Gịnị Dị Njọ N’ịhụ Ego N’anya?
PAUL na Mary nwere otu oké ụlọ ahịa n’otu ógbè ndị ogbenye dị n’Africa.a Site n’ịrụsi ọrụ ike ehihie na abalị, ha kpatara ego buru ibu. Mgbe oge na-aga, Mary pụrụ ịbụ onye bi n’ụlọ ọhụrụ buru ibu nke jupụtara ná ngwá ụlọ mara mma. Banyere Paul, o nwere ike ịdị na-agbagharị n’otu ụgbọ ala mara mma.
Otu ụbọchị otu ìgwè ndị na-emegide gọọmenti bịakwutere Paul. Ha gwara ya, sị: “Anyị chọrọ ka ụlọ ahịa unu na-enye [$100] kwa ọnwa iji kwadoo ihe anyị na-eme.” Ebe ha na-achọghị ịkwado akụkụ nke ọ bụla n’ịma aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Paul na Mary jiri obi ike jụ. N’ihi nnọpụiche ha, e lere ha anya dị ka ndị na-anata nkwado ego site n’aka gọọmenti. N’otu ngwụcha izu, ka Paul na Mary mere njem, e tikpọrọ ụlọ ahịa ha, a gbakwara ụgbọ ala na ọmarịcha ebe obibi ha ọkụ.
Nke a bụ akụkọ dị mwute n’ezie, ma ànyị pụrụ ịmụta ihe na ya? Ọtụtụ ndị rụsiworo ọrụ ike ịghọ ndị ọgaranya pụrụ ịbụ ndị ọdachi nke napụrụ ha akụ na ụba ha na-adakwasịbeghị, ma gịnị banyere ọdịnihu? N’ihi gịnị ka Bible ji kwuo na “ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi”?—1 Timoti 6:9.
Echiche Ziri Ezi Banyere Ego
Dị ka Bible si kwuo, ezi onye Kraịst aghaghị igbo mkpa ihe onwunwe nke ndị ezinụlọ ya dabeere n’ebe ọ nọ. Ọnọdụ dị iche iche, dị ka enweghị ọrụ ma ọ bụ nsogbu ahụ ike, pụrụ mgbe ụfọdụ ime ka nke a sie ike. N’aka nke ọzọ, onye Kraịst nke kpachara anya na-eleghara igbo mkpa ezinụlọ ya anya ‘agọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’—1 Timoti 5:8.
N’ụfọdụ ime ime obodo, ndị mmadụ na-esite n’ọrụ ugbo akpata ihe ha ji adị ndụ site n’ịkọ ihe oriri nke ha na ịkpa anụ ụlọ. Ụfọdụ nwere obere mkpa ego, na-enweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ site n’ịgbanwerịta ngwá ahịa na ije ozi. Otú ọ dị, ụzọ ndị na-achọta ihe ezinụlọ ha ga-eri na-esikarị egbo mkpa ezinụlọ ha bụ site n’inweta ọrụ a ga na-akwụ ha ụgwọ na ya. Ha na-eji ego ha kpatara azụta ihe oriri na ihe ndị ọzọ nke na-enye aka n’ọdịmma ezinụlọ ha. Tụkwasị na nke ahụ, ego e ji amamihe debe pụrụ inye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe n’oge ihe isi ike ma ọ bụ ọdachi. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji ya kwụọ ụgwọ ihe e mefuru maka ọrịa ma ọ bụ iji ya dozie ihe ndị dị mkpa n’ebe mmadụ bi. Nke ahụ mere Bible ji kwuo n’ụzọ ziri ezi na “ego bụkwa ndo,” na ọ “na-azakwa ihe nile.”—Eklisiastis 7:12; 10:19.
N’ihi na ego na-emezu ọtụtụ ihe, e nwere ihe ize ndụ nke ịzụlite echiche na-ezighị ezi banyere ike ya. Ọ dị mkpa ka onye Kraịst mara banyere ịkpa ókè ya ma e jiri ya tụnyere ihe ndị ọzọ dị mkpa karị. Dị ka ihe atụ, Bible ji uru ego bara tụnyere amamihe Chineke, na-asị: “Amamihe bụ ndo, ego bụkwa ndo: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) N’ụzọ dị aṅaa ka amamihe Chineke si kara ego mma otú a?
Ihe Mmụta Site n’Oge Gara Aga
Ihe ndị weere ọnọdụ na Jerusalem n’afọ 66 O.A. na-egosipụta ụzọ amamihe Chineke si kara ego mma. Mgbe ha chụpụsịrị ndị agha Rom wakporo ha, o doro anya na ndị Juu nọ na Jerusalem kwetara na ugbu a e nwere olileanya dị mma maka azụmahịa. N’ezie, ha malitere ibipụta ego nke ha iji mee ememe nke nnwere onwe ọhụrụ ha. E biri ná mkpụrụ ego, n’asụsụ Hibru, okwu ndị dị ka “Maka nnwere onwe nke Zaịọn” na “Jerusalem nke dị Nsọ.” Kwa afọ ọhụrụ ọ bụla, ha na-akpụpụta mkpụrụ ego ọhụrụ ndị nwere ihe odide na-egosipụta ha dị ka ndị gbara “afọ nke abụọ,” “afọ nke atọ,” na “afọ nke anọ.” Ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie egwupụtawo ọbụna mkpụrụ ego ndị dị ụkọ ndị nwere ihe odide “afọ nke ise,” bụ́ nke dabara n’afọ 70 O.A. Ndị Juu bụ́ ndị Kraịst hà lere ego ọhụrụ ndị Juu ahụ anya dị ka ihe ngosipụta dị irè nke nnwere onwe na-adịgide adịgide?
Ee e. N’ihi na ha chetara okwu amamihe nke Onyenwe ha kwuru. Jisọs ebuwo amụma banyere mwakpo ndị Rom nke weere ọnọdụ na 66 O.A. Ọ dụwo ndị na-eso ụzọ ya ọdụ na mgbe o mere, ha kwesịrị ‘isi n’etiti Jerusalem gbalaga.’ (Luk 21:20-22) Akụkọ ihe mere eme na-agba akaebe na ndị Juu bụ́ ndị Kraịst mere nnọọ otú ahụ. Ọ pụtara ìhè na ha dị njikere ịhapụ ngwá ụlọ, ihe onwunwe, na ohere nke ịrụ ọrụ n’ihi isi na Jerusalem pụọ. Mgbe afọ anọ gasịrị, ndị agha Rom lọghachiri wee gbaa obodo ahụ gburugburu.
“E nwere ọtụtụ ọlaedo n’Obodo ahụ,” dị ka onye ji anya ya hụ ihe merenụ si kwuo, bụ́ Josephus onye na-akọ akụkọ ihe mere eme. Ma ego buru ibu nke ukwuu apụghị ịzọpụta Jerusalem pụọ n’ụnwụ nri, nke ji nke nta nke nta “dị njọ karị” ma “ripịa ikwu na ibe na ezinụlọ dum.” Ụfọdụ ndị bi n’ala ahụ loro mkpụrụ ego ọlaedo ma nwaa ịgbapụ n’obodo ahụ. Ma ndị iro ha gburu ha, bụ́ ndị bọwara ha afọ iji wepụta ego ahụ. “Nye ndị bara ọgaranya,” ka Josephus kọwara, “ọ dị nnọọ ize ndụ ịnọ n’Obodo ahụ dịkwa ka ọ dị ịpụ na ya; n’ihi na site n’ịghọ aghụghọ na ha bụ ndị na-agbahapụ ihe onwunwe ha, e gburu ọtụtụ ụmụ nwoke maka ego ha.”
N’ihe na-erughị ọnwa isii site ná mmalite nke mwakpo ahụ, e bibiri Jerusalem, ihe karịkwara otu nde ndị bi n’ime ya nwụrụ site n’ụnwụ nri, ọrịa, na mma agha. Ịhụnanya ego emewo ka ọtụtụ kpuo ìsì, na-akwaba ha ná mbibi na mkpochapụ, ma itinye okwu amamihe n’ọrụ enyeworo ndị Juu bụ́ ndị Kraịst aka ịgbapụ.
Nke ahụ abụghị nanị oge n’akụkọ ihe mere eme mgbe ego na-enyeghịrị ndị mmadụ aka n’oge ọgba aghara. Lee aha ajọ onye nwe mmadụ ego pụrụ ịbụ! (Matiu 6:24) Ọzọkwa, ọ pụkwara ịnapụ gị obi ụtọ ị na-enwe ugbu a.
Obi Ụtọ Ndị Ego Na-apụghị Ịzụta
Oké ọchịchọ nke ịghọ ọgaranya pụrụ ime ka mmadụ kpuo ìsì ịhụ ọtụtụ obi ụtọ ndị na-achọghị oké ego. Dị ka ihe atụ, tụlee mmekọrịta ezinụlọ obi ụtọ, ezi ndị enyi, ihe ịtụnanya okike, ọdịda anyanwụ na-akpali akpali, égbè eluigwe dara oké ụda, eluigwe jupụtara na kpakpando, omume ụmụ anụmanụ, ma ọ bụ okooko osisi na osisi ndị dị n’oké ọhịa a na-emetọghị emetọ.
N’ezie, ụfọdụ ndị bara ọgaranya na-enwe oge karị iji nweta ihe ụtọ ndị a dị elu, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-eji ọrụ n’aka nke ukwuu ebe ha na-agbalị ichebe ma ọ bụ ịmụba akụ na ụba ha. Ọ pụrụ ịbụ ihe ijuanya na ọbụna ndị nwere ohere adịghị enweta obi ụtọ ọtụtụ mgbe. Nke a na-eju ndị nnyocha nke oge a anya. “Olee ụzọ anyị pụrụ isi kọwaa eziokwu ahụ bụ na ihe ọtụtụ ndị na-achọsi ike, nke e kwetakwara na ọ na-egbo mkpa nile, mgbe e nwetara ya, na-akpata mmetụta dị iche iche site ná ndakpọ olileanya ruo n’uche mgbaghasị?” ka Thomas Wiseman jụrụ n’akwụkwọ ya bụ́ The Money Motive—A Study of an Obsession.
Otu ihe nke pụrụ ịnapụ onye bara ọgaranya obi ụtọ ya bụ ihe isi ike nke ịmara ndị bụ ezi ndị enyi ya. Eze Solomọn ahụ bara ọgaranya nwere ahụmahụ nke ịmara na “mgbe ezi ihe na-aba ụba, ndị na-eri ya abawokwa ụba.” (Eklisiastis 5:11) Ọtụtụ ndị bara ọgaranya na-enwekwa nchegbu n’ịgbalị ilekọta ma ọ bụ ịmụba uru nke akụ na ụba ha. Nke a na-anapụkarị ha ihi ụra nke ọma. Bible na-akọwa, sị: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-ala ọrụ ubi bụ, ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ̀ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.”—Eklisiastis 5:12.
Ịhụnanya ego pụrụ imebi mmekọrịta dị n’etiti ezinụlọ na ndị enyi n’ihi na ọ pụrụ itinye mmadụ n’ọnwụnwa nke emeghị ihe n’eziokwu na mpụ. Ọtụtụ mgbe ndị hụrụ ego n’anya na-amalite ịgba chaa chaa. N’ụzọ dị mwute, ọchịchọ nke ịgbakwu chaa chaa nanị otu ugbo na-enubanye ọtụtụ ndị n’iji ụgwọ. “Tupu ha abịakwute m,” ka otu onye South Africa bụ́ ọkà n’ọrịa uche kwuru, “[ndị ịgba chaa chaa riri ahụ] agabigawo ebe a pụrụ inyere ha aka, ha enweghịkwa ọrụ, azụmahịa, ebe obibi, ọtụtụ mgbe ezinụlọ ha ahapụwokwa ha.” Lee ka ịdọ aka ná ntị Bible si bụrụ eziokwu: “Onye ọ bụla nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-enwe ọtụtụ ngọzi: ma onye na-anụkpọ onwe ya ịbụ ọgaranya, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.”—Ilu 28:20.
‘Ọ Na-emere Onwe Ya Nku . . . Wee Fepụ’
Ihe ọzọ mere ịhụ ego n’anya ji dị oké ize ndụ bụ na gọọmenti dị iche iche nke mmadụ enwebeghị ike inyerịta onwe ha nkwado zuru ezu ma ọ bụ hụ na ego nọgidere na-enwe ike ịzụta ihe nke na-adịghị agbanwe agbanwe ná mba nile; ha enwebeghịkwa ike igbochi ajọ ọnọdụ akụ na ụba, ndakpọ ọnọdụ akụ na ụba, na ndakpọ nke ụlọ ahịa ebe a na-ere ma na-azụrụ òkè n’uru nke ụlọ ọrụ dị iche iche. Wayo, izu ohi, na ọnụ ahịa ịrị elu na-emekwa ka eziokwu nke dị n’okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ pụta ìhè, nke bụ: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ ịbụ ọgaranya; site ná nghọta gị haa ya aka. Ị̀ ga-atụkwasị anya gị abụọ na ya? ọ dịghịkwa: n’ihi na akụ na-emere onwe ya nku n’ezie, dị ka ugo ka ọ na-efesi n’eluigwe.”—Ilu 23:4, 5.
Ọnụ ahịa ịrị elu. Nsogbu ahụ abụghị kpọmkwem nanị ná mba ndị dara ogbenye ka ọ dị. Ná mmalite nke narị afọ nke a, ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe dakwasịrị mba ndị mepere emepe nke ebe etiti Europe. Dị ka ihe atụ, tupu Agha Ụwa Mbụ, otu ego mark ndị Germany hà ka ihe dị ka otu shilling ndị Britain, otu franc ndị France, ma ọ bụ otu lira ndị Itali. Mgbe iri afọ gasịrị, shilling, franc, na lira fọrọ nke nta ka ha hara ka 1,000,000,000,000 mark. Mmetụta dị aṅaa ka ịrị elu ọnụ ahịa na-enwe n’ebe ndị mmadụ bi n’etiti ọha ndị bara ọgaranya nọ? “Ọ bụrụ na ihe mere Ike Etiti Ụwa ahụ e meriri emeri ná mmalite afọ ndị 1920 bụ ihe a ga-eji kpebie nke ahụ,” ka Adam Fergusson kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ When Money Dies, “mgbe ahụ [ndakpọ ego] kpatara anyaukwu, ime ihe ike, enweghị obi ụtọ, na ịkpọasị dị oké njọ, bụ́ nke a kpatara n’ụzọ dị ukwuu site n’ụjọ, ka a ghara inwe òtù ụmụ mmadụ ọ bụla ga-alanarị n’enweghị ndakpọ na mgbanwe.”
Na 1923, Germany megharịrị ike ịzụta ihe nke ego ya site n’ịkachapụ nọtụ 12 nke na 1,000,000,000,000 mark ochie ghọrọ na mberede nke hà ka otu mark ọhụrụ. Ihe omume nke a kwụsịrị ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe ma o nwere ọdachi ndị ọzọ ọ kpatara. Fergusson kọwara, sị: “Mweghachi e weghachiri nguzosi ike nke ego, bụ́ nke mere ka ọtụtụ puku daa ogbenye, napụ ọtụtụ nde mmadụ ihe ha ji adị ndụ, ma mebie olileanya nke ọtụtụ nde ndị ọzọ, si n’ụzọ na-apụtaghị ìhè kpata oké ụgwọ nke ụwa dum na-aghaghị ịkwụ.” O yiri ka “oké ụgwọ” nke onye dere akwụkwọ ahụ bu n’uche bụ mbilite nke Ọchịchị Nazi na Agha Ụwa nke Abụọ.
Na ego buru ibu e debere n’ụlọ akụ ewetaworo ọtụtụ ndị ndakpọ olileanya n’oge gara aga kwesịrị ịbụ ịdọ aka ná ntị ezi uche dị na ya n’oge ndị a nke a na-ejighị ọnọdụ akụ na ụba ụwa nile n’aka. Ọkpara Chineke n’onwe ya dọrọ aka ná ntị na ego ga-ada, bụ́ nke o meworo ọtụtụ mgbe n’ezie. (Luk 16:9) Ma ọdịda kasị ukwuu na nke ga-akasị zuo ebe nile nke ego ga-ada ga-abịa mgbe Jehova Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe megide ajọ ụwa nke a. “Akụ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe: ma ezi omume na-anapụta n’ọnwụ.”—Ilu 11:4.
Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị gbaa mbọ ijigide ọnọdụ ezi omume n’ebe ezi Ndị Enyi anyị nọ, bụ́ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst!
Isi Iyi nke Obi Ụtọ Na-adịgide Adịgide
Paul na Mary, ndị e hotara ná mmalite, bụ Ndịàmà Jehova. Ruo ọtụtụ afọ ha keere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma oge nile. Otú ọ dị, ọchịchọ ha maka akụ na ụba mere ka ha kwụsị ịga nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ndị Kraịst, ha kwụsịkwara ikerịta okwukwe ha n’ozi ihu ọha. Ma ha tetara n’ụra. “Ugbu a apụrụ m ịhụ ihe nzuzu ọ bụ itinye oge na ume m nile n’ihe nke pụrụ ịla n’iyi n’ime minit ole na ole,” ka Mary kwuru mgbe e zusịrị ya ohi ma tikpọsịa ụlọ ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, di na nwunye nke a mụtara ihe tupu oge agabiga. Ee, mmerụahụ kasị ukwuu nke ịhụ ego n’anya pụrụ ịkpata bụ ịnapụ mmadụ mmekọrịta dị mma n’ebe Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nọ. Ma e nweghị Ndị Enyi a, olileanya dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe maka ịlanarị ọgwụgwụ nke ajọ ụwa nke a baa n’ime ụwa ọhụrụ e kwere na nkwa nke ezi omume?—Matiu 6:19-21, 31-34; 2 Pita 3:13.
Ya mere n’agbanyeghị ma ì lere onwe gị anya dị ka ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, nọrọ na nche megide ịzụlite ịhụnanya nke ego. Rụọ ọrụ iji nweta ma jigide akụ ahụ kasị ukwuu—ọnọdụ dị mma n’ebe Jehova Chineke nọ. Ị pụrụ ime nke a site n’ịtụkwasị uche mgbe mgbe n’ịkpọ òkù ahụ dị ngwa: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E jighị ezigbo aha ha mee ihe.
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Akụkụ abụọ nke mkpụrụ ego ahụ a kpụpụtara n’oge ọgba aghara ndị Juu nke nwere ihe odide ahụ bụ “afọ nke abụọ”
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.