N’ihi Gịnị Ka Ndakpọ Olileanya Ji Dị Ukwuu?
OLILEANYA maka ndụ ka mma—e nwetara ya n’ikpeazụ! Ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ bụbu East Germany kwetara na nke a mgbe Mgbidi Berlin dakpọrọ na November 1989. Otú ọ dị, n’ihe karịtụrụ otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, ha mere mkpesa banyere “ịchọpụta na ịdị ike nke usoro ọchịchị onye kwuo uche ya nke aka ji akụ siri ike karịa ibi ndụ e chebere site ná Mgbidi Berlin.” Gịnị si na ya pụta? Nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya na-arị elu.
Ime ihe ike nke ezinụlọ na nke ógbè pụrụ ịmanye ndị mmadụ ịhapụ ebe obibi ha ịchọ ịnọ ná ntụkwasị obi, ma ole na ole na-achọta ya. Ụfọdụ pụrụ ọbụna imesị soro ndị na-enweghị ebe obibi bụ́ ndị na-ebi n’okporo ámá nke obodo biri. Ná mba ụfọdụ, ọtụtụ n’ime ndị a pụrụ ịdaba n’omume bịa taa na echi nke ndị ọchịchị. N’ịbụ ndị na-enweghị ebe obibi n’ihi na ha enweghị ọrụ, ha apụghị inweta ọrụ n’ihi na ebe ha bi enweghị adres. Ụlọ ọrụ ndị gọọmentị na-elekọta ndị nọ ná mkpa na-agbalị inye aka, ma ọ na-ewe oge ịgwọta nsogbu ndị ahụ. Ya mere nkụda mmụọ na ndakpọ olileanya na-amalite.
Ndakpọ olileanya na-eduba ọtụtụ ndị inyom gaa n’ime ihe nzuzu. N’ihe ndekọ ahụ bụ́ Women and Crime in the 1990s, onye na-akụzi nkà mmụta iwu bụ́ Dr. Susan Edwards kọwara, sị: “Aka ndị inyom ka na-eto eto na-etinye [n’ịgba akwụna] bụ kpọmkwem n’ihi ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba, ọ bụghị n’ihi enweghị ọzụzụ onwe onye ma ọ bụ ụzọ ezinụlọ mmadụ si zụlite ya.” N’otu aka ahụ, ụmụ okorobịa na-ahapụ ebe obibi ha ije chọọ ọrụ adịghị achọta mgbe nile. Ụfọdụ, ná ndakpọ olileanya, na-aghọ ‘ụmụ okoro e ji atụ mgbere,’ na-enye ndị na-edina ụdị onwe onye ahụ ha iji nweta ihe oriri na ebe ha ga-ebi, na-aghọ ndị ndị omekome ji emere ihe masịrị ha.
Ajọ ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ime ihe ike, ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba, ihe ndị a nile pụrụ ịkpali ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ndakpọ olileanya. Ọbụna ndị gụrụ oké akwụkwọ na-arụ ọrụ adịghị agbanahụ nke ahụ ka ha na-achọ ijigide ụdị ndụ ọgaranya ha na-ebi, ọ bụ ezie na ha na-enwe nsogbu ego na-arị elu. Gịnị na-esi na nke ahụ apụta? “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu,” dị ka Eze Solomọn oge ochie ahụ si kwuo!a (Eklisiastis 7:7) N’ezie, ndakpọ olileanya na-eduba ọnụ ọgụgụ na-arị elu gaa n’ụzọ mgbapụ nke kasị dị njọ—igbu onwe onye.
Ụzọ Mgbapụ Kasị Dị Njọ
Ọtụtụ ọnọdụ nke igbu onwe onye n’etiti ndị na-eto eto na-egosi na ndakpọ olileanya na-emetụta ọbụna ha onwe ha. Otu onye Britain na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ jụrụ, sị: “Gịnị na-eme n’oge anyị a nke na-akpata ndakpọ olileanya nke ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu?” N’otu ihe ọmụmụ nke ụmụaka nọ n’agbata afọ ndụ 8 na 16, bụ́ ndị e nyeworo àkwà n’ụlọ ọgwụ mgbe ha gbalịsịrị ime onwe ha nsí, Dr. Eric Taylor nke ụlọ ọrụ Institute of Psychiatry dị na London kọrọ, sị: “Otu ihe pụtara ìhè bụ ọnụ ọgụgụ ole nke ụmụaka nwere ndakpọ olileanya na ndị na-enweghị olileanya banyere ihe ọ bụla.” Britain nwere ihe ndekọ nke ihe dị ka 100,000 ndị na-akpacha anya eri nsí na-adịghị egbu egbu kwa afọ, iji mee ka ndị mmadụ mata mkpa ha nwere maka enyemaka.
Otu ụlọ ọrụ ebere nke ndị Britain malitere ime mkpọsa ka e jiri ọmịiko na-aṅa ndị nwere ndakpọ olileanya ntị. N’ụzọ dị otú a, ndị ndụmọdụ ya kwuru na ha na-enye “ihe ndị e ji edochi ọnwụ.” Ma, ha kwetara na ha enweghị ike ịgwọta nsogbu ndị ahụ na-akpatara ndị mmadụ ndakpọ olileanya.
Ọnụ ọgụgụ nke igbu onwe onye na-egosipụta “ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnọpụiche na enweghị ịdị n’otu nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya n’ọha,” ka akwụkwọ akụkọ The Sunday Correspondent kwuru. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọnụ ọgụgụ dị elu nke igbu onwe onye taa? Akwụkwọ akụkọ ahụ kpọtụrụ uche “enweghị ebe obibi, ịṅụ oké mmanya, iyi egwu nke ọrịa Aids na mmechi nke ụlọ ọgwụ ndị ọrịa uche” dị ka isi ihe ndị na-eduga ndị mmadụ ná ndakpọ olileanya dị omimi otú ahụ nke na ha na-ewere igbu onwe ha dị ka nanị ihe ngwọta dịịrị nsogbu ha.
È nwere olileanya ọ bụla iji kpochapụ ndakpọ olileanya? Ee! “Leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu” bụ mkpu Jisọs nke na-agba ume! (Luk 21:28) Gịnị ka o bu n’uche? Olileanya dị aṅaa ka e nwere?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament nke Harris, Archer, na Waltke hazigharịrị si kwuo, mmalite asụsụ mbụ nke okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “mmegbu” metụtara “ibokwasị ibu ọrụ n’isi, ịzọda n’ala, na ịzọpịa ndị ahụ ọkwá ha dị ala.”