Jehova Chebere M n’Ụlọ Mkpọrọ Dị n’Ọzara
DỊ KA ISAIAH MNWE SI KỌỌ
E kpeghị m ikpe ọ bụla, ọ dịghịkwa mpụ ọ bụla m mere. Ma, a mara m ikpe ịrụ ọrụ ahụhụ n’otu ụlọ mkpọrọ dị n’etiti Ọzara Sahara ahụ na-afụ ụfụ n’ahụ n’Africa. Nke ka njọ, ọ dịghị otu n’ime ndị enyi m maara ebe m nọ. Nke a mere n’ihe karịrị afọ asatọ gara aga, n’oge okpomọkụ nke afọ 1984. Ka m kọwaa otú m si daba n’ọnọdụ ọjọọ ahụ.
NA 1958, mgbe m dị nanị afọ 12, nwanne m nwoke nke tọrọ m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, nne m na nna m nọgidere na-efe chi agbụrụ nke ndị Abia State, Nigeria, bụ́ ebe anyị biri.
Na 1968, esonyere m òtù ndị agha Biafra. N’oge anyị nọ n’ọgbọ agha, echere m echiche banyere ọnọdụ nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova, ekpegakwaara m Chineke ekpere ka o nyere m aka. Ekwere m nkwa na ọ bụrụ na o kwe ka m lanarị n’agha ahụ, aga m aghọ otu n’ime Ndịàmà ya.
Mgbe agha ahụ kwụsịrị, emere m ngwa ngwa iji mezuo nkwa m. E mere m baptism na July 1970, ozugbo ahụ amalitere m ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. Ka oge na-aga, a họpụtara m dị ka onye okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’oge na-adịghị anya, anatara m ịkpọ òkù site n’alaka ụlọ ọrụ Nigeria iwere ọrụ ije ozi ala ọzọ n’otu mba dị nso ebe a na-anabatabeghị ọrụ Ndịàmà Jehova n’iwu. Anakweere m, ka ọ na-erule January 1975, ebiliri m ije, na-ejikwa akwụkwọ ikike ibi n’ala ahụ.
E Jidere M
Na 1978, e kenyere m ọrụ ileta Ndịàmà n’akụkụ nile nke mba ahụ. Ebe ha dị ole na ole, emere m njem dị anya, na-eleta obodo nile ebe e nwere ọgbakọ, nakwa n’ebe ndị e nwere ndị nwere mmasị. Ọtụtụ mgbe, a jụrụ m ajụjụ n’ebe ndị uwe ojii na-anọ n’okporo ụzọ. Ugbo abụọ, nke ọ bụla ruo ụbọchị anọ, a jụrụ na m agaghị ala ma jụọ m ajụjụ banyere ọrụ anyị.
Mgbe ahụ, na June 1984, ka anyị na-akwadebe maka ije ozi ubi n’otu Sunday, otu onye ọrụ ndị ọchịchị nwere omume enyi gbaara anyị àmà na ndị uwe ojii na-achọ ijide Ndịàmà Jehova. Mgbe otu izu gasịrị, e jidere mụ na Djagli Koffivi, bụ́ onye sitere Togo. A kpọgara anyị n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma nye anyị iwu ka anyị nye ha aha Ndịàmà Jehova nile nọ n’obodo ahụ. “Nanị ma ùnu nyere anyị aha ndị ahụ,” ka ha sịrị, “anyị agaghị atọhapụ unu.”
“Unu bụ ndị uwe ojii,” ka m zara. “Ọ bụ ọrụ unu ịchọta ndị unu chọrọ. Abụghị m onye ọrụ unu.” Anyị rụrịtara ụka ruo ihe dị ka 30 minit, ndị uwe ojii ahụ jikwa iti ihe yie anyị egwu. Ma, anyị enyeghị ha aha ụmụnna anyị ndị Kraịst. Mgbe ahụ ha kpebiri ibukọrọ ebe ndebe akwụkwọ m nke nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.
Mgbe M Bụ Onye E Ji Eji
Mgbe anyị bu akwụkwọ ndị ahụ laghachi n’ogige ndị uwe ojii, mụ na Djagli butusịrị ha. Ka anyị na-eme nke ahụ, otu ibe akwụkwọ si n’ime Bible m e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo dapụta. Ọ bụ usoro ihe omume mgbakọ distrikti nke e biri aha ndị Kraịst nile bụ́ ndị okenye ná mba ahụ. Atụtụlitere m ya ngwa ngwa ma fọba ya n’ime akpa m. Otú ọ dị, otu n’ime ndị uwe ojii ahụ hụrụ m wee nye m iwu ka m wepụta ya nye ya. N’ezie, ụjọ bịara m.
A tụkwasịrị akwụkwọ ahụ n’elu table dị n’ime ụlọ ebe mụ na Djagli na-ebubata akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe m bu ibu m ọzọ bata, agara m na table ahụ, were akwụkwọ ahụ, ma fọnye ya n’ime akpa m. Mgbe ahụ asịrị m na m chọrọ ịnyụ mamiri. Otu onye uwe ojii dugara m n’ebe a na-eje mposi. Mgbe m banyere ma mechie ụzọ, adọrịsịrị m akwụkwọ ahụ ma jiri mmiri wụba ya n’olulu mposi ahụ.
Mgbe ndị uwe ojii matara ihe merenụ, iwe were ha. Ma ha tụrụ ụjọ ime ihe ọ bụla banyere ya, ebe ọ bụ na ndị ka ha n’ọkwá ga-ebo ha ebubo na ha ejighị ọrụ ha kpọrọ ihe n’ihi inye m ohere ibibi akwụkwọ ahụ. Mgbe ha jidesịrị anyị ruo ụbọchị 17, otu onye inspektọ ndị uwe ojii gwara anyị ka anyị chịkọta ngwongwo anyị n’ihi na a gaje ịkpọga anyị n’ebe ọzọ. Anyị chịnyere uwe ụfọdụ n’akpa wọtapruf, etinyekwara m otu obere Bible nke otu onye ọbịa wetaara anyị na nzuzo n’ala ala ya.
Anyị nwere ike ime ka Ndịàmà mata na a na-akpọga anyị n’ebe ọzọ ma anyị amaghị ebe ọ bụ. N’isi ụtụtụ ụbọchị na-esonụ, bụ́ July 4, 1984, onye inspektọ ndị uwe ojii ahụ kpọtere anyị n’ụra. O lere ma ọ̀ dị ihe anyị ji, na-agwa anyị ka anyị wepụta uwe ahụ n’ime akpa ma kowe ya n’elu aka anyị. Ma mgbe m rutere n’uwe ikpeazụ, ọ sịrị na m pụrụ ịchịghachi uwe ndị ahụ n’ime akpa, Bible ahụ si otú a bụrụ nke a na-achọpụtaghị.
Ụlọ Mkpọrọ Dị n’Ọzara
Ndị uwe ojii ahụ ji ụgbọ ala buga anyị n’ọdụ ụgbọ elu, bụ́ ebe anyị banyere n’ụgbọ elu ndị agha. Mgbe ọtụtụ hour gasịrị, anyị rutere n’otu obodo nke ihe dị ka 2,000 mmadụ bi, bụ́ ebe e nwere otu ụlọ mkpọrọ dị nso. Ọ dị ihe dị ka 650 kilomita ma e si n’okporo ụzọ gaa n’obodo nke kasị dịrị nso. E si n’ụgbọ elu ahụ kpọga anyị n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma nyefee anyị n’aka onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị onye ezinụlọ anyị ọ bụla ma ọ bụ ndị enyi anyị maara ebe a kpọgara anyị.
Obodo ebe ahụ a kpọgara anyị bụ ala mmiri dị na Sahara. E nwere ihe ọkụkụ, osisi ole na ole, na ụlọ ndị e ji àjà ụrọ wuo. A pụrụ inweta mmiri site n’igwu nanị ihe dị ka otu mita ma ọ bụ otu mita na ọkara. Otú ọ dị, otu onye dị 31 afọ nke bụ nwa amaala obodo ahụ gwara anyị na ọ hụwo ka mmiri zoro nanị otu ugbo n’afọ ndụ ya nile! Ebe ahụ na-ekpokwa ọkụ nke ukwuu. Otu onye mkpọrọ kwuru na otu ígwè ọrụ e ji amata ọnọdụ ịjụ oyi na ịkpọ ọkụ nke dị n’ogige ndị mkpọrọ ahụ nwere mgbe o gosiri ọ̀tụ̀tụ̀ ịkpọ ọkụ dị 60° C.! Oké ikuku na-eku mgbe nile, na-efegharị àjà ndị na-agba agba n’ahụ ma na-afụ ụfụ n’anya.
Onye ọ bụla bịarutere n’ebe ahụ ga-achọpụta na ọ nọ n’ogige inye ahụhụ kachasị njọ nke mba ahụ. E ji mgbidi dị elu ndị na-enye nchebe ụfọdụ pụọ n’ikuku na anwụ gbaa ụlọ mkpọrọ ahụ gburugburu. Otú ọ dị, mgbidi adịghị mkpa iji gbochie mgbapụ, ebe ọ bụ na ọ dịghị ebe mmadụ ga-agbaga. A gafee ala ahụ dị mmiri, e nweghị otu osisi ọ bụla, ọ dịghị ihe ọ bụla, nke ga-enye onye ọ bụla chọrọ ịgbapụ ndo.
Tupu anyị abanye, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ lere ma ọ̀ dị ihe anyị ji. Ọ gwara anyị ka anyị wepụta ihe nile dị n’akpa anyị. Amalitere m ịchịpụta uwe anyị otu otu. Mgbe nanị ihe fọrọnụ bụ otu uwe nke kpuchiri Bible ahụ, ewelitere m akpa ahụ igosi ya uwe dị n’ime ya wee sị: “Nanị ihe ndị a ka e kwere ka anyị were.” N’inwe afọ ojuju, ọ sịrị ka anyị banye n’ogige ahụ. Bible ahụ bụ nanị akwụkwọ anyị nwere.
Ndụ n’Ụlọ Mkpọrọ
Ná ngụkọta, e nwere ihe dị ka 34 ndị mkpọrọ. Ha bụ ndị omempụ a kasị mara na ndị kasị dị ize ndụ e nwere ná mba ahụ. Ọtụtụ bụ ndị ogbu mmadụ e lere anya dị ka ndị na-apụghị ịgbanwe. Anyị nile na-arahụ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ abụọ buru ibu nke e kewara site n’otu ọnụ ụlọ ịsa ahụ na mposi nke ghere oghe. Ọnụ ụlọ ahụ nwere bọket nsì a na-adịghị ekpuchi ekpuchi e ji eme ihe dị ka ebe a na-eje mposi. Ọ bụ ezie na ndị mkpọrọ ahụ na-akwafu nke a n’ụtụtụ ọ bụla, o yiri ka ijiji nile dị n’ọzara ahụ na-abịa ebe ahụ izuru ike na iri unyi nke bọket nsị̀ ahụ.
Nanị nri anyị nwere bụ ọka sorghum. Onye na-akwọ ya bụ otu onye mkpọrọ, ọ na-esi ya, ma na-eke ya n’efere, bụ́ nke a na-adọsa otu otu n’ute nke onye mkpọrọ ọ bụla. A dịghị ekpuchi nri ahụ ekpuchi. Tupu anyị esi ọrụ lọta, a na-enwe ọtụtụ narị ijiji ndị na-ekpuchi efere nri ọka sorghum ahụ. Mgbe anyị bulitere efere anyị, ijiji ndị ahụ na-emere mkpọtụ fepụ. Ruo ụbọchị abụọ ndị mbụ, anyị erighị ihe ọ bụla. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke atọ, mgbe anyị chụpụsịrị ijiji ndị ahụ ma kpekapụ ebe elu ahụ kpọworo nkụ, anyị malitere iri nri ọka sorghum ahụ. Anyị kpere ekpere ka Jehova chebe ahụ ike anyị.
Anyị rụrụ ọrụ n’okpuru anwụ, na-akwatụ mgbidi nke ogige mkpọrọ ochie ma na-ewu mgbidi ọhụrụ. Ọ bụ ọrụ siri ike nke ukwuu. Anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ n’ezughị ike malite n’elekere 6:00 nke ụtụtụ ruo ehihie, jee rie nri, malitekwa ọrụ ruo elekere 6:00 nke uhuruchi. E nweghị ụbọchị a na-ahapụ ọrụ. Ọ bụghị nanị na anyị tara ahụhụ n’ihi okpomọkụ ma n’oge oyi anyị tara ahụhụ n’ihi oyi ọtụtụ. Anyị takwara ahụhụ n’aka ndị nche ahụ obi tara mmiri.
Ịnọgidesi Ike n’Ime Mmụọ
Mụ na Djagli gụrụ Bible na nzuzo, anyị kwurịtakwara okwu banyere ihe anyị mụtara. Anyị apụghị ịgụpụta ya agụpụta n’ihi na a gaara anapụ anyị Bible ahụ, a gaara atakwa anyị ahụhụ. Otu onye mkpọrọ mụ na ya malitere ọmụmụ Bible nwere oriọna e ji kerozin amụ nke mụ na ya na-eji eme ihe. Ọtụtụ mgbe m na-eteta n’elekere mbụ ma ọ bụ abụọ n’ụtụtụ ma na-agụ akwụkwọ ruo ihe dị ka elekere ise. N’ụzọ dị otú ahụ, enwere m ike ịgụzu akụkụ Bible nile.
Anyị kwusaara ndị mkpọrọ ndị ọzọ ozi ọma, otu onye n’ime ha gwakwara onye isi ndị na-elekọta ndị mkpọrọ banyere anyị. N’ụzọ anyị na-atụghị anya ya, onye nlekọta ahụ nyere onye mkpọrọ ahụ otu magazin Teta! nke o nwere, onye mkpọrọ ahụ nyefekwara anyị ya. Agụzuru m ya ọtụtụ ugbo. Ihe ọgụgụ anyị na nkwusa anyị nyeere anyị aka ịnọgidesi ike n’ime mmụọ.
Isoro Ndị Enyi Na-enwe Nkwurịta Okwu
E nyeghị anyị ohere ide ma ọ bụ izipụ akwụkwọ ozi. Otú ọ dị, otu onye nke meworo anyị enyi kwuru na ya gaje inyere m aka. N’August 20, ihe dị ka izu isii mgbe anyị bịarutesịrị, edere m akwụkwọ ozi abụọ ná nzuzo, otu gaa n’ụlọ ọrụ onye nnọchianya Nigeria, nke ọzọ nye ndị enyi m bụ́ Ndịàmà. Eliri m ha n’àjà ma jiri otu nnukwu nkume rịba ebe ahụ ama. Mgbe e mesịrị, onye ahụ nke mere anyị enyi bịara wee bọpụta ha.
Ọtụtụ izu gabigara, ọ dịghịkwa ihe m nụrụ. Nke nta nke nta, ewepụrụ m olileanya na akwụkwọ ozi ndị ahụ erutewo ha aka. Ma ha ruru, Ndịàmà ibe anyị malitekwara ịgbagharị iji hụ na a tọhapụrụ anyị. Ministrị Na-ahụ Maka Okwu Mba Ọzọ nke Nigeria nwekwara mmasị n’okwu ahụ, ha jụkwara gọọmenti nke mba ahụ ebe a tụrụ m mkpọrọ, ihe mere o ji tụkpuo m n’ụlọ mkpọrọ dị otú ahụ.
Ka ọ dị mgbe ahụ, n’ụtụtụ nke November 15, 1984, a kpọọrọ anyị jee n’ebe anyị ga-arụ ọrụ mkpocha. Ndị nche ahụ dugara m n’otu ụlọ mposi ụlọ akwụkwọ kọleji nke ndị mmadụ jiworo na-eme ihe kemgbe ọtụtụ izu n’agbanyeghị na ọ sụchiwo. Nsị̀ juru n’ime ya. Ọrụ m, ka ndị nche ahụ sịrị, bụ ikpocha ya. Nanị ngwá ọrụ m nwere bụ aka m abụọ. Ka m nọ na-eche otú mụ na ọrụ nke a na-asọ oyi ga-esi jee, onye isi ndị ahụ na-elekọta ndị mkpọrọ batara wee sị na onye isi nke mpaghara ebe ahụ chọrọ ịhụ m.
Mgbe m rutere onye isi mpaghara ahụ sịrị na ya na onye isi ala nke mba ahụ enwewo nkwurịta okwu n’oge na-adịbeghị anya, bụ́ onye mataworo banyere ajọ ọnọdụ m. Onye isi ala ahụ kọwara na ọ bụru na m ga-enye aha Ndịàmà Jehova nọ ná mba ahụ, a ga-atọhapụ m ozugbo, na m pụkwara iso ụgbọ elu nke na-achọ ịpụ wee laa. Ọzọ, asịrị m na ọ bụrụ na ha chọrọ Ndịàmà Jehova, ọ bụ ọrụ ndị uwe ojii ịchọta ha. Onye isi mpaghara ahụ gwara m na m kwesịrị ịtụle ihe ha gwara m nke ọma. Ọ gaje inye m ụbọchị anọ ma ọ bụ ise iji cheere ya echiche. Mgbe ahụ a sịrị m jewegodị, ndị nche ahụ dughachikwara m n’ụlọ mkpọrọ, ọ bụghịkwa n’ụlọ mposi ahụ, bụ́ nke nyere m obi ụtọ!
Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onye isi nke mpaghara ebe ahụ kpọrọ m òkù wee jụọ ihe m kpebiworo. Asịrị m na nanị ihe mere m ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ha bụ n’ihi na m na-agbara ezi Chineke ahụ àmà, na ọ dịghịkwa ihe ọjọọ m mere. Akọwara m na m nwere akwụkwọ ikike ngagharị na akwụkwọ ikike ibi ná mba ahụ. Akwụkwọ m nile zuru ezu, mgbe ọ bụla m mekwara njem gaa n’obodo ọ bụla, anọgidewo m na-eje na nke ndị uwe ojii ijide n’aka na ihe nile dị n’usoro. Ebe ọ bụ na ọ dịghị mpụ ọ bụla m mere, ajụrụ m, sị: “N’ihi gịnị ka e ji na-ata m ahụhụ? Ọ bụrụ na unu achọghị ka m nọrọ ná mba a, n’ihi gịnị ka unu ji ghara ịchụla m? N’ihi gịnị ka e ji maa m ikpe ịnọ n’ebe a?”
Ekwuru m okwu ruo ihe dị ka 15 minit. Mgbe m kwusịrị, a gwara m ka m detuo ihe m kwuworo n’akwụkwọ, a gwakwara m na a ga-ezigara onye isi ala ihe nile m kwuru. E nyere m akwụkwọ, m wee dee peji anọ.
A Tọhapụrụ M n’Ikpeazụ!
Ọ dịghị ihe ọzọ m nụrụ banyere okwu ahụ ruo na January 1985, ihe dị ka ọnwa asaa m nọworo n’ụlọ mkpọrọ. N’oge ahụ, onye isi ndị na-elekọta ndị mkpọrọ bịara wee jụọ m ma m̀ degara akwụkwọ ozi n’ụlọ ọrụ onye nnọchianya Nigeria. “Ee,” ka m zaghachiri.
“N’ihi gịni ka i ji mee ya? N’ihi gịnị ka i ji ghara ịgwa m?” ka ọ jụrụ.
Agwara m ya na okwu ahụ agbasaghị ya. Ma emesiri m ya obi ike na ọ dịghị ihe ọ bụla m dere megide ya, ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla o nwere n’okwu metụtara mkpọrọ a tụrụ m. “Ọbụna nne m amaghị ebe m nọ,” ka m kwuru. Mgbe ahụ ọ chọrọ ịma ụzọ m si ziga akwụkwọ ozi ahụ, ma ajụrụ m ịgwa ya.
N’echi ya ndị nche ahụ doziri otu ụgbọ ala Land-Rover wee gwa m na a na-akpọpụ mụ na Djagli. A kpọpụtara anyị abụọ n’èzí, yipụsịa anyị uwe, ma lee ma ọ̀ dị ihe anyị ji. Tupu mgbe ahụ enyewo m otu onye mkpọrọ mụ na ya nọworo na-amụ ihe Bible m n’ihi na m maara na ndị nche ahụ ga-ewere ya ma ọ bụrụ na ha ahụ m ebe m ji ya. Nwoke a gwara anyị na mgbe a tọhapụrụ ya, na ya gaje ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Anyị na-ekpe ekpere ka o mee otú ahụ.
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a chụlara m na Nigeria, na February 1985, a maliteghachiri ozi m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ná mba ahụ. Kemgbe 1990, anọwo m na-eje ozi dị ka onye nlekọta distrikti na Nigeria. Djagli na-eje ozi ugbu a dị ka Onyeàmà nke na-ekwesị ntụkwasị obi na Côte d’Ivoire.
Site n’ahụmahụ nke a, eji m ihe mere m wee mara na Jehova Chineke pụrụ ichebe anyị n’okpuru ọbụna nrụgide kasị sie ike. Ọtụtụ mgbe anyị hụrụ aka ya ka ọ na-echebe anyị n’ụlọ mkpọrọ. Ntọhapụ anyị mesiri ya ike n’obi m na ọ bụghị nanị na Jehova maara ebe ndị ohu ya nọ na ahụhụ ha na-ata kamakwa ọ maara ụzọ isi napụta ha n’ọnwụnwa.—2 Pita 2:9.