Ị̀ Ga-aṅa Ntị N’ịdọ Aka ná Ntị Chineke?
NDỊ mmadụ na-elegharakarị ịdọ aka ná ntị ndị na-azọpụta ndụ anya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na Pompeii họọrọ ileghara mbigbọ iwe nke Ugwu Vesuvius anya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ n’oge a na-eleghara ịdọ aka ná ntị nke ọdachi zuru ụwa ọnụ nke na-abịanụ anya. Ma nye ndị dị njikere iche eziokwu ahụ ihu, ịdọ aka ná ntị ndị ahụ na-eme eme dị ka igbu mara mara nke àmụ̀mà na ọkụ sitere n’Ugwu Vesuvius laa azụ na narị afọ mbụ. Agha ụwa abụọ, ọtụtụ narị mburịta agha ndị dị nta karị, ụnwụ nri, oké ala ọma jijiji, ajọ ọrịa na-efe efe, ọtụtụ ntiwapụ nke mpụ na ime ihe ike, nakwa ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, ha nile na-emejupụta ịdọ aka ná ntị na-akpali akpali nke na usoro ọha mmadụ ji ọsọ na-abịaru nso n’ọgba aghara ga-eweta ọdachi.
Bible na-ebu amụma nke a na-akpali iche echiche: “Mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Dị ka ọ dị n’ọdachi ahụ mere na Pompeii, a ga-enwe ndị ga-agbalaga—“oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile,” ga-alanarị, ya bụ, “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.”—Mkpughe 7:9, 14.
Ajụjụ bụ, Olee mgbe mbibi nke a ga-abịa? E nwere ihe dị mkpa mere a ga-eji kwere na mkpagbu ahụ dị nso. Ọ pụtara ìhè na iji mata mgbe ihe ndị a ga-ewere ọnọdụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ, NW] gị, na nke ọgwụgwụ oge a?” (Matiu 24:3) Rịba ama azịza Jisọs Kraịst nyere.
Agha—Akụkụ Pụtara Ìhè nke Ihe Ịrịba Ama Ahụ Ọtụtụ Ihe Mejupụtara
Jisọs ebughị amụma nke nanị otu ihe omume pụrụ iche. Kama nke ahụ, o kwuru okwu banyere usoro ihe omume nke, ọ bụrụ na e were ya n’ozuzu, ga-emejupụta ịdọ aka ná ntị Chineke—ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara nke ọgwụgwụ usoro ihe a. A kọwara ihe omume mbụ e buru n’amụma na Matiu 24:7: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” N’otu amụma yiri nke ahụ dị ná Mkpughe 6:4, Bible buru amụma na ‘a ga-anapụ udo n’ụwa.’ Nke a pụtara agha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ.
Akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na amụma nke a nke agha zuru ụwa ọnụ enwewo mmezu ya kemgbe afọ 1914 ahụ a na-agaghị echefu echefu. Akwụkwọ ahụ bụ́ American Adventures na-ekwu banyere afọ ndị ahụ bu 1914 ụzọ, sị: “Ọtụtụ ndị America abanyewo na narị afọ ọhụrụ nke jupụtara n’olileanya. Ndị a bụ ‘afọ ndị dị mma,’ ha nọrukwara iri afọ nke abụọ nke narị afọ ahụ. . . . Mgbe ahụ, na July 28, 1914, e tisara ọnọdụ nke a site n’otu okwu: agha.” Otú a ka Agha Ụwa nke Mbụ si malite, bụ́ nke malitere na 1914 ruo 1918, bụrụkwa nke ụfọdụ kpọrọ “agha iji kwụsị agha nile.” Mba 28 keere òkè na ya kpọmkwem. Ọ bụrụkwa na ị gụnye ala ndị nọ dị ka ndị dabeere n’ebe ha nọ, mba ndị ahụ lụrụ agha mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 90 pasent nke ndị nile bi n’ụwa n’oge ahụ.
Ọ bụkwa n’Agha Ụwa nke Mbụ ka a malitere iji ngwá agha ndị ọhụrụ na ndị dị oké njọ mee ihe, dị ka égbè ndị na-akwa mgbọ, ikuku gas na-egbu egbu, ihe agha na-agbọpụ ọkụ, tanki, ụgbọ elu, na ụgbọ okpuru mmiri. E gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị agha iri—ihe karịrị ndị agha nile nwụworo n’oké agha ndị a lụworo n’ime 100 afọ ndị bu ụzọ! E merụrụ ihe dị ka 21 nde ahụ. N’ezie, ọ bụ agha zuru ụwa ọnụ, na-aka 1914 akara dị ka mmalite nke “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Otú ọ dị, agha bụ nanị otu akụkụ nke ihe ịrịba ama Jisọs.
Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ihe Ịrịba Ama Ahụ
Jisọs kwukwara, sị: “Oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.” (Matiu 24:7, 8) Luk 21:11 na-agụnye “ajọ ọrịa na-efe efe” n’ihe ndekọ ahụ. Tupu Agha Ụwa nke Mbụ ebie, ntiwapụ nke oké ahụ ọkụ Spain malitere ịgbasa n’elu ụwa. E mesịa, o gburu ihe karịrị 20 nde mmadụ, ihe karịrị ndị nile nwụworo n’agha ahụ.
N’oge a na-alụ agha ahụ na mgbe ọ gasịrị, ọtụtụ nde ndị ọzọ nwụrụ n’ihi agụụ. Ala ọma jijiji kpatakwara ọnwụ nke ọtụtụ ndị. Na 1915 e gburu ihe karịrị 30,000 n’Itali; na 1920 ihe dị ka 200,000 nwụrụ na China; na 1923 ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 143,000 nwụrụ na Japan. Ma, dị ka Jisọs gosipụtara, ihe ndị a nile bụ nanị mmalite nke ihe mgbu. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara “ihe mgbu” dị ka “oké ụfụ na-adị nwa oge.” Ụwa nke a esiwo n’otu ihe ụfụ gaa n’ọzọ n’ụzọ na-esiwanye ike ma na-amụba amụba kemgbe 1914. Dị ka ihe atụ, nanị 21 afọ mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị, agha ụwa nke abụọ bịara, bụ́ nke gburu 50 nde mmadụ ma kpọbata ihe a kpọrọ mmadụ n’ọgbọ nuklia.
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e kwuwo ọtụtụ ihe banyere ihe ọzọ so na-akpata ihe isi ike: mbibi nke mmadụ na-ebibi gburugburu ebe obibi. Ọ bụ ezie na Jisọs ekwughị nke a kpọmkwem n’amụma ya, Mkpughe 11:18 na-egosi na tupu ọbịbịa nke mbibi ahụ, mmadụ ga “na-emebi ụwa.” Ihe àmà nke na-egosi na mmebi nke a na-ewere ọnọdụ bara ụba. N’ịbụ onye e hotara n’akwụkwọ bụ́ State of the World 1988, onye ọkà n’okwu banyere gburugburu ebe obibi bụ́ Norman Myers kwupụtara ihe nke a na-eyi egwu: “Ọ dịghị ọgbọ dị n’oge gara aga nke cheworo olileanya nke mkpochapụ n’oge ọgbọ ahụ dị ndụ ihu. Ọ dịghị ọgbọ ọ bụla n’ọdịnihu nke ga-eche ihe ịma aka yiri nke ahụ ihu mgbe ọ bụla: ọ bụrụ na ọgbọ dị ugbu a enweghị ike ibu ibu ọrụ ahụ, mbibi ahụ gaara abụ nke e mewororịị, a gaghịkwa enwe ‘ohere nke ugbo abụọ.’”
Tụlee akụkọ dị ná mbipụta February 17, 1992, nke magazin bụ́ Newsweek banyere mbelata nke ihe nchebe ozone n’ikuku. E hotara Alexandra Allen, bụ́ onye ọkà n’ihe nchebe ozone nke òtù na-elekọta mbara ala bụ́ Greenpeace ka ọ na-adọ aka ná ntị na ọgwụgwụ nke ihe nchebe ozone “bụ ihe iyi egwu ugbu a nye ọdịnihu nke ndụ nile n’elu ala.”—Lee igbe ahụ dị na peji a maka ihe àmà ndị ọzọ nke mmebi gburugburu ebe obibi nke elu ala.
Ohere agaghị ezu ịtụle ihe dum metụtara akụkụ nile nke amụma Jisọs. (Lee chaatị ahụ dị na peji nke 5 maka nchịkọta nke akụkụ ndị ọzọ nke amụma ahụ.) Otú ọ dị, a kọwara otu akụkụ nke a na-apụghị ileghara anya na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya banyere ndị na-arụ ọrụ nkwusa nke a zuru ụwa ọnụ. Ndịàmà Jehova nọ na 229 ala tinyere ihe karịrị otu ijeri hour n’ọrụ nke a n’afọ 1992 nanị. Ọrụ ha si otú a na-emejupụta otu n’ime ihe àmà ndị a na-ahụ anya nke na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ.
Ekwela Ka A Ghọgbuo Gị!
Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ihe a nile a na-ekwu banyere “mgbe ikpeazụ” bụ nnọọ enweghị nchekwube. ‘Olee banyere ọdịda ọchịchị Kọmunism dara n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’oge na-adịbeghị anya?’ ka ha na-ajụ, ‘ma ọ bụ mgbalị nke ndị ike ọchịchị ụwa iweta udo? Ọ̀ bụ na nke a abụghị ihe àmà na ihe na-akawanye mma?’ Ee e. Rịba ama na Jisọs ekwughị na ụwa dum ga-anọgide na-abụ nke e mikpuru n’agha, ala ọma jijiji, na ụnwụ nri n’ụbọchị ikpeazụ. Iji mee ka ozi ọma ahụ bụrụ nke e kwusara n’ụwa nile, a ga-enwe ma ọ dịkarịa ala oge ụfọdụ nke ịdị jụụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ.
Chetakwa na Jisọs ji ụbọchị ikpeazụ tụnyere ụbọchị ndị bu ụzọ tupu Iju Mmiri nke Noa. N’oge ahụ ndị mmadụ mikpuru onwe ha n’iri ihe, ịṅụ ihe, na ịlụ di ma ọ bụ nwunye—ihe omume ndị a na-eme ná ndụ. (Matiu 24:37-39) Nke a ga-egosi na ọ bụ ezie na ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị ikpeazụ ga-akpata ihe isi ike, ihe agaghị adị njọ ruo n’ókè nke na ndụ a na-adị kwa ụbọchị ga-akwụsị. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, ihe ka ọtụtụ n’agbụrụ mmadụ na-emikpu onwe ha n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị nke na ha adịghị amata ịdị mkpa nke oge ndị a.
Ya mere, ọ ga-abụ ihe ize ndụ ịdaba n’ọnọdụ nke enweghị mmasị n’ihi ihe ụfọdụ yiri ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị dị mma. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.) E nwere ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na amụma Jisọs na-enwe mmezu ugbu a—ịdọ aka ná ntị nke na mbibi dị nso!
Oge Dị Ebube Mgbe Mbibi Gasịrị
Mbibi nke Pompeii wetara ọnwụ na nhụjuanya. Otú ọ dị, ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a ga-emeghepụ ụzọ maka ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ́ paradaịs nke mara mma. (Mkpughe 21:3, 4) Ọchịchị ụmụ mmadụ nke na-akpata nkewa agaghịkwa ebibi elu ala ọzọ site n’agha. Ụmụ mmadụ agaghịkwa atụ ụjọ ọzọ banyere iyi egwu nke mgbukpọ nuklia. A gaghị enwekwa ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe mmiri ọgwụ na-egbu egbu na gburugburu ebe obibi.—Daniel 2:44.
N’oge ahụ onye ọ bụla dị ndụ ga-abụ onye hụrụ ezi omume n’anya na ezi enyi, onye na-erube isi kpam kpam n’ụkpụrụ nke Alaeze ahụ. (Abụ Ọma 37:10, 11) Ụlọ ọgwụ, ụlọ idozi ozu, na ebe ili ozu ga-abụ ihe mgbe ochie. Ịgba alụkwaghịm, nkewa, ịda mbà n’obi, na imetọ ụmụaka agaghị adịkwa ọzọ.—Aịsaịa 25:8; 65:17.
Ị̀ chọrọ ịlanarị ụbọchị ikpeazụ wee dịrị ndụ ịhụ ụwa ọhụrụ dị ebube nke Chineke? Mgbe ahụ ‘mụrụ anya, n’ihi na ị mataghị mgbe oge ahụ bụ.’ (Mak 13:33) Otú o sina dị, ihe ndị na-eme n’ụwa na-eme ka o doo anya na oge ahụ a kara aka dị nso—ọ dị nso n’ụzọ dị ize ndụ nye ọtụtụ ndị. Oge adịkwaghị. Ya mere, mee ihe iji zọpụta onwe gị, chọtakwa ndị ahụ na-aṅa ntị n’ihe ịrịba ama ahụ zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị ikpeazụ. A na-amata ndị a n’ụzọ dị mfe, n’ihi na ọ bụ nanị ha na-erube isi n’iwu Jisọs nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze n’ụwa nile. Site n’isonyere ndị dị otú ahụ, na-eme ihe iji nọrọ n’akụkụ nke Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, bụ́ onye e kwuru banyere ya, sị: “N’aha ya ka mba nile ga-atụkwasị obi.”—Matiu 12:18, 21.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Akụkụ 24 nke Ihe Ịrịba Ama Ahụ
1. Agha na-enweghị atụ—Matiu 24:6, 7; Mkpughe 6:4
2. Ala ọma jijiji—Matiu 24:7; Mak 13:8
3. Ụkọ nri—Matiu 24:7; Mak 13:8
4. Ajọ ọrịa na-efe efe—Luk 21:11; Mkpughe 6:8
5. Mmụba nke mmebi iwu—Matiu 24:12
6. Mmebi ụwa—Mkpughe 11:18
7. Ịhụnanya ịdajụ—Matiu 24:12
8. Ịhụ ihe ndị na-atụ egwu—Luk 21:11
9. Oké ịhụ ego n’anya—2 Timoti 3:2
10. Nnupụisi nye ndị mụrụ ụmụ—2 Timoti 3:2
11. Ịhụ ihe ụtọ n’anya karịa Chineke—2 Timoti 3:4
12. Ịhụ nanị onwe onye n’anya jupụtara ebe dum—2 Timoti 3:2
13. Enweghị ịhụnanya n’ebe mmadụ nọ nke zuru ebe dum—2 Timoti 3:3
14. Ndị mmadụ enweghị nkwekọrịta—2 Timoti 3:3
15. Enweghị njide onwe onye n’akụkụ nile nke ọha—2 Timoti 3:3
16. Mgbasa nke enweghị ịhụnanya maka ihe ọma—2 Timoti 3:3
17. Ọtụtụ ndị iji ihu abụọ na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst—2 Timoti 3:5
18. Ọtụtụ ndị imebiga ihe ókè n’iri ihe na ịṅụ ihe—Luk 21:34
19. Ndị na-akwa emo na-ajụ ihe ịrịba ama ahụ—2 Pita 3:3, 4
20. Ọtụtụ ndị amụma ụgha na-arụsi ọrụ ike—Matiu 24:5, 11; Mak 13:6
21. Ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo—Matiu 24:14; Mak 13:10
22. Mkpagbu nke ezi ndị Kraịst—Matiu 24:9; Luk 21:12
23. Iti mkpu nke udo na ntụkwasị obi iji mezuo ụbọchị ikpeazụ—1 Ndị Tesalọnaịka 5:3
24. Ndị mmadụ amataghị banyere ihe ize ndụ—Matiu 24:39
[Igbe dị na peeji nke 6]
Nsogbu Gburugburu Ebe Obibi—Ihe Ịrịba nke Oge Ndị A
◻ Ihe nchebe ozone nke dị ná mpaghara ebe ọtụtụ ndị mmadụ bijupụtara nke Ebe Ugwu Ụwa ji ọsọ na-atalata okpukpu abụọ karịa ka ndị ọkà mmụta sayensị chere nanị n’afọ ole na ole gara aga.
◻ Ọ dịkarịa ala a na-ekpochapụ 140 ụdị ihe ọkụkụ na anụmanụ dị iche iche kwa ụbọchị.
◻ Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikuku carbon dioxide nke na-ejide okpomọkụ e nwere n’ikuku ji 26 pasent dị elu ugbu a karịa mgbe a na-enweghị ọtụtụ ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, ha nọgidekwara na-arị elu.
◻ Mbara elu ala kporo ọkụ na 1990 karịa n’afọ ọ bụla ọzọ kemgbe a malitere idetu ihe ndekọ ya n’etiti narị afọ nke 19; isii n’ime afọ asaa ndị kasị kpoo ọkụ e nwetụrụla weere ọnọdụ kemgbe 1980.
◻ Ọtụtụ oké ọhịa na-apụ n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe dị ka 17,000,000 hekta kwa afọ, ókèala nke hà ka ọkara Finland n’ibu.
◻ Ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ji 92 nde ndị mmadụ na-amụba kwa afọ—ihe dị ka ịtụkwasị ọnụ ọgụgụ ndị Mexico kwa afọ; n’ime ngụkọta nke a, a na-atụkwasị 88 nde ná mba ndị na-emepe emepe.
◻ Ihe dị ka 1.2 ijeri ndị mmadụ enweghị mmiri dị mma ọṅụṅụ.
Dị ka akwụkwọ bụ́ State of the World 1992, nke Ụlọ Ọrụ Ikiri Ụwa bipụtara si kwuo, peji nke 3, 4, W. W. Norton & Company, New York, London.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe mbibi gasịrị, ụwa ọhụrụ Chineke nke dị ebube ga-abịa