Ọchịchọ A Na-achọ Amụma Ndị A Pụrụ Ịdabere Na ha
“ONYE pụrụ ịhụ ihe ga-emenụ n’ụbọchị atọ tupu ha emee ga-aba ọgaranya ruo ọtụtụ puku afọ.” Otú ahụ ka otu ilu ndị China si na-ekwu.
Ndị mmadụ chọrọ ịma ihe echi ga-eweta, ọtụtụ ndị ga-eji obi ụtọ kwụọ oké ụgwọ maka ihe ọmụma dị otú ahụ nke a pụrụ ịdabere na ya. Ha na-achọ amụma ndị a pụrụ ịdabere na ha. Dị ka a na-ahụ site ná nkwupụta ihe ga-abụ ọnọdụ ihu igwe na mgbakọ ọnọdụ akụ na ụba, anyị nwere mmasị n’ihe omume ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọzọkwa, ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya banyere ọdịnihu ga-enyere anyị aka ime atụmatụ na ịhazi ndụ anyị.
Ọchịchọ ịmara ihe ọdịnihu ga-eweta na-akpali ọtụtụ ndị ịga na nke ndị na-agba afa, ndị nduzi ime mmụọ, ndị na-agụ kpakpando, na ndị dibịa amoosu. Ụlọ ahịa ndị na-ere akwụkwọ na ebe a na-akwasa magazin jupụtara n’ihe odide oge ochie na nke oge ugbu a nke ndị na-azọrọ na ha na-ebu amụma banyere ọdịnihu. Ma obi abụọ na-adị n’ụdị ibu amụma ndị a. A kọrọ na onye Rom ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Cato kwuru, sị: ‘Ọ na-eju m anya ihe mere na onye na-akọwa ọdịnihu adịghị achị ọchị mgbe ọ bụla ọ hụrụ onye ọzọ na-akọwa ọdịnihu.’
Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ụdị nke ibu amụma. Na 1972, otu òtù mba nile nke ndị ọkà mmụta na ndị ji ego achụ ego a maara dị ka Club of Rom bipụtara otu ihe ọmụmụ nke na-ebu amụma na n’oge na-adịghị anya ihe ndị a na-egwute n’ala bụ́ ndị a na-apụghị ime ka ha dịghachi ọhụrụ ga-agwụcha n’ụwa. Ọ gaghị enwekwa ọlaedo ka ọ na-erule 1981, mercury ka ọ na-erule 1985, zinc ka ọ na-erule 1990, petroleum ka ọ na-erule 1992, na ihe ndị ọzọ. Anyị na-ahụ ugbu a na amụma ndị a emezughị.
Ọtụtụ amụma abụwo ndị dabeere n’echiche okpukpe. Iji mee ihe atụ: Bishọp obodo Saxon bụ́ Wulfstan kwetara na mwakpo ndị Denmark wakporo England ná mmalite narị afọ nke 11 bụ ihe àmà nke na ọgwụgwụ ụwa dị nso. Na 1525, Thomas Münzer nọrọ n’isi nke nnupụisi ndị ọrụ ugbo Germany n’ihi na n’otu ọhụụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi ka ha na-amụcha mma iwe ihe ubi maka ihe o chere na ọ gaje ịbụ oké owuwe ihe ubi. N’ụzọ doro anya, amụma ndị a abụghị eziokwu.
Dị ka ị pụrụ ịmaworị, Bible nwere ọtụtụ amụma. Ọzọkwa, ndị so dee Bible kwuru na Chineke kpaliri ha. Onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’Akwụkwọ Nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla; kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.”—2 Pita 1:20, 21.
Gụnyere ihe ndị ọzọ, Bible buru amụma banyere ihe omume dị iche iche nke a ga-eji mata ọgbọ nke ga-ahụ ọnụnọ nke Jisọs Kraịst n’ike Alaeze eluigwe. Agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji na-enweghị atụ, nakwa ndakpọ nke ịdị ike nke omume ọma mmadụ ga-abụ ihe ndị ga-egosipụta ihe Bible kọwara dị ka “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-14, 34) Dị ka Bible si kwuo, mwepụ nke usoro ihe dị ugbu a ga-emeghe ụzọ maka obi ụtọ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụwa ọhụrụ nke ngọzi ndị na-agaghị agwụ agwụ.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4.
Olee ụzọ i si ele amụma Bible ndị dị otú ahụ anya? Dị ka ọtụtụ amụma ndị ọzọ, hà bụ ịkọ nkọ nkịtị? Anyị pụrụ ịnwale ikwesị ndabere nke amụma Bible ndị na-emezubeghị site n’ikpebi ma amụma Bible ndị metụtara ihe ndị mere n’oge gara aga hà kwesịrị ndabere. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụfọdụ n’ime ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
A natara National Weather Service ike