Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ịzụ ihe ndị e zuru ezu anya?
Ndị Kraịst na-ezere ịmara amara kere òkè n’ịzụ ngwá ahịa ma ọ bụ ihe ndị e zuru ezu.
Izu ohi dị njọ n’ezie. Iwu Chineke nyere Israel kwuru hoo haa, sị: “Gị ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15; Levitikọs 19:11) Ọ bụrụ na e jide onye ohi, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuuru okpukpu abụọ, okpukpu anọ, ma ọ bụ okpukpu ise, na-adabere n’ọnọdụ ndị e nwere.
Site n’oge ochie, ndị ohi agbalịwo ire ihe ha zutere ka ha wee nwee ike inweta uru ngwa ngwa, ka a gharakwa inweta ihe ha zutere n’aka ha. N’ihi nzube nke a, ha na-erekarị ihe ndị e zutere ezute n’ọnụ ahịa dị ala nke na ọ na-esiri ndị na-azụ azụ ike ịjụ. Omume dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe a na-eme n’ihe anyị na-agụta n’Ọpụpụ 22:1: “Mgbe onye ọ bụla ga-ezu ehi ma ọ bụ atụrụ, wee gbuo ya, ma ọ bụ ree ya; ehi ise ka ọ ga-akwụghachi n’ọnọdụ ehi ahụ, ma ọ bụ atụrụ anọ ka ọ ga-akwụghachi n’ọnọdụ atụrụ ahụ.”
N’ịchọpụta ihe iwu ndị dị otú ahụ pụtara, Rabbi Abraham Chill dere, sị: “A machibidoro ịzụrụ ma ọ bụ ịnakwere ihe onwunwe e zuru ezu, ọbụna ma à sị na a mataghị na ihe onwunwe ahụ dị otú ahụ. Ya mere mmadụ agaghị azụrụ ewu site n’aka onye na-azụ ya, n’ihi na ma eleghị anya onye ahụ na-azụ ewu na-ere ha n’emeghị ka onye were ya n’ọrụ mara, burukwa n’uche iwere ego o retere.”—The Mitzvot—The Commandments and Their Rationale.
N’ezie, iwu Chineke adịghị amachibido ‘ịzụrụ ewu site n’aka onye na-azụ ya’ nanị n’ihi na a na-enyo ya enyo na ọ pụrụ iwere ego onye were ya n’ọrụ, si otú ahụ na-ere ewu e zutere ezute. Ma n’akụkụ ọzọ nke isiokwu ahụ, ndị ohu Jehova ekwesịghị ịmara amara zụrụ (ewu ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ) mgbe o doro anya na ọ bụghị onye ahụ na-ere ya nwe ya ma ọ bụ na ọ pụrụ ịbụ nke e zutere ezute. Iwu Chineke na-egosi na Ọ na-akwado mmadụ inwe ihe, ma onye ohi na-anapụ mmadụ ihe o nwere. Onye na-azụrụ ihe a maara dị ka ihe e zuru ezu nwere ike ọ gaghị abụ onye ohi n’ụzọ e si aghọta okwu ahụ, ma ya ịzụrụ ihe ahụ na-ebelata ohere nke onye nwe ihe ahụ inweta ihe onwunwe ya ọzọ.—Ilu 16:19; tụlee 1 Ndị Tesalonaịka 4:6.
Anyị nile ghọtara na ndị na-azụ ihe na-achọ ịzụta ngwá ahịa n’ọnụ ahịa kasị mma. Ndị inyom n’ụwa nile na-achọ ịzụta ihe n’ọnụ ala, na-agbalị ịhapụ ịzụ ihe ruo oge ọnụ ahịa gbadara ala, ma ọ bụ na-azụ ihe n’ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ahịa ukwu ndị na-eji obere uru ere ahịa, si otú ahụ nwee ọnụ ahịa ka mma. (Ilu 31:14) Ma, inwe mmasị dị otú ahụ n’ịzụ ihe kwesịrị inwe ịkpa ókè nke omume. Ndị na-eguzosi ike n’ihe n’oge Nehemaịa jụrụ ịzụ ihe n’ụbọchị Sabat, ọbụna ma à sị na ha pụrụ ịzụta ihe n’ọnụ ala n’ụbọchị ndị ahụ. (Nehemaịa 10:31; tụlee Emọs 8:4-6.) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị Kraịst nọ. Ọjụjụ ha na-ajụ izu ohi na-enyere ha aka ịchịkwa ọnwụnwa ọ bụla nke ịzụrụ ngwá ahịa ọnụ ahịa ha dị ala ndị o doro anya na e zutere ezute.
Ọ pụrụ ịbụ ihe onye ọ bụla maara na ụfọdụ ndị ahịa na-ere ngwá ahịa e zuru ezu. Ma ọ bụ ọnụ ahịa e kwupụtara na nzuzo pụrụ ịdị ala nke ukwuu nke na onye ọ bụla uche ya zuru ezu pụrụ ikwubi na ma eleghị anya e nwetara ngwá ahịa ahụ n’ụzọ megidere iwu. Ọbụna iwu obodo pụrụ ikwupụta mkpa ọ dị inwe ezi uche dị otú ahụ. Otu akwụkwọ banyere usoro iwu na-ekwu, sị:
“Ọ bụghị ihe dị mkpa n’ihe ọmụma nke ikpe mmebi iwu na onye ahụ a na-ebo ebubo ga-ama onye nwe ma ọ bụ onye zutere ihe onwunwe ahụ e zuru ezu, ma ọ bụ mgbe ma ọ bụ ebe e zutere ya, ma ọ bụ ọnọdụ mere e ji zuru ya, kama ọ bụ ihe zuru ezu na ọ maara na e zutere ya ezute. . . . Ụlọikpe ụfọdụ na-eche na a pụrụ ime ka inwe ihe ọmụma nke ikpe mmebi iwu ka njọ n’eziokwu ahụ bụ na onye a na-ekpe ikpe natara ihe onwunwe ahụ n’ọnọdụ ndị onye nkịtị maara ihe ma nwee uche ga-aghọta na e zuru ya ezu.”
Nke a na-eme ka e nwee ezi ihe mere onye Kraịst ga-eji zere ngwá ahịa ndị e zuru ezu. Ya ịzụrụ ngwá ahịa ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ọ bụrụ onye na-emebi iwu. N’ezie, ná mba ụfọdụ a ga-ele onye ọ bụla nke na-azụrụ ihe ndị e zuru ezu n’okpuru ọnọdụ ọ bụla anya dị ka onye dara iwu. Ọtụtụ ndị adịghị enwe obi ọmụma ikpe banyere imebi iwu ma ọ bụrụ na ha chere na a pụghị ijide ha. Nke ahụ abụghị otú ndị Kraịst si eme, bụ́ ndị chọrọ ido onwe ha “n’okpuru ndị na-achị isi.” Ịbụ ndị na-erube isi n’iwu na-echebe ha pụọ n’ịbụ ndị e kpere ikpe dị ka ndị omempụ, ọ na-enyekwa aka ime ka e nwee akọ na uche dị mma n’ihu Jehova.—Ndị Rom 13:1, 4, 5.
Enyi Chineke bụ́ Abraham setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere akọ na uche. N’ụbọchị ya, mmadụ anọ na-achị n’ebe ọwụwa anyanwụ meriri ndị eze na-achị n’ebe Lọt bi, na-akwakọrọ ọtụtụ ihe onwunwe n’ụdị nke ihe ndị e zutere n’agha. Abraham chụsoro, merie ndị iro ahụ, bulatakwa ngwongwo ndị ahụ e zuuru. Eze Sọdọm gwara Abraham, sị: “Were akụ n’onwe gị” dị ka nkwụghachi ụgwọ. Kama ime nke ahụ, Abraham nyefere ngwongwo ndị ahụ n’aka onye nwe ha n’ezie, na-asị: “M gaghị ewere ihe ma ọlị n’ime ihe ọ bụla nke i nwere, . . . ka i wee ghara ịsị, Mụ onwe m emewo Abram ka ọ bụrụ ọgaranya.”—Jenesis 14:1-24.
Ndị Kraịst enweghị mmasị n’uru ego ọ bụla a pụrụ inweta site n’ngwá ahịa e zuru ezu. Jeremaịa dere, sị: “Dị ka ọkwa nke na-ekpokọba ụmụ nke ọ na-amụghị, otú a ka onye na-akpa akụ, ma ọ kpaghị ya n’ikpe ziri ezi, si dị.” (Jeremaịa 17:11) Ya mere, e wezụga igosi amamihe site n’emebighị iwu Siza banyere ihe onwunwe e zuru ezu, ndị Kraịst na-achọ ijigide ikpe ziri ezi Chineke site n’ịjụ itinye aka n’ụzọ ọ bụla n’ikpe na-ezighị ezi nke izu ohi. Devid dere n’ụzọ dị mma, sị: “Ihe nta onye ezi omume nwere dị mma karịa ihe bara ụba nke ọtụtụ ndị na-emebi iwu.”—Abụ Ọma 37:16.