Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke”
NDỊ nile chọrọ ịbụ ndị Jehova ziri ihe na-elepụ anya nke ọma gaa ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke.” Ihe omume ahụ ga-ewe ụbọchị anọ ga-emesi ike akụkụ ndị dị mkpa nke izi ihe Akwụkwọ Nsọ nke na-echebe ndị Kraịst n’oge ndị a nke mmụba nsogbu onwe onye na ọgba aghara nke ụwa. Ihe omume ahụ ga-enyere ha aka iguzogide n’ụzọ siri ike ‘ihe ọ bụla na-emegide ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ.’ (1 Timoti 1:10) Ọ ga-agbakwa mmadụ nile ndị na-achọ ịghọ ndị nkụzi ka mma nke Okwu Chineke ume.
Lee aha ezi ihe nlereanya anyị ga-eṅomi! Onye Ozizi ahụ kasị ukwuu abụghị onye ọzọ ma e wezụga Jehova Chineke n’onwe ya! Otú a, Elaịhu gwara Job n’ụzọ ziri ezi na Jehova bụ “Onye na-ezi anyị ihe karịa anụ nke ụwa, ọ na-emekwa ka anyị mara ihe karịa anụ ufe nke eluigwe.” Ọ jụkwara ajụjụ banyere Jehova, sị: “Ònye bụ onye ozizi dị ka ya?” (Job 35:11; 36:22) E zoro aka n’ebe Chineke nọ n’Aịsaịa 30:20 [NW] dị ka ‘Onye Ozizi Kasị Ukwuu.’
Onye nanị ya na-esote Jehova dị ka onye ozizi bụ Ọkpara ya bụ́ Jisọs Kraịst. A maara ya dị ka “Onye Ozizi” na dị ka “Onye Nkụzi,” na-abụ onye e zoro aka otú ahụ ihe dị ka 50 ugbo n’Oziọma ahụ. N’agbanyeghị ọtụtụ ọgwụgwọ ọrịa ndị na-akpali akpali na ọrụ ebube ndị ọzọ, a maghị Jisọs dị ka Dibịa kama dị ka Onye Ozizi, Onye Na-ezi Ihe.—Matiu 8:19; Luk 5:5 [NW]; Jọn 13:13.
N’ụzọ kasị kwesị ekwesị, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na ndị ozi ya ịbụ ndị ozizi dị ka ya onwe ya bụ. Anyị pụrụ ịhụ nke a site na Matiu 10:5 ruo 11:1 nakwa na Luk 10:1-11. N’oge na-adịghị anya tupu ọ rịgoo n’eluigwe, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ izi ihe ahụ a maara nke ọma e dekọrọ na Matiu 28:19, 20: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.” Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, tinyere akwụkwọ ozi ndị e dere n’ike mmụọ sochiri ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, kọrọ ụzọ ndị na-eso ụzọ Jisọs oge mbụ si jiri ịnụ ọkụ n’obi, nkà, na ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ izi ihe nke a.
Ọrụ izi ihe nke a dị oké ngwa n’oge a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a, n’ihi nke ahụkwa, o metụtara ndụ. Ka ndị mmadụ ghara iketa mmehie nke Babilọn Ukwu ahụ ma nata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya, ha aghaghị ịbụ ndị e ziri ihe ma nyere aka isi na Babilọn pụta ma guzoro n’akụkụ Jehova na Alaeze ya.—Mkpughe 18:4.
Iji nyere Ndịàmà Jehova nile aka ná mgbalị ha na-eme iji rụzuo ọrụ izi ihe ha, Jehova site n’ọgbakọ ya emewo ka e nwee Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke.” Mgbakọ ụbọchị anọ ndị a ga-amalite n’Ebe Ugwu Ụwa ná mmalite oge okpomọkụ nke afọ 1993. Ka onye ohu Jehova ọ bụla rarawooro onwe ya nye jide n’aka na o jere ma ọ dịkarịa ala otu n’ime mgbakọ ndị a, na-anọ ya ma na-aṅa ntị nke ọma malite n’abụ na ekpere mmeghe n’ehihie Thursday ruo n’ekpere mmechi n’ehihie Sunday.