elekọta nne na nna anyị. E kpebiri na Audrey ga-abụ onye bụ́ isi ga na-elekọta papa m nakwa na mụ na Robert pụrụ inye aka n’ụzọ kasị mma site n’ịdị na-ezite akwụkwọ ozi bu ahụmahụ ndị na-agba ume kwa izu nakwa ịdị na-eme nleta mgbe mgbe ruo ókè o kwere mee.

M ka na-echeta nnọọ nleta ikpeazụ m letara papa m. Ọ pụghịdị ikwu okwu nkịtị, ma mgbe anyị gwasịrị ya na anyị na-alaghachi Mexico, n’ụzọ ụfọdụ, o ji oké mgbalị na mmetụta uche kwuo otu okwu, “Adios!” (Gaanụ nke ọma!) Site na nke a anyị matara na, n’obi ya, ọ na-akwado mkpebi anyị ịnọgide n’ozi ala ọzọ anyị. Ọ nwụrụ na July 1987, mama m nwụkwara ọnwa itoolu mgbe nke ahụ gasịrị.

Akwụkwọ ozi m natara site n’aka nwanne m nwanyị di ya nwụrụ chịkọtara ekele onye ọ bụla n’ime anyị nwere n’ebe nne na nna anyị nọ nke ọma. “Eji m ihe nketa bara ụba nke ndị Kraịst m nwere akpọrọ ihe nke ukwuu, echetụbeghịkwa m otu ụbọchị na m gaara enwe obi ụtọ karị ma a sị na nne na nna anyị họọrọ ịzụlite anyị n’ụzọ dị iche. Ihe nlereanya ha nke okwukwe siri ike, ịchụ onwe onye n’àjà, na ịtụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu enyeworo m aka ịtachi obi n’oge ndị m nwere ịda mbà n’obi ná ndụ m.” Edwena kwubiri, sị: “Ana m ekele Jehova maka nne na nna m bụ́ ndị, site n’okwu na ihe nlereanya, gosiri anyị obi ụtọ anyị pụrụ inwe ma ọ bụrụ na anyị emee ka ndụ anyị dabere n’ijere Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ozi.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke March 1, 1988, peji nke 11-12.

b Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15, 1960, peji nke 189-191.

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ezinụlọ Fountain: (site n’aka ekpe gaa n’aka nri) Dewey, Edwena, Winnie, Elizabeth, Dewey junior; n’aka nri: Elizabeth na Dewey junior ka ha nọkwasịrị n’ihu ụgbọala Henschel nke nwere ígwè okwu (1937); n’ala aka nri: Elizabeth ka ọ nya akwụkwọ e dekwasịrị ihe na-agba àmà, mgbe ọ dị afọ 16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya