Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 6/1 p. 20-24
  • Jehova Nọnyeere M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Nọnyeere M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịsụ Ụzọ na Netherlands
  • Ihe Ùgwù Ndị Ọzọ
  • N’okpuru Ọchịchị Ndị Nazi
  • Ụlọ Nga na Ogige Ịta Ahụhụ Dị Iche Iche
  • Ihe Omume Ka Agha Gasịrị
  • Ọ Dịghị Ihe Ka Eziokwu ahụ Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Iji Ndidi Na-echere Jehova Site Na Nwata M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “O, Okwukwe nke Na-agaghị Ada Ada”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Obi Dị M Ụtọ na m Na-ejere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ule Ndị Bịaara M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 6/1 p. 20-24

Jehova Nọnyeere M

Dị Ka Max Henning Si Kọọ

Ọ bụ 1933, Adolf Hitler ka batasịkwara n’ọchịchị na Germany. Otú ọ dị, ihe dị ka 500 Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè Berlin enweghị obi abụọ. Ọtụtụ ndị na-eto eto ghọrọ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, ụfọdụ ọbụna nakwerekwaara ọrụ gaa ná mba Europe ndị ọzọ. Mụ na enyi m bụ́ Werner Flatten na-ajụkarị ibe anyị, sị: “Gịnị mere anyị ji nọrọ nnọọ nkịtị, na-etufu oge anyị? Gịnị mere na anyị agaghị apụ ma sụọ ụzọ?”

ỤBỌCHỊ asatọ ka a mụsịrị m na 1909, abanyere m n’okpuru nlekọta nke nne na nna na-ahụ n’anya ndị kuchiri m. Na 1918 oké ihe mwute dakwasịrị ezinụlọ anyị mgbe obere nwanne m nwanyị ọ na-abụghị otu nne na nna ji mụ na ya nwụrụ na mberede. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, kpọtụrụ n’ọnụ ụzọ anyị, obi nke nne na nna kuchiri m mepekwara nnọọ ịnakwere eziokwu Bible. Ha kụzikwaara m inwe mmasị n’ihe ime mmụọ.

Etinyere m uche m n’agụmakwụkwọ m wee ghọọ onye ọrụ okporo ígwè mmiri. Ma nke ka mkpa, eweere m nguzo m n’ụzọ ime mmụọ. Mụ na Werner malitere ịsụ ụzọ na May 5, 1933. Anyị ga-eji ịnyịnya ígwè gaa n’obodo dị ihe dị ka 100 kilomita site na Berlin, bụ́ ebe anyị ga-anọrọ ma mee nkwusa ruo izu abụọ. Anyị na-alọtazi na Berlin iji lekọta ihe ndị dị mkpa. Mgbe e mesịrị anyị na-alaghachi n’ókèala anyị na-eme nkwusa na ya nọrọ ruo izu abụọ ọzọ.

Anyị tinyere akwụkwọ maka ije ozi ná mba ọzọ, na December 1933 anyị natakwara ọrụ ịga n’ebe bụ Yugoslavia n’oge ahụ. Otú ọ dị, tupu anyị enwee ike ịgawa, a gbanwere ọrụ anyị gaa na Utrecht dị na Netherlands. Ntakịrị oge ka e mesịrị, e mere m baptism. N’oge ahụ a dịghị emesikarị ime baptism ike; ọ bụ ozi ahụ bụ ihe dị mkpa. Ugbu a ịdabere n’ebe Jehova nọ ghọrọ ihe a na-ahụ mgbe nile ná ndụ m. Achọtara m nkasi obi dị ukwuu n’okwu onye so bụọ abụ n’ime Bible: “Lee, Chineke bụ onye na-enyere m aka: Onyenwe anyị nọ n’etiti ndị na-akwagide mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 54:4.

Ịsụ Ụzọ na Netherlands

N’oge na-adịghị anya ka anyị rutesịrị Netherlands, e kenyegharịrị anyị ọrụ n’obodo ukwu bụ́ Rotterdam. Nna na nwa nwoke nọ n’ezinụlọ anyị binyeere bụkwa ndị ọsụ ụzọ. Ọnwa ole na ole n’ihu, a zụtara otu nnukwute ụlọ na Leersum, obodo na-adịghị anya site na Utrecht, dị ka ebe obibi maka ndị ọsụ ụzọ, mụ na Werner kwafekwara ebe ahụ.

Ka anyị na-ebi n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ ahụ, anyị ji ịnyịnya ígwè gaa n’ókèala ndị dị nso, jirikwa ụgbọ ala na-ebu mmadụ asaa gaa ókèala ndị dị anya karị. N’oge ahụ, e nwere nanị otu narị Ndịàmà na Netherlands nile. Taa, 60 afọ n’ihu, ókèala ahụ anyị si n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ ahụ rụọ ọrụ na ya nwere ihe karịrị 4,000 ndị nkwusa n’ihe dị ka 50 ọgbakọ!

Anyị rụsiri ọrụ ike, ihe ruru hour 14 n’ozi ahụ kwa ụbọchị, nke ahụ mekwara ka obi na-adị anyị ụtọ. Nzube bụ isi bụ itinye ọtụtụ akwụkwọ ruo n’ókè o kwere mee. Ọtụtụ mgbe anyị na-ahapụrụ ndị nwere mmasị ihe karịrị otu narị akwụkwọ nta n’otu ụbọchị. Ime nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible esonyebeghị n’ihe anyị na-emechi anya n’oge ahụ.

Otu ụbọchị mụ na onye òtù m nọ na-arụ ọrụ n’obodo Vreeswijk. Ka ọ na-agbara otu nwoke nọ n’ọnụ ụzọ ámá nke ogige e wusiri ike nke ndị agha àmà, ejiri m oge ahụ gụọ Bible m. E ji akara ọbara ọbara na nke anụnụ anụnụ kaa akara n’ime ya n’ụzọ pụtara ìhè. Ka e mesịrị, otu onye kapịnta onye nọrịị na-arụ ọrụ n’elu ụlọ dị nso dọrọ nwoke ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ámá ahụ aka ná ntị na m bụ onye nledo ma eleghị anya. Dị ka ihe si na ya pụta, e jidere m otu ụbọchị ahụ ka m na-agbara otu onye nwere ụlọ ahịa àmà, e jichikwara Bible m.

A kpụpụrụ m ụlọikpe. N’ebe ahụ e boro m ebubo na akara ndị ahụ dị n’ime Bible m bụ mgbalị ndị m mere ise ogige ahụ e wusiri ike. A mara m ikpe, ọkàikpe ahụ tụkwara m nga afọ abụọ. Otú ọ dị, etinyere m akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, a tọhapụkwara m. Lee ka m si nwee obi ụtọ inwere onwe m, ma obi dị m ụtọ ọbụna karị mgbe e weghachiiri m Bible m na ihe nile e dere n’ime ya!

N’oge okpomọkụ nke 1936, mụ na Richard Brauning, bụ́ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ bi n’ebe obibi ahụ, jiri oge okpomọkụ mee nkwusa n’ebe ugwu nke mba ahụ. N’ọnwa nke mbụ, anyị tinyere 240 hour n’ozi ma tinye ọnụ ọgụgụ akwụkwọ dị ukwuu. Anyị biri n’ụlọ ntu ma lekọta mkpa nile nke onwe anyị, na-asara onwe anyị ákwà, na-esiri onwe anyị nri, na ihe ndị ọzọ.

Ka e mesịrị e wefere m n’ụgbọ mmiri ahụ aha ya bụ Lightbearer, nke ghọrọ nke a ma ama n’ebe ugwu nke Netherlands. Ndị ọsụ ụzọ ise bi n’ụgbọ mmiri ahụ, sitekwa n’ime ya anyị nwere ike iru ọtụtụ ókèala dịpụrụ adịpụ.

Ihe Ùgwù Ndị Ọzọ

Na 1938, e kenyere m ọrụ ịbụ ohu zonu, dị ka a na-akpọ ndị nlekọta sekit nke Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ya mere ahapụrụ m Lightbearer ahụ wee malite ileta ọgbakọ dị iche iche na Ndịàmà bipụrụ iche ndị nọ n’ógbè ndịda atọ.

Ịnyịnya ígwè agwụla ihe anyị ji eme njem. Ọtụtụ mgbe ọ na-ewecha otu ụbọchị isite n’otu ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè ndị nwere mmasị gaa n’ọzọ. Breda, bụ́ ebe m bi ugbu a, so n’obodo ukwu ndị m letara. N’oge ahụ, Breda enweghị ọgbakọ ọ bụla, nweekwa nanị otu di na nwunye meworo agadi bụ́ Ndịàmà.

Ka m nọ na-eleta ụmụnna nọ na Limburg, a kpọrọ m òkù ịza ọtụtụ ajụjụ nke otu onye na-arụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ihe, onye aha ya bụ Johan Pieper, jụrụ. O weere nguzo siri ike maka eziokwu Bible ma ghọọ onye nkwusa nwere obi ike. Afọ anọ n’ihu o nwetara onwe ya n’ogige ịta ahụhụ, bụ́ ebe ọ nọrọ afọ atọ na ọkara. Mgbe a tọhapụsịrị ya o ji ịnụ ọkụ n’obi malitekwa ọrụ ime nkwusa ahụ ọzọ, taakwa ọ ka bụ onye okenye na-ekwesị ntụkwasị obi. Ntakịrị ọgbakọ ahụ dị na Limburg nke nwere Ndịàmà 12 etowo ugbu a ruo ọgbakọ 17 na-enwe ihe dị ka 1,550 ndị nkwusa!

N’okpuru Ọchịchị Ndị Nazi

Na May 1940 ndị Nazi wakporo Netherlands. Enwetara m ọrụ ịga n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị n’Amsterdam. Anyị aghaghị iji nlezianya dị ukwuu na-arụ ọrụ anyị, nke mere ka anyị ghọta ilu Bible ahụ bụ: “Ezi enyi . . . bụkwa nwanne a mụrụ maka mgbe e nwere ahụhụ.” (Ilu 17:17, NW) Nkekọ udo dị ụtọ nke dị n’oge a nke nrụgide nwere mmetụta miri emi n’uto ime mmụọ m, o jikekwaara m maka oge ndị ka sie ike n’ihu.

Ọrụ m bụ ilekọta mbuga akwụkwọ n’ọgbakọ dị iche iche, nke ọ bụ ndị na-ebu ozi na-ebukarị. Ndị Gestapo nọgidere na-achọ ụmụ okorobịa ndị ga-arụ ọrụ na Germany dị ka ndị ọrụ e mere mmanye, ya mere anyị jiri ụmụnna nwanyị ndị Kraịst mee ihe dị ka ndị na-ebu ozi. Ka oge na-aga e si na The Hague zitere anyị Wilhelmina Bakker, bụ́ onye e ji Nonnie mara, akpọgakwara m ya ebe onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ anyị, bụ́ Arthur Winkler, zoro. Iji mee ka a ghara ịhụ m ngwa ngwa ruo n’ókè o kwere mee, ejiri m ejiji dị ka onye Netherlands na-akọ ugbo, yiri akpụkpọ ụkwụ osisi na ihe nile, wee jiri ụgbọ ala buru Nonnie gaa. Ka e mesịrị anụrụ m na o dilighị ịchị ọchị, ebe ọ bụ na o chere na a ga-ahụ m nnọọ ngwa ngwa.

N’October 21, 1941, a gbaara ndị iro àmà ebe a na-akwasa akwụkwọ na akwụkwọ e ji ebi akwụkwọ n’Amsterdam. N’oge mwakpo ndị Gestapo, e jidere Winkler na Nonnie. Mgbe a tụkpuru ha n’ụlọ nga, ha nụchatara ka ndị Gestapo abụọ nọ na-ekwu otú ha siworo na-achụ “otu onye dị ntakịrị nke nwere ntutu ojii” bụ́ onye ha na-enwekwaghị ike ịchụso n’okporo ámá ahụ jupụtara ná mmadụ. O doro anya na ha na-ekwu maka m, ya mere Winkler jisiri ike zigara ụmụnna ozi. Ozugbo, a kpọfere m na The Hague.

Ka ọ dịgodị n’oge ahụ a tọhapụrụ Nonnie n’ụlọ nga, ọ laghachitekwara The Hague ịsụ ụzọ. Ezutekwara m ya ọzọ n’ebe ahụ. Ma mgbe e jidere ohu ọgbakọ nọ na Rotterdam, e zigara m ije nọchie ya. Ka e mesịrị, e jidere ohu ọgbakọ nọ n’Ọgbakọ Gouda, a kpọfekwara m ebe ahụ ije nọchie ya. N’ikpeazụ, na March 29, 1943, e jidere m. Ka m nọ na-eleru akwụkwọ ndị e ji amụ Bible anyị nwere anya ịmata otú ha dị, ndị Gestapo wakporo m na mberede.

E wezụga akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị a tụsasịrị n’elu table, e nwekwara ndepụta nke aha ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Kraịst, ọ bụ ezie na e dere aha ndị a n’okwu ndebiri. Ná mwute, ekpere m ekpere ka Jehova nye m ụzọ isi chebe ndị ahụ ka nweere onwe ha ime nkwusa. N’ahụghị m, ejisiri m ike tụkwasị aka m ghere oghe n’elu ndepụta aha ndị ahụ ma hịkọọ ya n’ime ọbọ aka m. Mgbe ahụ arịọrọ m ka e nye m ikike ije n’ụlọ mposi, bụ́ ebe m gweriri ihe ndepụta ahụ ma jiri mmiri wụdaa ya.

Mgbe m nọ n’ihe isi ike ndị dị otú ahụ, amụtara m inweta ume site ná mmeso Jehova mesoro ndị ya n’oge gara aga na site ná nkwa ya nile maka nnapụta. Otu mmesi obi ike sitere n’ike mmụọ nsọ nke nọgidesiworo ike n’ime obi m bụ nke a: “A sị na ọ bụghị Jehova Nke dịịrị anyị, mgbe mmadụ biliri imegide anyị: mgbe ahụ ha ga-eloworị anyị ná ndụ.”—Abụ Ọma 124:2, 3.

Ụlọ Nga na Ogige Ịta Ahụhụ Dị Iche Iche

A kpụgara m n’ụlọ nga dị na Rotterdam, bụ́ ebe m nwere ekele inwe Bible m. Ejikwa m akwụkwọ bụ́ Salvation, akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ bụ́ Children, na oge dị ukwuu ịgụ akwụkwọ a nile. Mgbe ọnwa isii gasịrị adara m oké ọrịa, aghaghịkwa m ịga ụlọ ọgwụ. Tupu m hapụ ụlọ nga, ezoro m akwụkwọ ahụ n’okpuru mataras m. Ka e mesịrị, anụrụ m na a kpọfetere Onyeàmà ọzọ, bụ́ Piet Broertjes, n’ọnụ ụlọ nga m, ọ chọtakwara ya. Otú a a nọgidere jiri akwụkwọ ahụ na-eme ihe iji wusie ndị ọzọ ike n’okwukwe.

Mgbe m gbakere a kpọfere m n’ụlọ nga dị na The Hague. Ka m nọ n’ebe ahụ, ezutere m Leo C. van der Tas, bụ́ nwa akwụkwọ na-amụ iwu bụ́ onye nọ n’ụlọ nga n’ihi iguzogide mweghara nke ndị Nazi. Ọ nụtụbeghị maka Ndịàmà Jehova, enwekwara m ohere ịgbara ya àmà. Mgbe ụfọdụ ọ ga-akpọte m n’etiti abalị ma jụọ ajụjụ dị iche iche. O zochilighị mmasị o nwere n’ebe Ndịàmà nọ, karịsịa mgbe ọ nụsịrị na a pụrụ ịtọhapụ anyị ma ọ bụrụ nanị na anyị ga-abịanye aka n’otu akwụkwọ na-ajụ okwukwe anyị. Mgbe agha ahụ kwụsịrị, Leo ghọrọ onye ọkàiwu ma lụọrọ Watch Tower Society ọtụtụ ọgụ okwu ikpe ndị metụtara nnwere onwe ife ofufe.

N’April 29, 1944, e tinyere m n’ụgbọ okporo ígwè maka njem nhụsianya were ụbọchị 18 gaa Germany. Na May 18 e mechibidoro m ọnụ ụzọ ámá nile nke ogige ịta ahụhụ Buchenwald. Ruo mgbe Ndị Agha Jikọrọ Aka tọhapụrụ anyị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’ihu, ndụ jọrọ oké njọ n’ụdị a na-apụghị iji ọnụ kọọ. Ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ, ọtụtụ nwụrụ n’ihu anyị. Ebe m jụrụ ịrụ ọrụ n’ụlọ mmepụta ihe dị nso nke na-emepụta ihe agha, e kenyere m ịrụ ọrụ n’ebe mmiri ọjọọ si agbapụ.

Otu ụbọchị a tụrụ bọmbụ n’ụlọ mmepụta ihe ahụ. Ọtụtụ ndị gbagara n’ogige ebe obibi ndị ahụ maka nchebe, ebe ndị ọzọ gbabara n’ime ọhịa. Bọmbụ ndị hiere ụzọ tụtara ogige ebe obibi ahụ, bọmbụ ndị na-amụnye ihe ọkụ mụnyere ọkụ n’ọhịa ahụ. Ọ dị egwu! A gbara ọtụtụ ndị ọkụ ná ndụ! Achọtawo m ebe nzopụ nke na-adịghị ize ndụ, mgbe ọkụ ahụ belatakwara, agafetara m ọtụtụ ozu mmadụ ka m na-alaghachi n’ogige ahụ.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ taa maara banyere ihe ọjọọ nile nke Oké Mgbukpọ nke ndị Nazi. Ana m ekele Jehova na o wusiri ikike iche echiche m ike, nke na ihe ọjọọ ndị m hụrụ emejupụtabeghị uche m n’afọ ndị gafeworonụ. Mgbe m chere echiche banyere oge m gara nga, mmetụta m na-enwekarịsị bụ ọṅụ n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’iji nye aha ya otuto.—Abụ Ọma 124:6-8.

Ihe Omume Ka Agha Gasịrị

Mgbe ntọhapụ na nlọta m n’Amsterdam gasịrị, ejere m kpọmkwem n’alaka ụlọ ọrụ maka iketa ọrụ. Ọ dị m ọkụ n’obi ka a kọọrọ m ihe ndị mere n’oge m na-anọghị ya. Nonnie arụwalarị ọrụ n’ebe ahụ. N’afọ ikpeazụ nke agha ahụ, o jewo ozi dị ka onye na-ebu ozi, na-ebugara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. E jidebeghịkwa ya ọzọ, ọ bụ ezie na o jisi ike lanarị ọtụtụ mgbe.

Asụtụrụ m ụzọ oge m nọ Haarlem, ma na 1946, a gwara m ka m jee n’alaka dị n’Amsterdam ịrụ ọrụ na Ngalaba Mbupụ Akwụkwọ. Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke 1948, mụ na Nonnie lụrụ di na nwunye, anyị hapụkwara alaka ụlọ ọrụ ahụ maka ije sụkọọ ụzọ. Ebe e kenyere anyị ịsụ ụzọ bụ n’Assen. Afọ 12 tupu mgbe ahụ mụ na Richard Brauning anọọla ebe ahụ n’oge okpomọkụ, na-ebi n’ụlọ ntu ma na-eme nkwusa. Anụrụ m na a gbagburu Richard ka a nọ na-eje n’otu ogige ịta ahụhụ.

O doro anya na oge ahụ m nọrọ n’ụlọ nga mebiri ahụ ike m. Afọ isii ka a tọhapụsịrị m na Buchenwald, ọrịa mere ka m dinara n’àkwà ọrịa ruo ọnwa anọ. Ọtụtụ afọ n’ihu, na 1957, arịara m ọrịa ụkwara nta ruo otu afọ zuru ezu. Otu mkpụrụ ike adịghị m n’ahụ, ma mmụọ m nke ịsụ ụzọ ka siri ike. N’oge m na-arịa ọrịa ejiri m ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji gbaa àmà. Eche m na mmụọ a nke ịsụ ụzọ bụ isi ihe dị mkpa mere ka m ghara ikwe ka ọrịa m nile mee ka m ghọọ onye ọrịa nọ nkịtị. Mụ na Nonnie kpebisiri ike ịnọgidesi ike n’ozi oge nile ruo ogologo oge ahụ ike anyị kwere anyị.

Mgbe m gbakechara, e kenyere anyị ọrụ n’obodo Breda. Nke a bụ 21 afọ mgbe m letasịrị obodo a nke mbụ ya dị ka ohu zonu. Mgbe anyị rutere na 1959, e nwere ntakịrị ọgbakọ nke nwere 34 Ndịàmà. Taa, 37 afọ n’ihu, o towo ghọọ ọgbakọ isii nke nwere ihe karịrị 500 Ndịàmà, bụ́ ndị na-ezukọta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ! Ná nzukọ na mgbakọ ndị anyị na-enwe n’ógbè anyị, anyị na-ahụ ọtụtụ ndị bịaworo nweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible n’ihi mgbalị anyị ụfọdụ. Ọtụtụ mgbe anyị na-enwe mmetụta yiri nke Jọn onyeozi mgbe o dere, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.

Anyị emeela agadi ugbu a. Adị m 86 afọ, Nonnie dịkwa 78, ma aghaghị m ikwu na ịsụ ụzọ bụ ọrụ dị mma. Kemgbe m nọ na Breda, emeriwo m ihe ka ukwuu ná nsogbu ahụ ike ndị m butere n’oge a tụrụ m nga. Enwewokwa m ọtụtụ afọ nke ịrụpụta ihe n’ozi Jehova.

Ileghachi anya azụ n’ọtụtụ afọ nke ozi mịrị mkpụrụ bụ ihe ọṅụ nye anyị abụọ. Ekpere anyị na-ekpe kwa ụbọchị bụ na Jehova ga-enye anyị mmụọ na ume iji nọgide n’ozi ya ruo ogologo oge anyị na-eku ume. N’obi ike, anyị ji okwu nke onye ọbụ abụ ahụ ekwupụta ihe dị anyị n’obi, sị: “Lee, Chineke bụ onye na-enyere m aka: Onyenwe anyị nọ n’etiti ndị na-akwagide mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 54:4.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ịkwụdebe ụlọ ntu e ji mee ihe ka anyị na-asụ ụzọ n’afọ ndị 1930

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụgbọ mmiri e ji mee ihe iji jeruo ókèala dịpụrụ adịpụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ịgba m ajụjụ ọnụ n’usoro ihe omume mgbakọ na 1957

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na nwunye m taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya