Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 4/15 p. 31
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enyemaka Maka Kọmitii Dị Iche Iche nke Òtù Na-achị Isi
  • Inye Òtù Na-achị Isi Nkwado n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Otú E Si Hazie Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Onyinye Jehova, “Ndị E Nyesịworo”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ònye Na-eduzi Ndị Chineke Taa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 4/15 p. 31

Ịma Ọkwa

Enyemaka Maka Kọmitii Dị Iche Iche nke Òtù Na-achị Isi

Ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị dị 12 n’ọnụ ọgụgụ ugbu a, nọgidere na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihe omume ha. Ha nọgidere na-ekele ndị so n’òtù ahụ na-anọgidesi ike n’ihe nke “oké ìgwè mmadụ” na-amụba amụba maka nkwado ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-enye. (Mkpughe 7:9, 15) N’ihi oké mmụba ahụ na-ewere ọnọdụ n’ụwa nile, o yiri ihe kwesịrị ekwesị ime ka Òtù Na-achị Isi nwekwuo ụfọdụ enyemaka. Ya mere e kpebiwo ịkpọ ọtụtụ ndị inyeaka, karịsịa site ná ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ikere òkè ná nzukọ nke Kọmitii ọ bụla nke Òtù Na-achị Isi, ya bụ, Kọmitii Ndị Ọrụ, Mbipụta, Ije Ozi, Izi Ihe, na Ide Ihe. Otú a, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ nke Kọmitii ọ bụla n’ime ndị a ga-amụba ruo asaa ma ọ bụ asatọ. N’okpuru nduzi nke ndị so na kọmitii Òtù Na-achị Isi, ndị enyemaka ndị a ga-ekere òkè ná nkwurịta okwu, ha ga-enwe ihe omume nke kọmitii ahụ ga-enye ha. Ndokwa ọhụrụ nke a ga-amalite ịdị irè na May 1, 1992.

Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, ọnụ ọgụgụ nke ihe fọdụrụ ná Ndịàmà e tere mmanụ anọwo na-atalata, ebe ọnụ ọgụgụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ mụbaworo karịa ihe anyị tụrụ anya ya nke ukwuu. (Aịsaịa 60:22) Lee ka anyị si na-enye Jehova ekele maka mmụba nke a mara mma! Mgbe e ji obi ekele nabata aha ọhụrụ ahụ, bụ́ Ndịàmà Jehova, na 1931, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa bụ 39,372, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na ha bụ ụmụnna Kraịst e tere mmanụ. (Aịsaịa 43:10-12; Ndị Hibru 2:11) Mgbe afọ iri isii gasịrị, na 1991, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa n’ụwa nile bụ 4,278,820, nke nanị 8,850 n’ime ya na-ekwu na ha bụ ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ. Dị ka a tụrụ anya site n’ìhè nke Akwụkwọ nsọ, ugbu a “oké ìgwè mmadụ” akarịwo ihe fọdụrụ nke “ìgwè atụrụ nta” n’ọnụ ọgụgụ site n’ihe karịrị 480 maka 1. (Luk 12:32; Mkpughe 7:4-9) N’ilekọta ọdịmma Alaeze ahụ nke na-amụba amụba, n’ezie ọ dị ihe ahụ fọdụrụ mkpa inweta nkwado na enyemaka nke oké ìgwè mmadụ ahụ, ha na-enwekwa ekele maka nke ahụ.

Dị ka a kọwara ná mbipụta nke a nke Ụlọ Nche, e nwere otu ìgwè nke na-eso Israel ime mmụọ na-eje ozi taa nke a pụrụ iji tụnyere ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn, bụ́ ndị sooro ihe fọdụrụ ná ndị Juu ahụ laghachi site ná ndọta n’agha nke Babilọn; ndị ahụ na-abụghị ndị Israel karịrị ọbụna ndị Livaị ahụ na-alaghachinụ n’ọnụ ọgụgụ. (Ezra 2:40-58; 8:15-20) “Ndị e nyesịworo” nọ n’etiti oké ìgwè mmadụ nke oge a bụ ndị Kraịst tozuru okè, ndị nweworo ahụmahụ buru ibu n’ihi ịrụ ọrụ nlekọta n’alaka dị iche iche, n’ọrụ njegharị, nakwa n’ime 66,000 ọgbakọ ndị e guzobeworo ugbu a n’akụkụ nile nke ụwa.

N’oge na-adịbeghị anya gara aga, e nwere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na gburugburu ụwa maka inye ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi na-enyere ha aka ntụziaka. Na United States nanị, 59,420 ndị nlekọta bịara. E si otú a nye “ndị okenye” ndị a ngwá ọrụ iji rụzuo ibu ọrụ ha n’ụzọ dị irè karị.—1 Pita 5:1-3; tụlee Ndị Efesọs 4:8, 11.

N’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, ụfọdụ “ndị e nyesịworo” ejewo ozi ruo ọtụtụ afọ. Ndị a gụnyere ndị nlekọta tozuru okè site n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị nwetaworo ọtụtụ ike ọrụ na ahụmahụ. Otú a, Òtù Na-achị Isi ahọpụtawo ole na ole n’ime ndị nlekọta dị otú ahụ inye aka ná nzukọ nke kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi. Ndị a abụghị kpọmkwem ndị ikom nwere akụkọ ije ozi ndị kasị dị anya. Kama nke ahụ, ha bụ ndị ikom tozuru okè, nwee ahụmahụ, na-enwe iru eru ndị mere ka ha kwesị ekwesị inye aka n’ihe omume ụfọdụ. Nkenye e kenyere ha isoro otu kọmitii na-arụ ọrụ adịghị eme ka ha nọrọ n’ọkwá pụrụ iche. Dị ka Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, “unu nile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Otú ọ dị, a ga-atụkwasị ọtụtụ ihe n’aka ndị ikom ndị a, dịkwa ka ihe ga-esi na nke ahụ pụta, “a ga-achọkwa ihe ukwu” n’aka ha.—Luk 12:48.

Anyị na-enwe ọṅụ n’ọganihu nke ọgbakọ Jehova taa. N’ime afọ iri ndị gaworo aga, e nwewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmụba nke 100 pasentị n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ na-eje ozi n’ubi, n’ikwekọ n’amụma ahụ e buru banyere Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst: “Ịba ụba nke ọchịchị ya na udo agaghị enwe ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 9:7, King James Version) N’otu ụzọ ahụ ndị Netinim ji sonyere ndị nchụàjà rụọ ọrụ n’idozi mgbidi nke Jerusalem, otú ahụkwa taa amụma ahụ e buru banyere ọgbakọ Jehova na-emezu: “Ụmụ ala ọzọ ga-ewukwa mgbidi gị nile.” (Aịsaịa 60:10; Nehemaịa 3:22, 26) E kwesịrị ịja ndị Netinim nke oge a mma maka ịnụ ọkụ n’obi ha na-egosipụta n’iwulite ezi ofufe, na-enyere “ndị nchụàjà nke Jehova” aka n’ọrụ ma ọ bụ n’ozi ọ bụla a pụrụ ikenye ha n’ọgbakọ Jehova nke zuru ụwa ọnụ.—Aịsaịa 61:5, 6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya