Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 4/15 p. 12-17
  • Onyinye Jehova, “Ndị E Nyesịworo”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onyinye Jehova, “Ndị E Nyesịworo”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Israel Esi Babilọn Lata
  • Ndị Na-abụghị Ndị Israel Alatakwa
  • Ihe Yiri Ya n’Oge A
  • Ndị E Nyeworo Maka Ije Ozi Pụrụ Iche
  • Iwepụta Onwe Anyị Taa
  • Ịma Ọkwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Israel nke Chineke” na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị Na-ebikọ ‘n’Ala’ E Weghachiri Eweghachi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 4/15 p. 12-17

Onyinye Jehova, “Ndị E Nyesịworo”

“Ndị ala ọzọ ga-eguzo na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu.”—AỊSAỊA 61:5.

1. N’ihi gịnị ka okwu ahụ bụ “onye na-enye ihe” ga-eji mee ka Jehova bata n’uche anyị?

LEE ụdị onye na-emesapụ aka n’inye ihe     Chineke bụ! Pọl onyeozi kwuru, sị:      “[Jehova] onwe ya na-enye mmadụ nile ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ irite uru site n’ịtụgharị uche n’ọtụtụ ‘ezi onyinye na ihe e nyere enye zuru okè’ ndị anyị na-anata site n’aka Chineke.—Jemes 1:5, 17; Abụ Ọma 29:11; Matiu 7:7; 10:19; 13:12; 21:43.

2, 3. (a) Olee ụzọ anyị kwesịrị isi nara onyinye nile nke Chineke? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị Livaị bụ ndị “e nyesịworo”?

2 Ọ bụ ezi ihe mere onye ọbụ abụ ahụ ji tụgharịa uche n’ụzọ ọ pụrụ isi kwụghachi Jehova ụgwọ. (Abụ Ọma 116:12) Onye Okike anyị anọghị ná mkpa nke ihe ọ bụla ụmụ mmadụ pụrụ inwe ma ọ bụ ihe ha pụrụ inye. (Abụ Ọma 50:10, 12) Otú ọ dị, Jehova na-egosi na ọ na-atọ ya ụtọ mgbe ndị mmadụ ji obi ekele na-enye onwe ha n’ezi ofufe. (Tụlee Ndị Hibru 10:5-7.) Mmadụ nile kwesịrị ịrara onwe ha nye Onye Okike ha bụ́ onye, n’aka nke ya, pụrụ inyekwu ha ihe ùgwù, dị ka ọ dị n’ọnọdụ ndị Livaị oge ochie. Ọ bụ ezie na a raara ndị Israel nile nye Chineke, ọ họọrọ ezinụlọ ndị Livaị nke Erọn dị ka ndị nchụàjà ịchụ àjà n’ụlọ ikwuu na n’ụlọ nsọ. Gịnị banyere ndị Livaị ndị ọzọ?

3 Jehova gwara Mosis, sị: “Mee ka ebo Livaị bịaruo nso . . . Ha ga-edebekwa ihe nile nke ụlọ ikwuu nzute . . . Ị ga-ewerekwa ndị Livaị nye Erọn, nyekwa ụmụ ya ndị ikom: ndị e nyesịworo [Hibru, nethu·nimʹ], ya ha nile site n’etiti ụmụ Israel ka ha bụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 3:6, 8, 9, 41) Ndị Livaị bụ ndị ‘e nyeworo’ Erọn ịrụ ọrụ ndị dị n’ije ozi n’ụlọ ikwuu, nke na Chineke pụrụ ikwu, sị: “Ndị enyesịworo m ha nile ka ha bụ site n’etiti ụmụ Israel.” (Ọnụ Ọgụgụ 8:16, 19; 18:6) Ụfọdụ ndị Livaị rụrụ ọrụ ndị dị mfe; ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù pụrụ iche, dị ka ịkụzi iwu Chineke. (Ọnụ Ọgụgụ 1:50, 51; 1 Ihe Emere 6:48; 23:3, 4, 24-32; 2 Ihe Emere 35:3-5) Ugbu a ka anyị tụlee ihe banyere ndị ọzọ ‘e nyeworo’ nakwa ihe yiri ya n’oge a.

Ndị Israel Esi Babilọn Lata

4, 5. (a) Olee ndị Israel si ná ndọta n’agha na Babilọn laghachi? (b) N’oge a, gịnị nọchiri anya ndị Israel isi ná ndọta n’agha laghachi?

4 Ezra na Nehemaịa kọrọ ụzọ ihe fọdụrụ n’ụmụ Israel, bụ́ ndị Onye Ọchịchị bụ́ Zerubabel bụ onye ndú ha, si si Babilọn lata n’ala ha, iweghachi ezi ofufe. Ihe ndekọ abụọ ahụ kọrọ na ndị a latara alata ruru 42,360. Ọtụtụ puku n’ime ọnụ ọgụgụ ahụ bụ “ndị ikom nke ndị Israel.” Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu idepụta ndị nchụàjà. Mgbe ahụ e nwere 350 ndị Livaị, gụnyere ndị na-abụ abụ na ndị nche ọnụ ụzọ ama bụ́ ndị Livaị. Ezra na Nehemaịa dekwara banyere ọtụtụ puku ndị ọzọ, ndị yiri ka hà bụ ndị Israel, ma eleghị anya ọbụna ndị nchụàjà, ma bụrụ ndị na-apụghị ịnwapụta usoro ọmụmụ ha.—Ezra 1:1, 2; 2:2-42, 59-64; Nehemaịa 7:7-45, 61-66.

5 Ihe a fọdụrụ nke Israel a dọọrọ laa n’agha ma bụrụ ndị mesịrị laghachi Jerusalem na Juda gosipụtara nrara pụrụ iche nye Chineke na ịdị uchu miri emi n’ebe ezi ofufe dị. Dị ka a rịbaworo ama, anyị na-ahụ ihe yiri ya nke ọma n’ebe ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ nọ, bụ́ ndị si ná ndọta n’agha gaa na Babilọn Ukwu ahụ pụta na 1919.

6. Olee otú Chineke siworo jiri ndị Israel ime mmụọ mee ihe n’oge anyị a?

6 Kemgbe a tọhapụrụ ha na 1919, ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu n’ezi ofufe. Jehova agọziwo mgbalị ha ịchịkọta ndị ikpeazụ nke 144,000 ahụ mejupụtara “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16; Mkpughe 7:3, 4) Dị ka otu òtù, ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ mejupụtara òtù “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke e ji eme ihe iwepụta ụba nke nri ime mmụọ na-enye ndụ, nke ha rụsiworo ọrụ ike ikesa n’ụwa nile.—Matiu 24:45-47.

7. Olee ndị na-esonyere ndị e tere mmanụ n’ezi ofufe?

7 Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ gosiri, ugbu a ndị Jehova gụnyere ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị nwere olileanya ahụ Chineke nyeworo nke ịgabiga oké mkpagbu ahụ ka dị nnọọ n’ihu. Ha nwere ọchịchọ ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi n’elu ụwa, bụ́ ebe ha na-agaghị anọ n’agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ ọzọ, ebe anya mmiri nke iru újú na-agaghịkwa agba ha ọzọ. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9-17; 21:3-5) Ànyị na-ahụta n’ihe ndekọ ahụ nke ndị si Babilọn laghachi ihe ọ bụla nke yiri ndị dị otú ahụ? Ee!

Ndị Na-abụghị Ndị Israel Alatakwa

8. Olee ndị sonyeere ndị Israel ahụ si Babilọn na-alaghachi?

8 Mgbe ahụ a kpọrọ òkù ka ndị hụrụ Jehova n’anya nọ na Babilọn lata n’Ala Nkwa ahụ, ọtụtụ puku ndị na-abụghị ndị Israel zara òkù ahụ. N’ihe ndepụta ahụ nke Ezra na Nehemaịa wepụtara, anyị na-agụ banyere “Netinim” (nke pụtara, “Ndị E Nyesịworo”) na “ụmụ ndị ohu Solomọn,” bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha e jikọrọ ọnụ bụ 392. Ihe ndekọ ahụ hotakwara ihe karịrị 7,500 ndị ọzọ: ‘ohu ndị ikom na ohu ndị inyom,’ tinyekwara “ndị ikom na-abụ abụ na ndị inyom na-abụ abụ” bụ́ ndị na-abụghị ndị Livaị. (Ezra 2:43-58, 65; Nehemaịa 7:46-60, 67) Gịnị kpaliri ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Israel ịlaghachi?

9. Olee otú mmụọ Chineke si kere òkè n’ọlịla ahụ e si ná ndọta n’agha laghachi?

9 Ezra 1:5 na-ekwu banyere ‘onye ọ bụla Chineke kpọtere mmụọ ya ibili iwu ụlọ Jehova.’ Ee, Jehova kpaliri ndị ahụ nile laghachirinụ. Ọ kwaliri mmụọ ha, ya bụ, echiche uche nke na-akpali ha ime ihe. Ọbụna site n’eluigwe, Chineke pụrụ ime nke a site n’iji mmụọ nsọ ya, bụ́ ike ọrụ ya. Otú a, ndị nile biliri “iwu ụlọ Jehova” bụ ndị e nyeere aka “site na mmụọ [Chineke].”—Zekaraịa 4:1, 6; Hagaị 1:14.

Ihe Yiri Ya n’Oge A

10, 11. Gịnị yiri ndị ahụ na-abụghị ndị Israel si na Babilọn laghachi?

10 Olee ndị ka ndị ahụ na-abụghị ndị Israel so laghachi sere onyinyo ha? Ọtụtụ ndị Kraịst pụrụ ịzaghachi, sị: ‘Ndị Netinim nọchiri anya “atụrụ ọzọ” ahụ taa.’ Nke ahụ bụ eziokwu, ma ọ bụghị nanị ndị Netinim; n’ihi na ndị nile na-abụghị ndị Israel so laghachi nọchiri anya ndị Kraịst taa bụ́ ndị na-esoghị n’Israel ime mmụọ.

11 Akwụkwọ ahụ bụ You May Survive Armageddon Into God’s New Worlda kwuru, sị: “Ihe ahụ fọdụrụ nke 42,360 ndị Israel abụghị nanị ndị onye ọchịchị bụ Zerubabel hapụ Babilọn . . . E nwere ọtụtụ puku ndị na-abụghị ndị Israel . . . E wezụga ndị Netinim, e nwere ndị ọzọ na-abụghị ndị Israel, ndị ohu, ndị ikom na ndị inyom ọrụ ha bụ ịbụ abụ na ụmụ ndị ohu nke Eze Solomọn.” Akwụkwọ ahụ kọwara, sị: “Ndị Netinim ahụ, ndị ohu ahụ, ndị ọbụ abụ ahụ na ụmụ ndị ohu Solomọn, ha nile bụcha ndị na-abụghị ndị Israel, hapụrụ ala ndọta n’agha ahụ ma soro ihe fọdụrụ n’Israel laghachi . . . Ya mere ò ziri ezi iche na taa ndị sitere ná mba dị iche iche, bụ́ ndị na-abụghị ndị Israel ime mmụọ, ga-eso ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na-akpakọrịta ma soro ha na-akwalite ofufe nke Jehova Chineke? Ee.” Ndị dị otú ahụ ‘aghọwo ndị nọchiri anya ndị Netinim, ndị ọbụ abụ, na ụmụ ndị ohu Solomọn n’oge a.’

12. Olee ụzọ Chineke si eji mmụọ ya eme ihe n’ụzọ pụrụ iche maka Israel ime mmụọ, ma n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ndị nile na-efe ya ofufe pụrụ inweta ya?

12 Dị ka ọ dị n’ụkpụrụ nke oge ochie ahụ, Chineke na-enyekwa ndị a nwere olileanya ibi n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi mmụọ ya. N’ezie, ha abụghị ndị a mụrụ ọzọ. Nke ọ bụla n’ime 144,000 ahụ nwere ahụmahụ otu ugbo nke ịbụ onye a mụrụ ọzọ dị ka nwa ime mmụọ nke Chineke, ma bụrụkwa onye e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Jọn 3:3, 5; Ndị Rom 8:16; Ndị Efesọs 1:13, 14) N’ezie, mmanụ ahụ e tere ha bụ ihe ngosipụta pụrụ iche nke mmụọ Chineke ịdịkwasị ìgwè atụrụ nta ahụ. Ma mmụọ Chineke dịkwa mkpa iji mezuo uche ya. Ya mere, Jisọs sịrị: ‘Nna unu nke eluigwe na-ewere mmụọ nye ndị na-arịọ ya.’ (Luk 11:13) Ma onye arịrịọ ahụ ò nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ na ò so n’atụrụ ọzọ, mmụọ Jehova dị adị n’ụba iji mezuo uche Ya.

13. Olee ụzọ mmụọ nsọ pụrụ isi rụọ ọrụ n’ahụ ndị nile na-ejere Chineke ozi?

13 Mmụọ Chineke kpaliri ma ndị Israel ma ndị na-abụghị ndị Israel ịlaghachi na Jerusalem, ọ na-agbakwa ndị ya nile na-eguzosi ike n’ihe ume, na-enyekwara ha aka taa. Ma olileanya nke Chineke nyeworo onye Kraịst ọ̀ bụ ndụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ n’elu ala, ọ ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ, mmụọ nsọ na-emekwa ka o nwee ike ikwesị ntụkwasị obi na nke ahụ. Onye ọ bụla n’ime anyị—n’agbanyeghị ihe bụ olileanya anyị—kwesịrị ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ, bụ́ nke dị anyị nile mkpa n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu.—Ndị Galetia 5:22-26.

Ndị E Nyeworo Maka Ije Ozi Pụrụ Iche

14, 15. (a) N’ime ndị nile na-abụghị Israel laghachiri, òtù abụọ dị aṅaa ka a kpọtụrụ aha? (b) Olee ndị ka ndị Netinim bụ, gịnịkwa ka ha mere?

14 N’ime ọtụtụ puku ndị ahụ ndị na-abụghị ndị Israel, ndị mmụọ nsọ kpaliri ịlaghachi, e nwere obere òtù abụọ ndị Okwu Chineke kpọtụrụ aha—ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn. Olee ndị ha bụ? Gịnị ka ha mere? Gịnịkwa ka nke a pụrụ ịpụta taa?

15 Ndị Netinim bụ otu òtù ndị na-amaliteghị n’Israel ma bụrụ ndị nwere ihe ùgwù nke isoro ndị Livaị na-eje ozi. Cheta ndị Kenean ahụ sitere Gibeọn ndị ghọrọ “ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri banyere nzukọ Israel, banyekwara ebe ịchụàjà Jehova.” (Joshua 9:27) Ma eleghị anya ụfọdụ n’ime ụmụ ha so ná ndị Netinim ahụ si Babilọn na-alaghachi, tinyekwara ndị ọzọ a gụnyeworo dị ka ndị Netinim n’oge ọchịchị Devid na n’oge ndị ọzọ. (Ezra 8:20) Gịnị ka ndị Netinim mere? Ndị Livaị bụ ndị e nyeworo inyere ndị nchụàjà aka, mgbe e mesịkwara e nyekwara ndị Netinim inyere ndị Livaị aka. Ọbụna nye ndị ala ọzọ bere úgwù, nke a bụ ihe ùgwù.

16. Olee otú ọrụ ndị Netinim na-arụ si gbanwee mgbe oge na-aga?

16 Mgbe òtù ahụ si Babilọn laghachi, o nwere ndị Livaị ole na ole, ma e jiri ha tụnyere ndị nchụàjà ma ọ bụ ndị Netinim na “ụmụ ndị ohu Solomọn.” (Ezra 8:15-20) Akwụkwọ nkọwa bụ Dictionary of the Bible, nke Dr. James Hastings dere, na-ekwu, sị: “Mgbe oge ụfọdụ gasịrị anyị hụrụ ka e si guzobe [ndị Netinim] kpam kpam dị ka òtù dị nsọ nke iwu kwadoro, nke na a na-ekenye ha ihe ùgwù.” Akwụkwọ ahụ mara mma ọgụgụ bụ Vetus Testamentum kwuru, sị: “Mgbanwe weere ọnọdụ. Mgbe ha si ná Ndọta Laghachi, e leghị [ndị ala ọzọ] ndị a anya dị ka ndị ohu nke Ụlọ Nsọ, kama dị ka ndị na-eje ozi na ya, na-enweta ọnọdụ yiri nke ndị nke ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’Ụlọ Nsọ ahụ.”—Lee igbe ahụ bụ́ “Ọnọdụ Gbanwere Agbanwe.”

17. N’ihi gịnị ka ndị Netinim ji nwetakwuo ọrụ ndị ọzọ, olee ihe àmà Bible e nwere maka nke a?

17 N’ezie, ndị Netinim aghọghị ndị ha na ndị nchụàjà na ndị Livaị hà nhata. Ìgwè nke abụọ ahụ bụ ndị Israel, bụ́ ndị Jehova họọrọ n’onwe ya, ndị a na-agaghị ejikwa ndị na-abụghị ndị Israel dochie. Ma, dị ka ihe ndị dị na Bible na-egosi ebe e nwere ọnụ ọgụgụ dị ala nke ndị Livaị, e nyere ndị Netinim ọtụtụ ọrụ ịrụ n’ozi Chineke. E kenyere ha ebe obibi dị nso n’ụlọ nsọ ahụ. N’ụbọchị Nehemaịa, ha sooro ndị nchụàjà rụkọọ ọrụ n’idozi mgbidi ndị dị nso n’ụlọ nsọ ahụ. (Nehemaịa 3:22-26) Eze ndị Peasia nyekwara iwu ka a gụpụ ndị Netinim ná ndị ga-akwụ ụtụ isi, dịkwa ka a gụpụrụ ndị Livaị n’ihi ozi ha na-eje n’ụlọ nsọ. (Ezra 7:24) Nke a na-egosi otú e si jikọta ndị a “e nyesịworo” (ndị Livaị na ndị Netinim) n’ụzọ chiri anya n’ihe metụtara ihe ime mmụọ, na otú ihe omume ndị Netinim si mụbaa n’ikwekọ ná mkpa e nwere, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe a gụrụ ha dị ka ndị Livaị. Mgbe Ezra mesịrị kpọkọta ndị ahụ a dọọrọ n’agha maka ịlaghachi, ọ dịghị onye Livaị nọ n’etiti ha na mbụ. Ya mere o tinyesiri mgbalị ike ịkpọkọta ụfọdụ. Nke ahụ mere ka 38 ndị Livaị na 220 ndị Netinim soro laghachi ije ozi dị ka “ndị na-ejere ụlọ Chineke anyị ozi.”—Ezra 8:15-20.

18. Ụmụ ndị ohu Solomọn pụrụ ịrụworị ụdị ọrụ dị aṅaa?

18 Òtù abụọ nke ndị na-abụghị ndị Israel a kpọtụrụ aha bụ ụmụ ndị ohu nke Solomọn. Bible kwuru ihe ole na ole banyere ha. Ụfọdụ bụ “ụmụ Soferet.” Ezra gbakwụnyere okwu na-ezo aka n’ihe kpọmkwem n’aha ahụ, na-eme ya Has·so·pheʹreth, nke pụtara ma eleghị anya “ndị odeakwụkwọ ahụ.” (Ezra 2:55; Nehemaịa 7:57) Otú a, ha pụrụ ịbụworị ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị odeakwụkwọ ma ọ bụ ndị ndegharị, ma eleghị anya ndị na-ede banyere ụlọ nsọ ma ọ bụ ihe a na-eme na ya. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị e si ala ọzọ kpọta, ụmụ ndị ohu Solomọn gosipụtara nsọpụrụ ha nye Jehova site n’ịhapụ Babilọn ma na-alaghachi ikere òkè n’iweghachi ofufe Ya.

Iwepụta Onwe Anyị Taa

19. Gịnị bụ mmekọrịta dị n’etiti ndị e tere mmanụ taa na atụrụ ọzọ ahụ?

19 N’oge anyị a, Chineke ejiriwo ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ mee ihe nke ukwuu n’ibute ụzọ n’ofufe dị ọcha na ikwusa ozi ọma ahụ. (Mak 13:10) Lee otú ndị a siworo nwee ọṅụ ịhụ ọtụtụ iri puku, ọtụtụ narị puku, nakwa ọtụtụ nde atụrụ ọzọ ka ha sonyeere ha n’ife ofufe! Leekwa aha imekọ ihe ọnụ na-enye ọṅụ e nweworo n’etiti ihe ahụ fọdụrụ na atụrụ ọzọ ahụ!—Jọn 10:16.

20. Nghọta ọhụrụ dị aṅaa bụ nke ezi uche dị n’ime ya banyere otu ihe yiri nke ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn? (Ilu 4:18)

20 Ndị nile na-abụghị ndị Israel si na Babilọn oge ochie laghachi nọchiri anya atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị na-eje ozi ugbu a ha na ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ. Otú ọ dị, gịnị banyere eziokwu ahụ bụ na Chineke họpụtara ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn? N’usoro ahụ, e nyere ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn ihe ùgwù ndị karịrị nke e nyere ndị ọzọ na-abụghị ndị Israel so laghachi. Nke a pụrụ ise onyinyo dị mma nke na taa, Chineke emewo ka ihe ùgwù na ibu ọrụ ndị ọzọ rutere ụfọdụ n’ime ndị so n’atụrụ ọzọ bụ́ ndị tozuru okè ma dịkwa njikere.

21. Olee otú ụmụnna ụfọdụ nwere olileanya elu ala siworo nweta ibu ọrụ na ihe ùgwù ndị ọzọ?

21 Ihe ùgwù ndị ahụ a tụkwasịịrị ndị Netinim bụ ndị e jikọrọ kpọmkwem n’ọrụ ime mmụọ. O yiri ka ụmụ ndị ohu Solomọn hà natara ibu ọrụ ndị metụtara ịhazi ihe. N’otu aka ahụ taa, Jehova ejiriwo ‘onyinye dị na mmadụ’ gọzie ndị ya ilekọta mkpa ha. (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12) Ndị so n’onyinye nke a bụ ọtụtụ narị ụmụnna ndị tozuru okè, ndị nweworo ahụmahụ, bụ́ ndị na-ekere òkè ‘n’ịzụ ìgwè atụrụ,’ na-eje ozi dị ka ndị nlekọta sekit na distrikti nakwa na Kọmitii Alaka ndị dị na 98 alaka nke Watch Tower Society. (Aịsaịa 61:5) N’isi ụlọ ọrụ ụwa nke Society, n’okpuru ntụziaka nke ‘onye ahụ na-achị ezinụlọ nke kwesịrị ntụkwasị’ na Òtù Na-achị Isi ya, ndị ikom toruru etoru na-anata ọzụzụ iji nye aka n’ịkwadebe nri ime mmụọ. (Luk 12:42) E nyewo ndị ọzọ rarawooro onwe ha nye n’afọ ofufo ruo ogologo oge ọzụzụ ilekọta ebe obibi na ebe obibi akwụkwọ Betel dị iche iche na ilekọta usoro ihe omume zuru ụwa ọnụ n’iwu alaka ụlọ ọrụ na ụlọ nzukọ ndị ọhụrụ maka ofufe ndị Kraịst. Ha emewo nke ọma n’ije ozi dị ka ndị na-enyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ aka n’ụzọ chiri anya, bụ́ ndị mejupụtara akụkụ nke òtù ndị nchụàjà bụkwa ndị eze.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 4:17; 14:40; 1 Pita 2:9.

22. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na e nyere ụfọdụ ndị so n’atụrụ ọzọ ibu ọrụ ndị dị arọ ugbu a, oleekwa ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume na nke a?

22 N’oge ochie, ndị nchụàjà na ndị Livaị nọgidere na-eje ozi n’etiti ndị Juu. (Jọn 1:19) Otú ọ dị, taa ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ nọ n’elu ala aghaghị ịnọgide na-ebelata. (Lee ọdịiche dị na Jọn 3:30.) N’ikpeazụ, mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ, 144,000 nile ndị ‘a kara akara’ ga-anọ n’eluigwe maka alụmdi na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. (Mkpughe 7:1-3; 19:1-8) Ma ugbu a atụrụ ọzọ ahụ aghaghị ịnọgide na-amụba amụba. Eziokwu ahụ bụ na ụfọdụ n’ime ha, ma e jiri ha tụnyere ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn, bụ ndị a na-ekenye ibu ọrụ ndị dị arọ ugbu a n’okpuru nlekọta nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, adịghị eme ha ka ha bụrụ ndị nganga ma ọ bụ chee na ha dị oké mkpa. (Ndị Rom 12:3) Nke a na-eme ka anyị nwee obi ike na mgbe ndị Chineke ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ a ga-enwe ndị ikom nwere ahụmahụ—“ndị isi”—ndị a kwadebeworo idu ndú n’etiti atụrụ ọzọ.—Mkpughe 7:14; Aịsaịa 32:1; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 6:2-7.

23 Ndị nile si Babilọn laghachi dị njikere ịrụsi ọrụ ike na igosipụta na ofufe Jehova bụ isi ihe dị ha n’uche na n’obi. Ọ bụ otu ihe ahụ taa. N’isonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, ‘ndị ala ọzọ na-eguzo ma na-azụ ìgwè atụrụ.’ (Aịsaịa 61:5) Ya mere, n’agbanyeghị olileanya ọ bụla Chineke nyeworo nke anyị nwere, n’agbanyeghịkwa ihe ùgwù a pụrụ inye ndị okenye e ji mmụọ nsọ họpụta tupu ụbọchị iwepụ Jehova n’ụta eruo n’Amagedọn, ka anyị nile zụlite mmụọ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, nke dị mma, nke inye ihe. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe anyị pụrụ ịkwụghachi Jehova ụgwọ maka abamuru nile mara mma anyị nwetara site n’aka ya, ka anyị tinye obi anyị nile n’ihe ọ bụla anyị na-eme n’ime ọgbakọ ya. (Abụ Ọma 116:12-14; Ndị Kọlọsi 3:23) Otú a, anyị nile pụrụ inye onwe anyị maka ezi ofufe, ka atụrụ ọzọ ahụ na-eso ndị e tere mmanụ na-eje ozi n’ụzọ chiri anya, bụ́ ndị a kara akara ‘ịchị elu ala dị ka eze.’—Mkpughe 5:9, 10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Peji 142-148; nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Isi Ihe Ndị A Ga-echeta

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Livaị si bụrụ “ndị e nyesịworo” n’Israel oge ochie?

◻ Olee ndị na-abụghị ndị Israel si ná ndọta n’agha laghachi, na-ese onyinyo ndị dị aṅaa?

◻ Mgbanwe dị aṅaa yiri ka ò weere ọnọdụ n’ebe ndị Netinim nọ?

◻ Banyere ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn, myirịta dị aṅaa ka a na-aghọta ugbu a?

◻ Obi ike dị aṅaa ka a na-enweta site n’imekọ ihe nke dị n’etiti ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ?

23. N’ihi gịnị ka anyị nile na-aghaghị iji zụlite mmụọ nke inye ihe n’ihe banyere ozi Chineke?

[Igbe dị na peeji nke 14]

ỌNỌDỤ GBANWERE AGBANWE

Ọtụtụ akwụkwọ ndị na-akọwa ihe dị na Bible na akwụkwọ nkà mmụta na-ekwu banyere mgbanwe ụfọdụ ndị ahụ na-abụghị ndị Israel nwere, bụ́ ndị si ná ndọta n’agha laghachi. Dị ka ihe atụ, n’okpuru isiokwu bụ “Ịgbanwe n’ọnọdụ ha,” akwụkwọ bụ Encyclopædia Biblica kwuru, sị: “Ọnọdụ ha ná mmekọrịta ọha, dị ka e gosiworo na mbụ, gbagotere nke nta n’otu oge ahụ. [Ndị Netinim] eyighịkwa ka hà bụ ndị ohu n’ụzọ e si ele okwu ahụ anya kpọmkwem.” (Nke Cheyne na Black haziri, Mpịakọta nke Atọ, peji 3399) N’akwụkwọ bụ The Cyclopædia of Biblical Literature, John Kitto dere, sị: “A gajeghị ịtụ anya na ọtụtụ n’ime ha [ndị Netinim] ga-alaghachi n’ọnọdụ nke a dị ala na Palestine . . . Nraranye nke a e ji afọ ofufo mee nke ndị a si otú a gosipụta mere ka ọnọdụ nke ndị Netinim gbagote nke ukwuu.” (Mpịakọta nke Abụọ, peji 417) Akwụkwọ bụ The International Standard Bible Encyclopedia mere ka ọ pụta ìhè, sị: “N’ìhè nke mmekọrịta nke a na ọnọdụ ha n’oge Solomọn, a pụrụ ikwu na ndị ohu Solomọn nwere ibu ọrụ ndị dị mkpa n’ụlọ nsọ nke abụọ.”—Nke G. W. Bromiley haziri, Mpịakọta 4, peji 570.

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe ndị Israel laghachiri ije wughachi Jerusalem, ọtụtụ puku ndị na-abụghị ndị Israel sonyeere ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 17]

Kọmitii Alaka nke dị na Korea. Dị ka ndị Netinim oge ochie ahụ mere, ndị ikom so n’atụrụ ọzọ nwere ibu ọrụ ndị dị arọ n’ezi ofufe taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya