Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo ekele ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ya bụrụ otú ahụ, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
▫ Gịnị ka a pụrụ iseworị onyinyo ya n’ụzọ dị mma site n’ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ e nyere ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn mgbe ha laghachiri site ná ndọta n’agha na Babilọn? Taa, ka ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ nọ n’elu ala nọgidere na-ebelata n’ọnụ ọgụgụ, atụrụ ọzọ ahụ nọgidere na-amụba. Ụfọdụ n’ime ndị a yiri atụrụ, dị ka ndị Netinim na ụmụ ndị ohu Solomọn, abụwo ndị e kenyere ibu ọrụ dị arọ ugbu a n’okpuru nlekọta nke ihe ahụ fọdụrụnụ. (Aịsaịa 61:5)—4/15, peji nke 16-17.
▫ Gịnị ka Zefanaịa onye amụma bu n’uche mgbe ọ sịrị: “eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova”? (Zefanaịa 2:2, 3) Ka e wee chebe onye ọ bụla n’oge “mkpagbu ukwu” na-abịanụ, ọ bụghị ihe metụtara a zọpụtahaala gị, a zọpụtachaala gị. (Matiu 24:13, 21) Ịbụ onye e zobere n’ụbọchị ahụ ga-adabere ná mmadụ ịnọgide na-eme ihe atọ: Ọ ghaghị ịchọ Jehova, ịchọ ezi omume, na ịchọ ịdị umeala.—5/1, peji nke 15-16.
▫ N’echiche dị aṅaa ka Maịkael ‘na-eguzo ọtọ’ na “mgbe ọgwụgwụ”? (Daniel 12:1, 4) Kemgbe e chiri ya echichi dị ka Eze na 1914, Maịkael anọwo “na-eguzo” n’ihi ndị Jehova. Ma n’oge na-adịghị anya Maịkael “ga-eguzo ọtọ” n’echiche pụrụ iche kpọmkwem—dị ka Onye Jehova doworo iwepụ ajọ omume nile n’elu ala na dị ka Onye Mgbapụta nke ndị Chineke.—5/1, peji nke 17.
▫ Na gịnị ka ezi obi ụtọ dabeere? Ezi obi ụtọ dabeere ná mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Jehova, nnwapụta ya, na ngọzi ya. (Ilu 10:22) Ya mere, a pụghị inweta ezi obi ụtọ ma ọ bụghị site n’irubere Jehova isi na iji ọṅụ doo onwe anyị n’okpuru uche ya. (Luk 11:28)—5/15, peji nke 16, 19.
▫ Mgbe Jisọs rụrụ ọrụ ebube ịgwọ ọrịa, okwukwe ọ̀ dị mkpa n’akụkụ nke onye a gwọrọ ọrịa? Okwukwe ụfọdụ dị mkpa n’akụkụ nke ọtụtụ ndị iji wee bịakwute Jisọs ka a gwọ ha. (Matiu 8:13) Otú ọ dị, nkwupụta okwukwe ọ bụla adịghị mkpa ka Jisọs wee rụọ ọrụ ebube ya, dị ka mgbe ọ gwọrọ nwoke dara ngwụrọ nke na-amaghị onye Jisọs bụ. (Jọn 5:5-13) Jisọs ọbụna weghachiri ntị e bepụrụ ebepụ nke ohu onye isi nchụàjà, bụ́ onye so n’ìgwè nke ndị iro Jisọs. (Luk 22:50, 51) A rụrụ ọrụ ebube ndị a site n’ike nke mmụọ nsọ Chineke, ọ bụghị n’ihi okwukwe nke ndị ahụ na-arịa ọrịa.—6/1, peji nke 3.
▫ Gịnị ka “oké ụgbụ” ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ Jisọs nke dị na Matiu 13:47-50 nọchiri anya ya? “Oké ụgbụ” ahụ nọchiri anya ngwá ọrụ elu ala nke na-ekwu na ya bụ ọgbakọ Chineke, bụrụkwa nke na-achịkọta “azụ.” Ọ gụnyewo ma Krisendọm ma ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, nke ikpeazụ ahụ nọgidere na-achịkọta ‘azụ ọma,’ n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, n’ikwekọ na Matiu 13:49.—6/15, peji nke 20.
▫ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị ndị ikpe n’Israel na-aghaghị iji mee ihe n’ịrụzu ọrụ ha? Ikpe ziri ezi hà nhata maka ndị ọgaranya na ndị ogbenye, eleghị mmadụ anya n’ihu kpam kpam, na anaraghị aka azụ. (Levitikọs 19:15; Deuterọnọmi 16:19)—7/1, peji nke 13.
▫ Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ịgbalị ịrụzu site n’ịnụrụ okwu ikpe? Otu nzube bụ ịchọpụta eziokwu ndị dị n’okwu ikpe ahụ, na-eme nke a n’ịhụnanya. Ozugbo a matara nke a, ndị okenye aghaghị ime ihe ọ bụla dị mkpa iji chebe ọgbakọ ma debe n’ime ya ụkpụrụ nile dị elu nke Jehova na nrugharị na-enweghị mgbochi nke mmụọ Chineke. Ịnụrụ okwu ikpe ahụ bụkwa iji zọpụta, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, onye mmehie nọ n’ihe ize ndụ. (Tụlee Luk 15:8-10.)—7/1, peji nke 18-19.
▫ N’ihi gịnị ka echiche efu ndị metụtara mmekọahụ na-ezighị ezi ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ? N’ihi ihe Jisọs kwuru na Matiu 5:27, 28, ndị nile nọgidere na-enwe echiche efu nke mmekọahụ na-ezighị ezi nwere ikpe ọmụma nke ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye n’ime obi ha. E nwekwara ezi ihe ize ndụ nke na echiche efu ndị dị otú ahụ pụrụ iduba n’omume rụrụ arụ.—7/15, peji nke 15.
▫ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova pụrụ isi nyere anyị aka ile ọnwụnwa anyị anya n’ụzọ ziri ezi wee na-atachi obi na ha? A pụrụ ime ka uche anyị ruo n’akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị ma ọ bụ n’oge a na-amụ Bible. Ihe omume ndị mere site ná nduzi nke Chineke pụrụ inyere anyị aka ịhụ ihe anyị ga-eme. Ndị mmụọ ozi pụrụ ikere òkè n’iduzi anyị, ma ọ bụ anyị pụrụ ịnata nduzi site ná mmụọ nsọ. (Ndị Hibru 1:14)—7/15, peji nke 21.
▫ Kansụl nke Nicaea n’afọ 325 O.A., ò guzobere ma ọ bụ kwupụta ozizi Atọ n’Ime Otu? Ee e, Kansụl nke Nicaea mere nanị ka Ọkpara ahụ na Nna ahụ hara nhata n’ịbụ “otu ọdịdị.” Echiche ahụ bụ na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ ezi Chineke n’otu n’otu—Chineke dị atọ n’ime otu—abụghị nke kansụl ahụ chepụtara, ọ bụghịkwa nke sitere n’aka Ndị Nna Chọọchị oge gboo.—8/1, peji nke 20.
▫ Job ọ̀ bụ nanị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova n’oge o biri ndụ? (Job 1:8) Ee e, akwụkwọ Job n’onwe ya na-egosi na Elaịhu bụ onye Chineke nabatara. Ọzọkwa, n’oge Job biri ndụ, e nwere ọtụtụ ndị Israel bi n’Ijipt, e nweghịkwa ihe mere a ga-eji chee na ndị a nile abụghị ndị kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa ndị Chineke na-anabataghị.—8/1, peji nke 31.