Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 4/15 p. 26-30
  • Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido Akụkụ nke 1

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido Akụkụ nke 1
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Nsogbu
  • A Machibidowo Ọrụ Anyị
  • Inwe Nzukọ n’Okpuru Mmachibido
  • Ọrụ Mbụ Bụ Isi M Nwetara
  • Tụkwasị Jehova Obi
  • Nlekọta Onwe Onye nke Jehova
  • Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido—Akụkụ nke 2
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido—Akụkụ nke 3
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jehova Nọnyeere M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Imezu Nkwa M Kwere Ijere Chineke Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 4/15 p. 26-30

Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido Akụkụ nke 1

Ruo ọtụtụ iri afọ Ndịàmà Jehova echewo echiche banyere ụmụnna ha nọ n’ala ebe ndị a machibidoro ọrụ ndị Kraịst. Anyị nwere obi ụtọ ibipụta nke mbụ n’ime isiokwu atọ ndị ga-ekpughe ihe ụfọdụ merenụ. Ndị a bụ akụkọ ndị ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi kọrọ n’onwe ha n’ebe a maara mgbe ahụ dị ka East Germany.

N’AFỌ 1944, abụ m onye Germany a tụrụ mkpọrọ n’ihi agha, onye na-arụ ọrụ dị ka onye na-eje ozi n’ụlọ ọgwụ dị n’Ogige Cumnock, nke dị nso na Ayr, Scotland. E kwere ka m na-apụ n’ogige ahụ, ọ bụ ezie na a machibidoro isoro ndị obodo ahụ na-akpakọrịta. N’otu ụbọchị Sunday mgbe m pụrụ ime mkpagharị, ezutere m otu nwoke mere mgbalị dị ukwuu ịkọwara m ihe ndị dị na Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọtụtụ mgbe anyị na-emekọ mkpagharị ọnụ.

Mgbe oge na-aga, ọ kpọrọ m òkù ịbịa otu nzukọ a na-enwe n’otu ụlọ. Nke a bụụrụ ya ihe ize ndụ, ebe ọ bụ na m si ná mba na-ebuso mba ha iro. N’oge ahụ amataghị m na ọ bụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova—o doro anya na nzukọ nke a bụ otu n’ime ọmụmụ Bible ha na-enwe n’obere ìgwè. Ọ bụ ezie na aghọtaghị m ihe nile e kwuru, echetara m nke ọma ihe osise nke otu nwatakịrị yi uwe mwụda ọcha, ya na ọdụm na nwa atụrụ. Ihe ngosipụta nke a nke ụwa ọhụrụ, dị ka a kọwara n’akwụkwọ Bible bụ Aịsaịa, nwere mmetụta dị omimi n’ime m.

Na December 1947, a tọhapụrụ m n’ogige ụlọ mkpọrọ. Mgbe m laghachiri Germany, alụrụ m Margit, bụ́ onye m mawooro tupu oge agha. Anyị biri na Zittau, ebe dị nso n’ókèala Poland na Czechoslovakia. N’ime ụbọchị ole na ole, otu n’ime Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. “Ọ bụrụ na ndị a bụ otu ndị ahụ m zutere na Scotland,” ka m gwara nwunye m, “mgbe ahụ anyị ga-esonyere ha.” N’otu izu ahụ, anyị sooro Ndịàmà ahụ nwee nzukọ mbụ anyị.

Site na Bible, anyị mụtara n’oge na-adịghị anya mkpa ọ dị ịbịachi nzukọ ndị Kraịst anya na ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa. N’ezie, ihe Ndịàmà na-akụzi site na Bible ghọrọ ihe ndị kasị mkpa ná ndụ anyị n’oge na-adịghị anya. Amalitere m iduzi ọmụmụ Bible ìgwè. Mgbe ahụ, na February 1950, ndị nlekọta abụọ na-ejegharị ejegharị bụ́ ndị Kraịst jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na ị chọghị ka e mikpuo gị na mmiri ma ọlị?” N’otu ehihie ahụ mụ na Margit gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’ime baptism.

Mmalite nke Nsogbu

Zittau dị n’ógbè ndị Soviet nke Germany, mgbalị ndị e mekwara inye Ndịàmà Jehova nsogbu amaliteworị n’afọ 1949. Ọ bụ nanị mgbe e nwesịrị ọtụtụ ihe isi ike ka e nwetara ebe a ga-anọ nwee otu obere mgbakọ na Bautzen. Mgbe ahụ, n’oge okpomọkụ nke afọ ahụ, a kagburu ọpụpụ nke ụgbọ okporo ígwè ndị pụrụ iche ná mberede bụ́ ndị a kwadebere maka mgbakọ distrikti ka ukwuu a ga-enwe na Berlin. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ puku bịara.

E nwekwara nsogbu mgbe a na-enwe nzukọ ọgbakọ. Ndị na-eme mkpọtụ na-abịa nanị iji tie mkpu ma fụọ opi. N’otu oge ọ fọrọ ntakịrị ka a manye anyị ịkwụsị okwu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ekwu. Ndị nta akụkọ kpọrọ anyị ndị na-ebu amụma banyere ọdachi. Isiokwu ndị dị n’akwụkwọ akụkọ kwuru ọbụna na anyị ezukọwo n’elu ugwu ebe anyị nọ na-echere ka a kpọga anyị n’igwe ojii. Akwụkwọ akụkọ ndị ahụ hotara ụfọdụ ụmụ agbọghọ dị ka ndị na-ekwu na Ndịàmà nwara iso ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ. A sụgharịrị nkọwa ahụ bụ na ‘ndị ahụ na-arara onwe ha nye Jehova ga-enweta ndụ ebighị ebi’ isi ikwu na ndị ahụ na-eso Ndịàmà enwe mmekọahụ ga-enweta ndụ ebighị ebi.

Mgbe e mesịrị e bokwara anyị ebubo nke ịbụ ndị na-ekwukarị okwu banyere agha. A kọwahiere ihe anyị kwuru banyere agha Chineke nke Amagedọn ịpụta na anyị na-agba ume inwe ịma aka n’ịkpụpụta ngwá agha na ịlụ agha. Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe nzuzu! Otú o sina dị, n’August 1950, mgbe m bịarutere maka ọrụ abalị m n’ebe a na-ebipụta akwụkwọ akụkọ obodo ahụ, bụ́ ebe m na-arụ ọrụ dị ka onye na-ebi akwụkwọ, a kwụsịrị m na geti. “A chụwo gị n’ọrụ,” ka onye nche ahụ kwuru, bụ́ onye ya na ndị uwe ojii so. “Unu na-akwado agha.”

N’ụlọ, Margit kudara ume. “Ịrụru ọrụ n’ime abalị agaghị adịkwa,” ka o kwuru. Anyị enweghị nchekasị ọ bụla. N’oge na-adịghị anya achọtara m ọrụ ọzọ. Anyị tụkwasịrị Chineke obi inye anyị ihe dị anyị mkpa, o mekwara otú ahụ.

A Machibidowo Ọrụ Anyị

N’August 31, 1950, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na German Democratic Republic. E jidere ọtụtụ ndị. E kpere Ndịàmà ikpe, a mara ụfọdụ ikpe ịnọ ná mkpọrọ ná ndụ ha nile. Ndị Kọmunist tụrụ mmadụ abụọ sitere Zittau mkpọrọ, bụ́ ndị tara ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ ndị dị n’okpuru ndị Nazi.

E jidere onye na-elekọta ọgbakọ anyị na nwunye ya. Ndị ahụ jidere ha hapụrụ ụmụ ha abụọ ka na-eto eto n’ụlọ nanị ha ilekọta onwe ha. Nne na nna ha ochie kpọrọ ụmụaka ahụ, taa ụmụntakịrị nwanyị abụọ ahụ na-anụkwa ọkụ n’obi n’ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke.

Ndị na-ebu akwụkwọ sitere n’ọgbakọ ndị dị na East Germany na-aga Berlin ma na-alọta iji bute akwụkwọ ndị dị n’ebe nkwasa akwụkwọ ndị e nwere n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ na-anọghị na nsogbu. E jidere ọtụtụ n’ime ndị a na-ebu akwụkwọ obi siri ike, kpụrụ ha gaa n’ụlọ ikpe, maakwa ha ikpe ịga mkpọrọ.

Ndị ọchịchị bịara n’otu isi ụtụtụ ịchọ ma o nwere ihe ha ga-enweta n’ụlọ anyị. Anyị atụwo anya na ha ga-abịa, ya mere etinyewo m ihe ndekọ nile nke ọgbakọ, bụ́ nke m na-ejide, n’ọba anyị, n’ebe dị nso n’ebe ụmụ ebu na-akpa akwụ ha. Ọ dịghị mgbe ụmụ ahụhụ ndị ahụ nyere m nsogbu, ma mgbe ndị ikom ahụ malitere ime nchọgharị ha, ebu ndị ahụ wakwasịrị ha na mberede. Nanị ihe ndị ikom ahụ pụrụ ime bụ ịgba ọsọ maka ndụ ha!

Jehova akwadebewo anyị maka mmachibido ahụ site ná mgbakọ ukwu ahụ e nwere na 1949. Usoro ihe omume ahụ agbawo anyị ume itinyekwu mgbalị n’ọmụmụ ihe onwe onye, ịbịa nzukọ, na ọrụ ime nkwusa anyị, tinyekwara ịdabere n’ebe ibe anyị nọ maka inweta nkwado na agbamume. Nke a nyeere anyị aka n’ezie ịnọgidesi ike n’ihe. Otú a, ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-akatọkarị anyị ma na-agwa anyị okwu ọjọọ, nke ahụ enyeghị anyị nsogbu ọ bụla.

Inwe Nzukọ n’Okpuru Mmachibido

Mgbe a machara ọkwa banyere mmachibido ahụ, esoro m Ndịàmà ibe m abụọ nwee nzukọ ịtụle ụzọ anyị ga-esi nọgide na-enwe nzukọ ọgbakọ. Ije nzukọ ndị ahụ dị ize ndụ, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịkpatara onye e jidere ka ọ nọ n’ebe ahụ ịga mkpọrọ. Anyị kpọtụụrụ Ndịàmà bi n’ógbè anyị. Ahụ erughị ụfọdụ ala, ma ọ bụ ihe na-agba ume na onye ọ bụla n’ime ha ghọtara mkpa ọ dị ịbịa nzukọ.

Otu onye nwere, bụ́ onye nwere ọba, wepụtara ya ka e jiri mee ihe dị ka ebe a na-enwe nzukọ. Ọ bụ ezie na ọ dị n’ubi, ebe mmadụ nile na-ahụ ya, ọba ahụ nwere ọnụ ụzọ dị n’ebe azụ nke chere ihu n’ọwara ụzọ ọhịa kpuchiri. Ya mere ọ dịghị onye hụrụ mgbe anyị ji abịa na mgbe anyị ji ala. N’oge oyi ahụ nile, ọba ahụ bụ ebe anyị na-enwe nzukọ site n’iji ọkụ kandụl, na-enwe ihe dị ka 20 ndị na-abịanụ. Anyị na-ezukọ kwa izu maka ọmụmụ nke magazin Ụlọ Nche na maka Nzukọ Ije Ozi. A haziri usoro ihe omume ahụ ikwekọ n’ọnọdụ anyị, na-emesi ya ike na anyị aghaghị ịnọgide na-arụsi ọrụ ike n’ụzọ ime mmụọ. N’oge na-adịghị anya anyị nwere obi ụtọ ịnabata nwoke ahụ nwere mmasị dị ka nwanna ọhụrụ anyị n’eziokwu.

N’etiti afọ ndị 1950, amamikpe nke ụlọ ikpe dịwanyere nro, a tọhapụkwara ụfọdụ ụmụnna anyị n’ụlọ mkpọrọ. A chụlagara ọtụtụ na West Germany. Nye m, ihe gbanwere na mberede mgbe otu nwanna si West Germany bịasịrị leta anyị.

Ọrụ Mbụ Bụ Isi M Nwetara

Nwanna ahụ sịrị na aha ya bụ Hans. Mgbe anyị nwesịrị nkwurịta okwu, a gwara m ka m gaa n’otu adres dị na Berlin. Mgbe m chọtara okwu ahụ e nyere m iji mata ebe m na-aga ka ọ dị na mgbịrịgba ụzọ, a kpọbatara m n’ime ụlọ. Mmadụ abụọ sonyeere m ma malite iso m nwee nkwurịta okwu na-enye obi ụtọ ma bụrụ nke metụtara ọtụtụ ihe. Mgbe ahụ ha kwuru ihe ha nọworo na-achọ ikwu: “Ọ bụrụ na e nye gị ọrụ pụrụ iche, ị̀ ga-anakwere ya?”

“Ee,” bụ azịza m.

“Ọ dị mma,” ka ha kwuru, “nke ahụ bụ nanị ihe anyị chọrọ ịma. Laa nke ọma.”

Mgbe izu atọ gasịrị, a gwara m ka m laghachi na Berlin, ọzọkwa enwetara m onwe m n’ime ụlọ ahụ. N’inyefe m otu map e sere ógbè ndị dị na Zittau, ụmụnna ahụ gwara m ihe mere ha ji sị m bịa. “Ọ dịghị otú anyị si ezigara Ndịàmà nọ n’ógbè nke a ozi. Ị̀ pụrụ ime ka anyị nwee ike izigara ha ozi?”

“N’ezie m ga-eme otú ahụ,” bụ nzaghachi m nyere ha ozugbo. Ókèala ahụ buru ibu, ihe karịrị 100 kilomita n’ogologo, ma e site Riesa gaa Zittau, na ihe ruru 50 kilomita n’obosara. Nanị ihe m nwere bụkwa otu ịnyịnya ígwè. Mgbe e guzobesịrị ụzọ a pụrụ isi zigara Ndịàmà n’otu n’otu ozi, e mere ka onye ọ bụla sonye n’ọgbakọ nke ya, bụ́ nke na-eziga ndị nnọchianya mgbe nile gaa na Berlin ibute akwụkwọ na ịnata ndụmọdụ. Usoro ịrụ ọrụ nke a gbochiri itinye ọgbakọ ndị ọzọ n’ihe ize ndụ mgbe ndị isi ọchịchị na-akpagbu ọgbakọ ọ bụla.

Tụkwasị Jehova Obi

N’agbanyeghị mkpagbu ahụ, n’irube isi na ndụmọdụ nile nke Bible, ọ dịghị mgbe anyị kwụsịrị iji ozi banyere Alaeze Chineke na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 20:20) Anyị gara n’adres ebe ndị ndị maara anyị tụrụ aro ka anyị gaa, anyị nwetara ụfọdụ ahụmahụ ndị dị ịtụnanya. Mgbe ụfọdụ ọbụna njehie anyị gbanwere ghọọ ngọzi, dị ka ihe ndị a na-esonụ na-egosi.

E nyere mụ na nwunye m adres ebe anyị ga-eje mee nleta, ma anyị gara n’ụlọ nke na-abụghị ebe e nyere anyị. Mgbe ọnụ ụzọ ahụ mepere, anyị hụrụ otu uwe onye uwe ojii dị n’ebe a na-ekonye uwe. Ihu Margit gbanwere; obi mapụrụ m. Nke a pụrụ ịpụta ịga mkpọrọ. Mgbe ahụ bụ oge maka ikpe ekpere ọsọ ọsọ.

“Olee ndị unu bụ?” ka nwoke ahụ jụrụ na mkpirikpi. Anyị gbara nkịtị.

“Eji m n’aka na ọ dị ebe m matara gị,” ka Margit kwuru, “ma apụghị m icheta ebe ọ bụ. Ehe, ị bụ onye uwe ojii. Ọ ghaghị ịbụ na m hụrụ gị mgbe ị nọ n’ọrụ.”

Nke a nwere mmetụta dị jụụ, o wee jiri olu enyi jụọ, sị. “Ùnu bụ ndị Jehova?”

“Ee,” ka m tinyere ọnụ, “anyị bụ, ị ghaghị ikweta na anyị nwere obi ike ịkụ aka n’ọnụ ụzọ gị. Anyị nwere mmasị n’ebe gị onwe gị nọ.”

Ọ kpọbatara anyị n’ime ụlọ ya. Anyị jere na nke ya ọtụtụ mgbe ma malite ọmụmụ Bible. Mgbe oge na-aga nwoke a ghọrọ nwanna anyị bụ onye Kraịst. Lee ka ahụmahụ nke a si mesiwanye obi anyị tụkwasịrị na Jehova ike!

Ụmụnna nwanyị na-ejekarị ozi dị ka ndị na-ebu akwụkwọ, bụ́ nke na-eme ka ọ dị mkpa ha ịtụkwasị obi ha kpam kpam na Jehova. Otú ahụ ka o si mee mgbe Margit gara Berlin ibute akwụkwọ otu mgbe. E nwere ihe karịrị otú a tụrụ anya ya. E jiri ụdọ kee akpa ahụ e ji apịanye ákwà nke dị arọ ma jubiga ókè. Ihe nile gara nke ọma ruo mgbe Margit banyere n’ụgbọ okporo ígwè. Mgbe ahụ otu onye nche ókèala bịara.

“Ònye nwe ya, gịnịkwa dị n’ime ya?” ka ọ jụrụ, na-arụ aka n’ebe akpa ahụ e ji apịanye ákwà dị.

“Ọ bụ ákwà ndị m ga-asa asa,” ka Margit zaghachiri.

N’inyo ihe o kwuru enyo, o nyere ya iwu ka o mepee ya. N’iji nwayọọ ma marakwa ụma, site n’ịtọghe otu akpụ n’otu mgbe, Margit malitere ịtọghe ụdọ e kere gburugburu akpa ahụ. Ebe ọ bụ na ọrụ onye nche ókèala ahụ chọrọ ka o sonyere ụgbọ okporo ígwè ahụ ruo n’ebe ụfọdụ, mgbe ahụkwa rịtuo ma sonyere ụgbọ okporo ígwè ọzọ ná nlọta, o nweghị ike inwekwa ndidi. N’ikpeazụ, mgbe nanị akpụ atọ fọdụrụ, ike gwụrụ ya iche. “Si n’ebe a pụọ, burukwa ákwà ndị ahụ ị ga-asa!” ka o tiri ná mkpu.

Nlekọta Onwe Onye nke Jehova

Ọtụtụ mgbe adịghị m ehi ụra karịa hour anọ n’abalị, ebe ọ bụ na m na-arụkarị ọrụ ọgbakọ n’oge ọchịchịrị gbara. Ọ bụ mgbe otu abalị nke ịrụ ọrụ dị otú ahụ gasịrị ka ndị ọchịchị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị n’otu ụtụtụ. Ha bịara ịchọ ma ọ dị ihe ha ga-enweta. Oge agawo izo ihe ọ bụla.

Ndị ọfịsa ahụ ji ụtụtụ nile chọọ n’ebe nile ma ọ dị ihe ha ga-enweta, ọbụna na-enyocha ebe a na-eje mposi ka ọ ghara inwe ihe ọ bụla e zoro na ya. Ọ dịghị onye ọ bụla chere echiche inyocha uwe kootu m nke kosa n’ebe a na-ekonye uwe. Ejiwo m ọsọ ọsọ fọnye akwụkwọ dị iche iche n’ime ọtụtụ akpa dị na ya. Akpa ahụ koro afọ site n’ihe ndị ahụ ndị ọfịsa ahụ na-achọ, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ha ji laa.

N’otu oge ọzọ, n’August 1961, anọ m na Berlin. O mesịrị ghọọ mbute ikpeazụ m butere akwụkwọ tupu e wuo Mgbidi Berlin. Ọdụ ụgbọ okporo ígwè Berlin jupụtara ná ndị mmadụ ka m kwadebere ịlaghachi Zittau. Ụgbọ ahụ kwụsịrị, onye ọ bụla gbagara n’ebe ahụ a na-anọ echere ụgbọ ịbanye n’ụgbọ. N’ịbụ onye ìgwè mmadụ ahụ kwagharịrị, achọtara m onwe m na mberede n’akụkụ ụgbọ ahụ nke mmadụ na-anọghị na ya. Ozugbo m banyere n’ụgbọ ahụ, onye nche kpọchiri ọnụ ụzọ ndị ahụ site n’ézì. Eguzoro m nanị m n’otu nkebi nke ụgbọ ahụ, ebe a kpọbara ndị njem ndị ọzọ na nkebi ụgbọ ndị ọzọ nke ụgbọ ahụ.

Anyị gawara Zittau. Ruo oge ụfọdụ, anọ m nanị m n’ụgbọ ahụ. Mgbe ahụ ụgbọ okporo ígwè ahụ kwụsịrị, e mepere ọnụ ụzọ ndị dị na nkebi nke m nọ na ya. Ọtụtụ ndị agha Soviet batara. Ọ bụ mgbe ahụ ka m matara na ebe m nọ bụ na nkebi nke a hapụrụ ndị agha Soviet. Ọ dị m ka ya bụrụ na ala ga-emepe ma loo m. Ma, o yighị ka ndị agha ahụ achọpụtara ihe gahierenụ.

Anyị malitekwara njem ahụ ruo Zittau, bụ́ ebe e mepere ọnụ ụzọ nke nkebi ụgbọ anyị, ndị agha ahụ wee wụtusịa. Ha malitere inyocha ndị njem ahụ nile nọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ. Nanị m bụ onye a na-akpaghị aka. Ọtụtụ ndị agha ahụ gbuchapụụrụ m ekele, na-eche na m bụ onye ọfịsa nọ n’ọkwá dị elu.

Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị ka anyị matara oké uru akwụkwọ ndị ahụ bara, n’ihi owuwu e wuru Mgbidi Berlin mechiri ụzọ anyị si ebubata ihe ruo nwa oge. Ma, akwụkwọ ahụ zuru iji gboo mkpa anyị ruo ọtụtụ ọnwa. Ka ọ dị mgbe ahụ, a pụrụ ime ndokwa ịnọgide na-ezitere anyị ozi.

Mmalite nke Mgbidi Berlin na 1961 wetaara anyị mgbanwe dị iche iche na East Germany. Ma Jehova, dị ka ọ na-eme mgbe nile, matara ihe na-achọ ime. Ọ nọgidere na-elekọta anyị n’okpuru mmachibido.—Dị ka Hermann Laube si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 27]

Anyị nwere otu obere mgbakọ na Bautzen

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya