Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
“Onye na-ekwu site n’onwe ya na-achọ otuto nke aka ya: ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya, onye ahụ bụ onye eziokwu.”—JỌN 7:18.
1. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka e si malite usoro agụmakwụkwọ?
AGỤMAKWỤKWỌ malitere eri ogologo oge gara aga. Ọ bụ ngwa ngwa mgbe Jehova Chineke, Onye Nkụzi na Onye Izi Ihe Ukwu, kere Ọkpara ya ka usoro agụmakwụkwọ nwere mmalite ya. (Aịsaịa 30:20; Ndị Kọlọsi 1:15) Nke a bụ Onye pụrụ ịmụta ihe kpọmkwem site n’ọnụ Onye Nkụzi Ukwu ahụ n’onwe ya! N’oge mkpakọrịta chiri anya nke ya na Nna ya n’ọtụtụ puku afọ a na-adịghị agụta ọnụ, Ọkpara ahụ—onye e mesịrị mara dị ka Jisọs Kraịst—nwetara agụmakwụkwọ dị oké ọnụ ahịa metụta àgwà, ọrụ, na nzube nile nke Jehova Chineke. Mgbe e mesịrị, dị ka mmadụ n’elu ala, Jisọs pụrụ ịsị: ‘Ọ dịghịkwa ihe M na-eme n’Onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.’—Jọn 8:28.
2-4. (a) Dị ka Jọn isi nke 7 si kwuo, gịnị bụgasị ọnọdụ ndị gbara ọgịga Jisọs gara Ememe Ụlọikwuu na 32 O.A. gburugburu? (b) N’ihi gịnị ka ikike izi ihe nke Jisọs ji ju ndị Juu anya?
2 Olee ụzọ Jisọs si jiri agụmakwụkwọ o nwetaworo mee ihe? N’ime afọ atọ na ọkara nile nke ozi elu ala ya, o sooro ndị ọzọ kerịta ihe ndị ọ mụtara n’adaghị mbà. Otú ọ dị, o bu otu nzube bụ́ isi n’uche wee mee nke a. Gịnịkwa ka ọ bụ? Ka anyị nyochaa okwu Jisọs na Jọn isi nke 7, ebe ọ kọwara ma mmalite ma nzube nke nkụzi ya.
3 Tụlee ọnọdụ gbara ya gburugburu. Ọ bụ oge mgbụsị akwụkwọ nke 32 O.A., ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ ka baptism Jisọs gasịrị. Ndị Juu zukọtara na Jerusalem maka Ememe Ụlọikwuu. A nọwo na-ekwu ọtụtụ ihe banyere Jisọs n’ụbọchị ole na ole ndị mbụ nke ememe ahụ. Mgbe ememe ahụ gara ọkara, Jisọs bịarutere n’ụlọ nsọ ahụ wee malite izi ihe. (Jọn 7:2, 10-14) Dị ka ọ na-eme mgbe nile, o gosiri onwe ya ịbụ Onye Ozizi ukwu.—Matiu 13:54; Luk 4:22.
4 Amaokwu nke 15 nke Jọn isi nke 7 na-asị: “Ya mere ọ na-eju ndị Juu anya, ha sị, Onye a, Ò si aṅaa mata akwụkwọ hie nne, n’ebe ọ dịghị mgbe Ọ mụworo akwụkwọ?” Ị̀ ghọtara ihe mere o ji ju ha anya? Jisọs agaghị otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị rabaị, ya mere ọ gụghị akwụkwọ—dị ka ha chere! Ma, ọ dịịrị Jisọs mfe ịchọta ma gụọ akụkụ dị iche iche nke Ihe Odide Dị Nsọ ahụ. (Luk 4:16-21) Leenụ, ọbụna na onye ọkwa nkà a bụ́ onye Galili ziri ha ihe site n’Iwu Mosis! (Jọn 7:19-23) Olee ụzọ nke a si kwe omume?
5, 6. (a) Olee otú Jisọs si kọwaa isi iyi nke ozizi ya? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si jiri agụmakwụkwọ ya mee ihe?
5 Jisọs kọwara, dị ka anyị na-agụ n’amaokwu nke 16 na 17, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime ihe Ọ na-achọ, ọ ga-amara ihe ozizi a bụ, ma ò sitere n’aka Chineke, ma ọ bụ na Mụ onwe m na-ekwu site n’Onwe m.” Ha chọrọ ịmata onye kụziiri Jisọs akwụkwọ, ọ gwakwara ha hoo haa na agụmakwụkwọ ya sitere n’aka Chineke!—Jọn 12:49; 14:10.
6 Olee ụzọ Jisọs si jiri agụmakwụkwọ ya mee ihe? Dị ka e dekọrọ na Jọn 7:18, Jisọs kwuru, sị: ‘Onye na-ekwu site n’onwe ya na-achọ otuto nke aka ya: ma onye na-achọ otuto nke onye zitere ya, onye ahụ bụ onye eziokwu, ajọ omume adịghịkwa n’ime ya.’ Lee nnọọ otú o si kwesị ekwesị na Jisọs jiri agụmakwụkwọ ya wetara Jehova otuto, “Onye zuru okè n’ọmụma ihe”!—Job 37:16.
7, 8. (a) Olee otú e kwesịrị isi jiri agụmakwụkwọ mee ihe? (b) Gịnị bụ nzube anọ gbara ọkpụrụkpụ nke agụmakwụkwọ ziri ezi?
7 Anyị si otú a mụta ihe bara uru n’aka Jisọs—e kwesịghị iji agụmakwụkwọ too onwe anyị, kama iji wetara Jehova otuto. E nweghị ụzọ ka mma isi jiri agụmakwụkwọ mee ihe. Mgbe ahụ, olee ụzọ ị pụrụ isi jiri agụmakwụkwọ wetara Jehova otuto?
8 Ịkụzi ihe pụtara “inye ọzụzụ site ná ntụziaka kwekọrọ n’usoro na ihe omume e lekọtara elekọta ka[rịsịa] na nkà, aka ọrụ, ma ọ bụ ọrụ.” Ka anyị tụlee ugbu a ebumnobi anọ gbara ọkpụrụkpụ nke agụmakwụkwọ ziri ezi na ụzọ a pụrụ isi jiri nke ọ bụla n’ime ndị a too Jehova. Agụmakwụkwọ ziri ezi kwesịrị inyere anyị aka (1) ịgụ ihe nke ọma, (2) ide ihe a pụrụ ịgụta, (3) ito eto n’ụzọ echiche na omume, na (4) inweta ọzụzụ dị irè a chọrọ maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị.
Ịmụta Ịgụ Ihe nke Ọma
9. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịbụ onye na-agụ ihe nke ọma?
9 Ihe mbụ e depụtara bụ ịmụta ịgụ ihe nke ọma. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịbụ onye na-agụ ihe nke ọma? Akwụkwọ The World Book Encyclopedia na-akọwa, sị: “Ịgụ ihe . . . bụ ihe dị mkpa ná mmụta na otu n’ime nkà ndị kasị mkpa ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. . . . Ndị nwere nkà n’ịgụ ihe na-eso ewepụta ọha na eze na-aga n’ihu, nke na-emepụta ihe. N’otu mgbe ahụ, ha onwe ha na-anụ ụtọ nke ndụ na-eju afọ karị.”
10. Olee otú ịgụ Okwu Chineke si na-enyere anyị aka ibi ndụ zuru ezu ma na-ejukwa afọ karị?
10 Ọ bụrụ na ịgụ ihe n’ozuzu ya pụrụ inyere anyị aka ịmata ụtọ nke “ndụ na-eju afọ karị,” lee ka nke a ga-esi bụrụ nnọọ eziokwu karị banyere ịgụ Okwu Chineke! Ịgụ ihe dị otú ahụ na-emeghepụ uche na obi anyị nye echiche na nzube dị iche iche nke Jehova, nghọta doro anya nke ihe ndị a na-enyekwa nzube ná ndụ anyị. Tụkwasịkwa, “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike,” ka Ndị Hibru 4:12 na-ekwu. Ka anyị na-agụ Okwu Chineke, na-atụgharịkwa uche na ya, a na-adọta anyị n’ebe Onye Chepụtara ya nọ, a na-akwalikwa anyị ime mgbanwe ná ndụ anyị ịghọkwu ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Efesọs 4:22-24) A na-akpalikwa anyị isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa anyị na-agụta. Ihe a nile na-ewetara Onye Nkụzi Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, otuto. N’ezie e nweghị ụzọ ka mma isi jiri ikike ịgụ ihe anyị mee ihe!
11. Gịnị ka e kwesịrị ịgụnye n’usoro ihe omume ziri ezi nke ọmụmụ ihe onwe onye?
11 Ma ànyị bụ nwata ma ànyị bụ okenye, a na-agba anyị ume ịmụta ịgụ ihe nke ọma, n’ihi na ịgụ ihe na-ekere òkè dị mkpa ná ndụ ndị Kraịst anyị. Tinyere ịgụ Okwu Chineke mgbe nile, usoro ọmụmụ ihe onwe onye a haziri ahazi ga-agụnye ịtụle akụkụ Bible sitere n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị, iji nlezianya gụọ Ụlọ Nche na Teta!, nakwa ịkwadebe maka nzukọ nile nke ndị Kraịst. Gịnịkwa banyere ozi ndị Kraịst? N’ụzọ doro anya, ime nkwusa ihu ọha, ime nletaghachi n’ebe ndị nwere mmasị nọ, na iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi bụcha ihe chọrọ ikike ịgụ ihe nke ọma.
Ịmụta Ide Ihe A Pụrụ Ịgụta
12. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịmụta ide ihe a pụrụ ịgụta? (b) Gịnị bụ ihe odide kasị ukwuu e deworo?
12 Nzube nke abụọ bụ na agụmakwụkwọ ziri ezi kwesịrị inyere anyị aka ịmụta ide ihe a pụrụ ịgụta. Ọ bụghị nanị na ide ihe na-eme ka ndị ọzọ mara okwu na echiche anyị kamakwa ọ na-echekwa ha. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ihe dị ka 40 ndị ikom bụ́ ndị Juu dere okwu ndị mesịrị ghọọ Akwụkwo Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ n’elu papyrus ma ọ bụ parchment. (2 Timoti 3:16) N’ezie nke a bụ ihe odide kasị ukwuu e deworo! Obi abụọ adịghị ya na Jehova duziri ọtụtụ ndepụtagharị nke okwu ndị ahụ dị nsọ n’ime ọtụtụ narị afọ, ya mere ha erutewo anyị aka n’ụzọ a pụrụ ịtụkwasị obi. Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ekele na Jehova deturu okwu ya edetu, kama ịdabere n’iji okwu ọnụ gbasaa ya?—Tụlee Ọpụpụ 34:27, 28.
13. Gịnị na-egosi na ndị Israel maara otú e si ede ihe?
13 N’oge ochie, nanị ụfọdụ ndị ihe dabaara gụrụ akwụkwọ, dị ka ndị odeakwụkwọ na Mesopotamia na Ijipt. N’ụzọ dịwagara iche n’ebe mba nile dị, a gbara onye ọ bụla n’Israel ume ịgụ akwụkwọ. Iwu ahụ dị na Deuterọnọmi 6:8, 9 maka ndị Israel idekwasị ihe n’ibo ụzọ ha, ọ bụ ezie na o doro anya na ọ bụ ihe atụ, gosiri na ha maara ụzọ e si ede ihe. Mgbe ha ka bụ nwata, a na-akụziri ụmụaka ide ihe. Kalenda Gezer, bụ́ otu n’ime ihe atụ ndị kasị ochie nke ihe odide Hibru oge ochie, ka ụfọdu ndị ọkà mmụta na-eche na ọ bụ ihe nwa akwụkwọ ji amụ ibu ihe n’isi.
14, 15. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi jiri ikike nke ide ihe mee ihe n’ụzọ na-aba uru ma na-ewuli elu?
14 Ma olee ụzọ anyị pụrụ isi jiri ikike nke ide ihe mee ihe n’ụzọ na-aba uru ma na-ewuli elu? N’ezie site n’idetu ihe ná nzukọ na mgbakọ dị iche iche. Akwụkwọ ozi, ọbụna ma e dee ya “n’okwu ole na ole,” pụrụ inye onye ọrịa agbamume ma ọ bụ kelee nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị ime mmụọ meere anyi ihe ọma ma ọ bụ lee anyị ọbịa. (1 Pita 5:12) Ọ bụrụ na e nwere onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ n’ọgbakọ, akwụkwọ ozi dị nkenke ma ọ bụ kaadị pụrụ ikwuru anyị ‘okwu ngụgụ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst onye nne ya nwụnahụrụ n’ihi ọrịa cancer kọwara, sị: “Otu enyi m detaara m akwụkwọ ozi mara mma. Nke ahụ nyeere m nnọọ aka n’ihi na apụrụ m ịgụ ya mgbe mgbe.”
15 Ụzọ magburu onwe ya isi jiri ikike ide ihe mee ihe bụ iwetara Jehova otuto site n’ide akwụkwọ ozi iji gbaa àmà banyere Alaeze ahụ. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị mkpa ịdegara ndị ọhụrụ nwere mmasị ndị bi n’ókèala dịpụrụ nnọọ adịpụ akwụkwọ ozi. Nrịanrịa pụrụ ime ka o siere gị ike na nwa oge ije ozi ụlọ n’ụlọ. Ma eleghị anya akwụkwọ ozi pụrụ ikwu ihe ị gaara ekwu n’onwe gị.
16, 17. (a) Ahụmahụ dị aṅaa na-eme ihe atụ uru nke ide akwụkwọ ozi iji gbaa àmà Alaeze? (b) Ị̀ pụrụ ịkọ ahụmahụ yiri nke ahụ?
16 Tụlee otu ahụmahụ. Ọtụtụ afọ gara aga otu Onyeàmà dere otu akwụkwọ ozi na-agba àmà Alaeze nye nwunye nke otu nwoke a kpọsara ọnwụ ya n’akwụkwọ akụkọ obodo ahụ. E nwetaghị nzaghachi. Mgbe e mesịrị, na November 1994, ka 21 afọ gasịrị, Onyeàmà ahụ natara akwụkwọ ozi sitere n’aka ada nwanyị ahụ. Ada nwanyị ahụ dere, sị:
17 “N’April 1973, i detaara mama m akwụkwọ ịkasi ya obi mgbe ọnwụ papa m gasịrị. Adị m afọ itoolu n’oge ahụ. Mama m mụrụ Bible, ma ruo ugbu a ọ bụbeghị ohu Jehova. Otú ọ dị, ọmụmụ ihe ya mesịrị duje na mụ isonyere eziokwu ahụ. Na 1988, amalitere m ịmụ Bible—afọ 15 mgbe a natasịrị akwụkwọ ozi gị. Na March 9, 1990, e mere m baptism. Enwere m obi ekele dị ukwuu maka akwụkwọ ozi gị nke ọtụtụ afọ gara aga, na-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu ime ka ị mara na site n’enyemaka Jehova, mkpụrụ ndị ahụ ị kụrụ puru. Mama m nyere m akwụkwọ ozi gị idebe, ọ ga-amasịkwa m ịmata onye ị bụ. Enwere m olileanya na akwụkwọ ozi nke a ga-eru gị aka.” Akwụkwọ ozi ada nwanyị ahụ, nke gụnyere adres na nọmba fon ya, n’ezie ruru nwanna nwanyị nke dere akwụkwọ ozi ahụ ọtụtụ afọ gara aga aka. Cheedị ihe ijuanya ọ ga-abụrụ nwa agbọghọ ahụ mgbe o nwetara òkù fon site n’aka Onyeàmà ahụ—onye ka nọgidere na-ede akwụkwọ ozi iji soro ndị ọzọ na-ekerịta olileanya Alaeze ahụ!
Ito Eto n’Ụzọ Echiche, Omume, na n’Ime Mmụọ
18. N’oge Bible, olee otú ndị nne na nna si lekọta agụmakwụkwọ n’ụzọ echiche na omume nke ụmụ ha?
18 Nzube nke atọ bụ na agụmakwụkwọ ziri ezi kwesịrị inyere anyị aka ito eto n’ụzọ echiche na omume. N’oge Bible e lere ọzụzụ echiche na omume nke ụmụaka anya dị ka otu n’ime ibu ọrụ ndị bụ isi nke ndị mụrụ ụmụ. A naghị akụziri ụmụaka nanị ụzọ e si agụ na ụzọ e si ede ihe kamakwa, n’ụzọ ka mkpa, a na-akụziri ha ihe n’Iwu Chineke, nke gụnyere ihe nile ha na-eme ná ndụ. Ya mere, agụmakwụkwọ gụnyere ntụziaka banyere ibu ọrụ okpukpe ha, ụkpụrụ ndị na-achịkwa alụmdi na nwunye, mmekọrịta ezinụlọ, na ịdị ọcha mmekọahụ, tinyekwara ibu ọrụ n’ebe mmadụ ibe ha nọ. Agụmakwụkwọ dị otú ahụ nyeere ha aka ito eto, ọ bụghi nanị n’echiche na omume, kamakwa n’ụzọ ime mmụọ.—Deuterọnọmi 6:4-9, 20, 21; 11:18-21.
19. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta agụmakwụkwọ na-egosi anyị ụkpụrụ kasị mma iji bie ndụ ma nyere anyị aka ito eto n’ime mmụọ?
19 Gịnị banyere taa? Agụmakwụkwọ dị mma nke ụwa dị mkpa. Ọ na-enyere anyị aka ito eto n’ụzọ echiche. Ma olee ebe anyị pụrụ ichigharịkwuru maka agụmakwụkwọ nke ga-egosi anyị ụkpụrụ omume kasị mma anyị ga-eji bie ndụ na nke ga-enyere anyị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ? N’ọgbakọ ndị Kraịst, anyị nwere usoro agụmakwụkwọ ọchịchị Chineke nke a na-enweghị n’ebe ọzọ n’ụwa. Site n’ọmụmụ ihe onwe onye anyị nke Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible, tinyekwara ntụziaka a na-enye ná nzukọ ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche, anyị pụrụ inweta agụmakwụkwọ nke a dị oké ọnụ ahịa nke na-aga n’ihu—agụmakwụkwọ Chineke—n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Gịnị ka ọ na-akụziri anyị?
20. Gịnị ka agụmakwụkwọ Chineke na-ezi anyị, gịnịkwa na-esi na nke ahụ pụta?
20 Mgbe anyị malitere ịmụ Bible, anyị na-amụta nkụzi Akwụkwọ Nsọ ndị bụ isi, ‘okwu ndị mmalite.’ (Ndị Hibru 6:1) Ka anyị na-aga n’ihu, anyị na-eri “nri siri ike”—ya bụ, eziokwu ndị ka mie emie. (Ndị Hibru 5:14) Ma, karịa nke ahụ, anyị na-amụta ụkpụrụ Chineke ndị na-akụziri anyị ụzọ ibi ndụ dị ka Chineke si chọọ ka anyị na-ebi. Dị ka ihe atụ, anyị na-amụta izere àgwà na omume ndị ‘na-emerụ ahụ’ na inwe nkwanye ùgwù maka ịchịisi na maka ahụ na ihe onwunwe nke ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 7:1; Taịtọs 3:1, 2; Ndị Hibru 13:4) Tụkwasịkwa, anyị na-aghọta mkpa nke ịkwụwa aka ọtọ na ịdị uchu n’ọrụ anyị na uru nke ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Bible banyere mmekọahụ dị mma. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Efesọs 4:28) Ka anyị na-enwe ọganihu n’itinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị na-eto n’ime mmụọ, mmekọrịta anyị na Chineke na-emiwanyekwa. Ọzọkwa, àgwà Chineke anyị na-eme anyị ezi ndị amaala, n’agbanyeghị ebe anyị bi. Nke a pụkwara ịkwali ndị ọzọ ito Isi Iyi nke agụmakwụkwọ Chineke—Jehova Chineke.—1 Pita 2:12.
Ọzụzụ Dị Irè Maka Ndụ A Na-adị Kwa Ụbọchị
21. Ọzụzụ dị irè dị aṅaa ka ụmụ natara n’oge Bible?
21 Nzube nke anọ nke agụmakwụkwọ ziri ezi bụ inye mmadụ ọzụzụ dị irè a chọrọ maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ọzụzụ nke nne na nna na-enye n’oge Bible gụnyere ọzụzụ ime ihe eme. A kụziiri ụmụ agbọghọ nkà ọrụ ụlọ. Isiakwụkwọ ikpeazụ nke Ilu na-egosi na nke a aghaghị ịdịwo ọtụtụ ma dị iche iche. Ya mere, a na-akwadebe ụmụ agbọghọ ịtụ ogho, ịkpa ákwà, nakwa isi nri na nlekọta ezinụlọ, ịzụ ahịa, na ịhụ maka okwu ala na ụlọ. A na-akụzikarịrị ụmụ okorobịa ọrụ ego nna ha na-arụ, ma ọ́ bụghị ọrụ ugbo ọ bụrụ ọrụ aka ma ọ́ bụ nkà. Jisọs mụtara ọrụ ịkwa nkà site n’aka nna kuchiri ya bụ́ Josef; ya mere a kpọghị ya nanị “nwa onye ọkà” kamakwa “onye ọkà.”—Matiu 13:55; Mak 6:3.
22, 23. (a) Maka gịnị ka agụmakwụkwọ kwesịrị ịkwadebe ụmụaka? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnuche anyị n’ịhọrọ ịgụkwu akwụkwọ mgbe nke ahụ pụrụ iyi ihe dị mkpa?
22 Taakwa, agụmakwụkwọ nwere ezi nhazi na-agụnye ime nkwadebe maka ilekọta mkpa nke ezinụlọ otu ụbọchị. Okwu Pọl onyeozi ndị dị na 1 Timoti 5:8 na-egosi na mmadụ inye ezinụlọ ya ihe na-akpa ya bụ ibu ọrụ dị nsọ. O dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” Ya mere, agụmakwụkwọ kwesịrị ịkwadebe ụmụaka maka ibu ọrụ ndị ha ga-ewere ná ndụ ma jikewe ha ịbụ ndị òtù na-arụsi ọrụ ike nke obodo.
23 Agụmakwụkwọ ha aṅaa ka anyị kwesịrị ịchụso? Nke a pụrụ ịdị iche site ná mba gaa ná mba. Ma ọ bụrụ na ịrụ ọrụ achọọ ọzụzụ tinyere ókè kasị nta iwu chọrọ, ọ dịịrị nne na nna iduzi ụmụ ha n’ime mkpebi banyere inwekwu agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ, na-atụle ma uru ma ọghọm ndị ga-esi n’inwekwu ọmụmụ ihe dị otú ahụ apụta. Ma, gịnị kwesịrị ịbụ ebumnuche mmadụ n’ịhọrọ ịgụkwu akwụkwọ mgbe nke ahụ yiri ka ọ dị mkpa? N’ezie ọ bụghị akụ̀ na ụba, nganga ma ọ bụ otuto onwe onye. (Ilu 15:25; 1 Timoti 6:17) Cheta ihe anyị mụtara site n’ihe nlereanya Jisọs—e kwesịrị iji agụmakwụkwọ wetara Jehova otuto. Ọ bụrụ na anyị ahọrọ ịgụkwu akwụkwọ, mkpali anyị kwesịrị ịbụ ọchịchọ ịkwado onwe anyị n’ụzọ zuru ezu ka anyị wee nwee ike ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu dị ka o kwere mee n’ozi ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:23, 24.
24. Ihe dị aṅaa anyị mụtara n’aka Jisọs ka anyị na-ekwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla?
24 Ya mere, ka anyị dị uchu ná mgbalị anyị nile inweta agụmakwụkwọ ziri ezi nke ụwa. Ka anyị jiri usoro ihe omume nke agụmakwụkwọ Chineke na-aga n’ihu ugbu a nke a na-enye n’ime nzukọ Jehova, mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ka anyị gharakwa ichezọ ihe bara uru anyị mụtara n’aka Jisọs Kraịst, bụ́ nwoke kasị gụọ akwụkwọ nọtụworo n’elu ala—e kwesịrị iji agụmakwụkwọ wetara Onye Nkụzi kasị ukwuu, bụ́ Jehova Chineke otuto, ọ bụghị ito onwe anyị!
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee otú Jisọs si jiri agụmakwụkwọ ya mee ihe?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịmụta ịgụ ihe nke ọma?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi jiri ikike ide ihe wetara Jehova otuto?
◻ Olee otú agụmakwụkwọ Chineke si na-enyere anyị aka ito eto ma n’ụzọ omume ma n’ụzọ ime mmụọ?
◻ Ọzụzụ dị irè dị aṅaa ka agụmakwụkwọ ziri ezi kwesịrị ịgụnye?
[Igbe dị na peeji nke 13]
Enyemaka Dị Irè Maka Ndị Nkụzi
Ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” n’afọ 1995/1996, Watch Tower Society wepụtara broshuọ ọhụrụ a kpọrọ Jehovah’s Witnesses and Education. E bipụtawo broshuọ a dị 32 peji, tụrụ àgwà zuru ezu karịsịa maka ndị nkụzi. Ka ọ dị ugbu a, a sụgharịwo ya gaa na 58 asụsụ.
N’ihi gịnị ka e ji mepụta broshuọ maka ndị nkụzi? Iji nyere ha aka ịghọta nkwenkwe nke ụmụ akwụkwọ bụ́ ụmụaka nke Ndịàmà Jehova nke ọma karị. Gịnị dị n’ime broshuọ ahụ? N’ụzọ doro anya ma zie ezie, ọ na-akọwa echiche anyị n’okwu ndị dị ka ịgụkwu akwụkwọ, ụbọchị ọmụmụ na Krismas, na ikele ọkọlọtọ. Broshuọ ahụ na-emesighachikwa ndị nkụzi obi ike na anyị chọrọ ka ụmụaka anyị rite uru kasị ukwuu n’ịgụ akwụkwọ ha nakwa na anyị chọrọ n’ezie ịkwado ndị nkụzi, na-enwe ezi mmasị n’agụmakwụkwọ ụmụaka anyị.
Olee otú a pụrụ isi jiri broshuọ Education ahụ eme ihe? Ebe ọ bụ na a kwadebere ya maka ndị nkụzi, ka anyị soro ndị nkụzi, ndị isi ụlọ akwụkwọ kọleji, na ndị ọrụ ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ kerịta ya. Ka broshuọ ọhụrụ a nyere ndị nkụzi nile dị otú ahụ aka ịghọta echiche na nkwenkwe anyị na ihe mere mgbe ụfọdụ anyị na-eji azọrọ ikike nke ịdị iche. A na-agba ndị nne na nna ume iji broshuọ ahụ mee ihe dị ka ebe ndabere maka isoro ndị nkụzi ụmụ ha na-enwe nkwurịta okwu.
[Foto dị na peeji nke 10]
N’Israel oge ochie e ji agụmakwụkwọ kpọrọ oké ihe