Ihe Odide Nlereanya nke Bible n’Asụsụ Hibru
TUPU nchọpụta nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nnú ahụ na 1947, ihe odide Bible n’asụsụ Hibru nke kasị mee ochie a maara—ma e wezụga iberibe ole na ole—bụ ndị sitere n’akụkụ ngwụsị narị afọ nke 9 ruo narị afọ nke 11 O.A. Nke ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku afọ gara aga. Nke a ọ̀ pụtara na tupu 1947 ihe odide Hibru nke Bible bụ nke a na-ejighị n’aka? Gịnịkwa mere e ji nwee ọnụ ọgụgụ dị nta nke ukwuu nke ihe odide ndị ochie nke Hibru?
N’ibu ụzọ tụlee ajụjụ nke kpe azụ, n’usoro nke ndị Juu na-agbaso ụkpụrụ iwu ochie ha, ihe odide Bible ọ bụla nke asụsụ Hibru, bụ́ nke e lere anya na ọ dịwo nkịrịka nke ukwuu nke na a gaghị ejikwa ya mee ihe gaa n’ihu, bụ nke a na-akpọchi n’ime genizah, bụ́ ụlọ ndebe ihe dị n’ụlọ nzukọ. Ka oge na-aga, a chịpụtara mkpokọta nke ihe odide ndị a kaworo nká ma lie ha n’ala. Ndị Juu mere nke a iji gbochie Akwụkwọ Nsọ ha ịbụ nke e merụrụ ma ọ bụ jiri mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi gịnị? N’ihi na ha nwere Tetragrammaton, bụ́ mkpụrụ okwu Hibru anọ ahụ, bụ́ mkpụrụ okwu Hibru ndị na-anọchi anya aha ahụ dị nsọ nke Chineke, bụ́ nke a na-edekarị n’asụsụ Igbo dị ka “Jehova.”
“Okpueze” Ahụ
N’akụkụ kasị, ihe odide Hibru oge ochie abụrụwo nke e ji ikwesị ntụkwasị obi na-edegharị site n’oge ndị kasị ochie. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ihe odide Hibru dị mkpa nke a kpọrọ, Keter, “Okpueze” ahụ, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru nile dịbu na ya, ma ọ bụ “Testament Ochie.” E chebewo ya n’ụlọ nzukọ kasị mee ochie nke otu ìgwè oge ochie dị nta nke ndị Juu bi na Aleppo, Syria, bụ́ obodo ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya bụ ndị Alakụba. Tupu mgbe ahụ, a hapụụrụ ndị Juu na-anakwere Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị bi na Jerusalem ihe odide ahụ, ma ndị Agha Ntụte weere ya n’ike na 1099. Ka oge na-aga, e nwetaghachiri ihe odide ahụ wega ya na Cairo Ochie, Ijipt. O rutere Aleppo ma ọ dịkarịa anya, na narị afọ nke 15, bụrụkwa nke a maara ozugbo dị ka akwụkwọ Codex nke Aleppo. Ihe odide ahụ, nke e dere ma ọ dịkarịsịa ọhụrụ, laa azụ na 930 O.A., bụ nke e lere anya dị ka okpueze nke nkà mmụta ndị Masorete, dị ka aha ya na-egosi. Ọ bụ ezi ihe nlereanya inye ihe atụ nke nlezianya e ji mee ihe n’idepụtagharị ihe odide Bible ahụ, ọ bụkwa n’ezie, ihe odide nlereanya Bible n’asụsụ Hibru.
N’oge ndị ka dị nso n’oge ọgbara ọhụrụ, ndị nlekọta nke ihe odide nke a pụrụ iche, n’ihi egwu na-enweghị isi nke imerụ ihe dị nsọ ha nwere, ekweghị ka ndị mmụta bịa lee ya. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ọ bụ nanị otu ibe akwụkwọ ka e setụrụla foto, a pụghị iwepụta mbipụta nke yiri ya kpọmkwem maka iji mụọ ihe.
Mgbe ndị Britain seere aka ha na Palestine na 1948, ọgba aghara tiwapụrụ n’Aleppo megide ndị Juu. E suru ụlọ nzukọ ha ọkụ; akwụkwọ codex ahụ dị oké ọnụ ahịa pụrụ n’anya, e chekwara na e bibiri ya ebibi. Mgbe ahụ, lee ihe ịtụnanya ọ bụ ihe dị ka afọ iri n’ọdịnihu, ịmara na ihe dị ka ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ihe odide ahụ lanarịrị ma bụrụ nke e buuru na nzuzo si na Siria gaa Jerusalem! N’ikpeazụ na 1976 e wepụtara mbipụta mara mma nke yiri ya kpọmkwem n’àgwà zuru ezu, bụ́ nke dị 500 mkpụrụ.
Ọrụ nke Onye Ọkà
N’ihi gịnị ka ihe odide nke a ji dị oké mkpa? N’ihi na Aaron ben Asher, bụ́ otu n’ime ndị mmụta a kasị asọpụrụ, onye a zụrụ n’idepụtagharị Bible n’asụsụ Hibru, deziri mkpụrụ akwụkwọ ya ndị mbụ ma kanye akara ndị na-egosi ebe a ga-akwụsịtụ wee kuru ume n’ihe dị ka 930 O.A. Ya mere, ọ bụ akwụkwọ codex nlereanya, nke na-esetịpụ ụkpụrụ maka ndị e bipụtara n’ọdịnihu site n’aka ndị odeakwụkwọ na-enwechaghị nkà.
Ná mmalite o nwere 380 ibe akwụkwọ dị iche iche (760 peji), e dekwara ya na kọlọm atọ n’elu akwụkwọ parchment. Ugbu a o nwere 294 ibe akwụkwọ dị iche iche ma gharakwa inwe ihe ka ọtụtụ n’Akwụkwọ Ise Ndị ahụ Bu Ụzọ nke Bible na nkebi nke ikpeazụ, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ Abụ Ákwá, Abụ Nke Abụ, Daniel, Esta, Ezra, na Nehemaịa. E zoro aka na ya dị ka “Al” na New World Translation of the Holy Scriptures—Reference Bible (Joshua 21:37, ntụaka ala peji). Moses Maimonides (nke e gosiri n’ebe a), bụ́ onye mmụta oge ochie a ma ama nke bụ onye Juu narị afọ nke 12 O.A. kpọrọ akwụkwọ Codex nke Aleppo, nke kasị mma ọ hụtụworo.a
Ihe odide Hibru ahụ e ji aka degharịa site na narị afọ nke 13 ruo narị afọ nke 15 bụ nke e sitere n’usoro ihe odide abụọ bụ isi e jikọrọ ọnụ nke ndị Masorete, bụ́ nke Ben Asher na nke Ben Naphtali, depụta. Na narị afọ nke 16, Jacob ben Hayyim wepụtara ihe odide ahụ maka Bible e biri ebi n’asụsụ Hibru bụ́ nke e nwetara site n’ụkpụrụ nke e jikọrọ ọnụ, nke a ghọkwara ihe ndabere maka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Bible nile n’asụsụ Hibru ndị e biri na 400 afọ ndị na-esochi.
Site ná mbipụta nke atọ nke Biblia Hebraica (ihe odide Hibru e biri ebi) na 1937, e ji ụkpụrụ nke Ben Asher mee ihe ebe ọ bụ na e chebere ya n’ihe odide e debere na Russia, bụ́ nke a maara dị ka Leningrad B 19A. E dere Leningrad B 19A malite na 1008 O.A. Ụlọ akwụkwọ Hebrew University nke dị na Jerusalem na-eme atụmatụ ibipụta ihe odide Aleppo nke asụsụ Hibru n’ozuzu ya ná nkebi ná nkebi, tinyekwara ihe ndị a gụtara n’ihe odide na nsụgharị ndị ọzọ dị mkpa, gụnyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nnú.
Ihe odide Bible nke anyị ji eme ihe taa kwesịrị ndabere. Ọ bụ site n’ike Chineke ka e ji dee ya, e depụtagharịwokwa ya eri ọtụtụ narị afọ site n’aka ndị odeakwụkwọ bụ ndị ọkà n’idepụtagharị ihe, bụ́ ndị ji nkà nke ezi nlezianya rụọ ọrụ. A na-ahụ ezi nlezianya nke ndị ndepụta ihe ndị a n’ihi na ntụlerịta e mere n’etiti akwụkwọ mpịakọta Aịsaịa nke a hụrụ n’akụkụ Osimiri Nnú na 1947, na ihe odide ndị Masorete na-egosi n’ụzọ dị ịtụnanya, ọdịiche ole na ole, ọ bụrịị eziokwu na Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nnú ahụ ji ihe karịrị otu puku afọ dị ochie karịa Bible Masorete kasị ochie e nwere ugbu a. Ọzọkwa, ugbu a ndị mmụta nwere akwụkwọ Codex nke Aleppo, ọ ga-enye ihe mere a ga-eji nwee obi ike n’ịbụ eziokwu nke ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọbụna karị. N’eziokwu, “okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ruo ọtụtụ afọ ndị mmụta ụfọdụ rụrụ ụka na akwụkwọ Codex nke Aleppo abụghị ihe odide ahụ nke Ben Asher kanyere akara ndị na-egosi ebe a ga-akwụsịtụ kuru ume. Otú ọ dị, kemgbe e nwere akwụkwọ codex ahụ maka imụ ya, ihe àmà anọgidewo na-abịa na ọ bụ n’ezie, ihe odide ahụ nke Ben Asher nke Maimonides kpọtụrụ aha.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]
Bibelmuseum, Münster
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Ngalaba Ndị Juu / The New York Public Library / Astor, Lenox, and Tilden Foundations