Ndị Na-enye Ìhè—N’ihi Nzube Dị Aṅaa?
“Edebewo m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba nile.”—ỌRỤ 13:47.
1. Olee ụzọ iwu ahụ e zoro aka na ya n’Ọrụ Ndị Ozi 13:47 si metụta Pọl onyeozi?
“OTÚ a ka [Jehova, NW] nyeworo anyị iwu, sị, Edebewo m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba nile, ka i wee dị inye nzọpụta ruo nsọtụ ụwa,” ka Pọl onyeozi kwuru. (Ọrụ 13:47) Ọ bụghị nanị na o kwuru nke ahụ kama ọ ghọtakwara oké mkpa ọ dị. Mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst, Pọl raara ndụ ya nile nye n’imezu iwu ahụ. (Ọrụ 26:14-20) È nyewokwa anyị iwu ime nke ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa n’oge anyị?
Mgbe ‘Ìhè ahụ Nyụrụ’ nye Agbụrụ Mmadụ
2. (a) Ka ụwa na-abanye na mgbe ọgwụgwụ ya, gịnị weere ọnọdụ nke metụtara n’ụzọ dị ukwuu ọnọdụ ime mmụọ na nke omume ya? (b) Olee ụzọ otu nwa amadị nke mba Britain si meghachi omume n’ihe ọ hụrụ na-ewere ọnọdụ n’August 1914?
2 Tupu a mụọ ihe ka ọtụtụ ná ndị dị ndụ taa, ụwa nke a banyere na mgbe ọgwụgwụ ya. Ihe ndị dị ịrịba ama mere ngwa ngwa ná nsochi ná nsochi. A tụdara Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye isi nkwalite nke ọchịchịrị ime mmụọ na nke omume, n’elu ala. (Ndị Efesọs 6:12; Mkpughe 12:7-12) E meworị ka ihe a kpọrọ mmadụ dabanye n’ime agha ụwa mbụ ya. Ná mmalite nke August 1914, mgbe agha ghọworo ihe e ji n’aka, Sir Edward Grey, bụ́ odeakwụkwọ obodo nke mba Britain n’ihe ndị metụtara mba ọzọ, guzo na window nke ọfịs ya na London wee sị: “Oriọna ndị ahụ na-anyụ anyụ na Europe nile; anyị agaghị ahụ ka a mụnyere ha ọkụ ọzọ n’oge ndụ anyị.”
3. Ihe ịga nke ọma dị aṅaa ka ndị ndú ụwa nweworo n’ịgbalị ime ka ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ dị mma?
3 Ná mgbalị iji mee ka ìhè ndị ahụ maliteghachi inwu, e guzobere Njikọ Mba Nile na 1920. Ma ìhè ahụ enwupụtachaghị. Ná ngwụsị nke agha ụwa nke abụọ, ndị ndú ụwa gbalịrị ọzọ, nke ugbu a site n’iguzobe òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Ọzọkwa, ìhè ndị ahụ enwupụtaghị nke ọma. Otú ọ dị, n’ihi ihe ndị na-eme n’oge ndị na-adịbeghị anya, ndị ndú ụwa anọwo na-ekwu okwu banyere “usoro ụwa ọhụrụ.” Ma a pụghị ikwu na “ụwa ọhụrụ” nke ha wetawooro emewo ka e nwee ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ụzọ megidere nke ahụ, mburịta agha, esemokwu agbụrụ, mpụ, enweghị ọrụ, ịda ogbenye, mmetọ nke gburugburu ebe obibi, na ọrịa dị iche iche anọgidewo na-emebi ọṅụ ụmụ mmadụ na-enweta ná ndụ.
4, 5. (a) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ọchịchịrị si gbaa n’etiti ezinụlọ mmadụ? (b) Gịnị dị mkpa iji wee weta izu ike?
4 N’ezie, ọ bụ n’oge dị anya tupu afọ 1914 ka ìhè ndị ahụ nyụnahụrụ agbụrụ mmadụ. Nke ahụ mere n’ihe dị ka 6,000 afọ gara aga n’Iden, mgbe nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ họọrọ imere onwe ha mkpebi n’ajụghị ase ihe bụ uche Chineke nke o kwupụtara ekwupụta. Ahụmahụ ndị ahụ jọgburu onwe ha nke agbụrụ mmadụ kemgbe ahụ bụ nanị usoro ihe omume ndị dị n’okpuru ihe Bible kpọrọ ‘ike nke ọchịchịrị.’ (Ndị Kọlọsi 1:13) Ọ bụ n’okpuru mmetụta nke Setan bụ́ Ekwensu ka nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, nunyere ụwa n’ime mmehie; sitekwa n’aka Adam, mmehie na ọnwụ gbasara ruo ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 3:1-6; Ndị Rom 5:12) Agbụrụ mmadụ si otú a tụfuo nnwapụta nke Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ìhè na nke ndụ.—Abụ Ọma 36:9.
5 Nanị ụzọ a pụrụ isi mee ka ìhè ahụ nwuo ọzọ n’ezie nye onye ọ bụla n’etiti agbụrụ mmadụ ga-abụ ma ha nweta nnwapụta Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ahụ, a pụrụ iwepụ “ihe mfụchi ahụ e ji afụchi ndị nile dị iche iche,” bụ́ amamikpe n’ihi mmehie. Olee otú nke a ga-esi kwe omume?—Aịsaịa 25:7.
Onye E Nyeworo ‘Ịbụ Ìhè nke Mba Nile’
6. Olileanya dị aṅaa dị ebube ka Jehova meworo ka o kwe omume nye anyị site n’aka Jisọs Kraịst?
6 Ọbụna tupu a chụpụ Adam na Iv na Paradaịs, Jehova buru amụma banyere otu “mkpụrụ” nke ga-abụ onye mgbapụta nke ndị hụrụ ezi omume n’anya. (Jenesis 3:15) Mgbe a mụsịkwara Mkpụrụ ahụ e kwere na nkwa dị ka mmadụ, Jehova mere ka agadi nwoke bụ́ Simeọn, n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, mata onye ahụ dị ka “ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ.” (Luk 2:29-32) Site n’inwe okwukwe n’àjà nke ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs, a pụrụ ịnapụta ụmụ mmadụ n’amamikpe nke sitere ná mmehie e bu pụta ụwa. (Jọn 3:36) N’ikwekọ n’uche Jehova, ha pụrụ ilepụ anya ugbu a gaa ná ndụ ebighị ebi n’izu okè dị ka akụkụ nke Alaeze eluigwe ma ọ bụ dị ka ndị ọ ga-achị na paradaịs elu ala. Lee aha onyinye dị ebube nke ahụ bụ!
7. N’ihi gịnị ka nkwa ahụ dị n’Aịsaịa 42:1-4 na mmezu ha na narị afọ mbụ ji mee ka anyị jupụta n’olileanya?
7 Jisọs Kraịst n’onwe ya bụ ihe na-eme ka e jiri n’aka na a ga-emezu olileanya ndị a magburu onwe ha. N’ihe metụtara ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ ndị ọrịa, Matiu onyeozi ji ihe e dere n’Aịsaịa 42:1-4 mee ihe banyere ya. Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu, ná mkpirikpi, sị: “Lee ohu m, onye m na-ejide aka; onye nke m m họpụtara, onye ihe ya tọrọ mkpụrụ obi m ụtọ: atụkwasịwo m ya mmụọ m; ikpe ka ọ ga-ewepụtara mba nile.” Nke a ọ́ bụghịkwa ihe dị ndị nke mba nile mkpa? Amụma ahụ gara n’ihu ịsị: “Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ewelikwa olu ya elu, ọ gaghị emekwa ka a nụ olu ya n’èzí. Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa, ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-enwu inyoghị inyoghị.” N’ikwekọ na nke a, Jisọs emesoghị ndị e wedaworo n’ala omume aka ike. O gosiri ọmịiko n’ebe ha nọ, kụziere ha banyere nzube Jehova, ma gwọọ ha ọrịa.—Matiu 12:15-21.
8. N’echiche dị aṅaa ka Jehova nyeworo Jisọs ‘ịbụ ọgbụgba ndụ nke ndị ya’ na ‘ịbụ ìhè nke mba nile’?
8 Onye Nyere amụma nke a tụkwasịrị uche ya n’ebe Ohu ya nọ, n’ebe Jisọs nọ, wee sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, akpọwo gị n’ezi omume, m ga-ejidekwa aka gị, chebe gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m, ka ị bụrụkwa ìhè nke mba nile; imeghe anya nile kpuru ìsì, ime ka onye mkpọrọ si n’ebe e mechibidoworo ya pụta, ime ka ndị naanọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.” (Aịsaịa 42:6, 7) Ee, Jehova enyewo Jisọs Kraịst ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ, dị ka ezi ihe nke na-eme ka e jiri nkwa ahụ n’aka. Lee ihe na-agba ume nke ahụ bụ! Jisọs gosiri ezi nchegbu maka agbụrụ mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa; ọbụna na o nyere ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Nke a bụ onye Jehova nyeworo ike ịchị mba nile. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kpọọ ya ìhè nke mba nile. Jisọs n’onwe ya sịrị: “Mụ onwe m bụ ìhè nke ụwa.”—Jọn 8:12.
9. N’ihi gịnị ka Jisọs ji ghara ịrara onwe ya nye n’imeziwanye usoro ihe dị n’oge ahụ?
9 N’ihi nzube dị aṅaa ka Jisọs ji jee ozi dị ka ìhè nke ụwa? N’ezie, ọ bụghị maka nzube ihe ụwa ma ọ bụ nke ịhụnanya ihe onwunwe ọ bụla. Ọ jụrụ ịgbalị ime ka usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’oge ahụ guzozie, ọ jụkwara ịnara ịnara ọbụbụeze, ma ọ̀ bụ n’aka Setan, bụ́ onye ọchịchị ụwa, ma ọ̀ bụ n’aka ụmụ mmadụ. (Luk 4:5-8; Jọn 6:15; 14:30) Jisọs gosiri obi ebere dị ukwuu n’ahụ ndị e wedara n’ala, o wetakwaara ha izu ike n’ụzọ nke ndị ọzọ na-apụghị. Ma ọ maara na a pụghị inweta izu ike na-adịgide adịgide n’okpuru nhazi nke òtù ụmụ mmadụ ndị nọ n’okpuru amamikpe Chineke n’ihi mmehie ha bu pụta ụwa, bụrụkwa nke ike ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya na-eduzi. Site ná nghọta sitere n’aka Chineke, Jisọs tụkwasịrị ndụ ya nile n’ime uche Chineke.—Ndị Hibru 10:7.
10. N’ụzọ ndị dị aṅaa na n’ihi nzube dị aṅaa ka Jisọs ji jee ozi dị ka ìhè nke ụwa?
10 Mgbe ahụ, n’ụzọ ndị dị aṅaa na n’ihi nzube dị aṅaa ka Jisọs ji jee ozi dị ka ìhè nke ụwa? Ọ raara onwe ya nye n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 4:43; Jọn 18:37) Site n’ịgbara eziokwu banyere nzube Jehova àmà, Jisọs nyekwara aha Nna ya nke eluigwe otuto. (Jọn 17:4, 6) Tụkwasịkwa, dị ka ìhè nke ụwa, Jisọs kpughere ụgha dị iche iche nke okpukpe wee si otú a nye ndị nọ n’agbụ okpukpe nnwere onwe ime mmụọ. O kpughere Setan dị ka onye a na-adịghị ahụ anya nke na-eduzi ndị hapụrụ onwe ha ka o jiri ha na-arụ ọrụ. Jisọs mekwara ka a mata ọrụ ndị bụ nke ọchịchịrị n’ụzọ doro anya. (Matiu 15:3-9; Jọn 3:19-21; 8:44) N’ụzọ pụtara ìhè, o gosiri onwe ya ịbụ ìhè nke ụwa site n’ịtọgbọ ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta, si otú a na-emeghepụ ụzọ maka ndị na-egosipụta okwukwe ná ndokwa nke a inweta mgbaghara mmehie, mmekọrịta a nwapụtara anwapụta nke ha na Chineke, na olileanya maka ndụ ebighị ebi dị ka akụkụ nke ezinụlọ eluigwe na ala nke Jehova. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) N’ikpeazụkwa, site n’ijigide nsọpụrụ Chineke nke zuru okè ná ndụ ya nile, Jisọs kwadoro ọkaaka Jehova ma gosi Ekwensu ịbụ onye ụgha, si otú a na-eme ka o kwe omume nye ndị hụrụ ezi omume n’anya inweta uru ebighị ebi. Ma Jisọs ọ̀ gaje ịbụ onye nanị ya na-enye ìhè?
“Unu Onwe Unu Bụ Ìhè nke Ụwa”
11. Ka ha wee bụrụ ndị na-enye ìhè, gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na-aghaghị ime?
11 Na Matiu 5:14, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa.” Ha gaje ịgbaso nzọụkwụ ya. Ma site n’ụzọ ha si ebi ndụ ma site ná nkwusa ha, ha ga-eduzi ndị ọzọ gaa n’ebe Jehova nọ dị ka Isi Iyi nke ezi ìhè. N’iṅomi Jisọs, ha ga-eme ka a mara aha Jehova ma kwadoo ọkaaka Ya. Dị ka Jisọs mere, otú ahụ ka ha ga-akpọsa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Ha ga-ekpughekwa ụgha nke okpukpe, ọrụ ndị bụ nke ọchịchịrị, na ajọ onye ahụ nke nọ n’azụ ihe ndị a. Ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-agwa ndị mmadụ n’ebe nile banyere ndokwa ịhụnanya Jehova mere maka nzọpụta site na Jisọs Kraịst. Lee ụdị ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst mbụ ji jee ozi ahụ, buru ụzọ na-amalite na Jerusalem na Judia, mgbe ahụkwa, na-abanye n’ime Sameria, dị ka Jisọs nyeworo n’iwu!—Ọrụ 1:8.
12. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka ìhè ime mmụọ ahụ ga-agbasaru? (b) Gịnị ka mmụọ Jehova nyeere Pọl aka ịghọta banyere Aịsaịa 42:6, oleekwa ụzọ amụma ahụ kwesịrị isi metụta ndụ anyị?
12 Otú ọ dị, ikwusa ozi ọma ahụ agaghị ejedebe n’ubi ahụ. Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ka ha “mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 28:19) N’oge a tọghatara Sọl onye Tasọs, Onyenwe anyị gosipụtara kpọmkwem na Sọl (onye ghọrọ Pọl onyeozi) ga-ekwusara, ọ bụghị nanị ndị Juu, kama, ndị Jentaịl, ozi ọma. (Ọrụ 9:15) Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, Pọl ghọtara ihe nke ahụ gụnyere. Otú a, ọ chọpụtara na amụma ahụ nke dị n’Aịsaịa 42:6, bụ́ nke mezuru kpọmkwem n’ebe Jisọs Kraịst nọ, bụkwa iwu e nyere ndị nile na-etinye okwukwe n’ebe Kraịst nọ. Ya mere, n’Ọrụ Ndị Ozi 13:47, mgbe o hotara okwu site n’Aịsaịa, Pọl sịrị: “Otú a ka Onyenwe anyị nyeworo anyị iwu, sị, Edebewo m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba nile, ka i wee dị inye nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.” Olee banyere gị? Ì jiriwo ibu ọrụ ahụ nke ịbụ onye na-enye ìhè kpọrọ ihe? Dị ka Jisọs na Pọl, ị̀ na-eme ka isi ihe dị ná ndụ gị bụrụ ime uche Chineke?
Ìhè na Eziokwu Sitere na Chineke Maka Idu Anyị
13. N’ikwekọ n’Abụ Ọma 43:3, gịnị bụ ekpere anyị ji ezi ọchịchọ na-ekpe, gịnịkwa ka nke a na-echebe anyị pụọ na ya?
13 Ọ bụrụ na site ná nchepụta nke aka anyị na anyị gbalịrị ‘ime ka ìhè ahụ nwupụtaghachi,’ iji mee ka ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ dị mma, anyị ga-abụ ndị hiere ụzọ nke ukwuu n’ịghọta isi ihe dị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ụwa dum na-eme, ezi ndị Kraịst na-elegara Jehova anya dị ka ezi Isi Iyi nke ìhè. Ekpere ha yiri nke ahụ e dekọrọ n’Abụ Ọma 43:3, nke na-asị: “Zipụta ìhè gị na eziokwu gị; ka ha onwe ha na-edu m: ka ha mee ka m bịaruo ugwu nsọ gị, bịaruokwa ebe obibi gị nile.”
14, 15. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si ezipụ ìhè na eziokwu ya ugbu a? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi na ìhè na eziokwu Chineke na-edu anyị n’ezie?
14 Jehova nọgidere na-aza ekpere nke ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. Ọ na-ezipụ ìhè site n’ikwupụta nzube ya, site n’ime ka o kwe ndị na-ejere ya ozi mee ịghọta ya, nakwa site n’imezu ihe o kwupụtaworo. Mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere, ọ bụghị ihe mmeghachi efu, nke a na-eme nanị iji gosi ụdịdị nke ịbụ onye dị nsọ. Ezi ọchịchọ obi anyị bụ na ìhè nke sitere n’ebe Jehova nọ ga-edu anyị, dị ka abụ ọma ahụ kwuru. Anyị na-anara ibu ọrụ nke ya na ịnara ìhè nke Chineke na-enye na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. Dị ka Pọl onyeozi, anyị na-aghọta na mmezu nke Okwu Jehova nwere ihe pụtara iwu nye mmadụ nile bụ́ ndị na-egosipụta okwukwe na ya. Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ji ndị ọzọ ụgwọ ruo mgbe anyị gwaworo ha ozi ọma ahụ nke Chineke nyere anyị n’aka n’ihi nzube ahụ.—Ndị Rom 1:14, 15.
15 Ìhè na eziokwu nke Jehova zipụworo n’oge anyị na-eme ka o doo anya na Jisọs Kraịst na-achị achị site n’ocheeze eluigwe ya. (Abụ Ọma 2:6-8; Mkpughe 11:15) Jisọs buru amụma na n’oge ọnụnọ ya dị ka eze, a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke Alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà. (Matiu 24:3, 14) A na-arụ ọrụ ahụ ugbu a, a na-arụsikwa ya ike gburugburu ụwa. Ọ bụrụ na anyị na-eme ka ọrụ ahụ bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị, mgbe ahụ ìhè na eziokwu Chineke na-edu anyị n’ezie, dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru.
Ebube Jehova Awawo Dị Ka Anyanwụ
16, 17. Olee ụzọ Jehova si mee ka ebube ya wakwasị nzukọ ya yiri nwanyị na 1914, iwu dịkwa aṅaa ka o nyere ya?
16 N’asụsụ nke na-akpali mmụọ, Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ụzọ e si ekesa ìhè sitere n’aka Chineke nye ndị mmadụ nọ n’ebe nile. Aịsaịa 60:1-3, bụ́ nke a gwara “nwanyị” Jehova, ma ọ bụ nzukọ eluigwe ya nke ndị ohu na-anọgidesi ike n’ihe, na-asị: “Bilie, nwuo; n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ gị dị ka anyanwụ. N’ihi na, lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị. Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.”
17 Ebube nke Jehova wakwasịrị nzukọ eluigwe ya yiri nwanyị n’afọ 1914 mgbe, ka ogologo oge nke icheretụ gafesịrị, ọ mụrụ Alaeze Mesaịa, nke nwere Jisọs Kraịst dị ka Eze. (Mkpughe 12:1-5) Ìhè Jehova nke dị ebube ji nnwapụta na-awakwasị ọchịchị ahụ dị ka nke kwesịrị ekwesị maka ụwa nile.
18. (a) N’ihi gịnị ka ọchịchịrị ji ekpuchi ụwa, dị ka e buru n’amụma n’Aịsaịa 60:2? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi napụta ndị mmadụ n’otu n’otu site n’ọchịchịrị ụwa?
18 N’ụzọ megidere nke ahụ, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, igwe ojii na-ekpuchikwa ndị dị iche iche. N’ihi gịnị? N’ihi na mba dị iche iche jụrụ ọchịchị nke Ọkpara Chineke hụrụ n’anya iji nakwere ọchịchị nke mmadụ. Ha chere na site n’iwepụ otu ụdị ọchịchị na ichepụta ụdị ọzọ, ha ga-agwọta nsogbu ha. Ma nke a adịghị eweta izu ike nke ha tụrụ anya ya. Ha adịghị ahụ onye nọ n’azụ ihe omume ndị ahụ na-eduzi mba dị iche iche site n’ógbè ndị bụ mmụọ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ha jụrụ Isi Iyi nke ezi ìhè, n’ihi ya kwa, ha nọ n’ọchịchịrị. (Ndị Efesọs 6:12) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe mba dị iche iche mere, a pụrụ ịnapụta ụmụ mmadụ n’otu n’otu site n’ọchịchịrị ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’itinye okwukwe zuru ezu n’Alaeze Chineke na ịnọ n’okpuru ya.
19, 20. (a) N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ebube Jehova siworo wakwasị ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ? (b) N’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova jiworo mee ndị ya e tere mmanụ ndị na-enye ìhè? (c) Dị ka e buru n’amụma, olee ụzọ “ndị eze” na “mba nile” siworo bụrụ ndị a dọtara n’ìhè nke Chineke na-enye?
19 Krisendọm etinyebeghị okwukwe n’Alaeze Chineke, ha edobeghịkwa onwe ha n’okpuru ya. Ma ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ emewo otú ahụ. N’ihi nke a, ìhè nnwapụta nke Jehova awakwasịwo ndị nnọchianya ndị a a na-ahụ anya nke nwanyị eluigwe ya, ebube ya pụtakwara ìhè n’ebe ha nọ. (Aịsaịa 60:19-21) Ha na-enwe ìhè ime mmụọ nke ọ na-adịghị mgbanwe ọ bụla n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke akụ na ụba ụwa nke pụrụ ịnapụ ha ya. Ha ahụwo nnapụta Jehova site na Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 18:4) Ha na-enweta ihu ọchị nke nnwapụta ya n’ihi na ha anarawo inye ahụhụ ya ma jiri ịnọgidesi ike n’ihe na-akwado ọkaaka ya. Ha nwere olileanya dị mma maka ọdịnihu, ha na-aṅụrịkwa ọṅụ n’olileanya nke o setịpụworo n’ihu ha.
20 Ma n’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova jiworo mesoo ha n’ụzọ dị otú a? Dị ka ya onwe ya kwuru n’Aịsaịa 60:21, ọ bụ ka e wee ‘mee ka ọ maa mma,’ ka e wee sọpụrụ aha ya, ka e wee dọtakwa ndị ọzọ n’ebe ọ nọ dị ka nanị ezi Chineke—nke ahụ ga-abụkwa uru ebighị ebi nye ha onwe ha. N’ikwekọ na nke a, na 1931 ndị a na-efe ezi Chineke ahụ ofufe weere aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’ihi ịgba àmà ha, à dọtara “ndị eze” n’ìhè ahụ nke ha na-egosipụta, dị ka Aịsaịa buru n’amụma? Ee! Ọ bụghị ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa, kama ọnụ ọgụgụ fọdụrụ nke ndị ahụ ga-eso Kraịst chịa achị dị ka ndị eze n’Alaeze eluigwe ya. (Mkpughe 1:5, 6; 21:24) Oleekwa banyere “mba nile”? À dọtawo ha bịa n’ìhè nke a? Kpọmkwem! Ọ dịbeghị mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla a dọtaworo, ma oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba nile ewerewo nguzo ha n’akụkụ nke Alaeze Chineke, ha na-elesikwa anya ike ịbụ ndị a napụtara baa n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ọ ga-abụ n’ezie ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ejupụta n’ime ya.—2 Pita 3:13; Mkpughe 7:9, 10.
21. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi na anyị anarabeghị nzube nke amara Jehova na-erughịrị mmadụ n’ime ka anyị ghọta uche ya n’efu?
21 Ì so n’ìgwè ahụ na-eto eto nke ndị na-enye ìhè? Jehova enyewo anyị nghọta nke ihe ọ na-achọ ka anyị wee nwee ike, dị ka Jisọs, ịbụ ndị na-enye ìhè. Site n’igosipụta ịnụ ọkụ n’obi n’ọrụ ahụ Jehova nyeworo ndị na-ejere ya ozi n’aka maka ụbọchị anyị, ka anyị nile gosi na anyị anarabeghị amara ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke meworo ka o rute anyị n’efu. (2 Ndị Kọrint 6:1, 2) Ọ dịghị ọrụ ọ bụla dị mkpa karịa ya n’ụbọchị anyị. Ọ dịghịkwa ihe ùgwù ọzọ anyị pụrụ inwe nke ga-akarị inye aha Jehova otuto site n’igosipụta nye ndị ọzọ, ìhè ahụ dị ebube nke na-esite n’ebe ọ nọ.
Olee Ụzọ Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ isi ihe ndị kpatara nsogbu ndị jọgburu onwe ha nke ihe a kpọrọ mmadụ?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya si bụrụ “ìhè nke ụwa”?
◻ Olee ụzọ ìhè na eziokwu Jehova si edu anyị?
◻ Olee ụzọ Jehova siworo mee ka ebube ya wakwasị nzukọ ya?
◻ N’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova jiworo mee ka ndị ya bụrụ ndị na-enye ìhè?
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Otu ihe mere n’Iden na-enyere anyị aka ịghọta nsogbu ndị jọgburu onwe ha nke ihe a kpọrọ mmadụ n’oge a
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Tom Haley/Sipa
Paringaux/Sipa ▶