Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 29
  • Uru nke Papyrus nke Nash

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru nke Papyrus nke Nash
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Dị na Papyrus nke Nash
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Baịbụl—Akụkọ Dị Ịtụnanya nke Otú O Si Dịruo n’Oge Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Abụ Oké Osimiri”—Ihe Odide nke Jikọrọ Oge Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Àkụ́ Site n’Íkpó Ihe Mkpofu Dị n’Ijipt
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 29

Uru nke Papyrus nke Nash

OLEE otú ị pụrụ isi kwuo n’ụzọ ziri ezi afọ ole ihe odide oge ochie nke Bible Hibru dị? Nke ahụ bụ nsogbu na-eche Dr. John C. Trever ihu na 1948 mgbe ọ hụrụ Mpịakọta Aịsaịa nke Osimiri Nnú ahụ nke mbụ ya. Otú e si dee mkpụrụ okwu Hibru ndị ahụ juru ya anya. Ọ maara na mkpụrụ okwu ndị ahụ ga-ekwu oge e dere ya, ma ọ̀ bụ gịnị ka ọ ga-eji tụnyere ha? N’izi ezi, o kwubiri, sị: Ọ bụ nanị ihe odide Papyrus nke Nash. N’ihi gịnị? Gịnị bụ ihe odide nke a, ebeekwa ka o sitere?

Papyrus nke Nash nwere nanị mpekere anọ nke 24 ahịrị nke akụkụ ihe odide Hibru, hara ihe dị ka inch atọ n’obosara na inch ise n’ogologo. A kpọkwasịrị ya aha W. L. Nash, odeakwụkwọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị E Gwutere n’Ala Na-akwado Bible, bụ́ onye zụtara ya n’aka onye Ijipt na-ere ahịa na 1902. S. A. Cooke bipụtara ya n’afọ nke na-esonụ n’akwụkwọ òtù ahụ bụ́ Proceedings, e nyekwara ya Ebe Ndebe Akwụkwọ nke Cambridge University, England, ebe ọ nọgideworo. Uru nke mpekere papyrus nke a dị n’ime ochie ya. Ndị mmụta kwuru na e dere ya na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ nke mbụ T.O.A., ya mere ọ bụ akwụkwọ ihe odide Hibru kasị mee ochie a chọtaworo.

Mgbe Dr. Trever jiri akwụkwọ mpịakọta dị n’ihu ya tụnyere ihe nkiri slide tụrụ agwa agwa nke Paypyrus nke Nash, o leruru anya n’ọdịdị na otú mkpụrụ okwu ndị ahụ dị n’otu n’otu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha yiri nke ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ o juru ya anya na ihe odide ahụ buru ibu a chọtara ọhụrụ pụrụ ịbụ nke e dere n’otu oge ochie ahụ mgbe e dere Papyrus nke Nash. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga a nwapụtara echiche ya ịbụ nke ziri ezi. Mpịakọta Aịsaịa nke Osimiri Nnu ahụ bụ nke narị afọ nke abụọ T.O.A.!

Ihe Ndị Dị na Papyrus nke Nash

Nnyocha nke akụkụ ihe odide Papyrus nke Nash kpughere na 24 ahịrị ya nile ezughị ezu, na-enwe otu okwu ma ọ bụ mkpụrụ okwu ndị na-efu n’akụkụ aka nri na aka ekpe ya. O nwere akụkụ dị iche iche nke Iwu Iri ahụ site n’Ọpụpụ isi nke 20, tinyere amaokwu ụfọdụ sitere na Deuterọnọmi isi nke 5 na 6. Ya mere nke a abụghị nanị ihe odide Bible kama akụkụ ihe odide a chịkọtara ọnụ ná nzube pụrụ iche. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ akụkụ nke nchịkọta okwu ntụziaka iji chetara onye Juu ọrụ ya n’ebe Chineke nọ. E depụtara ugboro ugboro otu akụkụ nke akwụkwọ nsọ na-amalite na Deuterọnọmi 6:4, bụ́ nke a kpọrọ Shema. Amaokwu ahụ na-agụ sị: “Nụrụnụ, Israel; Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu.”

Mkpụrụ okwu anọ ahụ, bụ́ YHWH, “Jehova,” n’amaokwu a pụtara ìhè ugbo abụọ n’ahịrị ikpeazụ nke papyrus ahụ, ọ pụtakwara n’ebe ise ọzọ. Ọ pụtakwara otu ugbo ọzọ ebe mkpụrụ okwu mbụ ya na-efu efu.

E bu n’uche ka Shema ahụ karịsịa mesie ike “ịdị otu nke ọdịdị Chineke.” Dị ka Talmud ndị Juu si dị (Berakoth 19a), okwu mmechi, bụ́ ʼE·chadʹ (“Otu”), “kwesịrị ka e mesie ya ike n’ụzọ pụrụ iche mgbe a na-akpọpụta ya site n’ịkpọpụta akụkụ mkpọkọpụta ya nke ọ bụla.” (W. O. E. Oesterley na G. H. Box) N’izo aka n’ebe Chineke nọ, ʼE·chadʹ e mere ka ọ dịwanye ogologo kpọsakwara ịdị iche ya.

Taa, Papyrus nke Nash nwere ọtụtụ ndị e dere ha na ya n’otu oge, karịsịa n’etiti ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’ógbè ndị dị n’ụsọ Osimiri Nnu ahụ nso Qumran. Nnyocha ndị sara mbara emesiwo ya ike na e dere ọtụtụ n’ime ihe odide ndị a na narị afọ nke mbụ na nke abụọ T.O.A. a Ọ bụ ezie na ọ bụkwaghị ihe odide Hibru kasị mee ochie a maara, Papyrus nke Nash ka na-adọrọkwa mmasị dị ukwuu. Ọ kabụkwa nanị ya bụ ihe odide Hibru nke Bible e dere n’oge ochie ahụ nke a chọtara n’Ijipt.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke April 15, 1991, peji nke 10-13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya